2 Ndi Eze 17:1-41

Lesson 332 - Senior

Memory Verse
“Iwe JEHOVA we di ọku n’aru ndi-Ya Ọ we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árù, Ọ we nye ha n’aka mba di iche iche: Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha” (Abù Ọma 106:40, 41).
Cross References

I Mmehie nime Israel

1 Hoshea bụ eze ọjọọ, o wee chịa Israel arọ iteghete, 2 Ndi Eze 17:1, 2

2 Shalmanesa eze Asiria, rịgoro megide Hoshea wee ghọ orù ya, 2 Ndi Eze 17:3

3 Emechibidoro Hoshea n’ụlọmkpọrọ, n’ihi izu ọjọọ megide Shalmanesa, 2 Ndi Eze 17:4

4 Ndị Asiria nọchigidere Israel wee dọrọ ha niile n’agha, 2 Ndi Eze 17:5, 6

II Ikpé nke Chineke

1 Israel arapụwo òfùfè nke Chineke, wee ghọọ ndị náekpere arụsị, 2 Ndi Eze 17:7-12

2 Chineke zigara ndịamụma Ya na ndị ọhụụzọ niile ka ha ga rịọ Israel ma dọkwa ha akanántị banyere ikpere arụsị, 2 Ndi Eze 17:13-17; Jeremaia 7:25; 25:4; 11:7

3 Chineke jụrụ ebo iri nke Israel, weda ha n’ala, nye ha n’aka ndị náapụnarị mmadụ ihe, rue mgbe O siri n’iru Ya chụpụ ha, 2 Ndi Eze 17:18-24

4 Chineke zigara ọtụtụ ọdụm n’ala ahụ, ha wee gbue ọtụtụ nime ha ime ka ha wee mụta ịtụ egwù Onyenwe anyị, 2 Ndi Eze 17:25-28

5 Ndị bi n’ala ahụ naatụegwù Onyenwe anyị, otú ọ dị, ha naefè kwa arụsị na chi niile nke ha, 2 Ndi Eze I7:29-41

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Iwe Megide Israel

Hoshea, bụ eze Israel chịrị ọchịchị arọ iteghete, ma ọchịchị ya jupụtara n’iheọjọọ. Nke a bụ iheàmà Hoshea rapụrụ mgbe ọ chịsịrị ọchịchị ya. Ọ bụ eze ikpeazụ nke Israel nwere, ma n’oge ọchịchị ya ka ndị Israel, dịka otù mba na dịka otù gọvment naachịachị bụ ihe ndị Asiria bibiri. Mmehie alụzụwo ọlụ ya n’akụkọ ebo iri nke Israel ma mkpụrụ ahụ dị egwù nke akụwokwara nime arọ ndịa garaaga ka emere ka ha bịarue oge owuweiheubi. (Lee Jemes 1:15). Chineke enwewo ogologo ntachịobi zuruezu n’ebe Israel nọ, banyere nnupuisi ha na ikpere arụsị nke ndịnáadịghị ekpere Chineke ha nọgidesiworo ike nime ya. Ha ejegharịwo ijè ihe dịka narị arọ abụọ site na mgbe ekewara Israel na Juda, n’ụzọ nke ha onwe ha site n’ijisiike niile bụrụ kwa ndị edugharịworo site n’aka eze ọjọọ ha niile bụ ndi soro ọchịchọ na nzube ọjọọ nke onweha dị icheiche. Ma ugbu a ikpé nke Chineke dị nso.

Hoshsea gbopụrụ ihe ahụ nke náaghaghị ịdakwasị ya, na nwa oge, site n’ịbụ orù nke Shelmanesa. Otú ọ dị, ọ dịghịanya tutu Shelmanesa bụ eze Asiria amata na Hoshea naagba izu megide ya; n’ihi nke a ewee kpọchigide Hoshea n’ụlọmkpọrọ, ma nọchigide Samaria gburugburu. Ọ dịghị kwa nlata dịrị Israel site na ndọta n’agha nke adọtara ha, n’okpuru ọchịchị akaike nke ndị Asiria. Nnagide Chineke nke mmehie Ụmụ Israel abịaruwo n’isi njedebe, ndị Asiria wee bụrụ ngwa ọlụ nke Chineke ji mee ka Israel mara ihe ụfụ nke iwe Ya.

