Ọlu Ndi-ozi 12:1-23

Lesson 323 - Junior

Memory Verse
“Aririọ nke onye ezi-omume di ike nke-uku n’ilusi-ọlu-ike-ya” (Jemes 5:16).
Notes

Herod Agripa

Site n’aka ndị Rom ka emere Eze Herod onye ọchịchị nke Palestain. Ọ bụghị otù onye nime ndị Juu: ma nime arọ olenaole ọ chịrị ọchịchị ka o jiri chọọ inweta iruọma n’ebe ha nọ. Otù ụzọ o ji pụ ime ihe gaatọ ndị Juu ụtọ bụ site n’imejọ ndị náesoụzọ Jisọs Kraist. Herod malitere isetị aka ya megide ha. Ọ bụrụwo ihe ra ka arọ iri site na mgbe egburu Stifen (Iheọmụmụ 289). N’oge ahụ, ndị náeso ụzọ Jisọs agbasasiwo n’akụkụ niile nke ala ahụ, náezisa kwa Oziọma ebe ọ bụla ha gara (Ọlu Ndi-ozi 8:1). Ewee wue nzụkọ Kraist na Sameria na Antiọk, ebe eburu ụzọ kpọọ ndị náesoụzọ Jisọs “ndi Kristian” (Ọlu Ndi-ozi 11:26). Emewo ka Sọl onye Tasọs kwere na Chineke (Iheọmụmụ 301), Ezigawo Pita n’ụlọ Kọnilọs, o kwusawo kwa banyere Jisọs, Ndịmbaọzọ anatawo kwa Oziọma (Ọlu Ndi-ozi 11:1).

Náaarụghịụkà ndịisi ndị Juu chọrọ isite ná mkpagbu na okwu ịbámbá mee ka ndị náesoụzọ Jisọs tụọ egwù (Ọlu Ndi-ozi 5:40). Kama ịkwụsị ọlụ nke ndị náesoụzọ Jisọs, ha mere ka Oziọma gbasaa karịa.

Jemes

Iheọmụmụ anyị taa naagwa anyị banyere Onyeozi mbụ egburu n’ihi okwukwe ya. Onye egburu n’ihi okwukwe ya bụ onye ahụ nyere ndụ ya n’ihi okwukwe ya dịka onyeKraist karị ịgọnarị mkwenye o kwenyere na Jisọs, Jemes bụ Onyeozi mbụ egburu n’ihi okwukwe. Ọ bụ nwanne Jọn, bụrụ kwa nwanwoke Zebedi (Mak 1:19). Ọ bụ onye ọkụazụ mgbe Jisọs kpọrọ ya.Ya na nwanne ya rapụrụ nna ha na ụbgọmmiri otù mgbe ahụ iso Jisọs (Matiu 4:22). Mgbe emesịrị akpọrọ Jemes ka ọ bụrụ otù nime ndịozi irinaabụọ ahụ (Matiu 10:2). Ọ bụ otù onye nime mmadụ atọ ndị náanọ Jisọs nso karịsịa. Jemes na Jisọs nọ n’oge mnwogha Ya (Iheọmụmụ 114). Jemes na Jisọs nọ n’ogige Getsemane mgbe O kpereekpere n’óké ihemgbu.Ọ bụ otù onye nime mmadụ atọ ahụ Jisọs sịrị “Som nēche nche” (Matiu 26:38). Mgbe Jisọs rigosiworo Eluigwe, Jemes rubereisi n’iwu Jisọs nyere ka ha chéré mkwà nke Nna (Ọlu Ndi-ozi 1:4). O soro ndịọzọ jee n’ụlọ elu na Jerusalem ikpeekpere (Ọlu Ndi-ozi 1:13). N’ebe ahụ ka ha natara ike ịbụrụ Jisọs ndịàmà. (Ọlu Ndi-ozi 1:8).

Mkpagbu

Nke a bụ Jemes ahụ onye Herod jiri mmaagha gbue. Agwara anyị na ihe ihere ka ọ bụ, bụ iji mmaagha wee bipụ mmadụ isi, ọ bụ kwa ụzọ dị otú a ka esi gbue Jemes. Náarụghịụkà Herod atụworịanya na ebe ya mere ka ọnwụ na iheihere dakwasị Onyeozi a nọ Jisọs ezi nso, na ndị ọzọ agaghị enwe kwa mkwuwaokwu ná nzisa ha. N’otùaka ahụ kwa na omume ya gaatọ ndị Juu ụtọ, ka o wee site na nke a nweta iruọma ha. N’ebe Jemes nọ ọnwụ mberede ya pụtara mmeri mberede ọ gaanọnyekwara Jisọs, onye ọ hụrụ n’anya nke ukwuu.

