Lesson 321 - Junior
Memory Verse
“Ya mere, onye nēche na ọ nēguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ida” (I Ndi Kọrint 10:2).Notes
Otù Eze Okorọbịa
Nime ndịeze nke Juda ka otù onye anaakpọ aha ya Uzaia bụ onye anaakpọ kwa ya Azaraia (2 Ndi Eze 14:21). Ọ dị náánị arọ iri na isii mgbe egburu nna ya bụ Amazaia na mgbe emere ya eze. Ná agbaghịagụgọ ọ tụrụ mmadụ niile n’anya otú nwa okorọbịa a bụ eze gaesi chịaọchịchị. Ọ gaachọ ndụmọdụ site n’aka ndị nwere mmụta n’inye ndị náachịachị ndụmọdụ? Ọ gaarapụ ndịokenye, wee chọ ndụmọdụ ọjọọ dịka Rehoboam nwa Solomon mere? (Lee Iheọmụmụ 287). Eze okorọbịa dị otú a ọ pụrụ ichịọchịchị nkeọma.
Ezi Ihe Nlereanya
Uzaia gosịrị na apụrụ inyefe nwa okorọbịa ọlụ n’aka ịlụ. Mgbe ọ malitere ọchịchị, ọ chọọ Chineke na amamihe Ya, mgbe náadịghị anya o nwetara ntụkwasịobi nke ndị mmadụ. Uzaia aghaghị ịghọtaworị na ya bụ nwanta ị bụ eze, na ya chọkwara inyeaka nke Onyenwe anyị ọ bụrụ na ọ gaeme nkeọma. O sooro ihe nna ya mere dịka ihe nlereanya nke nna ya ime ihe ahụ zirieze n’anya Onyenwe anyị, Náarụghịụka nna Uzaia kuzikwara ya banyere Onyenwe anyị na iwu Ya. Baịbụl naakuzi na mkwà dị icheiche dịịrị ndị náasọpụrụ ndị mụrụ ha. Ndụmọdụ Solomon nye ụmụntà bụ ka ha nụrụ ịdọakanántị nke nna ha ma cheta iwu nke nne ha (Ilu 1:8). O kwuru na ihe agaenye ha dịka ụgwọọlụ nrubeisi ha bụ: “ụbọchị ndụ dị ogologo, na ọtutu àrọ nke ndụ na udo” (Ilu 3:1, 2).
Ka Uzaia chọrọ Onyenwe anyị, Chineke mere ka ọgan’iru dịrị ya. Nke a bụ ihe a pụrụ ileanya ya n’ihi na Chineke ekwewo Ụmụ Israel mkwà na ha gaenwe uche ọ bụrụ na ha erubere Ya isi (Deuteronomi 29:9). Mgbe ọ naede akwụkwọ banyere ndị ahụ náebindụ eziomume, onye dere Abù Ọma sịrị: “Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ gá nke-ọma (Abù Ọma 1:3).
Iheịgankeọma
Iheịgankeọma dị n’ụzọ dị icheiche. Iheịgankeọma pụtara ọgan’iru. Ihe naagara ụfọdụ mmadụ nkeọma n’ụzọ nke ihe náadị nwa mgbe. Ha nwereike nwe ego, iheonwunwe, na ọgan’iru n’ihe nke ụwa. Ihe náatọ ndị Chineke ụtọ karịsịa bụ ọgan’iru nke imemmụọ. Ha chọrọ itóètó nime Onyenwe anyị, nwee kwa amara Chineke na ịhụn’anya Ya n’ụba. Ha chọrọ ime nkeọma n’ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ. Chineke naagọzi ndị Ya nime mmụọ na n’anụarụ, ma iheịgankeọma nime mmụọ dị mkpà karịsịa.
