Ọlu Ndi-ozi 14:1-28

Lesson 326 - Junior

Memory Verse
“N’uwa unu nēnwe nkpagbu: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa” (Jọn 16:33).
Notes

Site N’Aikọniọm Rue Listra

Achụpụwo Pọl na Banabas site ná Antiọk dị na Pisidia mgbe ekwusịrị okwu Chineke dị ike n’ebe ahụ. N’oge mmalite nke Nzukọ na dịka ọ dị kwa taa. Ebe ọ bụla anaekwusa eziokwu, ekwensu naanọ nso ịgbalị iweta nkewa maọbụ weta nsogbu n’otù ụdị maọbụ n’ụdị ọzọ. Ugbu a n’Aikọniọm, ekwensu kpaliri nsogbu, mgbe ndị ọlụ abụọ a matakwara na ndị ahụ náatụ àtụmààtụ ịtụ ha nkume, ha siri n’ebe ahụ pụọ jee n’obodo ndịọzọ.

Pọl n’iheodide ya mgbe emesịrị, jiri ndụ OnyeKraist tụnyere nke onyeagha, anyị pụkwara ịhụ site n’iheodide niile a ihe kpatara o ji cheè otú ahụ banyere ya. Ndụ nke onyeagha abụghị nke inwe iheụtọ, Pọl eleghị kwa anya na ihe niile gaagara ya nkeọma. Onyeagha naezute ọtụtụ iheizendụ, ọ gaghịabụ kwa onye ụjọ wee site n’iru ọgụ gbalaga; otú ọdị, mgbe ụfọdụ ọ naadị mkpà iwezuga onweya ma ọbụghị otú ahụ, ọ gaetufu ndụ ya. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ ụfọdụ ụmụ okorọbịa bụ NdịKraist zutere óké iheizendụ n’ọgbọagha, ọtụtụ mgbe kwa olu nke Chineke naagwa ha n’oge mgbe ha kwesịrị ịpụ site n’ebe iheizendụ dị. Anyị kweere na ọ bụ olu Chineke dọrọ ndịagha nke Obe a akanántị n’oge ka ha pụọ n’obodo Aikọniọm wee jee Listra.

Atụrụ Ya Nkume

Ma ndị Juu ahụ jọgburu onweha sitere ná Antiọk na Aikọniọm ka kpebì kwara ịkwụsị ọlụ Pọl. Ha sooro ya jee Listra. Náarụghịụka, ha matara na ọlụ naaga n’iru n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ na Listra ka agwọrọ nwoke ngwụrọ site n’ike Chineke. Eleghịanya ha hụrụ ka ọ naamali elu náeje kwa ijè, ihe ọ naemebeghị na mbụ. Ha rụgidesiri ndị ahụ ike, n’ikpeazụ ha wee tụo Pọl nkume.

Ugbu a ha emezuwo ọchịchọ ha; ha chère na ha akwụsịwo Pọl ikwusa mbiliten’ọnwụ nke Jisọs. Ha pụrụ ịlaghachị n’ụdị òfùfè ha ochie. Obi ha jọgburu onweya achọghị ịma ma agwọrọ onyeọrịa site n’okwu Pọl. Ha achọghị ịhụ obi naeruuju emere ka o nwee ọñụ, dịka ọ naadị ebe Pọl kwusaworo Oziọma (Ọlu Ndi-ozi 13:48).

Okwu Ebighịebi

Siterị ná mmalite nke oge, ndị naemegide Oziọma nke Jisọs Kraist agbalịwo ihichapụ eziokwu nke Okwu Chineke na ịkwụsị mgbasa nke Oziọma. Otù mgbe n’ótú niile nke obodo England ndị náechenche náelerughịanya nkeọma, náahụ na ha nwetara ọtụtụ puku Testament Ọhụ wee suree ha n’ọkụ n’ebe anaakpọ obi ochie nke Pọl Onyensọ; ma anaebipụta kwa ọzọ. Mgbe ha chọpụtara na ha apụghị igbochị Akwụkwọ a ịbata n’England, Bishop ndị London gwara otù onye náazụ ahịa ka ọ zụkọta Akwụkwọ ahụ niile ọ pụrụ inweta n’ofé mmiri. Otú ọ dị, onye ahụ náazụahịa bụ enyì nzuzo nke Tyndale, onye bụ onye mbụ tụgharịrị Baịbụl niile n’asụsụ Bekee. Onyeahịa ahụ zaghachiri n’otù mgbe ahụ sị, “Achọrọm ka o doo gi anya na akwụkwọ a niile anaerebeghị ere gaerute gị aka.” Bishop ahụ wee naechè na ugbu a “ya ejidewo Chineke n’ụkwụ, námataghị na ọ bụ ogweaka ekwensu ka ya jideworo” o wee kwee mkwà na ya gaakwụ ego ole bụ ọnụahịa ya, “N’ihi na akwụkwọ ndịa abàghị urù, achọrọm ibibi ha niile, suree kwa ha ọkụ n’Obe Pọl” ka o kwuru. Ngwangwa onyeahịa ahụ wee zụkọọ akwụkwọ ahụ niile n’aka Tyndale, onye matara na náarụghịụka bishop gaje isure ha n’ọkụ. Ugbu a, o nwere ego gaezuru ya ibipụta Baịbụl karịa ka o biworo na mbụ, nke o mekwara, ewee webata kwa ha n’England ọzọ.