Pita

Mgbe Herod hụrụ na ọnwụ Jemes tọrọ ndị Juu ụtọ, o mere ka mkpagbu dị karịa. N’oge a o mere ka ejide Pita tụbà ya n’ụlọmkpọrọ. Ọ bụ oge achịcha ekoghịeko, idebezu ememe Ngabiga, nke bụ oge Ista anyị. Échèrè Pita nchè nkeọma n’ụlọmkpọrọ, Herod tụkwara àtụmààtụ idebe ya rue mgbe Ista gasịrị.

Nke a abụghị mbụ anaatụba Pita n’ụlọmkpọrọ n’ihi mkwusa ọ naekwusa Oziọma. Otù mgbe ndị ọchịchị atọpụwo ya na Jọn n’agbụ ebe ha náahụghị “uzọ ha gāesi me ka ha hu ahuhu nmehie” (Ọlu Ndi-ozi 4:21). Enyere ndịozi iwu ka ha ghara ikwusa ọzọ n’aha Jisọs. (Iheọmụmụ 283). N’oge ọzọ, otù mmụọozi nke Onyenwe anyị meghere ụlọmkpọrọ wee mee ka ndịozi ahụ nwere onweha (Ọlu Ndi-ozi 5:19). Atụbara ha n’ụlọmkpọrọ n’ihi na ha nọgidere n’ikwusa banyere Jisọs. Akpọpụtara ha n’iru nnọkọikpé ndị Sanhedrin. Pita na ndị ọzọ wee kwue sị: “Ayi aghgh ikwenyere Chineke kari madu.” N’oge a apịara ha ihe tupu arapụ ha (Ọlu Ndi-ozi 5:40).

Eleghịanya, Herod maara mgbe Pita siri n’ụlọmkpọrọ gbapụ, ọ bụ ezie na ahụrụ ụlọmkpọrọ ka “emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi nche ka ha nēguzo n’ọnu-uzọ” (Ọlu Ndi-ozi 5:23). N’oge a Herod nyere iwu ka atụbà Pita n’imeime ụlọmkpọrọ, ka ndịagha irinaisi ná eché kwa ya nché

Ekpere

Pita nọ n’ọnọdụ jọrọnjọ nke ukwuu. Ọ dịghị inyeaka ọ pụrụ inweta site n’ụwa. Iwu adịghị, ọ dịghị kwa onye náekwuru ya ọnụ ya nwere ike ime ka o nwere onweya. Ma ụfọdụ ndị enyì ya naekpeekpere. Ndị náesoụzọ Jisọs zukọtara n’ụlọ Meri, nne Jọn Mak. N’ebe ahụ ka ha kpereekpere náewepụghịaka maka Pita. Náarụghịụka, mgbe niile ọ nọ n’ụlọmkpọrọ ra ehihie na abalị ekpereekpere n’ihi ya.

Mgbe enwere nsogbu nke ọ dị ka olileanya adịghị, ụfọdụ mmadụ naeché na ọ baghị urù ikpeekpere. Ndịọzọ naakwụsị mgbe ha kpeworo ekpere otù ugbò maọbụ abụọ. Ka anyị nwee ihemmụta site na nke a “na apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ” (Mak 10:27).

Ọtụtụ ụbọchị gabigara, ma Pita ka nọ n’ụlọmkpọrọ. N’ikpeazụ náánị otù abalị fọdụrụ ikupụta Pita n’iru ọra mmadụ ka ekpé ya ikpé. Pita atụghị egwù, obi alọghị kwa ya mmiri banyere ihe gaeme ya. Ọ matara na ndị nke Onyenwe anyị naekpere ya ekpere. Náaarụghịụka, ọ naekpe kwa ekpere. Dịka ọ náadị, ndị nke Chineke naekpeekpere dịka Jisọs kpere: “Nnam, … ka eme ihe I nāchọ” (Matiu 26:42). Eleghịanya o metụrụ Pita n’obi dịka o metụkwara Pọl, onye sịrị: “N’ebe m’nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa uru” (Ndi Filipai 1:21). Pita jikeere ịnwụ maọbụ ịdịndụ n’ihi Kraist.

