Lesson 331 - Senior
Memory Verse
“Ònye bu onye amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia: ònye bu onye-nghọta? ọ gāmata kwa ha. N’ihi na uzọ nile nke JEHOVA ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ijè nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha” (Hosea 14:9).Cross References
I Chineke Chetara Israel banyere Nnapụta Ha Site n’Ijipt
1 Ịhụn’anya Chineke kpọpụtara Israel site n’ịbụ orù, Hosea 11:1
2 Israel laghachịrị n’ikpere arụsị Beal, Hosea 11:2; I Ndi Eze 18:18, 21
3 Eji aka dị nrò zụlite ha ná mmalite arọ niile nke akụkọ ndụ ha, Hosea 11:3, 4; Deuteronomi 32:9-12; 1:31
II Ncheta nke Chineke Chetara Israel banyere Ndọtan’agha ha nke náabịa nso
1 Onye Asiria gaabụ eze ha ma ọ burụ na ha jị ịlaghachịkwute Onyenwe anyị, Hosea 11:5; 2 Ndị Eze 17:22, 23
2 Mmaagha gaadakwasị ha n’ihi ndaghachịazụ ha niile, Hosea 11:6, 7
3 Egosịrị obiebere Chineke ọbụná n’ebe ndị Israel a daghachịrịazụ nọ, Hosea 11:8; Abụ Ọma 103:13, 14
4 Chineke ji obiebere mesoo Israel, náagbanyeghị iwe Ya dị ọkụ, Hosea 11:9; Abù Ọma 103:8, 9
5 Mkwà Chineke banyere nlaghachị ha, nkebụ ihe naaghaghị imezu, ka ekwukwara ihe banyere ya ọzọ, Hosea 1:10, 11; Deuteronomi 30:4, 5
6 Egosịrị ihe dị ichè nke dị n’etiti Israel na Juda n’oge ahụ, Hosea 11:12
III Ọkpụkpọ nke Chineke banyere Nchègharị
1 Chineke ji nnọọ nwayọ na ịgbasimgbáike rịọ Israel, Hosea 14:1, 2; Matiu 23:37
2 Ezi nkwupụta nke sitere nime obi ka achọwororị n’aka Israel, Hosea 14:3; Ilu 28:13
3 Ịkpọghachị Israel gaesite ná nchègharị ha, Hosea 14:4-8
4 Egosịrị amamihe nke dị nime ezi nchègharị nke sitere nime obi, Hosea 14:9
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEHosea, Onyeamụma ahụ
Onyeamụma ahụ bụ Hosea na Aisaia bụ ndị bịkọrọ n’otù oge n’ụwa. Aisaia bụ kwa onyeamụma ukwu ahụ dere ọtụtụ ihe banyere Alaeze nke Mesaia ahụ. Amụma niile Hosea buru kwuru ihe banyere alaeze nke Israel karịsịa, ma nke Aisaia bụ ihe banyere alaeze nke Juda. Ọtụtụ mgbe ka anaakpọ Hosea onyeamụma ná ákwáákwà banyere Israel; Jeremaia ka amatara dịka onyeamụma ná ákwáákwà banyere Juda. Hosea jikarịrị ụfọdụ okwu apụrụ ịhụ ebe ọ bụla nime akwụkwọ akụkọ anaakpọ “literature” kwue okwu. Ọ naeme ngwangwa ikwusi okwu ike megide mmehie niile nke ndị Israel, otùaka ahụ ọ bụ kwa onye náadị nrò na onye ndụmọdụ ya banyere nchègharị ná emetụ ụmụmmdụ n’obi. O nwere onyinye nke iji ike dị ukwuu kọwaa ihe, ma ụfọdụ nime akwụkwọ odide ya dị nsọ n’ezie naewuli kwa mmụọ. Ebo iri nke Israel ka anaeji aha ókéọnụ ahụ bụ Efraim kpọọ mgbe ụfọdụ, ma ọ dị ka Hosea jiri aha ahụ mgbe niile ọ naekwuokwu banyere ha.
