Lesson 329 - Senior
Memory Verse
“Ọ digh amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mgbe ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwu okwu mgbe Mọ Nsọ nēme ka ha kwue” (2 Pita 1:21).Cross References
I Onye akpọpụtara site n’Ọlụ nke Ụbọchị
1 Emos bụ onyenche nke Tekoa na onye naatụtụkọ mkpụrụ osisi sikomọ (sycomore), Emos 7:14; 1:1
2 Ndụ ya na nwata wepụtara ihe ngosi maramma nke dị kwa mfé ịghọta nime amụma ya dị icheiche, Emos 2:13; 3:8, 12; 6:1
3 Emos nwere agụụ na ibuarọ dị ukwuu ịzá ọkpụkpọòkù Chineke, Emos 3:8; 7:15
II Ike na Ozi Emos
1 “Otú a ka JEHOVA kwuru” maọbụ ụdị okwu dị otú a ka edepụtara ugbò irianọ n’Akwụkwọ a, Emos 1:3, 6, 9; 3:11, na nke náeso ha (etc)
2 Ahụhụ nke ikpéọmụma dị nso ka ekwupụtara megide mba niile dị gburugburu, Emos 1:3-5; 2:1-3
3 Ekwuru Okwu Jehova megide Juda, Emos 2:4, 5
4 Ọkpụrụkpụ nke ịdịarọ nke ozi niile nke Emos ka ekwuru megide Israel, Emos 2:6-16; 3:1-15; 4:1-13; 6:7-14
5 Chineke kpọrọ Ụmụ Israel ka ha jiri obi ha niile chègharịa, Emos 5:1-27
6 Emos tirimkpu megide mmehie na mmadụ ịma náánị onwe ya (maọbụ ịhụ náánị onwe ya n’anya), Emos 6:1-6; 8:4-6
III Ịrịọchitaarịrịọ na Mkpagbu
1 Ọtụtụ ahụhụ ikpeọmụma nke náechere ịdakwasị ha ka egbochiri site n’ekpere nke Emos kpere, Emos 7:1-9
2 Amazia sogburu Emos náasị na ọ chọrọ ikekọta ndị gaemegide eze, wee gbaa mbọ ịchụpụ ya site n’ala Israel, Emos 7:10-13
3 Ikpéọmụma Jehova dakwasịrị Amazia, Emos 7:16, 17
4 Ozi ikpéazụ Emos gosiri na Israel aghaghị ịbụ ebe gaatọgbọrọ n’efu, Emos 8:1-3, 7-14; 9:1-10
5 Chineke nyere mkwà ịgbàume nke ìhè na olileanya, Emos 9:11-15
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEOnyeamụma Achọrọ
Ọchịchị Jeroboam, nwa Joash (onye anaakpọ Jeoash mgbe ụfodụ), eze Israel, bụ ọchịchị nwere ọgan’iru n’ihi óké mmeri náagha, ma ọbụ kwa ọchịchị nke óké ịdaghachị azụ nime omume ojọọ niile dị icheiche. Ọtụtụ ala ka enyeghachiri Ụmụ Israel site n’ịdị ike n’agha nke eze a; náenweghị obiabụọ maọbụ isiagụgọ, ọtụtụ ihe mkwata n’agha na àkụ dị icheiche ka ha nwetara n’ihi agha ndịa nke gaara ha nkeọma, nke wetaara ndụ inwebiga ihe ókè, ndụ alụghịọlụ na ndụ mmehie n’ebe ndịa nọ. Ndị amụma Chineke tirimkpu megide ọnọdụ mmehie ndịa, ma otú ọ dị Ụmụ Israel añaghịntị. N’ezie, ndị ahụ gbarambọ nke ukwuu ime ka ndịozi Chineke kpuchie ọnụ ha (Emos 2:11, 12).
