Maika 1:1-6; 2:1, 2, 8-11; 3:9-12; 4:1-13; 5:2; 6:1-8; 7:18-20

Lesson 330 - Senior

Memory Verse
“Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ bu kwa gini ka JEHOVA nāchọ n’aka-gi, ma-ọbugh nání ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ijè?” (Maika 6:8).
Cross References

I Esemokwu nke Chineke na Israel

1 Anaekwupụta okwu ikpé Ya dị icheiche, Maika 1:1-6

2 Anaagụpụta mmehie nke ndị ahụ, maika 2:1, 2, 8-11

3 Onyeamụma, onyenchụàjà, na onyeisi ka akpọrọ ikpeọnụ ya, Maika 3:9-12; Jeremaia 6:13, 14; Aisaia 1:23; Taitọs 1:10

II Mkpughe nke Àtụmààtụ niile nke Chineke

1 Enyere nkwà ọchịchị puku arọ, Maika 4:1-8; Aisaia 11:1-10; 35:1-10; Nkpughe20:1-4

2 Eburu amụma banyere ịdọta Juda n’agha na mbibi agaebibi ndịiro Zaiọn, Maika 4:9-13

3 Agaamụ Onyeọchịchị na Betlehem, Maika 5:2; Matiu 2:5, 6

III Ọkpụkpọ ka Echègharịa

1 Chineke naarịọ Israel arịrịọ, Maika 6:1-8; Aisaia 1:18

2 Ebere naatọ Ya ụtọ, Maika 7:18-20; Abù Ọma 103:8-18

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nchègharị

Mgbe ndịnchụàjà na ndịamụma ụgha chọrọ igbu Jeremaia n’ihi na ọ naebu amụma banyere mbibi nke agaebibi Jerusalaem, ndị okenye ụfọdụ bịara guzoro Jeremaia site n’ikwu na Maika buru ụdị amụma dị otú ahụ. “Otú a ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha siri:agēji plough gwu zaiọn dika ubi n’ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.” Ndịokenye wee náajụ: “Hezekaia, bu eze Juda, na Juda niile hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? Ọ tugh egwù JEHOVA, we chọ ka iru JEHOVA dajua. JEHOVA we chègharia n’ihi ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha”? (Jeremaia 26:18, 19).

Lee ọtụtụ ugbò anyị naahụ ka anaewezuga ikpé niile Chineke mgbe mmadụ naesi ná mmehie chègharịa wee kpọkue Ya! Mgbe ajọ obodo Nineve chègharịrị, Chineke kwere ka obodo ahụ dịrị. Ọ dịghị eleanya otú mmehie mmadụ siri jọọnjọ rue. Chineke dị ebere n’ịzọpụta ya ma ọ bụrụ náánị na ọ gaèchègharị. Ọtụtụ mgbe ka Israel naakpasu Chineke iwe; ma mgbe ha kpọkuru Chineke ná nsogbu ha, Ọ naemere ha ebere. Ikpé Chineke niile naechere onyemmehie taa, ma ebere nọ náechere n’iru ndị niile gaechègharị tupu oge agabiga.

Ekwupụtara Ikpéọmụma

Maika ji okwu dị ike banyere ikpé niile nke Chineke megide mmehie ná apụta, náekwu: “JEHOVA nēsi n’ebe Ya aputa, Ọ gāridata kwa, zọkwasi ebe di elu nile nke uwa ukwu” (Maika 1:3). N’okwu apụrụ ịghọta nkeọma ihe ọ naegosi: “N’ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n’ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? Ọ bugh Sameria? Gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abugh Jerusalem?” Isi obodo ndịa bụ kwa isiebe ajọomume na ikperearụsị. Ọ dịghị mgbe ndịamụma Chineke nke náadịghị atụụjọ rapụrụ ikwuokwu megide mmehie maọbụ rapụ ikwu ebe ịtaụta dị. Samuel baara Sọl mbá; Elaija tụrụ Ehab aka na ọ bụ onyensogbu nke Israel; mgbe Devid mehiere, Netan nọ n’ebe ahụ ịgwa ya. “Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu.” Iheọjọọ anaeme n’isi obodo niile maọbụ n’etiti ndịisi adịghị ezonarị anya abụọ nke Chineke, ọ dịghị kwa mgbe agaagụ nwatakịrị mere mmehie n’onye ikpé náamaghị. Onye náeji ala bụ onye náapụnarị mmadụ ihe, nke náachụpụ nwamgbei n’ụlọ ndị bụ nna ya biworo wee chụpụ ndịnyom na ụmụntakịrị site n’ụlọ ha; onye agha nke náapụnarị mmadụ náadịghị ihe ha mere uwe ha; ndịnchụàjà na eji ego ezi ihe; ndịamụma náebu amụma ịnara ego -- ihe ndịa nile ka onyeamụma na atụaka, ha niile nọkwa n’okpuru ikpéọmụma Chineke. Ọ dịghị kwa mgbe arapụrụ ndịisi náakpọ ikpé ziriezi ihe árụ wee náeme ihe ziriezi niile ka ọ gbagọrọagbagọ.

