Joel 1:1-20; 2:1-32

Lesson 322 - Junior

Memory Verse
“Atula egwu, gi ala, te egwú ọñụ, ñuri kwa, n’ihi na JEHOVA emewo Onwe-Ya uku n’ime ihe” (Joel 2:21).
Notes

Okwu Nkasịobi

“Atula egwu gi ala, te egwú ọñụ, ñuri kwa, n’ihi na JEHOVA emewo Onwe-Ya uku n’ime ihe” (Joel 2:21). Lee okwu nkasịobi dị otú a nye Ụmụ Israel obi naalọ mmiri! Che banyere urù ọ gaabara ndị adọtaworo n’agha bụ ndị náahụ ahụhụ n’ihi mmehie ha. Ọ dịbeghị anya ha nụrụ amụna Joel banyere ikpé gaje ịdakwasị ha okwu mere ka ha jupụta n’obi ịdambà. Ugbu a ìhè nke a siri nime ọchịchịrị ahụ nwupụta: “Atula egwu, gi ala, te egwú ọñụ, ñuri kwa.”

Ikpé nke Joel kwuru okwu banyere ya abụghị nye náánị Israel. O kwu kwara banyere “ụbọchị JEHOVA,” nke gaabịa n’oge óké mkpagbu ahụ. Ọ gaabụ “ụbọchị igweoji na óké ọchịchịrị, … ihe dị ka ha adịgh site na mgbe ebighịebi garaaga, mgbe ha gasiri ihe di ka ha agagh-adi kwa ọzọ, rue arọ nile nke ọgbọ na ọgbọ.” “N’iru ha ka ala maworo jijiji, eluigwe emewo mkpatu: anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpuwo kwa onwunwu ha: JEHOVA emewo kwa ka olu-Ya da n’iru usu-ndi-agha-Ya; n’ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmụma-ụlọ-ikwu-Ya bu; n’ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n’ihi na ubochi JEHOVA di uku di kwa egwù nke-uku; ònye kwa ganagide ya? (Joel 2:10, 11).

Ọ bụrụ na nke a bụ náánị ọdịn’iru mmadụ náatụ anya ya, ọ bụghị ihe dị egwù? Chineke gwara Joel ka o dee okwu niile ahụ n’akwụkwọ ka Ụmụ Israel wee mata na ha bụ ndị mmehie, na ihe ahụhụ ha gaabụ ma ọbụrụ na ha échègharịghị chigharịkwute kwa Chineke.

Olileanya

Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla Chineke rapụrụ mmadụ náenweghị olileanya. Ọ gwara Ụmụ Israel ụzọ ha gaesi gbanarị ikpé niile ahụ: “Werenu obi-unu nile, were kwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-àkwà, were kwa iti-aka-n’obi, chigharikutem: dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute JEHOVA, bú Chineke-unu: n’ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere, Ọ nēcheghari kwa uche banyere ihe ọjọ ahụ Ọ gēweta” (Joel 2:12, 13). Nime okwu niile ahụ Ọ naakụziri ụmụmmadụ n’ọgbọ niile na ha aghaghị ichègharị ná enwe nwute n’ihi mmehie ha ka ewe zọpụta ha.

Chineke sị kwa-ra: “Biko bianu, ka ayi rurita uka, bu ihe JEHOVA nāsi: O buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi” (Aisaia 1:18). N’ihi nke a ọ dịghị onye kwesịrị ịhụ ahụhụ ikpé nke óké mkpagbu. Apụrụ izọpụta anyị niile ma ọbụrụ na anyị échègharịa si nime mmehie niile anyị chigharịa wee kwe ka Jisọs bụrụ Onyenzọpụta anyị.

Ịgụmmadụ n’onyeeziomume bụ náánị mmalite nke ngọzi niile anyị naenwe site n’iso Onyenwe anyị. Nzọụkwụ nke náeso ya bụ odudonsọ, nke anaesite na ya ropụ mkpọrọgwụ nke mmehie. Anyị naanata onyinyeamara ahụ site n’ikpeekpere na iwere ndụ anyị chụọàjà ga omimi nye Onyenwe anyị.

Nzọụkwụ nke atọ bụ ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Nke a bụ ihe Joel Onyeamụma naekwu banyere ya mgbe ọ sịrị: “Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọñụ, ñuri kwa na JEHOVA, bú Chineke-unu: n’ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bu miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n’ọnwa mbu” (Joel 2:23).