Amụma nke Aisaia wepụtasịrị eziokwu a náenwuenwu: na Chineke jiri obodo dị ichè náamaghị Chineke wetara ndị Israel ịta ahụhụ na iheotiti. Edewo ya sị: “Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n’aka ka ọ bu kwa n’aka-ha , bú oké iwem! Imegide mba emeruru emeru ka M’nēziga ya, banyere ndi nke nrubiga-ókè iwem ka M’nēye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n’agha, na iluta ihe nluta n’agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke ézì” (Aisaia 10:5, 6).

Site n’oge Moses ha enweworị ịdọakanántị dị nrò na ọbụbụọnụ nke Chineke gaadakwasị ha, ma ọ bụrụ na ha échègharịa site n’ezi òfùfè nke Chineke, wee fee arụsị. Ịdọakanántị ahụ bụ: “JEHOVA gēsi n’ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bu mba nke i nānugh asusu ya; mba nke nwere iru di egwù nke nāhugh okenye iru-ọma, nke nēmegh kwa nwata amara” (Deuteronomi 28:49, 50).

Apụrụrị ikwu na ndị Asiria bụ ụdị Satan. N’oge ochie, amatara ndị Asiria dịka mba jọkarịsịrị ibe ya ná njọ na ndị na enweghị obi ebere. Nke a n’ezie bụ ụdị omume Satan, onye bụ óké onyeisi ndịiro nke ụmụmmadụ. Mgbe ọ bụla Chineke sitere na amamihe ná enweghị ọgwụgwụ kwenye, ekwensu gaebili megide ndị nke Chineke site n’óké mkpagbu jọgburu onwe ya. Ihe banyere Job bụ ihengosi pụtara ìhè banyere mmegide nke ekwensu. Chinke na ekwnye kwa ka ekwensu weta ụfọdụ ihe ọjọọ dịka ikpé ziriezi megide mmehie. Otú ahụ ka o siri dị n’ebe Israel nọ. Ọ bụrị ihe dị nime obi ndị Asiria ibibi mba ahụ bụ Israel, ma Chineke kwenyere ka ha mee otú ahụ n’ihi nnupuisi na nguzogide megide Chineke nke Israel nọgideworo nime ya ogologo oge. “Ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.” (Gụọ Ndi Rom 13:1-6). Onyenwe anyị ekwuworị nime Okwu Ya sị: “Le Mu onwem ekèwo uzù nke nāfu ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi” (Aisaia 54:16).

Amaokwu a nke si nime akwụkwọnsọ, náarụghịukà, nwekwara nkọwa nke a nime ya, na ekwensu bụ óké onye mbibi nke ihe niile ekèreèkè, nọ kwa n’okpuru ọchịchị nke Chineke ime ihe ọ bụla nke Chineke hụrụ na ọ dị mma ka ewere ya bokwasị ya. N’otùaka ahụ, Chineke pụrụ iji àtụmààtụ ọjọọ niile nke ekwensu mee ka àtụmààtụ nke Ya onwe ya na ikpé Ya pụta ìhè, dịka O kwenyere ka ndị Asiria merie ndị Israel.

Ọbụná mgbe amamikpé Chineke bịaruru Israel nso, Chineke pụkwara ịnapụta Israel site ná mmegide dị egwù nke ndị Asiria na ịbụ ndị adọtara n’agha nke náeso ya ma asị na ha chègharịa site ná mmehie ha niile wee chọ iru Chineke wee rịọ arịrịọ ebere. Ọ bụ ezie na Chineke zigara ndị amụma Ya ịdọ ha akanántị, ma ha échègharịghị. “JEHOVA we gbara Israel àmà, gba-kwa-ra Juda, site n’aka onye amuma ọ bula na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, sinu n’uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M’nyere n’iwu, na ukprum nile dika iwu ahu nile si di nke M’nyere nna-unu-hà n’iwu, nke M’zite-kwa-ra unu n’aka ndi-orùm, bú ndi-amuma.” Ha jụrụ ịdọaknántị nke Chineke, amamikpé wee dakwasị ha. “JEHOVA we wesa Israel iwe nke uku, si n’iru-Ya wezuga ha: ọ digh ndi fọduru, nāgugh ebo Juda, nani ya” (2 Ndi Eze 17:13, 18).