Ọnọdụ niile Ranrata

N’ihi ụdị ọnọdụ mmehie ndịa agaeme Sameria “ka ọ ghọ obo-ihe” “agēji plough gwu Zaion dika ubi.” “Bilienu, la; n’ihi na nka abugh izu-ike-unu … n’ihi na ugbu a ka I gāpu n’obodo, biri n’ọhia, biarue Babilọn” (Maika 2:10; 4:10). Ọ bụ ezie na Babilọn abụbeghị obodo dị ike, ọ bụbeghị kwa obodo nke pụrụ imegide Juda, Chineke si n’ọnụ Maika bue amụma banyere ndọtan’agha nke Babilọn na nke Assiria (gaadọta Ụmụ Israel). Anyaukwu, uré, na ihe ike nke wetara Israel ikpéọmụma yiri ụdị ọnọdụ anaahụ n’ọchịchị nke obodo na ndụ mmekọrịta nke ala anyị dum n’ụbọchị taa. Ànyị gaesi añaa gbanarị maọbụrụ na anyị lefuuru ụzọ mgbanarị mmehie ahụ nke Chineke n’onwe Ya doziri. Dịka ọ bụ ihe mereeme na ndị Assiria bibiri Sameria, na Jerusalem bụ kwa ebe ndị Babilọn kwaturu n’ala, ala anyị nke a gaabụ ebe tọgbọrọ n’efu n’ihi iwe dị ọkụ nke Chineke náánị ma anyị niile dịka otù mba, si n’ihe ọjọọ anyị chègharịa.

Mkpagbu na Nwghachịn’ọnọdụ

Ọ bụ ezie na Maika kwuru ọtụtụ ihe banyere mmehie na ikpé, ọtụtụ ihe o dere nwere arịrịọ dị ike banyere nchègharị na mkwà iweghachị n’ọnọdụ mbụ. O kwuru banyere mgbe ahụ agaesi na Babilọn napụta “ada Zaion,” we sị, “N’ebe ahu ka JEHOVA gāgbaputa-gi n’aka ndi-iro-gi” (Maika 4:10). Amụma ya gara n’iru karị mgbe ahụ ha gaalaghachị mgbe iriarọ asaa gasịrị nime ndọta n’agha ha, rukwarị na mgbe ahụ gaje ịbịa mgbe mba niile gaekekọta imegide Zaion, ibibi ya. “Ma ndi ahu amagh échìchè nile nke JEHOVA, ha aghọtagh kwa ndum-ọdu-Ya: n’ihi na ọ chịkọtawo ha dika ùkwù-ọka n’ebe-nzọcha-ọkà” (Maika 4:12). N’ịgwa Zaion Okwu Chineke náagbá ha ume: “Bilie zọcha, gi ada Zaion: n’ihi na mpi-gi ka M’gēme ka ọ ghọ igwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M’gēme ka ha ghọ ọlà: I gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M’gēwezuga kwa urù-ha nye JEHOVA, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe-uwa” (Maika 4:13).

Ụdị nkọwa nke a ịmaatụ dị otú a nke ịtụba ùkwùọkà nke wheat n’ebe nzọchaọkà nke mgbe ochie wee were ụkwụ ụmụanụ zọchapụta mkpụrụ, naakọwa n’eziokwu ụbọchị ahụ nke ọgwụgwụ Óké Mkpagbu ahụ mgbe Chineke “gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; mu na ha gēkpe kwa ikpé n’ebe ahu banyere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n’etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère” (Joel 3:2). Eze ukwu ahụ bụ Eze kachasị ndịeze niile na Onyenwenụ kachasị ndịnwenụ niile nke efesaworo uwe Ya n’ọbara, Ya na usu niile nke ndịagha ndị dị n’Eluigwe naeso Ya n’elu ịnyịnya ọcha, ewe bibie ndiịiro Zaion. (Lee Nkpughe 19:14-21). Site n’ibi ndụ mmeri nke OnyeKraist ugbu a, ị pụrụ iso ndị ahụ kwesirịntụkwasịobi ndị náeso Ya anọkwasị n’elu ịnyịnya, bụ usu ndịagha ahụ náeyi ezi ákwà ọcha.