Oge Nke Mmụọ Nsọ

Ihe a niile bụ amụma, náatụaka oge nke Mmụọ Nsọ, oge nke Mmụọ Nsọ ganakpọ náakwadobe kwa ndị bụ Nwunyeọhụụ nke Kraist nye ọbịbịa Jisọs. Pita Onyeozi sịrị na ndịamụma ebuworị amụma banyere oge a dị ebube nke nwụpụ nke Mmụọ Nsọ ọbụná ndị mmụọozi nwere mmasị na ya wee chọ ịma banyere ya (I Pita 1:10-12).

Oge bu ụzọ n’akụkọ Baịbụl ka amara dịka “tutu ijummiri,” mgbe ijummiri náaka adịghị. Oge nke ndịokenye n’okwukwe sitere na Noa rue mgbe Ụmụ Israel batara biri n’ala Kenan. Oge nke ndịikpé wee rue, mgbe nke ahụ gasịrị oge nke ndịamụma. Mgbe emesịrị oge Joel kwuru banyere ya dkaị oge “mmiriozuzo mbụ.” Nke ahụ malitere n’ụbọchị Pentikọst mgbe Mmụọ Nsọ rịdatara wee wụọ otù narị na iri mmadụ abụọ ahụ nọ n’ụlọ mmiri.

Jisọs asịwo: “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābikwasịwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm … ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Nke ahụ bụ ihe mere eji nye ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ: ka enye ụmụ Chineke ike na ịbụ ndịàmà Chineke ka ewe rite ọtụtụ mkpụrụobi n’urù nye Alaeze Chineke.

Nime ọtụtụ arọ náeso ụbọchị Pentikọst, ụmụmmadụ natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Otú ọ dị óké mkpagbu bilitere megide mkwusa nke Oziọma ahụ, n’ikpeazụ ọtụtụ nime ndị náekwusa náebi kwa ndụ nke Oziọma ahụ gbapụrụ ga n’ebe nzuzo. Ọ fọdụrụ ihe ntà ka ekpochapụ Nzukọ Kraist. Ndị Rom bibiri Jerusalem, ewe chụsasịa ndị Juu ga nime ụwa niile. Nke a bụ otù akụkụ nke ikpé ahụ Joel buru amụma banyere ya. Ala Nsọ ahụ wee bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu; mmiriòzùzò ezoghị, ewe gbutue osisi niile. Ebe bụrị ala nke ogige maramma wee ghọọ ọzara. Ma nke ahụ abụghị ọgwụgwụ nke akụkọ Ụmụ Israel.

Mmiriòzùzò Ikpeazụ

Joel ekwuwo kwa banyere oge ọzọ náabịa n’ọdịn’iru nke akpọrọ oge nke “miri-ozuzo ikpe-azu.” Ọ gaeme ka “oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n’ọnwa mbu.” Oge nke Mmụọ Nsọ agwụghị mgbe ndị mbụ náesoụzọ Jisọs na Ndịozi nwụrụ. Jemes bú Onyeozi, onye dịrịndụ n’oge Mmiriòzùzò Mbụ, kwuruokwu banyere oge ọzọ mgbe ọ sịrị: “Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n’ebe ọ di, rue mgbe ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu” (Jemes 5:7).

Mkpụrụ nke ala ahụ o kwuruokwu banyere ya bụ Nwunye anaalụ ọhụụ nke Kraist, onye anaejikere nye ọbịbịa nke Onyenwe anyị. Nzukọ Kraist anatawo Mmiriòzùzò Mbu, malite n’ụbọchị Pentikọst; ma Jisọs akàabịaghị ịkpọrọ Nwunye Ọ naalụ ọhụụ. Oge ọzọ naabaịa mgbe agaje ịwụpụ Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ n’ụzọ baraụba karịa; mgbe nke a gasịrị, Jisọs gaabịa mgbe Nwanyị ahụ Anaalụ ọhụụ jikeere. Nke a metụtara oge anyị nọ nime ya taa.