Jisọs kwuru sị: “Onye-amuma abugh onye anādigh asọpuru, ma-ọbugh n’ala nke aka-ya” (Matiu 13:57). Ndị Sameria na Ụmụ Israel, hà gaañaworị onyeamụma si n’obodo náabụghị nke ha ntị karị? Chineke zigara Emos, onye naazụehi si na Tekoa, nke ebo Juda, ka ọ bụrụ onyeozi Chineke nye ndịa nke náadịghị asọpụrụ Chineke. Olu Emos, nke Mmụọ Chineke meworo ka o nwee ndụ na ike, náetisi mkpu ike, náenweghị mgbagọ ọ bụla, megide ajọomume niile nke Ụmụ Israel naeme. Ekwukwara okwu Chineke nye ọtụtụ mba ọzọ gbara ha gburugburu otùaka ahụ, ma ibu dịkarirị ukwu n’amụma Emos ka échèrè iru n’ebe Ụmụ Israel nọ. Mmụọ nke onyencheatụrụ a dị ala kpaliri n’óké mwute n’ihi óké ndaghachị ahụ nke ọ hụrụ n’etiti ndịa náefé Chineke nke Eluigwe na mbụ.
Enweghị Ngọpụ
Chineke dị mma nwe kwa échìchè ọma n’ebe Ụmụ Israel nọ; “Nání unu ka M’maworo n’etiti agburu nile nke uwa” (Emos 3:2). Jehova emewo ka ndịa si n’ịbụ orù n’ala Ijipt pụta, wee due ha n’ọzara iriarọanọ, iji mee ka ha baa n’Ala a Ekwere ná Mkwà. Jehova bibiri ndị Amọrait n’iru ha. Ọ sị na “idi-elu-ya di ka idi-elu osisi Cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osis oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n’elu na nkpọrọgwu-ya nile n’okpuru” (Emos 2:9).
Chineke emewo ka ngọzi anaapụghị ịgụtaọnụ rukwasị ndịa: ngọzi n’obodo ha niile na n’ubi ha niile, ngọzi ná mkpụrụ nke ala na n’ịbaụba nke ehi ha, ngọzi nke nketa na nke ụlọàkụ; ma ná mkwughachị nke ngọzi niile ndịa, Ụmụ Israel naatụkwasị óké mmehie n’elu ibe ya iji náeme ka aha nsọ Chineke bụrụ ihe emeruruemeru wee kpalie iwe Ya.
Ụdị ọnọdụ mmehie ndịa, bụ nke Ụmụ Israel nọ nime ha, bụ ihe emere ka ha jọọnjọ karịsịa mgbe ha naefé Chineke òfùfè n’egbugbereọnụ; ma Chineke naasị, “Madu abua gāyikọta je ijè, ma ọ buru na ha ezutegh?” (Emos 3:3). Ndị Israel nwere ụdị ifè òfùfè, ma ha jụrụ inye Chineke nke ndị nna ha nsọpụrụ zuruòkè, ha wee rapụ ifè Ya òfùfè bụ nke Ya. Chineke nyere ha iwu: “Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, … gi akpọla isi ala nye ha, efe-kwa-la ha òfùfè: n’ihi na Mu onwem bu JEHOVA Chineke-gi bu Chineke ekworo” (Ọpupu 20:3-5). Ụmụehi eji ọlaedo mee nke ebeịchụàjà ha dị na Betel na Dan bụ nkwulu na ihe iwe pụtara ìhè megide ezi òfùfè nke Chineke dị na Jerusalem. Ha na achụàjà ụbọchị dum -- ma ha naeji achịcha nke ajụrụajụ n’ifèòfùfè; otùụzọn’ụzọiri na onyinye afọofufo ka ana eweta n’ebe ịchụàjà a nke na adịghị nsọ site n’olu ịkpọmkpu; ma Chineke anabataghị akụkụ ya ọ bụla.