Mgbe ndị náemegide Akwụkwọ a hụtara n’ikpeazụ na ibibi ya kpamkpam karịrị ike ha, otù onye nime ha kwusara okwu dị ike n’Obe Pọl, naarụtụ aka “n’ihe jọrọ njọ” ná ndahie niile dị n’Akwụkwọ ahụ. Ná mmechi nke okwu ya, ọ tụba otù Baịbụl o ji n’aka n’óké ọkụ náenwu na nso abe ahụ. Náagbanyeghị óké mmegide, Akwụkwọ a abụrụwo ihe anaagụ nke anaekwu kwa okwu banyere ya ebe niile, rue otù ụbọchị otù bishop sịrị, “Ọ karịrị ikem, maọbụ nke onye ọ bụla naachọ ihe nke mmụọ igbochi ya ugbu a.” Ugbu a ụzọ emeghewo nye Baịbụl; ọ dịghị eze maọbụ onyeọchịchị ọ bụla pụrụ igbochi ọgan’iru ya, n’ihi na Chineke asịwo “Ka ìhè di,” ìhè wee dị!

Taa, Baịbụl bụ Akwụkwọ anaebipụta karịa. akwụkwọ niile ọzọ anaereere; atụgharịwo Baịbụl niile maọbụ akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ ruru (1118), otù puku otù narị na irinaasatọ enwe kwara ike ịzụta ya n’ọnụ ego dị ntà. Otù onye náagọnarị Chineke aha ya bụ Ingersoll, weliri Baịbụl otù mgbe wee sị, “Nime arọ irinaise, m’gaeme ka akwụkwọ a baa nime ílì.” Nime arọirinaise, Ingersoll wee baa nime ílì, ma Baịbụl ka naadị kwa ndụ. Onye ọzọ náekweghị kwa ekwe aha ya bụ Voltaire, sịrị na nime narị arọ, Baịbụl gaabụ Akwụkwọ echèfuworo. N’ọgwụgwụ nke narị arọ ụlọ ya wee bụrụ nke ndị Òtù náebipụta Baịbụl na Geneva.

Ihụrụ Kraist Ahụhụ

Otù mgbe Pọl kwenyere ka atụọ Stifen nkume, ọbụ kwa ya jideworo uwe nke ndị mere óké mmehie a (Ọlu Ndi-ozi 22:20). Emesịa Pọl wee hụọ ahụhụ n’ihi Kraist n’otù aka ahụ n’aka ndịkom bụ ndịmmehie. Ma Onyenwe anyị matara na ọlụ Pọl agwụsịbeghị, O wee mee ka o bilie ọzọ. Náarụghịụka arụ dịkwara ya ike ọzọ n’ihi na ọ laghachịkwara n’ọlụ ikwusa Oziọma. Otuto aghaghị ịpụta n’ọnụ Pọl na Ndịozi niile ọzọ guzo ya gburugburu mgbe o biliri laghachi kwa n’ọlụ ya.

N’oge nchịgharị nke Pọl, Onyenwe anyị agwawo Ananaias sị: “Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghagh ihu n’ihi aham” (Ọlu Ndi-ozi 9:16). Ugbu a, Pọl edetụwo ụfọdụ ahụhụ ahụ ire, nke a abụghị kwa ọgwụgwụ ya.

Mgbe ụfọdụ Onyenwe anyị naekwe ka óké nsogbu na ọnwụnwa bịakwasị ndị Ya arọpụtara, oge ụfọdụ ihe adịghị “agazi agazi;” ma mgbe enyere ohere ahụ n’ịhụn’anya Chineke, ọ bụ maka ọdịmma nke anyị. Ka anyị tinye nke a n’uche mgbe ahụhụ maọbụ ọnwụnwa bịakwasịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị ahụbeghị ahụhụ n’ihi Kraist ugbu a, anyị nwereike ịhụ ụfọdụ tutu ndụ anyị n’ụwa agwụsịa, n’ihi na ọnọdụ ọjọọ gaabịakwasị ụwa ochie nke a. Ka anyị kpebìe n’obi anyị iguzosiike ghara ikwe ka okwukwe anyị nime Chineke maa jijiji.

