Lesson 325 - Junior
Memory Verse
“Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n’ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n’ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso” (Mak 16:20).Notes
Iheisiike
Ọ bụ ihe dịụtọ isoro Pọl site n’anya nke imemmụọ na njèm nke ịgbsa Oziọma ya. Ka anyị buru n’obi na ọnọdụ ijé njèm n’oge nke Pọl adịghị mfé dịka ọ dị ugbu a. O kwupụtara ụfọdụ ihe mere ya n’ijè ya ikwusa Kraist. Ọ naasị na ihe izendụ dị n’ala na n’elu mmiri; iheizendụ nke ndị náapụnara mmadụ ihe na ndị náamaghị Chineke; iheizendụ nke ndị obodo nke aka ya; n’izendụ nime obodo na nime ọhịa. Ọtụtụ mgbe ike naagwụ ya nkeụkwuu ọ naenwe kwa óké ihemgbu. Mgbe ụfọdụ agụụ naagụ ya mgbe ụfọdụ akpịrị ịkpọnkụ. Mgbe ọzọ oyi na enweghị uwe gaezuru ya (Gụọ 2 Ndi Kọrint 11:7-27). Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị gụrụ na Pọl kpesara mkpesa n’ihi iheisiike niile ọ hụrụ ahụhụ ha n’ihi Kraist, kama ọ sịrị: “Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n’ebe mu onwem nọ, ka m’we gbazue ọsọm (n’ọñu)” (Ọlu Ndi-ozi 20:24).
Pọl anatawo okpụkpọòkù ịlụọlụ site na Chineke, o kpebìkwara ịlụsị ọlụ ahụ. Mgbe azọpụtasịrị ya, Onyenwe anyị kwuru banyere ya sị “Onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n’iru mbaọzọ na ndịeze, na umu Israel” (Ọlu Ndi-ozi 9:15). Pọl ka edebeworo ka ọ bụrụ ìhè nke ndị mbaọzọ na onye agaesite na ya zigaa Oziọma rue nsọtụ niile nke ụwa (Ọlu Ndi-ozi 13:47)
Banabas
Banabas bụ onye náenyere Pọl aka bụ kwa onye náesoụzọ Jisọs jiworo ndụ ya chụọàjà kpamkpam. N’otù oge o nwewo ala, ma o rere ya wee weta ego ahụ nye Ndịozi, ka ewee kesaara ya ndị mkpà naakpà (Ọlu Ndi-ozi 4:34-37). Mgbe Pọl chègharịrị ọhụụ, Banabas gosipụtara ịbụenyì na ịhụn’anya nye Pọl (Ọlu Ndi-ozi 9:27). Pọl nwere iruọma inwe Banabas dịka onye inyeaka, ezi nwoke nwere okwukwe onye jupụtakwara na Mmụọ Nsọ (Ọlu Ndi-ozi 11:24).
Jọn Mak
Otù nwa okoro ọzọ anaakpọ Jọn Mak, sokwara Pọl n’ije nke ịgbasa Oziọma a, anyị naahụ kwa ka ha atọ naarapụ agwéetiti Saiprọs. Ha wee bànye n’ụgbọmmiri gabiga Osimiri Mediterranean rue òkéala Esaia wee kwụsị n’otù ebe amaara dịka Paga. Eleghịanya ọ bụ n’ijé a ka ha dabara n’ụbọchị iheizendụ nke Pọl mesịrị kwueokwu banyere ha.
Mgbe ha rutere n’ótú, Mak kpebìri ịrapụ ndịọzọ wee laghachị Jerusalem. Nke a dịka óké nrapụ nye Pọl n’oge a; otú ọ dị, o mesịrị kwue banyere Mak dịka onye inyeaka “baram urù” n’ijé-ozi, kwue kwa okwu ọma banyere ya (2 Timọti 4:11; Failimon 24).
Ụzọ Ahụ Niile
Mgbe mmadụ naachọ Chineke maka mgbaghara nke mmehie ya, ọ naekwe mkwà iwere ndụ ya niile jeere Chineke ozi. Mgbe ọ naabịaru Chineke nso karị náamụta kwa ihe banyere iji obichụọàjà karị, ọ naachọ, nata kwa mnwapụta nke odudonsọ na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ma ọ ghaghị ịkwụghachị mkwà ahụ o kwere. Ụfọdụ mmadụ asịwo, “Onyenwe anyị, enyem Gi ndụm,” náaghọtaghị òzùzùòkè nke ihe okwu ahụ pụtara. Ọ dịghị ihe anaerite n’ịdaghachịazụ -- ọ bụrụ na ị malite, jee ụzọ ahụ niile.