Isin’orù Pụta
Dịka ịhụn’anya nnenanna dị n’ebe nwa ha nọ, otú a ka ịhụn’anya Chineke dịrị n’ebe Israel dị. Ọ bụ ịhụn’anya na obiebere O nwere n’ebe Israel dị mere O jiri kpọpụta ha site n’ịbụorù n’ala Ijipt. Ịhụn’anya mbụ ahụ nke ná ejupụta nime obi onyemmehie nke náechègharị, mgbe agbapụtara ya site n’aka onye iro ahụ, bụ nketa ntà nke otù ụdị ịhụn’anya ahụ Chineke nwere n’ebe ụmụ Ya nọ nke O gosịrị n’ebe Israel nọ.
Chineke hụrụ Israel n’anya wee site n’ịbụorù kpọpụta ha. Ọ naahụ onyemmehie n’anya ma náakpọ ya ka o chègharịa. Dịka Israel bụrụrị n’ezie orù n’okpuru ndị jiri akaike chịa ha n’ala Ijipt, otú a ka onyemmehie naabụ orù n’okpuru onye ahụ nke ji akaike náachị -- nke bụ ekwensu. Ọ bụ náánị Chineke pụrụ itiji agbụ nke mmehie ma mee ka onyemmehie nwere onwe ya.
Otù abalị Chineke kpọpụtara Israel site n’ala Ijipt, site n’okpuru óké nsogbu na ọchịchị akaike dị egwù nke Fero. N’oge dịkarịsị ntà, Jisọs pụrụ itiji ike nke ekwensu dị nime ndụ mmadụ, ma mee ka onye ahụ si na omume ọjọọ ọ bụla nke kere ya agbụ pụta. Ọ bụ ọmiko na ịhụn’anya nke Chineke, Onye dị ebere, na ewere onyemmehie amaworo ikpé, nke náadịghị kwa ọcha, wee wukwasị ya ịhụn’anya na obiọma dị nrò otú a ịkpọ kwa ya nwa Ya. “Site n’Ijipt ka M’si kpọputa nwam” buri eziokwu pụtara ìhè n’ebe Israel nọ, bụrụkwa eziokwu nke dịka amụma eburu si dị -- nke emezuwokwara n’uju -- nime Kraist.
Akụziri ha otú esi Agaijè
Jekob rịdaruru nime Ijipt ịnapụta ndụ ya na nke èzínaụlọ ya. Akpọrọ Jisọs gbalaga Ijipt ka eze bụ Herod wee ghara igbu Ya. Ma Onyenwe anyị arapụghị Israel maọbụ Kraist n’ala ahụ ebe ha bụ orù. Ọ kpọpụtara ha! Ọ bụghị náánị na Onyenwe anyị kpọpụtara Israel site n’ala Ijipt kama Ọ kuziri ha site n’ụzọ niile ọ bụla dị icheiche otú esi ejeijè nime ezi ụzọ ahụ nke mmekpaarụ náadịghị nime ya. Mmụọ Nsọ nọkwa nime ụwa taa náakpọpụta mkpụrụobi dị icheiche site n’ọchịchịrị baa nime ìhè nke Oziọma. Chineke dọrọ Israel akanántị banyere ọtụtụ iheizendụ na ọtụtụ ihe nke pụrụ ịkwada mmadụ n’ụzọ, ma anya Ya apụghị n’ebe ha nọ ịhụ na O duru ha gabiga ebe niile anaazọbeghị ụkwụ na mbụ. O nyere ha iheoriri mgbe agụụ gụrụ ha. O jiri mana zụọ ha -- bụ nri ndị Mmụọozi -- ma mgbe ahụ Efraim “we ma abuba, we gba ukwu.”
Ndaghachịazụ
Onyeamụma bụ Hosea nọgidere náarụso Israel ụkà oge niile n’ịbámbá n’ihi ndaghachịazụ ha niile. O jiri okwunkọwa dị otú a kwueokwu, “Israel ewezugawo onwe ya, dika nwa-agbọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya,” “Onye ekekọtaworo ya n’arusi di iche iche ka Efraim bu: kwe ka ọ nọduru onwe-ya;” “N’ihi na ifufe ka ha nāgha dika nkpuru-ọghigha, ọ bu kwa óké ifufe ka ha gēwe dika ihe-ubi.” Okwu niile ndịa náakọwa ọnọdụ ime mmụọ nke Ụmụ Israel. Náagụghị ngọzi niile Onyenwe anyị nyeworo ha, ha nọ náadaghachịazụ.