Ịchọ Chineke
Banyere Uzaia, eze Juda, “Ma n’ubọchi ọ nāchọ JEHOVA, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma.” O wee chọọ Chineke n’ụbọchị Zekaraia, onye nwere nghọta n’ihe nke mmụọ. Náarụghụụka Uzaia jekwuru ya maka ndụmọdụ na inyeaka. Ndị amụma biri n’ụbọchị Uzaia bụ Aisaia (Aisaia 1:1), Hosea (Hosea 1:1), na Emos (Emos 1:1). Ọ bụ ohere dị ịtụn’anya nye Uzaia inwe ike jekwuru ndị Chineke dị otú a ịnụ na ime okwu ha.
Iwu Ụlọ
Ka ihe naagara Uzaia nkeọma, o wuru ọtụtụ obodo nye ndị Juda. Otù nime ndị ahụ, bụ Ilot, nke nọ n’ụsọ Óké Osimiri Uhie n’ala Edom (2 Ihe Emere 8:17). Nke a bụ otù nime òtù ndị Solomon ji mee ebe ọ naedebe ọtụtụ ụgbọmmiri ya (I Ndi Eze 9:26). Uzaia weghachịrị Juda nke a, ma eleghịanya o jiri ya mee òtù maka ịzụrịta ahịa nke ha na obodo ndị dị n’Ọwụwaanyanwụ.
Ọ bụghị náánị na Uzaia wuru ọtụtụ obodo o wukwara ọtụtụ ụlọelu maka nchebe. Na Jerusalem, a pụrụ ichebe ọnụụzọama site n’ụlọelu ndị ahụ o wuru. Náarụghịụka ụlọelu ndịa pụrụ ị bụ maka nchebe, maka nlepụanya, na kwa ebe mgbaba n’ala tọgbọrọ n’efu. Uzaia nwekwara mmasị ime ka ihe náaga nkeọma n’obodo ahụ. Ọ hụrụ ịlụọlụ ubi na ịzụ anụụlọ n’anya. O gwuru ọtụtụ olulu ime ka mmiri dị karị. Ebe akụkụ ugwu ka enwere ubi vine. Na ndagwurugwu ka ọtụtụ anụmanụ dị. N’ụbọchị ndị ahụ, obodo Juda ghọrọ nke nwere ọgan’iru, nwe akụnaụba, bụrụ kwa obodo amaara nkeọma.
Megide Ndịiro
Chineke nyekwara Uzaia aka ime ka ihe gaara ya nkeọma n’imegide ndịiro ya. O buru agha megide ndị Filistia, bụ ndịiro ochie nke Ụmụ Israel. Ndị Filistia ewuwo ọtụtụ ebe mgbaba n’etiti ala ha na Juda. Ebe ndịa ewusịrị ike ka Uzaia bibiri mgbe ọ na arịdaru n’emebi kwa ebe niile ewusịrịike nke ndịiro.
Ihe gaara Uzaia nkeọma n’agha nke o buru megide ndị Arebia megide kwa ndị agbataobi ha ndịọzọ. Ndị Amọn nyere onyinye ịnata iruọma, náarụghị ụka, ka ha na Uzaia wee bụrụ enyi. Chineke nyere Uzaia aka megide ndịiro ya rue mgbe Uzaia ghọrọ onye amaara nkeọma n’ebe niile, ọbụná n’ebe dị anya dịka Ijipt.
Uzaia nwere ndịagha dị ike nke ukwuu nke nwere ngwaọgụ n’ụzọ anapụghị iji tụnyere ndịagha ọ bụla ọzọ n’oge ahụ. Enwere ọta, okpuagha, na uweagha iji kpuchie ndịagha. Ndịkom Uzaia nwere nghọta na ume. Ha mepụtara “ihe-agha-igwè” nke náagba ákù na nkume ukwu. Nke a bụ mbụ ejiri ihe nchépụta dị otú a gba ihe n’agha.