Ọchịchịpukuarọ

Ị pụrụ iketa ókè n’alaeze ahụ, mgbe Zaion gaabụ isiobodo nke ụwa niile na Pukuarọ ahụ, site n’ilezianya nkeọma ifè ya na ndụ nke a. Ịlụọgụ niile nke anyị naalụ ugbu a agaghị abụ ihe lara n’iyi iji dị ndụ n’ụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị “gēkpe kwa ikpé n’etiti ọtutu ndi ndi iche iche dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ogè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agagh-ebuli mma-agha megide mba, ha agagh-amuta kwa agha ọzọ” (Maika 4:3). Nke a bụ mgbe ahụ “ihe ekère èkè nile nāsukọ udè” (Ndi Rom 8:22); mgbe ahụ “Ka agēmeghe anya ndi-isi, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe” (Aisaia 35:5); “ala ihe nādigh gēteghari kwa egwù ọñu, gbawa okoko-ọhia, dika rose” (Aisaia 35:1). Ị naejikere onwe gị iketa ókè n’alaeze ahụ?

Betlehem

Maika kwuru banyere ebe agaamụ Onyeọchịchị ukwu ahụ: “Ma gi onwe-gi, Betlehem Efrata, nke di nta idi n’etiti usu nile nke nnu abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n’Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mgbe ochie, site n’ubọchi nile nke mgbe ebigh-ebi gara aga.” Ọ bụghị náánị na Maika nyere aha obodo ebe agaamụ Jisọs, ma o kwukwara banyere ọdịdị Ya ebighịebi. Mgbe ndị amamihe ahụ jụrụ ha, “Òle ebe Ọ nọ bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju?” ndịisinchụàjà na ndị odeakwụkwọ zara, “Na Betlehem nke Judia: n’ihi na otú a ka edeworo ya n’akwukwọ site n’aka onye-amuma” (Matiu 2:2, 5). Edebere amụma niile ndịa nkeọma n’arọ niile nke náeso, o wee rue anyị aka n’ịmamma na izuòkè dịka atụgharịrị ya nime Baịbụl Eze Jemes (King James Version).

Ebere

Chineke onye hụrụ Israel n’anya, naachọ kwa ka ha nwe ọñụ n’ihe ebube niile ndịa edebere ha, náarịọ ka ha chègharịa site ná ndaghachịazụ ha niile. “Ndim, gini ka M’meworo gi? Ọ bu kwa gini ka M’jiworo me ka ike gwu gi?” (Maika 6:3). Otú a ka Chineke nke ịhụn’anya gaesi kwa náakpanyere ndị ahụ niile siworo n’eziokwu laghachịazụ ụkà. Ọ bụghị onyinye ha, àkụ ha maọbụ inye nwa mbụ ha ka Jehova chọrọ, náánị “ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije.” Mmehie na eweta nkewa site n’ebe Chineke nọ, náewepụ aha mmadụ site n’Akwụkwọ nke Ndụ, náewepụ kwa ọnọdụ ya site n’alaeze Chineke náadị ebighịebi; ma nchègharị naeweghachị ngwangwa ihe ahụ niile furuefu. “Ònye bu Chineke dika Gi, nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru. O jgidegh iwe-Ya rue mgbe ebigh-ebi, n’ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu” (Maika 7:18).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ihe ajụjụ a pụtara “Gini bu njehie Jekob? Ọ bugh Sameria?” (Maika 1:5).

  2. 2 Kpọọ aha mmehie ụfọdụ onyeamụma Maika kwuru okwu megide.

  3. 3 Kọwaa ụzọ ọnọdụ nke ihe anaahụ n’ụwa ụgbu a ji yie ụdị ihe niile ahụ Maika kwuru banyere ha?

  4. 4 Òge gịnị ka onyeamụma naekwu banyere ya n’isi 4 amaokwu nke 2?

  5. 5 Òlee ihe okwu ndịa pụtara, “Bilie, Zọcha gi ada Zaiọn”?

  6. 6 Òlee otú ndị odeakwụkwọ nke oge Jisọs si mata ebe agaamụwo Ya rịị?

  7. 7 Gịnị ka Jehova nyere dịka ihe Ọ naachọ n’aka Israel? (Lee isi nke 6).

  8. 8 Kọwaa ihe ụfọdụ ganaeme n’oge Ọchịchịpukuarọ ahụ.

  9. 9 Òlee ọnọdụ Israel gaewere na mgbe Ọchịchịpukuarọ ahụ?