Ọlu Ndi-ozi 15:1-41; Ndi Rom 14:1-6

Lesson 333 - Senior

Memory Verse
“Esitere n’aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n’aka Jisọs Kraist bia” (Jọn 1:17).
Cross References

I Iwu ma ọ bụ Amara

1 Ndị ahụ naagbaso okpukpé ndị Juu gbalịrị iwere Iwu Moses kpugide Ndịmbaọzọ ahụ nke chègharịworo, Ọlu Nd-ozi 15:1; Ndi Galetia 1:6, 7

2 Pọl na Banabas apụghị ichipụ onweha site n’ụkpụrụ dị elu nke amara nke Kraist, Ọlu Ndi-ozi 15:2, Ndi Rom 10:4; Ndi Galetia 1:8-12

3 Otù ndị nọchịrị anya ha ka ezigara Jerusalem maka ajụjụ ahụ, Ọlu Ndi-ozi 15:2-5

II Nnọkọ nke Ndịozi na Ndịokenye ahụ dị na Jerusalem

1 Ndịozi ahụ na ndịokenye wee zukọta ịtule ajụjụ ahụ, Ọlu Ndi-ozi 15:6

2 Pita kwuwara ihe o kwere nke naekokwasi n’elu ihe niile o buworo ụzọ nwapụta nke bụ kwa dịka uche Chineke si dị, Ọlu Ndi-ozi 15:7-11; 10:44-48

3 Pọl na Banabas gosịrị ha ihe ebube niile nke Chineke naalụ n’etiti Ndịmbaozọ, Ọlu Ndi-ozi 15:12

4 Jemes tinyere ahịrị okwu nke ya wee chịkọta ntụpụta niile nke nzukọ ahụ, Ọlu Ndi-ozi 15:13-21; Ndi Rom 14:1-6

III Amara Zuruókè

1 Nnọkọ ahụ wee kpebie na Ndịmbaọzọ ahụ bụ NdịKraist nwere onwe ha site n’ebe Iwu Moses dị, Ọlu Ndi-ozi 15:22-29; Ndi Galetia 2:14-16

2 Edere akwụkwọozi wee zipụ ụmụnna ndị wegara ozi ahụ, Ọlu Ndi-ozi 15:23-33

IV Ijè nke Abụọ nke Mkwusanjégharị

1 Pọl zubeere ịrapụ Antọk ma gabiga rue obodo niile ọ gara nambụ, Ọlu Ndi-ozi 15:34-36

2 Banabas rọrọ ịkpọ Jọn Mak, o wee kuru ya ga Saiprọs, Ọlu Ndi-ozi 15:37-39

3 Pọl rọpụtara Sailas wee ga Siria na Silisia, Ọlu Ndi-ozi 15:40, 41

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

“Unu onwe-unu nākpọ isi-ala nye ihe unu nāmagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi-ala nye ihe ayi matara n’ihi na nzọputa si n’etiti ndi-Ju puta” (Jọn 4:22). Jisọs kwuru okwu nke onye Juu ọ bụla n’ewere ịnụọkụn’obi kwere, ọtụtụ ọgbọ agabigawo mgbe Chineke kwere Abraham onye okwukwe mkwà ahụ, “Agāgọzi kwa agburu nile nke uwa nime gi” (Jenesis 12:3).