Site n’oge Eron mere nwaehi awụrụawụ rue mgbe adọtachasịrị Israel n’agha jee Asiria na Babiliọn, ahụrụ ogologo ahịrị nke ndaghachịazụ na nchègharị, na ndaghachịàzụ ọzọ kwa ọtụtụ ugbò. Mgbe ihe gaara ha nkeọma obi ha ewe bụrụ ihe efu nke ebuliwokwara elu. N’ihi nke a Onyenwe anyị naeme ka ndịiro ha bịakwasị ha merie kwa ha, ma nime mkpagbu ha, ha naakpọku Onyenwe anyị. Anaeme ka ebere Chineke rute ha mgbe ha tikuru Ya mkpu, mgbe ahụ ọtụtụ ngọzi Ya gaeso kwa ha. N’ụzọ dị otú a, Israel bụ ụdị nwanyị nke náakwaiko, mba ndị rapụrụ ezi Chineke dị ndụ ma feé arụsị òfùfè. Baịbụl mere ka amata na: “Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n’anya, ihun’anya nke Nna-ayi adigh nime ya” (I Jọn 2:15).
Enyere Ndụmọdụ maka Nchègharịa
“Israel, laghachịkute JEHOVA bú Chineke-gi; N’ihi na I suwo ngọngọ site n’ajọ omume-gi. Chirinu okwu n’aka-unu laghachikute JEHOVA: sinu Ya. Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe.” Ndịa bụ arịrịọ nke Onyenwe anyị naarịọ obodo a nke náenupuisi. Arịrịọ niile dị otú a ka anaeme ka o rue mkpụrụobi ọ bụla náefuụzọ arụ n’ụzọ pụrụ iche n’ụbọchị ndịa. Ọ gaabụrị na onyeiro emewo ka mmadụ sụọngọngọ, ma Onyenwe anyị naasị ya, “Laghachikutem, Mu onwem gālaghachikute kwa unu.” “Ọ buru na nmehie unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi” (Aisaia 1:18). Jisọs jiri okwu di otú a mee ka ọkpụkpọ òkù a rue ebe niile: “Onye nābiakutekwam M’gagh-achupu ya ma-ọli” (Jọn 6:37). Ọ bụ ezie na ekwuwo amamikpé Chineke megide ndị náanọgide nime mmehie, ma n’otùaka ahụ inyeaka nke ebere Ya naeru ndị niile gaechègharị.
Nime iheọmụmụ a Chineke naagwa Israel sị, “Chirinu okwu n’aka-unu, laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe.” Were obi iruuju rịọ Chineke ka O wepụ mmehie gị niile! Ị bụ onye furuefu, náenweghị inyeaka, onye tọgbọrọ n’efu, nke náala kwa n’íyì n’enweghị Chineke!
Ụmụ Israel jụrụ “imeghari omume ha nile” ichigharịkwute Chineke ha. Ọ bụghị náánị na ha nwere ọchịchọ ijéijè n’ụzọ megidere Chineke, kama ha náanya kwa isi n’omume ọjọọ ha niile. Chineke ekwuwo, site n’ọnụ onyeamụma bụ Aisaia sị “Rapunu ime ihe ọjọ, mutanu ime ezi ihe.” Chineke naahụ onye ọ bụla nwere ezi obi, na nke ji ezi nzube náachọsiike isi ná mmehie chigharịa, ọ bụ onye dị otú a ka Ọ naenyereaka.
Ọchịchọ Chineke N’ebe Ndị Ya Nọ
“M’gēsi aña rara gi nye, Efraim? M’gēsi aña nyebiga gi, Israel?” Okwu ndịa sitere n’obi náarịọsiike nke Chineke Onye ọmiko, na nke náaba kwa ụba n’ebere, Onye amara. Jisọs kwaara Jerusalem ákwá wee sị: “Jerusalem, Jerusalem, nke nēgbu ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! Ọtutu mgbe òle ka M’chọrọ ichikọta umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọta umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọgh!” (Matiu 23:37).
Ọ bụ Chineke n’onwe Ya naarịọ umummadụ, náagbafu ọbara Ya n’ihi ha, ma náagbasa aka ịhụn’anya Ya jupụtara n’amara ịnabata ha nyeghachị onwe Ya. Ịhụn’anya n’enweghị atụ! Òle otú ha gaesi náeguzogide mmeso ịhụn’anya nke Mmụọ dị otú a?