Ha gabigara ugwu gbagọrọagbagọ rue obodo Antiọk dị na Pisidia. Ha nwere ohere dị ukwu ịgwa ọtụtụ mmadụ banyere Jisọs n’obodo a. Eleghịanya ị kwesịghị ịlaghachị, Mak, ị garaeso Banabas gee ntị, ka Pọl naekwuokwu Chineke dị ebube ná Antiọk.
Nime Ụlọnzukọ
Ọ bụ n’Ụbọchị Izuike ka ha jere n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ụlọnzukọ ndịa bụ ebe mgbakọ nke ndị Juu ebe anaagụ Akwụkwọ Iwu. Akwụkwọ omen’ala náagwa anyị na enwere ihe dịka ụlọnzukọ narị anọ na iriisi maọbụ narị anọ na iriasatọ n’obodo Jerusalem; otú ọ dị, Antiọk ebughịibu dịka Jerusalem.
Mgbe agụsịrị Iwu na ndịamụma, onyeisi ụlọnzukọ zigara otù onye ka ọ jụọ ndịọbịa abụọ ahụ ma ọ dị ihe ha gaagwa ndị nọ n’ebe ahụ. Lee óké ohere nke a bụ nye Pọl -- ohere ọ naachọachọ!
N’otù mgbe ahụ, Pọl wee bilie gwa ndị Juu okwu sị, “Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwù Chineke, nurunu.” Mgbe ahụ, ọ kọọrọ ha banyere mmeso Chineke n’ebe ndị Juu nọ site ná mmalite nke mba ahụ rue n’oge nke Jisọs. Pọl amụwo Iwu na ndịamụma n’ụkwụ onyeòzízí ukwu nke ndị Juu, anakpọ Gameliel. Pọl pụrụ ịgụpụta Iwu ahụ náeleghị anya n’akwụkwọ, kọwaa kwa otú esi mezue amụma niile banyere Jisọs. Ọ gwara ha sị, “Ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka” (Ọlu Ndi-ozi 13:26). Ọ sịrị, ndị bi na Jerusalem ndị naanụ ka anaagụ Akwụkwọnsọ Ụbọchị Izuike niile, bụ ndị maworo Jisọs ikpé ọnwụ. Pọl rụtụrụ aka n’Abù Ọma 16:10 mgbe ọ sịrị. “I gagh-enye Onye nke Gi di ọcha n’obi ka Ọ hu ire-ure” (Ọlu Ndi-ozi 13:35). Nke a bụ ihe kpatara óké ekweghịekwe n’obi ndị Juu: ha ekweghị na Jisọs siri n’ọnwụ bilie. Pọl gwara ha na eliwo Devid n’ílì ya, arụ ya alaghachịwo kwa n’àjà, ma Jisọs biliri n’ụbọchị nke atọ.
Pọl sịrị, lee otú ọ dị mma ijekwuru Jisọs wee nweta mgbaghara mmehie karịa ịnọ n’okpuru Iwu. O jiri okwu siriike dọọ ha akanántị ka ha lezieanya wee ghara ịbụ ndịnlelìanya ewee mee “ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu.” N’ụzọ ọzọ, Pọl rịọrọ ndị Juu ka ha ghara ịtụda ịhụn’anya Jisọs wee fue ebighịebi.
Ná mmechi nke Okwu Chineke ahụ, Ndịmbaọzọ rịọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu Chineke n’Ụbọchị Izuike soni. Ọ dịghị ihe gaatọ ya ụtọ karịa na n’Ụbọchị Izuike ahụ soni ọ fọdụrụ ntakịrị ka ndị niile bi n’obodo ahụ bịa ịnụ Okwu Chineke. Nke a mere ka ndị Juu kwooekworo, ha wee kwueokwu megide okwu niile nke Pọl. Ma o nwere ọzịzá ọ gaenye ha: Chineke akàwo ya akara na agaekwusa Oziọma nye “onye-Ju na mbụ” (Ndi Rom 1:16); nke ahụ mere Pọl ji buru ụzọ kwusaara ha. “Ebe unu nēnupu ya n’aru-unu, nēkpe kwa onwe-unu ndi nēkwesigh ndu ebigh-ebi, le, ayi gaje ichigharai gwa ndi mba ọzọ okwu” (Ọlu Ndi-ozi 13:46).
