2 Ndi Eze 13:1-25; 14:9-16

Lesson 328 - Senior

Memory Verse
“Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya” (Eklisiastis 9:10).
Cross References

I Jehoahaz, Eze Israel

1 Jehoahaz chịrị Israel arọ irinaasaa, o me-kwara ihe jọrọnjọ n’anya Jehova, 2 Ndi Eze 13:1-3

2 Chineke napụtaara Israel n’aka ndị Siria n’ihi na Jehoahaz chọrọ inyeaka Chineke, 2 Ndi Eze 13:4-9

II Ọchịchị Jehoash

1 Ọchịchị Jehoash n’Israel yiri nke nna ya n’ụdị na o mere ihe jọrọnjọ n’anya Jehova, 2 Ndi Eze 13:10-13

2 Elaisha gwara Jehoash na Chineke gaanapụta Israel site n’aka ndị Siria, 2 Ndi Eze 13:14-21

3 Chineke napụtara Israel n’ihi ọgbugbandụ Ya na ndịbụ nna ha gbara, 2 Ndi Eze 13:22-25

4 Enwere agha n’etiti Juda na Israel, Israel wee merie, 2 Ndi Eze 14:9-16

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ụlọ Ekewaraekewa

Ka iheọmụmụ nke Ụlọakwụkwọ nke Ụbọchịụkọ anyị naeduba anyị n’ịmụ ihe dị n’Akwụkwọ ndi Eze na Akwụkwọ Ihe Emere n’Ubọchị Ndị Eze, agaecheta na ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’Okwu Chineke gafere ókè maọbụ náadịghị mkpà. Ana emezu àtụmààtụ Chineke site n’otù ọgbọ rue ọgbọ ọzọ, náagbanyeghị mgbalị nke mmadụ na agbalị ime ka ọ ghara ịdị otú ahụ. Anaemezu uche Chineke mgbe mmadụ chọrọ ime uche Ya maọbụ náagbanyeghị na ha achọghị. Ọtụtụ ihe anyị naamụ n’Akwụkwọ Ndị Eze na n’Akwụkwọ Ihe Emere bụ akụkọ banyere ndịkom náefeghị Chineke òfùfè, ndị ndụ ha jọrọnjọ, ma bụrụ kwa ndị àtụmààtụ Chineke banyere nzọpụta metụtara n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ.

Anyị naamata site n’ọtụtụ Akwụkwọ nke Baịbụl na mgbe niile ka mmehie na ajọomume dị icheiche naagbá mba Israel niile gburugburu, na ọ bụ kwa náánị olenaole ndị kwesịrị ntụkwasịobi bụ ndịnaeme ka ezi òfùfè Chineke dị. Chineke ekewawo ebo irinaabụọ ejikọrọọnụ nke Israel ụzọ abụọ n’ihi na ha arapụwo Ya (Lee I Ndi Eze 11:30-40). Ebo iri nke Israel buliri mmegide nnupụisi nye ọchịchị Rehoboam nwa Solomon. Ihe nke a lụpụtaara bụ na ọ bụ ebo Juda na Benjamin bụ náánị ihe fọdụrụ ya ịchị. Site na mgbe ahụ gaa n’iru, Israel bụ ụlọ kewara megide onweya. Ọtụtụ narị arọ ise gabigasịrị, mgbe Jisọs nọ n’ụwa; Ọ dọrọ Israel akanántị banyere ajọ ihe gaapụta n’ihi mmehie ha na ihe gaeso kwa adịghị n’otù na ịkpọasị na ekwòrò dị icheiche dị n’etiti ha. Ọ sịrị “Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe ya, anēme ya ka ọ tọgbọrọ n’efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agagh-eguzo: ọ buru kwa na Setan achupu Setan, ọ kewara megide onwe-ya; ala-eze-ya gēsi kwa aña guzo?” (Matiu 12:25, 26).

Ọ bụ nzube Chineke site námmalite na Israel gaabụ mba, na ha gaabụ ìhè nye Ndịmbaọzọ. Mgbe anyị naagụ iheodide nsọ banyere Israel, anyị naahụ na ebere Chineke naeme ka arapụ ndị fọdụrụafọdụ mgbe ikpe Chineke bịakwasịrị ha. Chineke kwuru na Jeremaia 30:11: “N’ihi na M’gēme ka mba nile gwusia: bú ebe M’chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M’nāgagh-eme ka igwusia: ma M’gādọ gi aka ná-nti n’ikpé, M’gagh-asi kwa na i bu onye ikpé nāmagh ma-ọli.” Otú ọ dị, mkwà nke Chineke na mba ahụ agaghị agwụsị apụtaghị na agaazọpụta mkpụrụobi onye Juu ọ bụla. Onye ọ bụla gaechègharị ka ewe zọpụta ya. Ezubere na Israel gaalụ ọlụ dị óké mkpà n’àtụmààtụ Chineke banyere nzọpụta. Chineke chọrọ ka Israel soro Ya lụkọ ọlụ mgbapụta, site n’ikwusa Oziọma nye ụwa nọ ná mkpà. Nke a bụ ihe kpatara na ịbaụba nke ịdịmma Chineke na ezokwasị Israel n’arọ niile na n’ọgbọ niile náagbanyeghị ọtụtụ ndaghachịazụ, dịka otù mba, ha naadaghachị site n’ịkpọ isiala nye Chineke.

