I Ndi Kọrint 15:1-58

Lesson 327 - Senior

Memory Verse
“Ma otú ọ dị, emewo ka Kraist si ná ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu” (I Ndi Kọrint 15:20).
Cross References

I Ịbụ Eziokwu nke Mbiliten’ọnwụ Kraist

1 Ọ bụ otú esi dee ya n’Akwụkwọnsọ, I Ndi Kọrint 15:1-4; Abù Ọma 16:9, 10

2 Ndị hụrụ n’anya ha gbaraàmà ya, I Ndi Kọrint 15:5-7; Ọlu Ndi-ozi 4:33; 10:40, 41

3 Pọl n’onwe ya bụ kwa onye ji anya ya hụ wee gbaa kwa àmà ya, I Ndi Kọrint 15:8-11; Ọlu Ndi-ozi 9:4, 17; 22:14, 18

II Mkpà Nke Mbiliten’ọnwụ Kraist Dị

1 Ọ bụ ihengosi na ndị nwụrụanwụ na ebili ọzọ, I Ndi Kọrint 15:12-15; Ọlu Ndi-ozi 1:3

2 Ọ bụ ntọala nke okwukwe anyị, I Ndi Kọrint 15:16, 17; Ndi Rom 4:25; 10:9

3 Ọ bụ olileanya anyị banyere ndụ ebịghịebi, I Ndi Kọrint 15:18, 19; I Ndi Tesalọnaika 4:14

III Usoro nke Mbiliten’ọnwụ ahụ

1 Kraist bụ mkpụrụmbụ, I Ndi Kọrint 15:20-22; Ọpupu 22:29; Levitikọs 23:10; Ilu 3:9

2 Mkpọkọbata nke ndị nsọ gaesonye n’oge Mwelikọ Ndịnsọ, I Ndi Kọrint 15:23; I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17

3 Kraist gaeme ka ọnwụ ghara ịdị ọzọ n’oge mbiliten’ọnwụ nke ikpeazụ, I Ndi Kọrint 15:24-28; Nkpughe 20:14

4 Pọl wepụtara nkọwa dị icheiche iji kwagide eziokwu nke mbiliten’ọnwụ, I Ndi Kọrint 15:29-34

IV Ụdị nke Mbiliten’ọnwụ

1 Eji ụdị arụ nke anụarụ maaàtụ ụdị arụ nke mmụọ, I Ndi Kọrnt 15:35-50; 2 Ndi Kọrint 5:1-4

2 Aga enwo arụ nke ndị kwereekwe dị ndụ n’otù ntabianya n’ọbịbịa Kraist, I Ndi Kọrint 15:51-53; Ndi Filipai 3:20, 21

3 Elomiri ọnwụ rue mmeri, I Ndi Kọrint 15:54-58; Nkpughe 21:4

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Dịka Edeworo ya n’Akwụkwọnsọ

“Ufọdu n’etiti unu si aña nēkwu na nbilite n’ọnwu nke ndi nwuru anwu adigh?” Pọl ziri Oziọma nke mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụanwu, ma ụfọdụ ndị Kọrint anabataghị ozi a. N’ihi nke a, Pọl zighachiri oziọma ahụ nke o ziri, náasị ná mmalite -- ya bụ, ihe kachasị mkpà -- bụ eziokwu ahụ na Kraist nwụrụ n’ihi mmehie anyị, elie Ya, O wee si n’ọnwụ bilie ọzọ n’ụbọchị nke atọ. O lezirianya nkeọma ịrụtụ ya aka na ọ bụ dịka ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ si dị na Kraist nwụrụ n’ihi mmehie anyị. Ná enweghị obiabụọ, o bu ihe a nke edere n’Akwụkwọnsọ n’obi, tinyere ndị ọzọ kwa: “Ya onwe-ya bu Onye amapuworo site ná njehie nile nke ayi, Onye azọpiaworo site n’ajọ-omume nile nke ayi: ahuhu nmehie nke udo-ayi di n’aru Ya: ọ bu kwa ubiri-utari-Ya ka ejiri me ka aru ayi di ike … ebipuru ya n’ala ndi di ndu: site ná njehie nke ndim ka ihe-otiti diri Ya. Ewe me ka ílì-Ya di n’etiti ndi nēmebi iwu. Ya na ọgaranya nọ kwa n’ọnwu-Ya” (Aisaia 53:5-9). Pọl rụtụkwaraaka na mbiliten’ọnwụ Jisọs bụ kwa dịka ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ si dị -- “I gagh-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gagh-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi” (Abù Ọma 16:10).