Ọgbụgbandụ na Sainai

Mba Israel bụ nnọọ mpụtaìhè nke sitere nime na akụkụ mmezu nke mkwà Chineke nye Abraham. N’ugwu Sainai, Chineke na Ụmụ Israel gbarandụ; ha onwe ha, ná nzaghachị, nagidere Ọgbụgbandụ ahụ site n’obi ha niile dịka Moses gụpụtara ya nye ha. Akọwara ya n’ụzọ dị mfé ịghọta, ókù dị ukwuu dị kwa óké ebube nke Chineke kpọrọ Ụmụ Israel pụtara na Chineke chọrọ ka ndị Israel bụrụ otù mba dị nsọ na alaeze ndị nchụàjà -- àkụ dị ókéọnụ nye Chineke. Ha gaabụrụ Chineke ndị náejeozi nke Ọgbụgbandụ Ya ma kwusaa, maọbụ rita ụwa dum n’urù kpọbata kwa ha nime Ọgbụgbandụ nke Chineke gosịrị Ụmụ Israel onweYa n’ụzọ doroanya nke anaapụghị ichezọ. O nyere ha Iwu iri ahụ, nke ejiri mkpịsịaka Chineke dee n’elu mbadamba nkume ahụ, na iwu ụfọdụ nke Moses dere n’akwụkwọ. Chineke mere ka ndị Israel bụrụ ndị nlekọta na ndị náechébezi ihe niile nke Chineke zubere nye mmadụ, Ọ kakwara Ụmụ Israel akàrà dịka èzínaụlọ na ụzọ nke agaesi mezue Ọgbụgbandụ nke emere site n’aka Abraham n’ikpeazụ, emezuru ya nye ụwa niile site n’ọmụmụ nke Mesaia ahụ.

•kpụrụ niile nke Chineke doro Ụmụ Israel n’usoro n’Ugwu Sainai wee bụrụ ihe amara dịka Iwu nke Moses n’ihi na Moses bụ ihe ọlụ nke Chineke jiri nyefe Iwu ahụ n’aka Israel, ma eziokwu Iwu ahụ bụ nke Chineke. N’ịmụgharị ihe banyere Iwu ahụ na oge nke enyere ya, mmadụ gaekwenye na náánị Chineke pụrụ ịkpaliteworị ụdị usoro nke iwu eziomume dị otú a. Iwu ahụ webatara otù ụzọ nke ịdị ndụ na ifè Chineke òfùfè nye Ụmụ Israel nke na ọ dịghị mba ọzọ maliteworo ịbịa nso ya. Iwu ahụ bụ mkpughe Chineke dị ukwuu karịa otú esi nye ya na mbụ, site kwa n’Iwu ahụ Ụmụ Israel mụtaara ihe Chineke chọrọ n’aka ha ka O wee nara òfùfè nrò ha nkeọma.

Nzube nke Iwu ahụ

Iwu ahụ maramma dị kwa ebube n’ihi na ọ tụrụ aka banyere Àjà ahụ zuruòkè nke náabịa, bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraist. Chineke zubere ka Iwu ahụ bụrụ ụzọ iheọmụmụ n’ụdị ya nye Ụmụ Israel -- ọ bụghị na Iwu ahụ n’onwe ya pụrụ iweta nzọpụta. “Ya mere iwu ahu aghọwo onye òzízí-ayi ikuru ayi biakute Kraist, ka ewe site n’okwukwe gu ayi ná ndi ezi-omume” (Ndi Galetia 3:24). “N’ihi na iwu ahu, ebe ọ nwere nání onyinye nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bugh ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apugh ime ka ndi nābiaru ha nso zue ókè mgbe ọ bula, site n’otù àjà ndia nke ha nēche n’iru Chineke kwa arọ mgbe nile … N’ihi na ọbara nke óké-ehi na ewu apugh iwepu nmehie” (Ndi Hibru 10:1, 4).

N’eziokwu enwere ụfọdụ iheatụ pụtara ìhè nke ndịeziomume n’okpuru Iwu ahụ -- mmadụ ndịazọpụtara ma dokwa ha nsọ; ma eziomume ha esiteghị n’ọlụ dị icheiche nke Iwu kama site n’okwukwe ha nwere na Chineke na nrubeisi n’okwu Ya. “Oge gagwunarim ma ọ buru na akọm akukọ banyere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi amuma: ndi sitere n’okwukwe lugbu ala-eze, lu ọlu ezi-omume, nata nkwà di iche iche, kpuchie ọnu ọdum, … ndia nile, ọ bu ezie na agbara ha àmà site n’okwukwe-ha, ma ha anatagh nkwà ahu, n’ihi na Chineke buru uzọ leputa ihe ka nma banyere ayi, ka aghara ime ka ha zue òkè ma asi na ayi anọgh ya” (Ndi HIbru 11:32, 33, 39, 40).

