Ọlu Ndi-ozi 11:27-30; 12:24, 25; 13:1-12.

Lesson 324 - Junior

Memory Verse
“Nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n’anya, ndi nwere uche di ume-ala” (I Pita 3:8).
Notes

Otù Obodo Ukwu

Obodo Antiọk bụ obodo dị ukwu jupụta kwa na àkụ, ma o jupụtakwara n’ihe ọjọọ. Ọtụtụ ndị bi nime ya naefè arụsị karịa ifè Chineke òfùfè. N’otù obodo a kwa, Chineke hụrụ ndị agaazọpụta ọ bụrụ na ha mara ihe banyere Oziọma, ya mere O zigara Pọl na Banabas ijé kwusaara ha Oziọma. Amalitere nzukọ n’ebe ahụ n’arọ irianọ na abụọ mgbe Kraist nwụsịrị (42 A.D.), ebu kwa ụzọ kpọọ ndị náesoụzọ Jisọs NdịKristian n’obodo Antiọk.

Nzukọ Kraist dị ná Antiọk gara n’iru n’ihe nke mmụọ, ọtụtụ Ndịmbaọzọ bịakwara fee ezi Chineke òfùfè, kwere kwa na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụghị náánị na azọpụtara ha, kama edoro ha nsọ, ha anata kwa ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Site n’ebe a ka Ndịozi lụrụọlụ iziga Oziọma n’alaeze niile nke Rom.

Eburu Amụma Banyere Ụnwụ

Ndịamụma sitere na Jerusalem bịara ileta nzukọ ahụ dị ná Antiọk, otù onye n’etiti ha bukwara amụma na ụnwụ gaje ịdakwasị ụwa niile. Ọ bụ Chineke naenye mmadụ ike ịhụ ihe gaje ime, Ndị Kristian wee kwere okwu ahụ, malite kwa ijikere maka oge ihe isiike ahụ naabịa. Ma NdịKristian nọ na Jerusalem enweghị ihe ọ bụla ha gaakpadoro onweha. Ha ahụjuwo anya n’óké mkpagbu n’ihi okwukwe ha nime Jisọs, ọtụtụ nime ha ka anapuwokwara iheonwunwe ha. Ndịmbaọzọ ahụ bụ NdịKristian nọ ná Antiọk nọ n’ọnọdụ dị mma karị, ngwangwa ha wee gosipụta ịhụn’anya ha n’ebe ndịenyi ha náenweghị ihe nọ site n’izigara ha ihe.

Onyinye ahụ nke sitere ná nzukọ dị ná Antiọk aghaghị inyeworị aka mee ka mmekọrịta dị nsọ karị dị n’etiti nzukọ Ndịmbaọzọ na nzukọ Ndị Juu. Banabas na Pọl ka arọpụtara iburu onyinye niile ahụ bugaa na Jerusalem.

Ịjụ Àkụnaụba na Ike

N’etiti ndịndú nọ ná nzukọ Antiọk, tinyekwara Pọl na Banabas, enwere otù nwoke onye azụkọworo ya na Herod, onye ọchịchị ahụ nweworo obiọjọọ nkeukwu n’ebe NdịKristian nọ. Manaen jikeere, dịka Moses, ịjụ obíeze na àkụnaụba na ike ya niile, náarọrọ ịhụjụanya n’ihemgbu na mkpagbu nke NdịKraist n’oge ahụ naahụ, karịa “inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge.” Chineke agọziworị Manaen, mee kwa ka ọ dị ike n’ọlụ Onyenwe anyị. Náarụghịụkà, nguzo nke nwoke dị otú a na nzukọ, bụ onye nweworo udé aha n’ụwa gbara ndịọzọ ume ịbịa ná nzukọ.

Okwu Nke Mmụọ Nsọ

Ka ndịndú ndịa náebuọnụ náekpe kwa ekpere ka ọlụ Chineke náaga n’iru rue ọtụtụ ndịọzọ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M’kpọworo ha ka ha lua.” (Rue oge a akanaakpọ Pọl Onyeozi.) Ugbu a bụ oge ịlụọlụ nke akpọworo ha ka ha lụọ. N’oge nchègharị nke Sọl, Chineke zigara Ananaias ka ọ gwa ya na ọ bụ iheọlụ arọpụtara ikwusara Ndịmbaọzọ banyere Jisọs. Ọ dị kwa ka agwawo Banabas tupu oge a erue naaga eziga ya n’etiti Ndịmbaọzọ.