Nnápụta

N’abalị ahụ, ka Pita naeje idina wee rarụụra, ebe niile gbara ọchịchịrị, ekere ya agbụ n’etiti ndịagha abụọ. Na mberede, ìhè wee nwuwaa nime ụlọmkpọrọ ahụ, mmụọozi nke Onyenwe anyị mekwara ka ahụ ya anya. Pita chère na ya naahụ ọhụ, ma o mere dịka mmụọozi ahụ siri gwa ya. Ka o biliri, mkpọrọ niile ahụ wee dapụ. Pita wee yiri akpụkpọụkwụ ya, gbokwasị uwe n’arụ ya, wee soro mmụọozi ahụ. Ha wee gafee ndịnché nke mbụ na ndịnché nke abụọ. Ka ha naabịaru ọnụụzọama nke ezi, o meghere onweya nye ha. Mgbe ha gafesịrị ọnụụzọama igwè ahụ nke náeduba nime obodo, mmụọozi ahụ rapụrụ Pita. Mgbe ahụ ka ọ matara na ọ bụghị ọhụ ka ọ hụrụ. Anápụtara ya site n’ụlọmkpọrọ. Ọ dịghị opi ọ bụla anụrụ ụda ya, ọ dịghị kwa ndịnché náetimkpu n’ihi mgbalaga ya. Ihe niile dị jụụ, n’ihi na Chineke ezigawo mmụọozi ahụ ịlụọlụ ịrịbaàmà a. Pita sịrị: “Ugbu a ka m’matara n’ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n’aka Herod, ya na ileanya niile nke ndị Ju.”

Okwukwe

Pita kpebiri ijé n’ụlọ Meri, nne Jọn Mak, ebe ọ matara na ndị nke Chineke nọ náekpere ya ekpere. Ọ chọrọ ịnọnyere ndị ahụ kpeere ya ekpere. Ọ chọrọ ịgwá ha otú Chineke ji zaa ekpere ha wee napụta ya. Mgbe Pita kụrụ aka n’ụzọ, otù nwantanwanyị aha ya bụ Roda wee jụọ onye náakụ aka . Mgbe ọ matara olu Pita, o jupụtara n’ọñụ na n’obiụtọ nke mere na o chefuru imeghe ụzọ ime ka Pita bata nime.

Roda wee jee gwa ndịọzọ. Ha ekpeworo Pita ekpere ọtụtụ ụbọchị náesepụghịaka. Mgbe azara ekpere ha wee napụta ya, ọ dị ka ihe nrọ. O siri ha ike ikwenye na ọ bụ Pita bụ onye nọgidere n’èzí náakụaka n’ọnụụzọ. Mgbe ha hụrụ ya, ibobo nwụrụ ha n’arụ. Chineke alụwo ọlụ ịtụn’anya dị otú a! Pita weliri aka ya elu ime ka ha kpuchie ọnụ ha, wee kọọrọ ha akụkọ banyere nnápụta anápụtara ya.

Mgbe ọ rịọsịrị ndị náesoụzọ Jisọs ka ha kọọrọ Jemes, Pita rapụrụ ebe ahụ wee jee ebe ọzọ. Náenweghị obiabụọ, nke a bụ Jemes ahụ onye eweere dịka onye nlekọta nke nzukọ Kraist dị na Jerusalem. (Lee Ọlu Ndi-ozi 21:17, 18). Mgbe ndị nke Chineke kpeere anyị ekpere, Chineke ewee nápụta anyị, náánị ihe ziriezi ime bụ anyị gwa ha ihe Onyenwe anyị mere. Pita chọrọ ka Jemes na ụmụnna ndịọzọ mara na ya nọ n’udo n’ihi na Chineke anápụtawo ya.