Jehoahaz na Jehoash

Ihe achọrọ na Testament Ọhụụ bụ ka ndịokenye nke nzukọ na ndịọzọ bụ ndị nọ n’isi bụrụ ndị ana ekwu nkeọma banyere ha (maọbụ ndị nwere ezi àmà). (Lee Ndi Filipai 4:8; I Timọti 3:7). N’oge Jehoahaz na Jehoash, Nzukọ na ọchịchị obodo bụ otù, Chineke lekwara anya na ndị eze Israel gaabụ ihe ilereanya nye ndị obodo ha site n’ime ihe niile enyere n’Iwu Moses. Nke a ka amara nkeọma na ha emeghị. “Otú nna di ka nwa di” dịka eziokwu anaahụ n’ebe Jehoahaz na Jehoash nọ. Akụkọ nsọ edepụtara kwuru otù ihe banyere ha abụọ. “O me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA jeso nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie; o sigh nime ya wezuga onwe-ya” (2 Ndi Eze 13:2, 11). Okwu Chineke bụ eziokwu; ọ bụ kwa eziokwu mgbe Mmụọ Jehova depụtara ihe ndịa: “Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: n’ihi na ezi-omume ka oche-eze ji eguzosi-ike” (Ilu 16:12).

Ọ burụ na Chineke rapụrụ Israel ijéso ụzọ aka ha niile na ijéso ụzọ ndị eze ha, Israel gaabụworị ndị náadịkwagịike site n’ajọ mmeri niile nke Siria meriri ha. Anyị matara na nke a bụ eziokwu site n’okwu ahụ nke naasị, “Ma Hazel, bu eze Siria, megburu Israel ubọchi nile nke Jehoahaz.”

Ọgbụgbandụ ha na Chineke

Otù ihe dị mkpà ka ahụrụ n’otù amaokwu nke ihe ọgụgụ anyị nke náakọwa mmeso niile Chineke naemeso Israel náeleghịanya ná mmehie ha niile. Anyị gụrụ: “JEHOVA we mere ha amara, nwe obi-ebere n’aru ha, che ha iru, n’ihi ọgbugba-ndu-Ya nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob mere, O kwegh kwa ibibi ha, O sigh kwa n’iru Ya chupu ha rue ugbu a.”

Ọ bụ náánị n’ihi ọgbụgbandụ ukwu ahụ Chineke na ndị bụ nna Israel mere ka ejiri napụta mba ahụ site ná mkpagbu niile nke ndị iro ha. Ọ bụghị n’ihi ndị eze ha, n’ihi na ndụ ha jọrọnjọ. Ọ bụghị kwa n’ihi igwè mmadụ ndị karịrị n’ọnụọgụgụ nke mba ahụ, n’ihi na, ha niile n’otù n’otù, na ejeso ndị eze ha. Ọ bụ n’ihi olenaole ahụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi -- ndị ntakirị fọdụrụ bụ ndịnáaña ntị ihe niile Chineke nyere n’iwu -- na n’ihi ọgbugbandụ Ya, ka Chineke jiri nyere Israel aka megide ndị iro ha.

Ndị bụ ụmụ Chineke n’eziokwu matara ihe ndịa nkeọma. Aisaia Onyeamụma kwuru n’otù mgbe, mgbe ọ naeruuju mmehie niile nke Isreal sị: “Ọ buru na JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha emegh madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sodom, ayi gēyiwori Gọmora” (Aisaia 1:9). N’oge ọzọ mgbe ọ naekwu ihe bụ uche Chineke, ọ sịrị “Dika anāchota manya -- vine ọhu n’uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n’ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M’gēme n’ihi ndi-orùm, ka M’we ghara ibibi ha nile.” (Aisaia 65:8).

Ọ bụghị mgbe dum ka ndị naemebiiwu jọgburu onwe ha naanọ náenweghị oge ntà nime ndụha mgbe ha kpọkuworo Chineke. Náagbanyeghị ndụ ịlan’iyi nke Jehoahaz, o nwekwara otù mgbe ọ kpọkuru Chineke, Chineke wee zaa ekpere ya. (Lee 2 Ndi Eze 13:4). Ọ bụ ihe mnwuta na, ụdị okwukwe umeọkụ dị otú a n’ikwenyere Chineke náánị mgbe ụfọdụ ka anaechèfu kwa ngwangwa nime ndụ nke jọrọnjọ dịka nke Jehoahaz. Anyị enwehị ebe edere ya na nwa ya Joash dị mgbe ọ kpọkuru Chineke. Otú ọ dị, ọ dị ka Jehoash hụrụ ike Chineke dị ebube nime Elaisha, nriarịa na ọnwụ Elaisha wee metuta ya nke ukwuu.