Ndị Náagbaàmà Ihe Ha Hụrụ

Ihe àmà ọzọ nye mbiliten’ọnwụ Jisọs Kraist bụ ndị ahụ dị ndụ wee náagbaàmà ihe ha hụrụ, bụ ndị ahụ mara Ya tutu Ọ nwụọ wee hụ kwa Ya anya mgbe O siri n’ọnwụ bilie – Kifas, ndị ozi irinaabụọ ahụ, narị mmadụ ise n’etiti ụmụnna n’otù mgbe, Jemes, na Ndịozi niile. Ndịa niile gbara àmà mbiliten’ọnwụ Ya; ekwesirị ịjụ ihe ndị àmàmiile a kwuru? Pọl pụrụ ikwu Ahụrụm Ya! Ọ bụ eziokwu na Pọl kwenyere àmà nke ndị ọzọ ahụ hụrụ Kraist anya gbara, ma ihe kachasị iwepụtara ya eziokwu nke mbiliten’ọnwụ bụ na ya na Onyenzọpụta ahụ nke siworo n’ọnwụ bilie zutere iru n’iru. Ọ bụ ezie na anya nke anụarụ anyị ahụbeghị Ya, ihe ngosi nke kachasi nke anyị naenwe banyere Onyenzọpụta ahụ nke náadị ndụ bụ mmata nke anyị naamata na ebupụwo mmehie anyị na Kraist náachị kwa nime ndụ anyị. Okwukwe anyị abụghị ihe efu n’ihi na anyị matara na Kraist nwụrụ n’ihi mmehie anyị, “ewe me ka O si n’ọnwu bilie n’ihi igu ayi ná ndi ezi-omume” (Ndi Rom 4:25).

Olileanya Anyị

Olileanya onyensọ Chineke ọ bụla site námmalite rue ọgwụgwụ oge ka ekekọtara nime mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụanwụ. “Asi na ọ bu nání ná ndu a ka ayi nweworo olile-anya ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.” O doro Job anya na ọ gaenwe mbiliten’ọnwụ nke anụarụ ya o wee chọsieike ka amatawa nke a mgbe o tiri mkpu sị: “Ọ gādim nọ nma ma asi na ede okwum nile n’akwukwọ ugbu a! Ọ gādim nọ nma ma asi na aka ha n’akwukwọ! Ma asi na eji pen igwe na òpù ka ha óké nkume rue mgbe ebigh-ebi! Ma mu onwem amawo na Onye ngbaputam di ndu, na Ọ gēbili kwa ọtọ n’elu àjà n’ikpe-azu: mgbe emebisi-kwa-ra akpukpọ-arum nka, ọ bu na m’gēsi n’anu-arum hu Chineke: Onye mu onwem gāhuru onwem, anyam abua gāhu kwa Ya, ọ bugh kwa onye-ala ọzọ. Akurum abua agwusiwo nimem” (Job 19:23-27).