Okporoụzọ ịdịnsọ nke Chineke naedu rue Eluigwe, ma Ụmụ Israel; naaga n’ụzọ nke gbanyere ya azụ. Chineke mere ka ọtụtụ ikpéọmụma nke gaemekpa anụarụ arụ bịakwasị ndị Israel iji mee ka ha laghachikwute Ya, ma ha ekweghị ịlghachị. N’ezie ibuarọ nke ozi Emos nye ndị ahụ metutu ya onweya n’arụ nke ukwuu. Mgbe ọ naebu amụma banyere ndapụ ikpéazụ nke ndịa gaadapụ site n’ebe Chineke ha nọ, na ikpéọmụma na ajọihe nke náaghaghị iso ha, ozi ahụ dị ọkụ n’egbugbereọnụ ya: “N’ihi nka ka M’gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M’gēme gi, jikere izute Chineke gi, gi Israel” (Emos 4:12).
Oziọma dị Elu karịa
Ozi Emos ziri ndị Israel bụ mkwà ozi Chineke naezi ụwa taa. N’ọchịchị èzínaụlọ nke Oziọma ọ bụghị náánị otù mba ka Chineke mesoworo, kama ọ bụ ndị bi n’ụwa dum. “N’ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa, nādọ ayi aka-na-nti ka ayi we ju asọpugh-Chineke na agu ihe ọjọ di n’uwa, we di ndu uche zuru òkè na nke ezi-omume na nke isọpuru-Chineke n’oge di ugbu a” (Taitọs 2:11, 12).
Chineke erukwasịwo mmadụ niile óké ngọzi dị icheiche, ngọzi nke dịkasịrị ukwuu karị ngọzi ọzọ niile bụ onyinye nke Ọkpara Ya. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a na O nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyi, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16).
Ụmụmmadụ hà anabatawo ma kele kwa ekele n’ihi ịdịmma nke onyinye Chineke a dịkarịsirị ukwuu? É-è. Ná ngụkọta ihe niile ụmụmmadụ ajụwo Onyenwe anyị Jisọs. Chineke, Ò mesowo ụmụmmadụ na mba niile n’ikwesịntụkwasịobi ọ bụ ezie na ha ajụwo Ya na onyinye Ya dị óké ọnụahịa? É. Ọ fọdụrụ ntakirị ka o rue puku arọ abụọ na n’ọtụtụ ụzọ anaapụghị ịgụtaọnụ nke Ya na ụmụmmadụ rụrịtaworoụka wee gba mbọ ime ka ha mata mmehie ha niile na ihe dịrị ha ime. Chineke Ọ gaagụ ndị ahụ náajụ Kraist na ndị ikpé náamaghị? Ọ pụghị ime! Onye ọ bụla jụrụ Onyenzọpụta gaeguzo, ná mkpuchịọnu, n’iru Chineke n’ikpé n’ihi nlefuru anya ya. Ka mkpụrụobi ọ bụla dị ndụ laghachịkwuru Onyenzọpụta mgbe O ji ebere náarịọ “Biakutenum, unu nile ndi nādọgbu onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. Nyaranu yoke nkem n’olu-unu, muta-kwa-nu ihe n’ọnum; n’ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n’obi unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu. N’ihi na yoke nkem adigh-egbu ngbu, ibum di kwa nfé” (Matiu 11:28-30).
Ọtụtụ Ụzọ nke Chineke
Ọ naesiri ụmụmmadụ ike mgbe ụfodụ ịrapụ ọlụ ha naalụ wee zaa ọkpụkpọókù Chineke n’ihi na ha naeche na ha erughịeru n’ọkpụkpọ dị elu otú a; otú ọ dị, ọ bụrụ na ọkpụkpọ Chineke bụ n’ezie, egwù ekwesịghị ịdị. Emos bụ onyenchéehi dị ala, ma Chineke jiri amamihe na nghọta Emos nwetara mgbe ọ naelekọta ụmụatụrụ, wee kọwaa n’ụzọ dị ukwuu ozi ahụ anaezi Israel. “Ọdum, ọ gāgbọ uja n’óké ọhia, mgbe ọ digh anu ọ nādọgbu? Ọdum agbọwo uja, ọ bu onye nāgagh-atu egwù? Onye-nwe-ayi JEHOVA ekwuwo, ọ bu onye nāgagh-ebu amuma?” (Emos 3:4, 8). Emos gaamataworị otú ọdum si abịakwasị igweatụrụ ọ naeché, ọ makwara na ọdum adịghị agbọ ụja rue mgbe ahụ ọ naadakwasị anụ ahụ ọ naadọgbu. Emos na ejéozi n’ebe igwèatụrụ dị iche dị ugbu a -- igwèaturụ nke Israel. Ọ bụ olu ọhụụ nke ikpé ka anụworo -- olu Chineke. Ọ dị ihe agaeme ngwangwa ma ọ bụrụ na agaazọta igwèaturụ ahụ, ọ bụkwara Emos óké ibuarọ ịdọ igwèatụrụ ahụ akanántị na ime ihe niile ọ pụrụ ime iji zọpụta ha site n’iwe dị ọkụ nke Chineke.