Ọkpụkpọ nke gaeweta ijéozi maọbụ ọlụ Oziọma gaaga nkeọma aghaghị isite n’Eluigwe. N’oge a Mmụọ Nsọ gosipụtara na Ya na Chineke ra site n’ịgwa ndịkom ahụ okwu n’ike ka ha lụọọlụ Onyenwe anyị. O gosikwara Onweya dịka Otù onye mgbe edepụtara n’ebeọgụgụ anyị na O kwuruokwu.

Ọlụ Pọl na Banabas naalụrị n’Antiọk bụ n’etiti Ndịmbaọzọ, ma ugbu a ọlụ ahụ naagbasa karịa. Ọtụtụ Ndịmbaọzọ nọ gburugburu ala ahụ ndị ọ dị mkpà ịmara ihe banyere Jisọs. Pọl na Banabas anọgidewo n’ọlụ ha naalụ rue mgbe agwara ha gaa n’iru. Chineke agọziwo ọlụ ha, azọpụtawo kwa ọtụtụ mkpụrụobi. Ma ugbu a Mmụọ Nsọ nyere iwu ka ha gaa n’iru.

Ndịndú nke nzukọ dị ná Antiọk zukọtara kpeere Pọl na Banabas ekpere, bikwasị kwa ha aka n’isi n’otiti mmanụ n’ihi ọlụ nke ha gaalụ. Nzukọ ahụ ji ekpere na ike ya kwagide ndịọlụ Oziọma ndịa, ma ọkpụkpọòkù bu ụzọ si n’Eluigwe bịa. Jisọs sịrị: “Ọ bugh unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n’aham, ka O we nye unu ya” (Jọn 15:16).

Ijéru Saiprọs

Ọkpụkpọòkù nke Mmụọ Nsọ naeduru ha gabiga osimiri. Otù onye náejére Chineke ozi bụ nwa okoro aha ya bụ Jọn Mak so kwa Pọl na Banabas. Mmadụ atọ ndịa naalụ ọlụ Chineke jere n’ebe dị anya site n’ụlọ ha, rue n’agweetiti Saiprọs.

Ọ bụ ezie na nke a bụ ijéijè kwusaara Ndịmbaọzọ Oziọma, ma nzukọ ha mbụ naabụ n’ụlọnzukọ Ndị Juu. Ndị Juu ka naechè na ha nwere iruọma n’ebe Chineke nọ karịa ndịọzọ, ya mere anaenye ha ohere mbụ ịnata òzízí niile banyere Jisọs. Ọ bụrụ na ha anara ya, mgbe náadịghị anya ha naenwe ọñụ izukọta dịka NdịKraist ha na Ndịmbaọzọ azọpụtaworo; ma ọ bụrụ na ha jụ ya, ọ dịghị ihe kpatara ha gaeji tamúentamù. Enyewo ha ohere niile ọ bụla.

Izute Onyemgbasị

N’ijè niile nke ndị ahụ náagbasa Oziọma na Saiprọs, ha zutere otù onyemgbasị, maọbụ onye naajụ ase n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Ndị nọ ná agwéetiti ahụ bụ ndị náasọpụrụ ndị mmụọ ha nke ukwu, ha naaña kwa ya ntị mgbe ọ naakọ akụkọ ya niile. Ọbụná onyeọchịchị nke Rom nọ n’agwéetiti ahụ naekwere n’ọlụebube ọ naalụ site n’ike ekwensu. Ma mgbe onyeọchịchị ahụ aha ya bụ Sajiọs Pọlọs, nụrụ banyere Pọl na Banabas, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu o wee chọsie kwa ha ike. Obi ya chọrọ eziokwu. Ọ naaña onyemgbasị ahụ ntị na mbụ n’ihi na ọ mataghị ihe ọ bụla karịrị nke ahụ mma. Mgbe ọ nụrụ na ndịọlụ Oziọma ahụ naekwusa eziokwu nke Okwu Chineke, ọ chọọ ịnụ okwu ha.

Otú ọ dị, Elimas, bụ onyemgbasị achọghị ka enyì ya ahụ bụ onyeukwu rapụ ya. Ọ matara na ọ dịghị nkwekọrịta dị n’etiti òzízí ya nke sitere n’aka mmụọ ọjọọ, na ihe Pọl na Banabas naekwusa. Ọ bụrụ na Sajiọs Pọlọs abụrụ OnyeKraist, ịbụ enyì ha gaakwụsị. Onyemgbasị ahụ wee malite ịlụso mkwusa nke eziokwu ahụ ọgụ.