Anyị amataghị otú Elaisha si nwedebe ike n’ebe Jehoash nọ. Eleghịanya ike o nwere ebe ọ nọ adịghị ukwu n’ihi na Jehoash bụ mmadụ jọrọnjọ ná ndụ ya niile. Ọ makwara Elaisha irunairu ma eleghịanya o nwere nsọpụrụ na mmasị n’ebe onyeamụma nke Chineke nọ. Náenweghị obiabụbọ Elaisha gaekpeworị ọtụtụ ekpere ọtụtụ ugbò n’ihi nzọpụta nke Jehoash, ma ọ dịghị ihe pụtara nime ya. Jehoash gatụworị ụjọ banyere ọdịn’iru ya ma ewezuga ekpere Elaisha. Ọ bụ ihe naeme eme na ndị mmehie naachọsi ekpere nke ndị Chineke ike n’ihi onwe ha, mgbe ha naanọgide n’ịjụ ifè Chineke òfùfè n’onwe ha.

Mgbe Elaisha gwasịrị ya na Chineke gaetigbu ndị Siria, agwakwara Jehoash ka ọ gbaa ụta, nke ọ gbakwara. Elaisha gwara ya na nke a bụ àkụ nnapụta site ná aka ndị Siria. Ma mgbe agwara ya ka o tida àkụ ya n’ala, o tie náánị ugbò atọ. Elaisha wesaara ya iwe n’ihi na o tiri ala náánị ugbò atọ, o wee bụrụ na agaekwe ka o tigbue ndị Siria náánị ugbò atọ kama ịkarị otú ahụ.

Enweghị ịnụọkụ n’obi nime Jehoash iji àkụ nzọpụta Chineke tie ala bụ óké ihe mwute. Mmadụ pụrụrị iche sị na ọ gaakpọworị ndịiro ya asị nke ukwuu wee tie ala ihe ọtụtụ ugbò karịa ka o meworo igosi échìchè ya n’ebe ha nọ. Enweghị ịnụọkụ n’obi nke ya ka apụrụ iji tụnyere ndị ahụ ná adịghị ike n’olileanya ịnata ihe site n’aka Jehova. Ha naekpe ekpere ọtụtụ ugbò, ma n’oge náadịghịanya ha etufue ịdị ike na ịnụọkụ nke obi ha. Chineke naachọ ka ndị náabịakwute Ya bịa n’ịnụọkụ n’obi nke ịchọsiike. Náánị ndị ahụ náachọsi Ya ike gaanata ihe n’aka Chineke. Anyị gaenweta náánị mmeri náezughịezu, dịka Jehoash, ma ọ bụrụ na anyị etinye ike náenweghị ume n’arịrịọ anyị.

Ọlụ nke anaejighị obi niile lụọ agaghị enwetara Chineke mmeri, otùaka ahụ. Ozi anyị nime ndụ anyị bụ ka anyị chebe obi anyị “kari ihe ndebe gi nile,” na ka anyị nyere mmadụ ibe anyị aka. Ma ọ bụ n’ijéozi nke ịkpọ ụbọ na ịbụabụ, n’ikpeekpere n’ihi ọdịmma ndị ọzọ, n’ikwusa Okwu ahụ, n’inyere ndị ọrịa na ndị nọ ná mkpà aka maọbụ n’ihe ọ bụla ị naeme, “nālunu ọlu site ná nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu” (Ndi Kọlọsi 3:23). Chineke zipụrụ Okwu Ya site n’ọnụ Jeremaia: “Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi JEHOVA bu (onye nējigh obi-ya nile).”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òle ụdị ndị eze Jehoahaz na Jehoash bụ?

  2. 2 Gịnị mere eji kewaa Israel ụzọ abụọ?

  3. 3 Gịnị mere Chineke ji nyere Israel aka ibu agha megide ndị Siria?

  4. 4 Òle otú anyị si mata na ọ dị mgbe Jehoahaz kpere ekpere nye Chineke?

  5. 5 Jehoash, ò kwere na Chineke?

  6. 6 Gịnị mere o ji wute Jehoash mgbe Elaisha nọ na nrịanrịa nke ọnwụ?

  7. 7 Ì chere na ihe funarịrị Jehoash mgbe Elaisha nwụsịrị? N’ihi gịnị?

  8. 8 Ì chere na Jehoahaz na Jehoash nataara ndụ ebighịebi? N’ihi gịnị?