Ike Nke Imemmụọ
N’ụzọ nke imemmụọ, ọ bụ kwa ihe zirieze ikwada ebe ewusiri ike niile nke onyeiro. Dịka Chineke nyeere Uzaia aka, otú a ka Ọ gaenyere anyị aka n’ụbọchị taa imegide Setan, onyeiro nke mkpụrụobi anyị. Ọ naatọ Chineke ụtọ ịhụ ka ndị Ya naalụso onyeiro ọgụ karị ikwenyere Setan. Agwara anyị sị, “Guzogidenu ekwensu, ọ gāgbapu kwa n’ebe unu nọ” (Jemes 4:7). Ọ naeju gị anya bụ otú anyị gaesi guzogide onyeiro ahụ? Agwara anyị sị, “Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke” ka unu wee pu iguzo (Ndi Efesọs 6:11). “Ọta nke okwukwe” na “mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke” di n’ọnu-ọgugu nke ihe-agha ahụ. (Ndi Efesọs 6:13-17).
Jisọs n’onwe Ya jiri Okwu Chineke megide Setan. Mgbe ekwensu nwàrà Jisọs ọnwụnwa, o kwuru ihe edere n’Akwụkwọnsọ sị, “Edewo ya n’akwụkwọ nsọ,” setan “we si n’ebe Ọ nọ pua” (Luk 4:4-13). Anyị kwesịrị ịdị náagụ, naamụ kwa Baịbụl ka anyị wee mata ebe ihe ndịa di nime Akwụkwọnso. Ọ baara anyị urù nke ukwuu dịka “mmaagha nke Mmụọ Nsọ.” A pụrụ ime ka okwukwe anyị sieike site n’Okwu Chineke n’ihi na “okwukwe si n’onunu puta, ma ọnunu ahu sitere n’okwu Kraist” (Ndi Rom 10:17).
Ekpere dị kwa mkpà, maka mmadụ iji náetóetó nime mmụọ, na iji dị kwa ike nime Onyenwe anyị. Anyị naagụ sị, “ha aghagh ikpe ekpere mgbe nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha” (Luk 18:1). Ọ bụ ihe inyeaka nye mmadụ ikwu okwu banyere Onyenwe anyị, ichè échìchè banyere Ya, na ịgbaàmà ihe Chineke mere (Malakai 3:16; Abù Ọma 1:1, 2). N’Akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl anyị naagụ banyere mmadụ ụfọdụ ndị ọ gaabụ na ha emeriwo onyeiro nke mkpụrụobi ha “n’ihi ọbara nwa-aturu ahu, na n’ihi okwu àmà-ha” (Nkpughe 12:11).
Nganga
Uzaia abụrụwo onye amara aha ya, O nwewo ike na ọgan’iru n’ihi na Onyenwe anyị nyeere ya aka. Ọ chịrị nkeọma ọtụtụ arọ. Ma otù ihe mere. Ọ malitere ichè échìchè ukwu banyere onweya. Kama inye Chineke ekele na otuto, o wee chee na ya emewo nkeọma. O nyere onweya nsọpụrụ n’ihi ịgan’iru ya. O wee malite ịkpà nganga, ghọọ kwa onye ebuliri elu n’anya onweya. Anyị naagụ na Baịbụl na iheewù dị na nganga dị kwa n’ibuli onweonye elu. Ndịa bụ ebe ụfọdụ nime Akwụkwọnsọ n’ekwu banyere nganga “Nganga bia, nleli abia kwa” (Ilu 11:2); “Anya npako na obi di nganga … bu mmehie” (Ilu 21:4); “Niru ntipia ka npako nāga, ọ bu kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga (Ilu 16:18).
Banyere iweli onweonye elu anyị naagụ: “Onye ọ bula nke gēweli onweya elu, agēweda ya (Matiu 23:12); “Ọ buru na madu egwupụta ala nsọpuru-ha ọ bugh nsọpuru” (Ilu 25:27); “Ya mere, onye nēche na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida” (I Ndi Kọrint 10:12): “Onye nēme ka ọnu-uzọ ya di elu nāchọ ntipia” (Ilu 17:19).
Ihentà na Iheukwu
Eleghịanya Uzaia anuwo banyere Sọl onye buwororị eze Ụmụ Israel. Mgbe Sọl dị “ntà” n’anya onweya, Chineke mere ya eze (I Samuel 15:17). Mgbe Sọl ghọrọ onye ukwu n’anya onweya nke mere na o nupụrụ isi ma jụ iwu Onyenwe anyị, mgbe ahụ ka Onyenwe anyị jụrụ Sọl ịbụ eze (I Samuel 15:23). Nke a kwesịrị ịbụ ihemmụta nye ndị niile náanụ maọbụ náagụ banyere Sọl.