Oge nke Onyinyeamara

“Ihe ka nma” ahụ nke Chineke kwadobere nye anyị bụ Oziọma nke Jisọs Kraist. Ọtụtụ ugbò ka Akwụkwọnsọ kwururị banyere ụbọchị ahụ nke Onyenwe anyị gaemeghe ọnụụzọ nke amara ahụ nye ụwa niile. “Le mba nke i nāmagh ka i gākpọ, mba nke nāmagh gi gāgbakute kwa gi, n’ihi JEHOVA, bú Chineke-gi, ọbuná n’ihi Onye Nsọ nke Israel; n’ihi na ọ mewo ka i ma nma” (Aisaia 55:5).

Ọmụmụ nke Jisọs Kraist bụ Mesaia ahụ karàakàrà mmalite nke oge ọhụụ nime mmeso nke Chineke náemeso mmadụ -- oge nke Amara. Oge abịaruwo mgbe azachapụsịrị ihe ochie niile gafesịa kwa ịkpàókè niile, ewe wetara mmadụ niile Amara nke Chineke. Jisọs gwara nwanyị Sameria ahụ: “Oge hour nābia, mgbe unu nāgagh-akpọ isi-ala nye Nnam, ma-ọbu na Jerusalem … Ma oge hour nābia, ugbu a ka ọ di kwa, mgbe ndi nākpọ isi-ala n’ezie gākpọ isi-ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n’ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi-ala nye Ya” (Jọn 4:21, 23). Ọ dịghị kwa mkpà ka enwe ndị nchụàjà nke ụwa ọzọ; òfùfènrò nke anaanara nkeọma esiteghị kwa nime ememe n’Ụlọuukwu Chineke; esiteghị kwa n’ịchụàjà nke ụmụ anụ maọbụ ememe dị icheiche enweta iruọma maọbụ mgbaghara mmehie n’aka Chineke. Obi eziokwu ọ bụla, site ná mba ọ bụla, pụrụ ịbịakwute Chineke site n’okwukwe nime Jisọs Kraist na ezi nchègharị site ná mmehie ya ma nata ịgbààmà ahụ nime obi ya na anụwo ekpere ya ma gbaghara kwa mmehie ya niile.

Ọgbụgbandụ Ọhụụ

Chineke mere ka Ọgbụgbandụ ọhụụ ahụ guzosieike ka ewe mezue Ọgbụgbandụ ochie ahụ, ebe atọworo ntọala nke Ọgbụgbandụ ọhụụ ahụ bụ site na ntọala ụwa. Ịkwụụgwọ ukwu ahụ nke Ọgbụgbandụ ọhụụ ahụ bụ ihe ahụ nke duru Onyenwe anyị gaa n’obe nke Kalvarị mee ka akpọgide Ya n’obe n’ebe ahụ, ka ewe site n’Ọbara nke awụsịrị, site ná ndụ Ya nke enyebigara, pụ ime Ọgbụgbandụ -- ọ bụghị náánị Ya na ndị Juu kama Ya na mmadụ niile n’otù n’otù -- bú ụzọ nke ha na Chineke pụrụ isi dị n’udo.

Ọgbụgbandụ ahụ bụ maka ime àkwàmmiri n’ebe mmehie mere ka olulu dị n’àgbàtàabụọ nke kewapụrụ mmadụ n’ebe Chineke nọ. Náánị ụzọ nke apụrụ iji mee àkwà nke ngabiga bụ site n’ụgwọ nke Jisọs kwụrụ, Ọbara ahụ nke Ọ wụsịrị, àjà ahụ nke O nyere, Mkpuchi mmehie nke O mere nke site na ya mmadụ na Chineke gaadị n’udo. Ọ bụ ihe dị ebube na Chineke kwadoro ụzọ nke agaeji merie mmehie ma laghachịkwute kwa Chineke; ma, karịsịa ihe ndịa, apụrụ ịkụ ịhụn’anya nime obi -- ịhụn’anya nye Chineke, ịhụn’anya nye mmadụ ibe anyị. Iwu nke ịhụn’anya bụ iwu ọhụụ ahụ n’okpuru oge onyinye Amara.