Mmehie Nzuzo

Ọtụtụ ihe kpatara iwe Chineke megide Israel ka ekpughere nime iheọmụmụ a: “Umu Israel we were nzuzu me ihe nke nēzigh ezi megide JEHOVA, bú Chineke ha we wuere onwe ha ebe di elu n’obodo ha nile, site n’ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike.” N’ezie ọ bụ mmehie mere ka Ndị Israel kpue ìsì wee ghara ịmata na Chinke ha nọ n’ebe niile. Anya Chineke naahụzu ihe niile mmadụ naeme. Ọ matakwara ihe dị nime obi ụmụmmadụ. Apụghị izonarị Chineke mmehie, ọbụná ma eme ya nanzuzo. Chineke naamata ya dịka agaasị na emere ya n’ìhè. Onye dere Abù Ọma sịrị: “Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, we gbasapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi; Chineke agagh-egwuputa ala ihe a? N’ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi” (Abù Ọma 44:20, 21). Jisọs gwara ndị Israel sị: “N’ihi na ọ digh ihe ezoro ezo, ma-ọbugh ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ digh kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka ọ we puta ìhè” (Mak 4:22).

Ụwa hụrụ ọchịchịrị n’anya, ma Jisọs kwukwara banyere ụwa sị “Ma nka bu ikpé ahu, na ìhè ahu abiawo n’uwa, ma madu huru ọchichiri n’anya kama ìhè ahu; n’ihi na ọlu-ha jọrọ njọ” (Jọn 3:19). Ụmụmmadụ naèchè na dịka mmehie ha si bụrụ ihe zoroezo n’anya mmadụ ibe ha, na otú ahụ ka ọ pụrụ ịbụ ihe zoroezo n’iru Chineke.

Ọ bụrụ na ọ dị ka amamikpé nke dakwasịrị Israel siri ókéike, aghaghị icheta kwa na Israel na Juda abụrụwokwarị ndị agọziriagọzi karị ndị niile ọzọ nime ụwa a, ebe ọ bụ na ha bụ ndị Chineke rọpụtara ịbụrụ Ya ndị pụrụ ichè. Ejiri Eziokwu nke ndị nsọ mụnye, ha nime dịka ọkụ, ha matara òfùfè nke ezi Chineke dị ndụ, ezubeworị nye ha dịka mkwadobe nke Chineke si dị ịbụ ndị agọziriagọzi karị ndị ọzọ niile, iji mee ka ha onwe ha bụrụ kwa ngọzi nye ndị ọzọ. Ha jụrụ ihe niile ziriezi, ihe niile dị mma ihe niile dị ọcha, wee chọọ ihe ọjọọ na ajọomume nke omen’ala nke mba ahụ niile náamaghị Chineke dị ha gburugburu.

Óké ihe ọjọọ ha bụ na mgbe ha matara Chineke, bụ isiiyi nke ndụ na eziomume, ha wee gbakụta Ya azụ. Okwu nke Pita kọwara nkeọma omume nke ebo iri nke Israel ndị iweọkụ nke Chineke dakwasịrị: “N’ihi na asi na, mgbe ha gbanariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmezu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisọs Kraist, ewe tuhi ha ọzọ nime ihe ndia, meri kwa ha, we si n’ihe di nsọ ahu enyere n’iwu, nke enyere ha n’aka idebe, laghachi. Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n’ihe ọ gbọrọ, buru kwa nne-ezi nke chighariri ọzọ n’ituru n’apiti mgbe o sachasiri onwe-ya” (2 Pita 2:20-22).

Ka anyị bụ ndị matara eziokwu nke Chineke soro okwu niile nke Jọn onyeahụrụn’anya: “Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n’iyi, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù” (2 Jọn 8).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye bụ eze ikpeazụ nke Ụmụ Israel?

  2. 2 Gịnị mere Asiria ji bilie megide Israel?

  3. 3 Gịnị mere Chineke alụrụghị Israel ọgụ dịka O mewororị n’oge garaaga?

  4. 4 Gịnị mere Chineke ji wesaa Israel iwe?

  5. 5 Gịnị bụ ngwaọlụ nke Chineke jiri gosi iwe Ya?

  6. 6 Ònye bụ óké onye mbibi ahụ?

  7. 7 Chineke, Ò nyere ekwensu ọkara ebe ọ gaejedebe?

  8. 8 Àpụrụ izonarị mmehie n’iru Chineke?

  9. 9 Gịnị bụ mmehie nzuzo?