Otu ụbọchị Uzaia kpebiri na ya gaesurere Onyenwe anyị ihensure ọkụ náesìísìụtọ. Ebe ịchụàjà nke ihensureọkụ náesiísìụtọ. maọbụ ebeịchụàjà ọlaedo (Ọpupu 40:5), ka edobere n’Ebe Nsọ, “n’iru ákwà-ngbochi” n’Ụlụ ukwu Chineke (Ọpupu 30:6). Ụtụtụ niile mgbe anaedozi orịọna na echihie niile mgbe anaamunye ya ọkụ, ka anaedobe ihensureọkụ náesiísìụtọ n’elu ebeịchụàjà ka o wee náenwu mgbe dum dịka òfùfè nye Onyenwe anyị (Ọpupu 30:7, 8). Náánị ndị nchụàjà ka ekwere ka ha náaba n’Ebe Nsọ, ọ bụ kwa náánị ndị nchụàjà nwee ohere isure ihensureọkụ náesìísìụtọ n’elu ebe ichụàjà ọla-edo (Ọnu-ọgugu 16:40).
Ọ bụghị Ọlụ Ya
Mmadụ nwereike chee na Uzaia bụ ezi onye okpukpé site n’ịchọ isurere Onyenwe anyị ihe nsureọkụ náesìísìụtọ. Ma site n’ime otú a, ọ naalụ n’onweya ọlụ Chineke náenyeghị ya. Ọ pụtara na ọ chọrọ iwere ọnọdụ Chineke nyere náánị ndịnchụàjà. Ọ bụ ezie na Chineke agọziwo Uzaia mekwa ka ihe gaara ya nkeọma, Chineke emebighị Iwu ahụ nke nyere náánị Ụmụ ndịkom Eron ohere isure ihensureọkụ naesìísìụtọ. Onye ọ bụla aghaghị ịnọ n’ọlụ Chineke nyeworo ya. Mgbe mmadụ kwesịrị ntụkwasịobi dị kwa umeala n’obi, Chineke nwere ike inye ya ohere ịlụ ọlụ niile ọzọ. Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike inwe agụụ dị ukwu imeere Onyenwe anyị ihe, ọ ghaghị ime ihe kwesịrịekwesị na nke zikwara ezi n’anya Chineke. Samuel bụ Onyeamụma kwuru sị:, Le, ige ntị dị nma karị ịchụàjà, ịña ntị dị mma karị abụba ebulu (I Samuel 15:22).
Inupuisi
Ọ dịghị onye ọ bụla, ọbụná eze, gaemebiiwu Chineke wee ghara ịhụ ahụhụ. Mgbe Uzaia banyere n’Ebe Nsọ, o nupuruisi, ọ bụghị n’ihi na o nwere agụụ dị ukwu ịlụrụ Chineke ọlụ maọbụ na ọ maghị Iwu. Ma Uzaia eweliwo onweya elu rue mgbe ọ chọrọ iwere ọnọdụ ndịnchụàjà. Azaraia bụ Onyenchụàjà na iri ndịnchụàjà asatọ ndị ọzọ wee dọọ Uzaia akanántị, gbalị kwa ịkwụsị ya. Ndị nchụàjà ahụ wee kpọkue ya sị: “Pụa n’ebe nsọ a; n’ihi na i mekpuwo emekpu.”
Chineke Tiri Ya Iheotiti
Mmadụ gaele anya na Uzaia gaesi n’ebe nsọ ahụ gbapụ ọsọsọ wee rịọarịrịọ maka mgbaghara mmehie. Ma Uzaia jupụtara na nganga, ọ sọpụrụghị kwa ndịnchàjà ahụ na Chineke. Ka o ji ihe eji esure ihensureọkụ náesìísìụtọ n’aka ya guzoro n’ebe ahụ, náeweiwe megide ndịnchụàjà ahụ, kpebie kwa isure ihensureọkụ naesìísìụtọ, ekpenta malitere iwapụta náegedege iru ya. Onyweanyị tiri ya iheotiti, nke a wee bụrụ kwa nsọtụ nke ịdịukwu ya.
