Ọlu Ndi-ozi 16:9-40

Lesson 334 - Senior

Memory Verse
“Ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe Ọ nēzube si di” (Ndi Rom 8:28).
Cross References

I Òkù Akpọrọ Pọl Igaru Masedọnia

1 Nime ọhụ otù nwoke onye sịrị: “Gabita na Masedọnia, nyere ayi aka,” Ọlu Ndi-ozi 16:9

2 Pọl na Sailas nupuru ụgbọ ha rue Mesedọnia wee do òfùfè nrò n’usọ óké-osimiri, Ọlu Ndi-ozi 16:10-13

3 Lidia lere Pọl na Sailas ọbịa, Ọlu Ndi-ozi 16:14, 15; I Timọti 5:10; Ndi Hibru 6:10

II Ha Nwere Mwuta n’ihi Nwaagbọghọ ahụ Mmụọ Náadịghị Ọcha Naesogbu

1 Ọ naewetara ndị ya ọtụtụ urù site n’ibu amụma ụgha, Ọlu Ndi-ozi 16:16

2 O soro Pọl, n’etimkpu, “Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe niile elu,” Ọlu Ndi-ozi 16:17

3 Pọl chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nime ya, Ọlụ Ndi-ozi 16:18

4 Ndị nwe ya, ebe ha hụrụ na olileanya nke urù ha alawo ha wee jide Pọl na Sailas, Ọlu Ndi-ozi 16:19

III Ndịikpé ahụ Tiri ha ihe ma Tụ kwa ha Mkpọrọ

1 Eboro Pọl na Sailas ebubo n’iru ndịikpé ahụ, Ọlu Ndi-ozi 16:20, 21

2 Ndịikpé ahụ dọwara uwe ndịkom ahụ eboroebubo nye kwa iwu ka apịa ha ụtarị, Ọlu Ndi-ozi 16:22, 23

3 Atụbara ha nime ime nke ụlọmkpọrọ, Ọlu Ndi-ozi 16:24

IV Ekpere na Otuto na Óké Alaọmajijiji

1 Ha fere òfùfè nrò nke ekpere na abùotuto mgbe ụkwụ ha nọ n’ọtọsị, Ọlu Ndi-ozi 16:25

2 Óké alaọmajijiji bịara, ọnụụzọ ụlọmkpọrọ niile meghere, agbụ ndịmkpọrọ tọpụkwara, Ọlu Ndi-ozi 16:26

3 Onyenche ụlọmkpọrọ ahụ gbalịrị igbu onweya ma Pọl gbochiri ya, Ọlu Ndi-ozi 16:27, 28

4 Azọpụtara onyenche ụlọmkpọrọ ahụ na ndị ụlọ ya ewe lekọtazie ndịmkpọrọ ahụ anya nkeọma, Ọlu Ndi-ozi 16:29-40

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Njèm Mkwusanjégharị Abụọ nke Pọl

N’oge iheọmụmụ anyị a Pọl nọ na njèm nke abụọ nke mkwusanjégharị ya. O jewo kwa ọtụtụ obodo ebe ya na Banabas kwusara Oziọma ma mee ka ọtụtụ nzukọ guzo na njèm nke mbụ ya. Banabas esoghị Pọl na njèm nke abụọ nke a, kama ọ gara Saiprọs bú obodo ya. Pọl wee kuru Sailas dịka onyeinyeaka ya, ma tụkwasi n’igazu ebe niile o jeworo na njèm mbụ ya, ọ gabigara Siria na Silisia, náagba nzukọ ndịa ume. Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ wee gaa n’ụzọ ugwu na ọdịdaanyanwụ rue Galetia na Misia. Pọl zubererị ịga ụzọ ugwu rue Bitinia, ma Mmụọ nke Onyenwe anyị wee sị É-è, ya mere ha wee bịarue Troas, ọ bụ kwa n’ebe ahụ ka Pọl hụrụ ọhụ nke duru ya site na Esia rue Yurop (Europe).

Ókù Ahụ nke Si na Masedọnia Bịa

Ugbò abụọ ka Mmụọ nke Chineke gbochiri Pọl ịbami nime Esia, nke mere na ọ bịara na Troas náatụle banyere ebe Onyenwe anyị chọrọ ka ọ gaa. Ma emeghị ka ọ nọ ná mgbagwojuanya ogologo oge. Nime ọhụ nke abalị, otù nwoke onye Masedọnia guzoro n’iru ya wee sị: “Gabita na Mesedọnia, nyere ayi aka.” Chineke mara na ọtụtụ mkpụrụobi ndị sitere na Mba Gris (Greece) jikere ịnabata Oziọma ahụ. Site n’ụbọchị ahụ rue taa, òkù nke “Masedọnia” ahụ naada ná ntị ndị naezisa Oziọma, ime ka akpọta mmụọ ha.