Chineke, n’otùaka ahụ, pụkwara iji onye ahụ si n’ụdị ọlụ ọ bụla lụ ọlụ, bụ onye ahụ gaaza ókù Ya n’ụzọ zuruókè. Onyekraist ọ bụla amụrụ ọzọ naenwe mmasị n’ebe ọlụ nke ikwusa oziọma nke nzọpụta dị, ma ọ pụrụ iwe oge ya niile tinye n’ọlụ a maọbụ na ọ pụghị. Ndụ onye ọ bụla nke naasị na ya matara, naefékwa Onyenzọpụta ahụ nke siworo n’ọnwụ bilie bụ akwụkwọ asaghereasaghe, ndị ụwa naagụ ndụ ya na omume ya niile. Ihe ọ bụla agụpụtara ná ndụ onye ahụ naekwu n’ọnụ na ya bụ OnyeKraist,karị ihe ahụ agụpụtara n’Okwu Chineke, ọ naaaabụkarị ihe ndị mmehie naeguzo n’elu ya ikpé Nzukọ Kraist niile ikpé ọtụtụ mgbe. “Menu ka ìhè-unu nēnwu n’iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna unu Nke bi n’elu-igwe” (Matiu 5:16).
Emos naeme ihe dị mkpà mgbe ọ naeje ozi ya bụ ihe ndị amụma oge ugbu a náelefeuruanya. Emos wetara ozi Chineke, o dokwaa ndụ ya ịdị dịka Okwu Chineke si dị. Iri ugbò anọ n’akwụkwọ ntakịrị ya ka anyị gụrụ, “Otú a ka JEHOVA siri,” maọbụ ụdị okwu ụfọdụ dị otú a ahụ. Emos atụghị egwù itimkpu megide mmehie, n’ihi na ọ mara ike Chineke ịnapụta site ná mmehie na ime mmadụ ka o nwere onweya site n’ebe mmehie dị. Mgbe Emos tirimkpu sị, “Ahuhu diri ndi nọ ju na Zaiọn, na ndi nwere ntukwasi-obi n’ugwu Sameria” (Emos 6:1), ọ dịghị onye ọ bụla hụrụ ebe Emos nọdụrụọdụ inwe ọñụ n’ihe ụtọ nke ụwa na mmehie; ọ dịghị kwa mgbe Emos naatụkwasịobi n’ihe nke anụarụ. Ozi Chineke kpaliri Emos n’imeime mmụọ ya, o nwekwaghị ike ịnagide onye ahụ nke ozi Chineke banyere ikpé náabịa náatụteghị ime ka o chègharịa. Ezi OnyeKraist ọ bụla kwesịrị ka ihe banyere ndị kpafuruakpafu metụta ya dịka ihe banyere Israel si metuta Emos.