Nlaghachị Ụlọ

Ijé mkwusa Oziọma mbụ nke Pọl naabịaru n’ọgwụgwụ ka ụgbọmmiri ya naerute kwa Siria ọzọ; ha wee rue Antiọk, site n’ebe ya na ndịọzọ maliteworo. Lee otú nlaghachị ụlọ ha si dị óké ụtọ! Onye ọ bụla bịara chọọchị ịnụ ka Pọl naakọ ihe Chineke meworo. Akụkọ kachasị ụtọ ha ji lata bụ na Chineke emeghewo ụzọ nke okwukwe nye Ndịmbaọzọ (Ọlu Ndi-ozi 14:27). Lee otú iru Pọl aghaghị ịnaegbuke n’ọñụ ka ọ naekwu na Ndịmbaọzọ rịọrọ ya ka ọ gwa ha okwu Chineke, na ọfọdụrụ ntakịrị ka obodo ahụ niile zukọta ịnụ Okwu Chineke. O doro anyị anya na o weghachịrị akụkọ ọma banyere njèm ya mbụ, ọbụná na ọ bụ ezie na ọ bụghị mgbe niile ka ụzọ ahụ dịrị ya mfé. Ọ bụrụ na o kwue banyere izendụ, iheisiike niile, nkume atụrụ ya, o doro anyị anya na ọ bụ náánị igosipụta aka nchebe nke Chineke, ike ndebe Ya na amara náeso ya ogologo ụzọ ahụ niile. Anyị kweere na o nwere mmetụta ikwu na nsogbu niile nke ụzọ a abụghị ihe ma ewere ya tụnyere ọñụ nke ijéozi ahụ. Ezi OnyeKraist ọ bụla naenwe kwa mmetụta dị otú ahụ banyere òfùfè Chineke.

Ụzọ Nke Obe

Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorọbịa maọbụ nwa agbọghọbịa onye azọpụtaworo mgbe garaaga, eleghịanya ị mụtawo na mgbe ị naebindụ, dịka OnyeKraist ị naezute ọnwụnwa na ule olenaole. Ma ị mụtawo kwa na náagbanyeghị ihe ọ bụla, na ọ bụ ụzọ kachasị mma ibindụ, n’ihi na ị nwere ọñụ nke Onyenwe anyị nime obi gị, náagbanyeghị ihe ọ bụla mere.Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorọbịa maọbụ nwa agbọghọbịa azọpụtara na nso a, o nwereike ị hụwo iheisiike olenaole n’ụzọ; ma ekwuwo ya ọtụtụ mgbe na oge kachasị njọ OnyeKraist nwere dị mma karịa oge kachasị mma nke onyemmehie nwere. Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorọbịa maọbụ nwa agbọghọbịa anaazọpụtabeghị ma ị naachọ kwa ka Eluigwe bụrụ ebe obibi gị, ekwela ka ụzọ nke Obe dị ka osiriike nye gị, n’ihi na cheta na ọ bụ ya naeduru Ụlọ. N’ime ule maọbụ ọnwụnwa ọ bụla, mkwà a dịrị gị, “Amaram ezuworo gi” (2 Ndi Kọrint 12:9). Site na Kraist i nwereike imeri n’agha ọ bụla.

OnyeKraist nwere ohere isoro Jisọs n’ejéijè, naekwu kwa okwu; ọ naagwa Ya banyere nsogbu niile, Jisọs naaghọta kwa karịa ọbụná nnenanna ọ bụla nwere ịhụn’anya nwee kwa obiọma. Ụbọchị niile, Ọ naeji ezi ihe kpube ndụ nke OnyeKraist okpueze, O doziwo kwa ebe obibi n’Eluigwe nye ndị niile gaeguzosiike kwesịkwa ntụkwasịobi rue ọgwụgwụ. Pọl sịrị: “N’ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ugbu a ekwesigh ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n’ebe ayi nọ” (Ndi Rom 8:18).

Ị pụrụ ikwu ihe onye ahụ dere abụ kwuru?

“Ọ bugh’ihe ụtọ ụwa,

M’ọbụ ọnọdụ dị’elu’

N’ahụhụ n’ir’ujum nile,

Nání kwe ka m’nọ nso Gị.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere na Listra mgbe agwọsịrị onyengwụrọ ahụ?

  2. 2 Òlee ndị rụgidere ndị ahụ ka ha tụọ Pọl nkume?

  3. 3 Òlee obodo ndị Pọl na Babanas letara ka ha naalaghachị ụlọ

  4. 4 Òlee ebe ha laghachịrị?

  5. 5 Òlee ụdị nzukọ ichère na ha nwere mgbe Pọl laghachịrị ụlọ?

  6. 6 Ijè mkwusa Oziọma mbụ Pọl jere, ò wetara ezi ihe?

  7. 7 Chọpụta ụfọdụ amaokwu nke naagwa anyị banyere ụgwọọlụ nke onye jeere Chineke ozi na ndụ Ya.