Mkpụrụmbụ

N’okpuru Iwu, Ndị Israel naeweta ihe mbụ niile ha nwetara n’ubi, ịbụ onyinye nye Jehova. Chineke kwere mkwà na ọ bụrụ na ha ganaeme nke a, ọbá ha niile gaejupụta n’ịbaụba. “Sọpuru JEHOVA site n’àkù-gi, site kwa na nkpuru mbu nke ihe-omume-gi nile: ọbá-gi nile gējuputa kwa n’ihe-nriju-afọ, ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine-ọhu” (Ilu 3:9, 10). Mkpụrụmbụ niile ndịa enyere n’onyinye bụ ihengosi nke owuweiheubi nke gaje iso ha n’azụ. Otú a Kraist kwa, mgbe O siri n’ọnwụ bilie, weere ọnọdụ “nkpuru-mbu nke ndi daworo n’ura ọnwu.” Ya onwe ya bụ onye mbụ jiri anụarụ ebube wee pụta site ná ndị nwụrụanwụ. Ọ bụ mkpụrụmbụ -- ihe ngosi maọbụ mkwà nke anụarụ agaeme ka ha si n’ọnwụ bilie site nime ílì n’ọbịbịa ya. Olileanya nke OnyeKraist banyere mbiliten’ọnwụ bụ olileanya dị ndụ, n’ihi na achịkọtaworị mkpụrụmbụ ma owuweiheubi abụrụwo ihe nke náaghaghị iso.

Usoro nke Mbiliten’ọnwụ ahụ

Ọ bụghị ndị niile nwụrụanwụ gaapụta mgbe Kraist gaesi n’ụwa welikọ ndị ahụ nke náemerịemeri tutu oge mkpagbu. “Ma madu nile n’otù n’otù n’usoro nke aka ha: Kraist dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist n’ọbibia-ya.” Ọ dị ka agaenwe mbiliten’ọnwụ nke ndị egburu n’oge mgbagbu nke ndịnsọ na mgbe mkpughe nke Kraist (Nkpughe 20:4). “Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, …” Mgbe ọchịchị nke otù puku arọ nke Kraist gaachị n’ụwa a gasịrị, agaeme kwa ka ndị ajọomume ndị nwụrụanwụ si n’ọnwụ bilie. “Ewe kpe ndi nwuru anwu ikpe site n’ihe nile edereri n’akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di. Óké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha ewe kpe ha ikpè n’otù n’otù dika ọlu nile ha si di. Ewe tubà ọnwu na Hedis nime ọdọ ọku ahu” (Nkpughe 20:12-14). Nke a bụ ọgwụgwụ ihe niile na mmeri ikpeazụ nke Kraist meriri ọnwụ, bụ onyeiro ya nke ikpeazụ nime ndị iro Ya niile. N’Eluigwe ọhụụ na ụwa ọhụụ “ọnwu agagh adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru ufu agagh-adi kwa ọzọ: ihe mbu nile agabigawo” (Nkpughe 21:4).

Ọwụwụmmiri nke Mmiri

N’ịga n’iru ịkwagide nkọwa ya nye òzízí nke mbiliten’ọnwụ nke ndị nwụrụanwụ, Pọl náatụaka na ụkpụrụ nke ndị Kraist si awụ mmiri site n’ịbịanye na mmiri. Nke a bụ ihengosi nke ílìkọ mmadụ na Kraist n’ọnwụ na ibilite n’ụdị nke mbilite n’ọnwụ Ya. “Ebe elikọrọ unu na Ya nime baptizim, ọ bu kwa nime-Ya ka esitere n’aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ bú okwukwe unu kwere n’ilusi-ọlu-ike nke Chineke, Onye mere ka O si ná ndi nwuru anwu bilile” (Ndi Kọlọsi 2:12). Ajụjụ a na egosi nzuzu nke ịbịanye ndị mmadụ na mmiri na iwepụtakwa ha n’ụdị nke mbiliten’ọnwụ masị na mbiliten’ọnwụ adịghị. “Unu amagh na ka ayi ra, bú ndi emere baptizim ibà nime Kraist Jisus, emere ayi baptizim iba n’ọnwu Ya? Ya mere esitere na baptizim-ayi likọ ayi na Ya ibà n’ọnwu ahu: ka, dika esitere n’ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si ná ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jegharia kwa na ndu ọhu otú a. N’ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n’ọnwu Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe” (Ndi Rom 6:3-5).