Ọ bụ nnọọ ihe pụtara ìhè na Mmụọ Nsọ nọ n’eduzi ndị mkwusanjégharị mbụ ahụ jere ala Yurop nkeọma. Anyị naadị ndụ ugbu a n’ihe ra ka puku arọ abụọ site n’oge ahụ ma Mmụọ Nsọ ahụ n’eduzi kwa ọlụ nke ezi ndị mkwusanjégharị na ndị nlekọta ahụ taa.

Oge ọhụụ naamalite kwa n’ọlụ oziọma nke Pọl. Òkù nke Masedọnia ahụ gosịrị mkpà dị omimi nke Oziọma ahụ dị nye ndị bi nime obodo ahụ na njikere nke dị n’obi ndị ahụ ịnara ya.

Kristian Mbụ Sitere na Yurop

Ndịmkwusanjégharị mbụ nke jere Yurop gara rue Filipai nke bụ isi obodo n’akụkụ nke mba ahụ. O do kwara anya nkeọma na ọ dịghị ọtụtụ ndị Juu nọ n’ebe ahụ. Ma ahụrụ Pọl na onyeòtù ya n’azụ obodo ahụ n’akụkụ osimiri n’ụbọchị Izuike mbụ ebe ha chọrọ ikpeekpere. N’ebe ahụ ka ndịnyom olenaole gbakọrọrị; ụfọdụ bụ ndị Juu ma ndị ọzọ bụ ndị náeso omen’ala niile na okpukpé nke ndị Juu.

Pọl na Sailas nọdụrụ ala wee gwa ndịnyom ahụ okwu. N’ihi otú ọnọdụ ebe ahụ si dị, ọ gaabụ nnọọ òfùfènrò dị mkpirikpi, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otù nwanyị n’etiti ndị ahụ gbakọrọ nwere obi nke agụụ naagụ. O meghere obi ya nye eziokwu ahụ. O wee bụrụ onyembụ zara òkù nke Oziọma mgbe akpọsịrị Pọl òkù nke Masedọnia ahụ. Ndịụlọ ya niile nara Oziọma nke Ọgbụgbandụ ọhụụ ahụ. Pọl gaeziwo harị oziọma banyere ọwụwụmmiri nke mmiri tinyere okwu ọ gwara ha n’ụtụtụ ahụ, n’ihi na awụrụ Lidia na ndị ụlọ ya niile mmiri. Ngwangwa Lidia wee chọ ka ndịozi Kraist ndịa bịa nọdụ n’ụlọ ya. O wee rugide ha rue mgbe ha kwere ịga. Ọ makụrụ okpukpé Ndị Kraist, wee n’emezu kwa iwu nke ịhụn’anya bụ nke Jisọs kwusara -- ịhụn’anya n’ebe ndịozi Chineke na ndị nke Ya nọ -- náakpadoro onweya ntọala ọma nye oge gaje ịbịa (I Timọti 6:19). Akwụkwọnsọ sịrị: “Unu echezọla ile ndi-ọbia nke-ọma: n’ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbia nāmagh-ama” (Ndi Hibru 13:2).

Ọtụtụ Mkpagbu

Ọlụ nke ndị mkwusanjégharị ahụ agaghị agaworị n’iru n’enweghị nguzogide chere ha iru. Ekwensu dị aghụghọ n’omume ya mgbe ọ naagbalị ka ọ kwatue ọlụ nke Chineke. Ọtụtụ oge n’ewere okwuụgha nke ejiri eziokwu ụfọdụ kechie, ịgbalị iduhie. Otù nwa agbọghọntà soro Pọl na Sailas, n’etimkpu, “Madu ndia bu ndi-orù Chineke Onye kachasi ihe nile elu, ndi nēkwusara unu uzọ nzọputa” (Ọlu Ndi-ozi 16:17). Ọ bụrị eziokwu, ma ịgbáàmà nke onye nwere mmụọ ọjọọ mata onyeozi ahụ na onyeòtù ya ka ewe site n’ụzọ dị otú a gbochie ọlụ ahụ nke Chineke ji ha abụọ naalụ. Ihe wutara Pọl bụ ụdị mmụọ ahụ nke o ji kwue okwu ahụ. Ọ bụ otù mmụọ ahụ ka nwoke ahụ nwere mmụọ ọjọọ onye náanọ n’ebe anaelì ozù nwere mgbe ọ hụrụ Jisọs.

Iwu ahụ sịrị: “Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bú JEHOVA, bú Chineke unu” (Levitikọs 19:31). Mmekọrịta niile nke mmadụ na ndị náajụ mmụọ ihe, ndị mgbasị, maọbụ ndị naeke eluigwe bụ ihe megidere iwu Chineke. Chineke kpọrọ ya asị, n’ihi na o sitere n’aka ekwensu. Mmadụ ịgbalị ka ọ chọpụta site n’aka ndị dibịaafa na ndị náajụpụta mmụọ ihe banyere ihe nke Chineke náachọghị ikpughere anyị bụ mmehie megide amamihe Ya. Site n’amara Ya dị ukwu Chineke ezonarịwo mmadụ amamihe dị ukwu banyere ọdịn’iru wee nye olileanya n’ọnọdụ nke ahụ.