Òlee otú anyị si mata na Joel naekwu banyere ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ mgbe ọ naekwu banyere mmiriòzùzò mbụ na mmiriòzùzò ikpeazụ? Pita kọwara ya n’Ụbọchị Pentikọst mgbe ọ sịrị: “Kama nka bu nke ekwuworo site n’ọnu Joel onye-amuma, si Ọ gēru kwa na mgbe ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anuaru nile, bú madu” (Ọlu Ndi-ozi 2:16, 17), o wee gaa n’iru ikwu banyere ọlụ NdịKraist nataworo ike ahụ gaalụrụ Onyenwe anyị.

Mmiriòzùzò na Palestain

Mgbe obodo Palestain tọgbọsịrị n’efu ọtụtụ narị arọ, mmiri malitere izò ọzọ, ala ahụ wee malite ịmị mkpụrụ. Ná mmalite nke narị iri arọabụọ (20th century) mgbe ọzara malitere ịtụwa okoko, ejiwo nwayọ náakọ ugbó n’ala ndị fọdụrụ ọbụná rue taa anaenweta ụfọdụ nime mkpụrụ ọkụkụ kachasị mma nime ụwa n’ala Nsọ ahụ.

Joel ekwewo mkwà sị: “Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n’ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhụ. M’gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-warm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M’ziteworo n’etiti unu. Unu geriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe too aha JEHOVA, bu Chineke unu, Onye mesoworo unu n’ilu oké ọlu: ihere agagh-eme kwa ndim rue mgbe ebigh-ebi” (Joel 2:24-26). Ndị jụ ahụwo ahụhu n’ụwa niile ihe ra ka narị arọ iri na iteghete, ma ugbu a Chineke naezighachị ha n’ala nke aka ha. Ha naalaghachị n’ekweghịekwe, ma oge naabịa mgbe ha gaanara Jisọs dịka Mesaia ha. Ngọzi niile nke ndịamụma kwuru banyere Ọchịchị nke Puku Arọ ka agaawụkwasị ndị niile kwere nara kwa Jisọs.

Óké Nwụpụ ahụ

Iheọzọ karịrị ngọzi nke anụarụ mere mgbe mmiriòzùzò malitere izó na Palestain, Óké mnwụpụ nke Mmụọ Nsọ n’oge nke Mmiriòzùzò ikpeazụ, malitere dịka .Chineke kwuru. Ọ malitere ọbụná n’ọnwa mbụ n’arọ nke Ndị Juu dịka okpukpé ha si dị dịka Joel dere ya n’akwụkwọ. Mmadụ olenaole nime narị arọ ndị ahụ anatawo ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, ma edebere mmalite nke óké mnwụpụ ahụ nye ọnwa April nke arọ 1906.

N’oge ahụ enwere óké agụụ nke imemmụọ nime nzukọ niile na n’etiti NdịKraist n’ụwa niile. Enwere óké ntute n’oge nke Luther, na n’oge nke Wesley, na nime mkwusa nke ndị Chineke dịka Charles Finney, Charles Spurgeon, Jonathan Edwards, na D. L. Moody. Emesịa óké Ntute nke Welsh we bịa mgbe Mmụọ Nsọ kpọtara ọtụtụ puku mmadụ nime Alaeze Chineke.

Nime obodo Los Angeles dị na California ọtụtụ mmadụ nime ọtụtụ nzukọ naekpeekpere n’ihi ntute. Ọgbakọ nke ụmụ okoro ji ego náachụ ego naenwe nzukọ ekpere ogologo abalị niile. Ụfọdụ mmadụ naagbakọ n’ụlọ ntà ikpeekpere. Ndịa niile naeleanya mnwụpụ nke Mmụọ Chineke n’ụzọ dị ukwu karịa otú ha matara na mbụ. Akụkọ nke otù nwoke sitere ná Ntute nke Welsh mere ka agụụ ahụ dị omimi karịa.

Onye malitere ọlụ nke Apostolic Faith na Portland Oregon, bụ Mrs. Florence L. Crawford so n’etiti ndị ahụ náenwe agụụ nke ike Chineke nime ndụ ha. O tolitere n’èzínaụlọ nke ndị náamaghị Chineke; ma ihe dịka arọ irinaise tutu mnwụpụ nke Mmiriòzùzò ikpeazụ ahụ, ọ nụwo ka Chineke gwara ya okwu n’ụlọ itéegwú sị, “Nwam nwanyị, nyem obi gị.” Site ná inyeaka nke otù nwanyị bi ya nso onye ọ chọpụtara dịka nwanyị náatụ egwù Chineke o kpereekpere wee mata na agbagharawo ya mmehie ya niile.