N’ihi ekpenta ahụ, nke bụ ahụhụ enyere Uzaia n’ihi mmehie ya, “ebipuru ya n’ulo JEHOVA.” Ha wee mee ka o si n’Ụlọ Ukwu Chineke pụọ ọsọsọ, ọ gaghịefè kwa òfùfè n’ebe ahụ ọzọ. Ka èzínaụlọ ya ghara kwa ịghọ ndị ekpenta, o jee biri n’ụlọ ọzọ dị iche site n’ebe ndị èzínaụlọ ya bi, náebi iche, dịka Iwu si dị (Levitikọs 13:46). Uzaia apụghị kwa ịlụọlụ dịka eze ọzọ -- nwa ya nwoke bụ Jotam, wee náekpe ndị ala ahụ ikpé. Uzaia nọgidere n’ịbụ onyeekpenta ụbọchị ndụ ya niile nke fọdụrụ. Mgbe ọ nwụrụ, eliri ya n’ọhịa nke ndịeze nwere. Ọ dị ka agaasị na ílì ya dị iche site na nke ndịeze ọzọ, n’ihi na ha siri na “Onye-ekpenta ka ọ bụ.”
Obi Umeala
Enwere ihe ndepụta nime Baịbụl naagwọrọ ndịekpenta. Anyị amụwo ihe banyere Neaman onye agwọrọ site n’ekpenta ya mgbe o wedara onwe ya ala irubere Chineke isi (Iheọmụmụ 311). Etiri Miriam, nwanne Moses nke nwanyị ekpenta (Ọnu-ọgugu 12:10). Chineke gwọrọ ya mgbe o kwupụtara mmehie ahụ Moses kpekwara ya ekpere. Eleghịanya apụrụ ịgwọwọrị Uzaia. Ma anyị agụghị na Baịbụl na o chègharịrị ọbụná site ná mmehie ya maọbụ rịọ ka ekpere ya ekpere ka ewee napụta ya. Náánị otù mmehie a, ka akpọrọ aha megide Uzaia (Ihe Emere 27:2). Anyị naahụ site ná ndụ ya na otù mmehie gaeweta nkewapụ site n’ebe Chineke nọ. Lee mbibi nke otù mmehie wetara ibuli onwe ya elu! Lee otú o si dị mnwute na ndụ ya gaebi n’ụzọ dị otú a mgbe ọ chịsịrị ọchịchị iri arọ ise na abụọ nke ka nke mgbe ọ malitesịrị nkeọma! Lee otú o si dị mma karị ka anyị “were obi di ume-ala ke onwe-unu dika àkwà, n’ihi Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-nkpako, ma Ọ nēnye ndi dị ume-ala n’obi amara” (I Pita 5:5). Otù nime ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ bụ “iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije (Maika 6:8). Na ndụ Uzaia, achọpụtara na Okwu ekwuru n’Akwụkwọ Ilu bụ eziokwu: “ Npako madu gēme ka ọ di ala: ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpụrụ ike (Ilu 29:23).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Uzaia ọ dị arọ ole mgbe ọ malitere ọchịchị?
2 Gịnị mere obodo Ilot ji dị mkpà?
3 Òlee otú ụlọelu pụrụ iji baa urù?
4 Ònye nyere Uzaia aka megide ndịagbata obi ya?
5 Òlee ndịamụma biri n’oge Uzaia?
6 Gịnị ka ịchọ Chineke ya lụpụtara?
7 Gịnị mere Uzaia jiri chọọ isure ihensureọkụ náesìísìụtọ?
8 Gịnị mere o zighị ezi ka Uzaia sure ihensureọkụ náesìísìụtọ?
9 Gịnị bụ ahụhụ enyere ya?
10 Gịnị kpatara mmehie Uzaia?