Mgbe ọ bụla anaekwusa Okwu Chineke nime Mmụọ, ekwensu naagbalị ịgbochị ndị náegentị. Ọ bụrụ na mmadụ naachọ ịbụ OnyeKraist, anaenwe otù onye gaanọ n’akụkụ nke ganaasị ya, “Ị gaghịenwe kwa iheụtọ ọzọ ọ bụrụ na ị ghọọ OnyeKraist.” Maọbụ ekwensu anáakpanyere ya ụkà n’olu ntà sị, “Ị gaesi añaa dozie ụzọ gị?” Ị gaghịenwe ike ibindụ OnyeKraist, ọbụná ọ bụrụ na ị malite.” “Ndụ OnyeKraist bụ ndụ siriike.”

Ndịa niile bụ ụgha nke ekwensu. Ọ dịghị onye nwere obiụtọ dịka OnyeKraist. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya sị, “Ihe ndia ka M’gwaworo unu, ka ọñum we di nime unu, ka ọñu-unu we zu kwa” (Jọn 15:11). Aisaia bụ Onyeamụma kwukwara sị: “Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n’isi-iyi nile nke nzọputa” (Aisaia 12:3).

Oziọma Dị Nsọ

Apụrụ iji ijéozi nke Elimas tụnyere okpukpé ụgha ndị náeme ememe dị icheiche. Ụfọdụ mmadụ naabà n’inwe mkpughe mgbe ha naeté egwú naeti iheotiti maọbụ naakụaka, wee náasị na ọ bụ Mmụọ Chineke. Ụfọdụ naeté egwú ha naakpọ iteegwú dị nsọ, mgbe ahụ ha gaamalite ịhụ ọhụ. Ọtụtụ mmetụta na mkpalị dị nke náabụghị Mmụọ Chineke.

Oziọma nke Pọl na Banabas kwusara bụ nke ibindụ dị nsọ. Nzukọ ha niile naaga n’usoro. Pọl Onyeozi naagwa anyị sị: “Chineke abugh Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ dị nzukọ nile nke ndi nsọ” (I Ndi Kọrint 14:33).

Pọl atụghị egwù ịgwa Elimas na ọ bụ nwa ekwensu. Mmụọ Nsọ bi nime Pọl, okwu nke o kwuru wee mezue kwa. O kwupụtara okwu ikpé megide Elimas -- na ọ gaekpu ìsì na nwa oge -- o wee mezue kwa ngwangwa ahụ. Ọ bụghị mgbe niile ka ikpé naada ngwangwa, ma ọ bụrụ na onyemmehie échègharịghị, o doroanya na ikpé ya aghaghị ịbịa.

Mgbe Sajiọs Pọlọs hụrụ otú Chineke si lụọọlụ site na Pọl, nụ kwa òzízí nke Pọl kwusara, o kweere na Jisọs. Òzízí ahụ dị ọhụụ nye ya. Eleghịanya ọ nụbeghị ihe banyere Jisọs na mbụ. Ma ọ hụtara eziokwu mgbe Pọl kwusara site n’otitemmanụ nke Mmụọ Nsọ.

Nke a bụ onye ọzọ dị ukwu n’ihe nke ụwa, onye wedara onweya ka o nweeike ịbụ onye nke Chineke arọpụtara. Otù mgbe Pọl Onyeozi kwuru sị: “Ọ digh ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ digh ọtutu ndi-ike, ọ digh ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ” (I Ndi Kọrint 1:26). Otù mgbe, otù nwanyị amara aha ya, onye mesịrị bụrụ OnyeKraist kwuru sị, “Anamaekele Chineke ekele n’ihi Okwu-Ya. Anamañụrịọñụ na Ọ sịrị ‘ọ digh ọtutu karịa ikwu na ‘ọ digh ndi mara ihe” akpọrọ.

Mkwusa nke Pọl na Banabas gara n’iru, ọbụná ọ bụ ezie na ekwensu gbalịrị igbochi ha; ọtụtụ Ndịmbaọzọ chịgharịrị ewee rite ha n’urù nye Alaeze Eluigwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee arọ amalitere nzukọ ahụ dị ná Antiọk?

  2. 2 Òlee ndị eburu ụzọ mee ndị náejeozi (minista) na ya?

  3. 3 Ònye bụ nwoke amaara aha ya azọpụtara n’ebe ahụ?

  4. 4 Gịnị bụ ọlụ ahụ dị ukwu nke gara n’iru site ná nzukọ dị ná Antiọk?

  5. 5 Ònye bụ nwa okorọbịa soro Pọl na Banabas n’ijè mgbasa Oziọma mbụ ha jere?

  6. 6 Òlee ebe ha jere?

  7. 7 Ònye ka ndịọlụ Oziọma ahụ zutere ná agwéetiti ahụ?

  8. 8 Òlee onye amaara aha ya chigharịrị n’ebe a?

  9. 9 Gịnị bụ ndụmọdụ Pọl banyere ime usoro okpukpé?