Ọ bụghị ihe ijuanya na ibobo nwụrụ ndịa náekpeekpere a n’arụ mgbe mmụọozi ahụ tọpụrụ Pita n’agbụ? Eleghịanya Chineke nyere anyị ihemmụta nke a dịka ihenlereanya. Ànyị naenwe okwukwe mgbe niile ikwere na azawo ekpere anyị? Anyị naagụ nime Baịbụl na: “Ihe nile, ka ha ra, bu nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu” (Mak 11:24). Jisọs gwara nna ahụ nke kutara nwa nke mmụọ ọjọọ ji ka agwọọ ya sị: “Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe niile” (Mak 9:23). Ndịa bụ okwu nke onye nsọ bụ Jọn: “Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n’ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchịchọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n’ihe ọ bula ayi nāriọ ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi rịworo n’aka-Ya” (I Jọn 5:14, 15). Ka iheọmụmụ a nyere anyị aka ikpeekpere ma nwee kwa okwukwe karịa mgbe anyị naekpeekpere.

Enweghị Ebere

N’ụtụtụ echi ya óké ọgbaaghara dị n’ụlọmkpọrọ. Ọ dịghị ebe enwereike ịchọta Pita. O doroanya na ndịagha ahụ nọ n’ụra mgbe mmụọozi mere ka Pita nwere onweya. Ọnụụzọama igwè ahụ galaghachịworị n’ọnọdụ ya n’ụzọ dị ịtụnaanya dịka o meghere onweya nye ha. Enweghị ike ịchọta Pita. Ajụrụ ndịnché ụlọmkpọrọ ajụjụ n’iru Herod. O nweghị onye maara ihe ọ bụla banyere mgbalaga Pita. Mgbe ha náenweghị ike ịkọwara eze ihe banyere Pita, Herod nyeree iwu ka egbue ha.

Nwoke a, onye tụworo àtụmààtụ igbu Pita gaje ịnwụ mgbe náadịghị anya. Herod ahụghị ndị náesoụzọ Jisọs n’anya. Herod naalụso Chineke ọgụ mgbe ọ naakpagbu ha. Ma oge ruru mgbe Chineke megidere Herod.

Chineke Tigburu Ya

Anyị amaghị ihe kpatara na ihe Taia na Saidọn atọghị Herod ụtọ. Ha mere Blastọs enyì, bụ onye nwere ọnọdụ anaasọpụrụ n’ụlọ eze, bụrụ kwa onye nọ ya nso. Ha chọrọ ka ha na ya dịrị n’udo, ya mere edozisịrị ihe ka eze gwa ha okwu. O nwere mgbe akaraaka na Herod gaagwa ha okwu. O yikwasịrị uwe eze ya wee nọdụ n’oche ikpé ya ebe mmadụ niile naahụzu ya anya. O doroanya na okwu ya dị ha mma n’ihi na ha tiri óké mkpu náasị: “Ọ bu olu chi, ọ bugh kwa olu nke madu.” Okwu niile nke otutoụgha tọrọ Herod ụtọ o wee rapụ inye Chineke otuto. Ma otuto Herod adịgịdeghị. Ka ọ nọdụrụ ala n’iru ụmụmmadụ ebe ahụ Chineke tiri ya iheotiti. Ọrịa ya bụ nke jọgburu onweya ná njọ, ekwuwo kwa na ọ nọ n’óké ihemgbu. Mgbe náadịghị anya ọ nwụrụ n’ahụhụ ya.

Mmadụ abụọ ndịa nọ n’iheọmụmụ anyị a nọchitere anya ụdị mmadụ abụọ nime ụwa. Ndi dịka Herod, onye náakpagbu kwa ndị nke Ya, aghaghị ịnọgide n’ikpé Chineke. Ọ bụrụ na Herod kpereekpere, agara agbanwe ndụ ya. Ndị ahụ dịka Pita, bụ ndị nwere mmetụta maka Chineke na ọlụ Ya, bụ ndị anapụtaworo site n’ekpere. “Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n’ilusi-olu-ike-ya.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere ejiri gbue Jemes?

  2. 2 Ònye gburu ya?

  3. 3 Ònye ka atụbara n’ụlọmkpọrọ?

  4. 4 Gịnị mere ejiri tụbà ya n’ụlọmkpọrọ?

  5. 5 Gịnị ka Herod tụpụtara ime Pita?

  6. 6 Òlee otú ejiri nápụta Pita?

  7. 7 Ònye kpeere Pita ekpere?

  8. 8 Gịnị mere mgbe ha kpereekpere?

  9. 9 Onye ọchịchị dị añaa ka Herod bụ?

  10. 10 Gịnị mere ikpé Chineke jiri dakwasị Herod?