Achụpụrụ Ha
Ụfọdụ ndị Juu na ọtụtụ ìgwè Ndịmbaọzọ kweere ewee zọpụta ha n’óké ntute a nke kwụsịrị na mberede. Ndị Juu kpaliri nsogbu wee chụpụ Pọl na Banabas n’ebe ahụ. Pọl na Banabas rupụrụ ájá nke ụkwụ ha megide ndị Juu ahụ jụrụ Kraist dị ná Antiọk, dịka ha naasị, “Unu enwewo ohere nke unu ma unu ajụwo ya, ayi na-ejekuru ndi ga-anabata Ozi-ọma,” ha wee jee Aikọniọm ihe ruru iri mail anọ n’akụkụ ndịda nke obodo Antiọk.
Nye Mba Niile
Chineke naenye onye ọ bụla ohere ịnabata Ya ka o wee nwee nzọpụta. Jisọs sịrị: “Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa” (Matiu 24:14). N’oge nke mmalite Chọọchị, Pọl na Banabas nọ n’etiti ndị eburu ụzọ zipụ ijé kwusaa Oziọma. Site n’oge ahụ akọsawo akụkọ nke nzọpụta n’ụwa niile. Náánị mmadụ olenaole bụ ndị naachọ Chineke n’ezie, náanata mnwapụta nke ịmụmmadụọzọ, náebi kwa ndụ dịka Baịbụl kụzirị. Otú ọ dị, Oziọma eruwo n’ala niile, ọgwụgwụ ihe niile dị kwa ezi nso.
Anyị niile apụghị iwepụta onweanyị dịka ndị ọlụ ha bụ ịgbasa Oziọma, kama ka anyị mee ihe niile anyị pụrụ ime ka mkpụrụobi ụmụmmadụ wee chigharịkwute Onyenwe anyị tutu oge agasịa. Ụfọdụ enweghị ohere ijé n’ófé mmiri dịka ndịọlụ Oziọma, ma ha pụrụ ịlụrụ Jisọs ọlụ nime ala anyị ebe a. Ụfọdụ pụrụ inye ihe ha nwere (dịka ego na ihe ọzọ dị icheiche) iji kwagide ndịọlụ Oziọma nọ n’obodo dị anya; maọbụ na ekesara ndịagbataobi ha akwụkwọ Oziọma náakpọ kwa ha òkù ka ha bịa n’ụlọnzukọ. Ihere Oziọma ọ naeme gị? Ihere emeghị Pọl (Ndi Rom 1:16). Ụzọ ọzọ mmadụ pụrụ isite wee nyeaka ịgbasa Oziọma bụ site n’ikpeekpere maka nzukọ n’ụlọmkpọrọ, na ileta ndị ọrịa n’ụlọọgwụ. Nwoke ọ bụla, nwanyị, na nwantakịrị ọ bụla pụrụ idutere Kraist mkpụrụobi site n’ekpere. “Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ìgwè; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mgbe nile ebigh-ebi” (Daniel 12:3).
Ìhè Nime Ọchịchịrị
Pọl bụ onye Juu Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ “ìhè nke mba nile (mba ọzọ)” (Ọlu Ndi-ozi 13:47), ghọrọ Onyeozi dị ukwu na óké ìhè. Ọ laghịazụ n’ọkpụkpọ ahụ dị elu nke akpọrọ ya. Onye ọ bụla Chineke kpọrọ n’oge a -- onye Juu maọbụ onye mbaọzọ -- akpọrọ ya ka ọ bụrụ ìhè, n’ihi na Jisọs kuziiri anyị sị, “Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa” (Matiu 5:14). Ànyị gaeguzo n’ikwesịntụkwasịobi nye ọkpụkpọòkù ahụ dị elu nke akpọworo anyị, dịka Pọl, bụrụ kwa ìhè nye ụwa, site n’ịgbaàmà ná ndụ anyị naebi?
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Ònye soro Pọl na njèm a?
2 Kwue otú esi nye Pọl ohere ikwuokwu Chineke ná Antiọk
3 Gịnị bụ isiokwu ya?
4 Gịnị bụ omume nke Ndịmbaọzọ banyere okwu Chineke nke Pọl kwusara?
5 Gịnị mere n’Ụbọchị Izuike soni?
6 Kwue banyere omume ndị Juu mgbe ahụ.
7 Oziọma, ọ dịrị ndị Juu kaọbụ Ndịmbaọzọ?
8 Òlee ndị akpọrọ nnọọ aha na ezigara Pọl nye?
9 Chọpụta ụfọdụ amaokwu náakụziri anyị na Chineke abụghị onye náele mmadụ anya n’iru.