Iwu na Amara

Iwu ahụ siriike nke ukwu n’ọchịchọ ya maka nrubeisi. “Onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma su ngọngọ n’otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara” (Jemes 2:10). “Gi emekwala” bu ihe mgbakwasị ụkwụ nke ihe enyere n’Iwu ahụ, Ụmụ Israel wee site n’ihe enyere n’Iwu ahụ mụta na mmehie bụ mmebiiwu dị ukwuu (Ndi Rom 7:13). Mee maọbụ nwụọ bụ mmụọ nke Iwu ahụ.

“Dika Moses weliri agwọ n’ọhia, ọbuná otú a aghagh iweli Nwa nke madu elu: ka onye ọ bula nke kwere we nwe ndu ebigh-ebi na Ya” (Jọn 3:14, 15). Ụmụ Israel ndị ná anwụanwụ lekwasịrị agwọọla ahụ nke dị n’ọzara anya wee dị ndụ. N’otùaka ahụ, ndị mmehie ná anwụanwụ pụrụ ilegide Ọkpara Chineke akpọgidere n’elu obe anya wee chọta ndụ; ya mere, lee ka ị dị ndụ bụ okwu ichénché nke Oziọma. “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa” (Jọn 1:29).

Ọtụtụ ndụmọdụ nke Iwu, otú ọ bụla ịdị elu ya ra, daraada n’ala n’ebe ọkọlọtọ nke Jisọs guzobere dị. Iwu ahụ bụ onyinyo nke eziihe gaje ịbịa, ma mgbe ihe ahụ nke zuruòkè nke Oziọma dị nime Jisọs Kraist nwupụrụ, onyinyo ahụ gbapụrụ. Iwu ahụ kwuru, “Anya lara anya, ézé lara ézé;” ma Jisọs nyere iwu, “Onye ọ bula nākpu gi ura na nti aka-nri, tugharia-kwa-ra ya nti ọzọ” (Matiu 5:39). Iwu ahụ kwuru sị, “Gi akwala iko;” ma Jisọs weliri ọkọlọtọ ya elu karịa: “Ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwayi anya ka agu ya we gua ya, o kwasiwo ya iko n’obi ya ugbu a” (Matiu 5:28). “Unu nuru na agwara ndi ochie , si Egbula madu; ma onye ọ bula nke gburu madu gēnye onwe-ya n’aka ikpé: ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n’aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n’aka nnọkọ ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, onye nzuzù, gēnye onwe-ya n’aka ọku ala-mọ” (Matiu 5:21, 22).

Ezinleruanya n’ọmụmụihe nke edere n’Akwụkwọnsọ gaegosi na Iwu Iri nke Agba Ochie ka emere ka ha guzosieike karịa nime Agba Ọhụụ n’ụzọ dị elu náabụghị dịka na Agba Ochie, ma ewezuga Iwu nke Anọ. Ọ dịghị ebe ọ bụla nime Agba Ọhụụ emesiri iwu nke Ụbọchịizuike ndị Juu (Sabbath) ike.

Ịrụụkà (maọbụ) Esemokwu

Ọ bụrịị ihe náesikarị Ndị Israel ike ịmata na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’iru. Ọtụtụ nime ndị Farisii, na ndị náesoụzọ Kraist ndị akpọbatara n’oge Ndịozi, dabere na nchèkwube na nzọpụta sitere ma bụrụkwa nke ndị Juu náánị. Ha lere Ndịmbaọzọ anya dịka ndị náamaghị Chineke, ndị náenweghị kwa olileanya n’ụwa nke a maọbụ n’ụwa nke gaje ịbịa, karịa kwa ma ha bụ ndị Juu ma nara kwa iwu nke náachị ndị Israel. “Ufọdu nime irọ-òtù ndi Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghagh ibi ha ùgwù na, inye ha iwu ka ha debe iwu Moses” (Ọlu Ndi-ozi 15:5).