“Nání mara ajọ omume-gi” (Jeremaia 3:13). Ị mewo ka ụzọ gị niile na échìchè gị niile bụrụ gị chi (maọbụ arụsị)? Hà egbochịwo gị ịchọta ụzọ nke Chineke? Náánị ihe dị mkpà ka mmadụ mee bụ ikwere na ụzọ nke ndụ ya ọbụná ma asị na ọ bụ ụzọ jupụtara ná mmehie kachasị njọ, maọbụ náánị nime ịgbáọchịchịrị na isiike nke obi ya, ná enwetabeghị udo na mnwezuga nke olileanya ọ naachọ, náarịọ Chineke ka O zi ya ụzọ Ya. Onye ahụ gaachọta ụzọ nke Chineke mgbe ọ naagụ Baịbụl, ma ji obi ghereoghe na nke nwere mmasị náanụrụ mkwusa okwu Baịbụl nke anaekwusa. Chineke gaegosi ya ụzọ Ya nke bụ ụzọ ịhụn’anya, ọñụ, udo, na ịdịnwayọ: dịka mmadụ si nwe obintiwa n’iru Chineke, n’ihi ụzọ ya niile nke megidere ụzọ nke Chineke, ma rịọ ezi mgbaghara. Chineke gaabịa binyere ya. “Otú a ka Ọ siri, bu Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mgbe nile ebigh-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si N’ebe di elu di kwa nsọ ka M’bi, M’binye-kwa-ra onye mọ ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n’obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu” (Aisaia 57:15). (Lee kwa Abù Ọma 34:18).
Efraim Náeruujú
Hosea nyopụtara ihe ọzịzá Efraim gaabụ mgbe obi nke ekweghịekwe na nke nnupuisi ya gaetiwa. Efraim gaasị, “Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ?” Na ikpeazụ o wee chee onwe ya n’iru Chineke! Wee daa n’ụkwụ nke Obe n’iruujú!
Hosea jiri anya nke amụma hụta oge ikpeazụ mgbe Israel náagaghị achọkwa ikpere arụsị. Ọ hụwo kwa ụbọchị ahụ dị ebube mgbe mba a náagaghị emehie kwa ọzọ. Chineke gaabụrụ ha Chineke rue mgbe ebighịebi, ma ha onwe ha gaabụ kwa ndị Ya. Ha gaakwụghachị Ya “egbugbere-ọnu” ha dịka óké ehi, n’ihi na agaghị eji kwa anụụlọ dị icheiche chụọ àjà ọzọ. Ha gaabụrụworị ndị chọpụtara àjà ahụ zuruòkè -- bụ Kraist ahụ ha jụwororị. Ha gaachụ àjà “bú otuto nye Chineke mgbe nile -- nēkwuputa nye aha Ya” (Ndi Hibru 13:15).
Ịhụn’anya nke Chineke N’enweghịatụ
Nụrụ ọzịzá nke Chineke ịhụn’anya, Onye ebere. “M’gāgwọ ndaghachi azu-ha, M’gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, gbasa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon.” Ihenlereanya ọma dị ebube ka nke a bụ! Onye ọ bụla nwere oghere ịdị otú ahụ. Ndụ agọziriagọzi dị aña ka ọ gaabụrụ mmadụ ibi, mgbe ọ gaagbawa dịka urodi na ísìsìụtọ nke na nzọụkwụ ya nke ụbọchị niile, ewe dịka mmanụotite awụpụrụawụpụ.
Hosea tụrụ Israel nke náadighị eguzosiike mmehie ha n’anya, ba kwa mba, ma dụọ kwa ha ọdụ, ma were okwu ndịa di elu nke náemetụ n’obi mechie amụma ya: “Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāmakwa ha. N’ihi na uzọ nile nke JEHOVA ziri-ezi, ndi ezi-omume gēje kwa ijè nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Kpọọ aha onyeamụma ukwu ahụ ya na Hosea pụtara n’otù oge.
2 Gịnị bụ aha ịhụn’anya nke anaakpọ Israel mgbe ụfọdụ?
3 Gịnị bụ mmehie nke náejide Israel?
4 Òlee mgbe ebuliri Israel elu dịka mba?
5 Kọwaa mmetụta Chineke naenwe n’ebe Israel daghachịrịazụ nọ.
6 Ì nwere ike ikwu ndụmọdụ Onye nwe anyị nke naarịọ ha ka ha lata?
7 Kwue okwu olenaole dị ọkpụrụkpụ nke Hosea kwuru.