Ihe sitere ná mgbanwe nke ndụ ya gaje imetụta ụwa niile n’oge náabịa. Agbanwere omume ya site n’ịchọ iheụtọ nke ụwa ghọ onye nyere onweya n’ijere ndịọzọ ozi. Ọ naebugara ndị ogbenye iheoriri na uwe. Ya na ndịọzọ naalụkọọlụ iwuru ụmụntà ndịkom na ndịnyom ajọ ihe dakwasịrị ebeobibi. Ọlụ ya n’ụlọmkpọrọ dị icheiche, ebe ọ naagbalị iwetara ndị akpọchibidoro n’ụlọmkpọrọ olileanya bụ ọlụ nke ịhụn’anya nye ụfọdụ ụmụokoro a nwere nne ndị chọrọ enyemaka.

Ọ nụrụ banyere odudonsọ, ma ọ bụ ezie na nke a gụsịrị mkpụrụobi ya agụụ ike ma ọ hụghị onye pụrụ ịgwa ya ihe ọ gaeji mata na edowo ya nsọ. Otù ụbọchị otù enyì ya gwara ya banyere nzukọ anaenwe n’otù akụkụ nke obodo ebe ha náadịghị aga mgbe niile. Otú ọ dị, o kwere na ndị ahụ nwere ihe naagụ ya agụụ. Ná nzukọ mbụ nke o soro ha nwekọ, ụkọchukwu biliri wee sị “Ekwerem na otù onye n’ebe a chọrọ ka edo ya nsọ.” N’abalị ahụ ka ọ natara onyinyeamara ahụ.

Ọ bụ n’etiti ndị ahụ dị umealan’obi, nọ n’okporo ụzọ Bonnie brae dị na Los Angeles, ka mnwụsa nke Mmụọ Nsọ malitere. Ike Chineke dakwasịrị ụmụmmadụ n’ụzọ dị ukwu. Ka akụkọ nke Mmiriòzùzò nke Ikpeazụ na Los Angeles naagbasa kwa, akụkọ wee si n’India si kwa n’obodo dị icheiche dị na Scandinavian bịa kwa ná awụpụ ike. Mmiriòzùzò nke mmụọ ahụ zokwara n’akụkụ obodo dị icheiche nke ụwa. Oge nke Mmiriòzùzò ikpeazụ ahụ abịawo, ewe mee ka obi ndị ahụ agụụ ike Chineke naagụ ñụrịa.

Jemes asịwo na Onye ọlụ ubi (Onyenwe anyị) naatachị ogologo ntachịobi náeché mkpụrụ nke ala “rue mgbe ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzu ikpeazụ.” Ugbu a Mmiriòzùzò ikpeazụ abịawo, nke agaeji dozie Nwunye ọhụụ nke Kraist nye ọbịbịa Ya.

Ta, “nzukọ nke ndi eburu uzọ mụpụta” (Ndi Hibru 12:23), ndị kwereworo Okwu Chineke wee nata onyinyeamara niile nke Chineke nwere inye ha, náele anya ọbịbịa nke Onyenwe anyị mgbe ọ bụla. Ha naechere ịnụ “ Ka ayi ñurịa ọñụ, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya” (Nkpughe 19:7)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ikpé dị egwù nke Joel gwara Ụmụ Israel banyere ya?

  2. 2 Olileanya gịnị ka o nyere ha?

  3. 3 Kpọọ aha onyinyeamara atọ pụtara ìhè nke OnyeKraist.

  4. 4 Gịnị ka “mmiriozuzo mbu” nke mmụọ pụtara?

  5. 5 Òlee mgbe ọ bịara?

  6. 6 Gịnị bụ ụfọdụ nime ikpé dakwasịrị Israel mgbe náadịghị anya Kraist lasịrị n’Eluigwe?

  7. 7 Gịnị bụ mkwà dị icheiche Chineke kwere ala Palestain n’ọdịn’iru?

  8. 8 Òlee mgbe Mmiriòzùzò Ikpeazụ malitere izò? Òlee ebe?

  9. 9 Ndị Juu hà naemezu amụma taa?

  10. 10 Gịnị ka “nzukọ nke ndị eburu ụzọ mụpụta” naechere?