Pọl na Banabas ndịisi ụkọ nke Oziọma nye Ndịmbaọzọ, apụghị ịkwagide ụdị òzízí a maọlị, n’ihi na ha ahụwo igwè Ndịmbaọzọ ndị bịaruru Chineke nso site n’ezi nchègharị wee nata mgbanwe nke ndụ n’ihi ọzịzá ekpere ha. Ewere ajụjụ ahụ gaa Jerusalem, ka Ndịozi na ndịokenye nọ n’ebe ahụ wee dozie okwu ahụ.

Mmụọ nke Nduzi

Ndịozi na ndịokenye ahụ, ndị Mmụọ Nsọ náedu matara na emezuwo Iwu ahụ nime Kraist na ọdịkwaghị irè. “Ayi nuru na ufọdu ndi siri n’etiti ayi pụa were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi unu, nasi, Aghaghi ibi unu ùgwù, we debe kwa ihe enyere n’iwu: bú ndi ayi nēnyegh ihe ọ bula n’iwu: … Ya mere ayi ezitewo Juda na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu n’otù ihe ndia n’okwu ọnu. N’ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ kari ihe ndia di nkpà: ka unu rapu ihe nile achuru n’àjà nye arusi, na ọbara, na anu anyagburu anyagbu, na ikwa-iko” (Ọlu Ndi-ozi 15:24, 17-29). Ha kwubiri na obibi ùgwù adịghị mkpà. Ọ dịghị ihe ha kwuru banyere idebe ụbọchị nsọ niile, n’ọnwa ọhụụ, maọbụ Ụbọchị Izuike; maọbụ ikwu ihe banyere iri anụ na erighi anụ ma ọbụghị iwezuga onweanyị n’anụ nke achụrụ n’àjà nye arụsị.

“Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpe unu n’oriri, ma-ọbu n’ọñụñụ, ma-ọbu n’okwu n’ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike: nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist” (Ndi Kọlọsi 2:16, 17). “Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bụla nēkwuzu n’ime uche nke aka ya. Onye nātukwasi uche na ubọchi na atukwasi uche ya n’ebe Onye-nwe-ayi nọ: Onye nēri kwa, nēri n’ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādigh eri, ọ nēkele kwa Chineke” (Ndi Rom 14:5, 6). “Ugbu a atọpuwo ayi n’iwu ahu ebe ayi nwuru n’ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n’idi-ọhu nke Mọ Nsọ ọ bugh kwa n’idi-ochie nke ihe edeworo n’akwukwọ” (Ndi Rom 7:6). Ndịa bụ ebe olenaole nke ọtụtụ ebe n’Akwụkwọnsọ nke náegosi ụzọ Eziokwu ahụ nke dị nime Jisọs ji nọchie Iwu nke Moses n’ụzọ anaapụghị ịgbanwe.

Ònye doziri ajụjụ ahụ? “Ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma.” Mmụọ nke Chineke jègharịrị nime obi ndị ọchịchị nke nzukọ -- ha niile nọkọrọ n’otù obi -- wee kọwapụta nzube Chineke nke Ọ kàrà akàrà site na ntọala nke ụwa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ndị bụ ndị ahụ náeso ụkpụrụ omen’ala ndị Juu? Gịnị bụ kwa òzízí ha?

  2. 2 Gịnị mere Pọl na Banabas apụghị ikwenyere ha?

  3. 3 Gịnị bụ òzízí ahụ nke Pọl na Banabas kwusara?

  4. 4 Òlee ụzọ esi dozie ajụjụ ahụ?

  5. 5 Gịnị bụ mweliaka elu nke Pita banyere ajụjụ ahụ?

  6. 6 Òlee ụzọ Pọl na Banabas si nye aka idozi ajụjụ ahụ?

  7. 7 Ònye chịkọtara ma kwubie okwu niile nke ndịokenye ahụ?

  8. 8 Òlee ihe nzukọ ahụ mụpụtara?