Mkpagbu
Ụdị omume dị elu aghaghị iweta ịtaụta na mkpagbu. Na mgbe náadịghịanya, Emos malitere inwe mkpagbu ahụ. Amazaia, onyenchụàjà, zigara eze Israel ozi, na Emos ekekọtawo ụmụmmadụ imegide eze, na ala niile apụghị ịnagide okwu ya niile. Onyenchụàjà ahụ wee náadụ Emos ọdụ ka o si n’Israel gbalaga wee laghachị na Juda ibu amụma, ma ọ bụrụ na ọ gaebu amụma. Emos bụ nwoke dị obiumeala (nke bụ ezi ịgbaàmà ahụ kwesịrịekwesi, dị kwa mkpà. Ka ezi onyeozi ọ bụla nke Chineke nwe). Ọ laghịazụ ịgwà Amazaia na ya onwe ya abụghịrịị onyeamụma rue mgbe Jehova kpọrọ ya ókù site na ndụ onyenchéehi wee nye ya ike iji zie Ụmụ Israel ozi a. Nguzogide niile nke Amazaia emeghị ka ozi Chineke ghara ịga n’iru. Chineke gbochiri nzube ọjọọ niile nke Amazaia wee nye onyenchụàjà ụgha ahụ náadịghị asọpụrụ Chineke ozi ihe ọjọọ ukwu gaje ịdakwasị ya. Ọ gaadịworị Amazaia mma karịa ma asị na ọ ñarantị wee nábata ozi onnyeamụma na ezí kama ịchọ otụ ọ gaesi chụpụ onyeamụma ahụ.
Jisọs gara ndịnáesoụzọ Ya: “Ọ bu ihe nāghagh ime na ihe di iche iche nēme ka madu ma n’ọnyà gābia: ma ahuhu gādiri onye ahu nke ha nēsite n’aka ya bia. Ọ gābara ya-ri urù ma akwuba ya nkume igwe-nri n’olu, tuba kwa ya n’oké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n’ọnyà” (Luk 17:1, 2). Ọ dịghị mgbe ọ bụla mkpagbu mere ka ezi Nzukọ ghara ịga n’iru kama ọ naeme ka ọ dị ike karịsịa nime Onyenwe anyị na n’inwe okwukwe.
Ezi Ịhụn’anya
Emos nwere ezi ịhụn’anya n’ebe ndị ọ naejere ozi nọ nke mere na o were obi ya niile náetisi mkpu ike megide mmehie nke mmadụ ịhụ náánị onweya n’anya, umengwu, ikpere arụsị, na ọtụtụ mmehie ọzọ dị icheiche. N’ihe dịka ugbò abụọ ka Onyenwe anyị site n’ọhụ gosi Emos ikpè gaje ịbịakwasị Ụmụ Israel; ma site n’ekpere Emos kpeere ha, ewezugara ikpéọmụma ahụ.
N’otùaka ahụ, ụwa nọ n’óké mkpà nke ekpere taa. Ikpéọmụma Chineke naekokwasị n’elu ndị ụwa dịka igweojii nke iwe dị ọkụ. Ekpere ndị Chineke, dịka ebeewusiri ike naegbochi ikpọmụma niile ahụ ịdakwasị ụwa n’uju ya niile. Otù ụbọchị agaewepụ ihe nnọchigide a, mgbe ahụ iwe dị ọkụ nke Chineke ewee wụkwasị ụwa n’ọnụma ya niile Jehova akpọwo ndị niile bi n’ụwa ka ha laghachịkwute Ya, ma ha ajụwo ịlaghachị. Ọ naagwa mba niile okwu dịka Ọ gwara Israel: “N’ihi nka ka M’gēme gi otú a, unu ndi mba nile: ebe ọ bu nka ka M’gēme gi jikere izute Chineke-gi.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Òlee ebo nke amụrụ Emos?
2 Òlee ọlụ Emos naalụ tupu Jehova akpọ ya ibu amụma?
3 Gịnị mere mmehie niile Ụmụ Israel jiri jọọnjọ nke ukwuu n’anya Chineke?
4 Òlee ihe eji enye nkọwa ụfọdụ nke Emos jiri bue amụma ya?
5 Òlee ihe dị mkpà karịa n’ozi niile Emos ziri Ụmụ Israel?
6 N’ụzọ dị añaa ka Emos ji nwee ike igbochi ikpé Chineke ụfọdụ ka ha ghara ịdakwasị ala Israel?
7 Gịnị mere eji kpagbue onyeamụma Emos n’ala Israel?
8 Òlee otú Emos si mee omume na mgbe mkpagbu nke Amazaia?
9 Òlee otú Chineke si ele onye ahụ naanọ “ju na Zaiọn” anya?