Ịnwụanwụ na Anwụghịanwụ

Ajụjụ a biliri, “Èsi aña eme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie? Ọ bu kwa aha aru gini ka ha ji bia?” N’ịza nke a, Pọl nyere anyị ihe atụ kwesịrịekwesị nke mkpụrụ ọka akụrụ n’ala. Mkpụrụ ahụ na eréuré ma site na ya ka ome ọhụụ naepute náamịpụtakwa mkpụrụ dịka nke ahụ akụworo. “Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya.” “Anāgha ya n’ire-uré; anēme ka o si n’ọnwu bilie n’eregh-uré.” Lee ụdị olileanya naeweta obiụtọ nke a bụ: anụarụ nke a eji mụọ anyị naada n’ụra ọnwụ nime adịghịike, ireuré na enweghị nsọpụrụ, ewe mee kwa ka o bilie bụrụ anụarụ nke mmụọ n’ebube ike, ereghị uré, náadighị kwa n’ụdị anụarụ ahụ ejiri kèè ya, ma náenwe kwa oyiyi nke eluigwe! Ọ dịghị kwa ụdị nke ịnwụanwụ inwe ihe mgbu, ọrịa na adịghịike niile dị icheiche, kama ọ naadị n’ụdị nke anwụghịanwụ náamaghịkwa iruuju niile. Ahịhịa ndụ niile naepupụta mgbe óké oyi nke ụgụrụ gabigasịrị, okokoosisi urodi, na ahịhịa ndụ dị mma dị icheiche naebilite n’ụra mgbe ikpoọkụ nke oge ọkọchị gasịrị bụ ezi ihengosi na n’ụbọchị mbiliten’ọnwụ, onyensọ ọ bụla nke ná edina n’ụra gaebili náeyikwasị anwụghịanwụ.

Nwogha nke Ndị Dị Ndụ

Iheomimi ọzọ nke Onyeozi ahụ tọghere bụ na mmadụ niile agaghị arịda n’ílì n’iréuré, kama ndịótù Kraist ụfọdụ gaanọ ndụ n’ụbọchị ahụ nke gaadị ebube mgbe Jisọs “gēwere óké ikpọ-ókù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opi nke Chineke, si n’elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie: mgbe ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ ná ndu, ndi anaārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji” (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17). N’oge ahụ dịkasịrị ntà, ndị ótù Kraist dị ndụ bụ ndị mmeri ka agaagbanwe n’otù ntabianya site n’ụdị esi mụọ ha baa n’ụdị nke mmụọ maọbụ ụdị anụarụ enyere ebube. “Ya mere, umu-nnam m’huru n’anya, guzosianu ike, burunu ndi anapugh iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu nādọgbu onwe-unu n’ọlu abugh ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere o ji dịrị anyị mkpà na Kraist si na ndị nwụrụanwụ bilie?

  2. 2 Òle ihengosi nke mbiliten’ọnwụ Kraist ànyị nwere?

  3. 3 Òle ihe dị mkpà ọ naegosi bụ ịkpọ Kraist mkpụrụ mbụ nke mbiliten’ọnwụ?

  4. 4 Gịnị bụ onyeiro ikpeazụ Kraist nke agaje ibibi?

  5. 5 Òle otú ịwụ mmadụ mmiri si bụrụ oyiyi mbiliten’ọnwụ?

  6. 6 Òle ihe òzízí anyị natara site ná mkpụrụọghịgha banyere mbiliten’ọnwụ?

  7. 7 Kpọọ aha ụfọdụ ndị àmà nke mbiliten’ọnwụ.

  8. 8 Gịnị gaeme anụarụ nke ndị ahụ agaewelikọ na mgbe Mwelikọ?

  9. 9 Ònye bụ “Adam ikpeazù”?

  10. 10 Gịnị bụ iheọgbụgbá nke ọnwụ?