Pọl chụpụrụ mmụọ ahụ náadịghị ọcha site na nwanyị ahụ, nke a wee kpasue ndị nwe ya. Ohere ha nke inweta ego site na mmụọ ọjọọ ya agabigaworị. Ya mere ha jidere Pọl na Sailas wee kute ha n’iru ndịikpé. Ndịikpé ahụ nụrụ ebuboeboro Pọl na Sailas ma ha ekpeghị ha ikpé -- ohere nke ikpé ọnụ ha -- nke bụ ihe megidere iwu náekwesịghị ka ndị Rom mee. Mgbe apịasịrị ha ọtụtụ ubè ụtarị, ndịisi ahụ wee tụba ndị nke Chineke ahụ nime ụlọmkpọrọ wee nye onyenche ụlọmkpọrọ ahụ iwu ka o dobesie ha, ya onweya, n’ihi nke a, debere ha nime ime nke ụlọmkpọrọ ahụ wee chịrị ụkwụ ha tinye nime ọtọsị.

Òfùfè nrò nke Ekpere na Abụ

Ọ dịghị abụ ihe dị mfé mgbe niile mmadụ ịbụ abụ nime etiti abalị nke ọnwụwa anyị. Ọtụtụ oge ibú gaadị ka ọ dị arọ karịsịa obúbú. Ma Jisọs ekwewo mkwà ibu ibú anyị. Pọl na Sailas kpereekpere wee buru ibú ha tụkwasị na Chineke. Onye sịrị, “M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli.” Mgbe ha naekpeekpere, óké ọñụ wee jupụta nime obi ha nke mere ka ha busie abùotuto ike nye Chineke.

Ndịmkpọrọ ọzọ nụrụ abụ nke óké ọñụ ahụ. Lee otú ọ gaesi gbagwoju ndịmkpọrọ ahụ anya mgbe ha tetara n’etiti abalị site n’olu ekpere na abụ nke ndị ọbara naagbapụta site n’azụ ha ndị ewerewokwara ụkwụ ha tinye n’ọtọsị, ọ gaghị abụ ihe ijuanya nye ndịmkpọrọ ahụ ma asị na ha nụrụ isùude na iduikwù, ma ekpere na ịbụabụ ihe ha náeleghịanya ya. Ekpere na abụ ahụ mere ka Eluigwe rulata ala wee gee ntị. Namberede ụlọmkpọrọ ochie ahụ mara jijiji ọbụná rue na ntọala ya. Ọnụụzọ niile wee meghepụ, agbụ nke ndị mkpọrọ niile tọpụkwara. Ihe dịka nke ahụ emetụbeghị n’ụlọmkpọrọ nke Filipai. Ike nke Chineke gaabụworị ihe dị ukwu, n’ihi na ọ dịghị otù onyemkpọrọ nke chọrọ ịgbapụ.

Nzọpụta nke Onyenche Ụlọmkpọrọ ahụ

Alaọmajijiji kpọtere onyenche ụlọmkpọrọ ahụ onye, mapụtara site n’ákwà ndina ya, hụ ọnụụzọ niile nke ụlọmkpọrọ ka ha ghereoghe. “Dika iwu ndi Rom si di, onye-nche ulọ-mkpọrọ ahụ gānara (ma-ọbu aghagh inara) ahuhu ahu nke diri ndi-mkpọrọ ahu gbapuru agbapu site nēlezigh anya-ya.” Ọtụtụ mgbe onyenche ahụ naewepụ ndụ ya karịa onyeozi govment gaegbu ya. Ebe o chere na ndịmkpọrọ niile agbapụsiwo, onyenche ụlọmkpọrọ ndị Filipai a itili gbakwara, ìhè ntà dị si n’oghere ọnụụzọ ndịa meghere emeghe nke Pọl jiri chọpụta ihe onyenche ụlọmkpọrọ ahụ chọrọ ime, o wee tie mkpu, “Emerula onwe-gi aru: n’ihi na ayi nile nọ n’ebe a.”

Amamikpé jigidere onyenche ụlọmkpọrọ ahụ. O wee chọ inweta nzọpụta ahụ nke Pọl na Sailas nwere. O wee kpọọ òkù ka eweta ọkụ wee were kwa ịmajijiji da n’iru ndịkom nke Chineke. O wee kupụta Pọl na Sailas n’ezi wee sị, “Ndi-nwe-ayi gini di nkpa kam’me ka ewe zọputa?” Nke a gaemeworị ka Pọl cheta maka ụbọchị niile nke o sogbuworo ndị nke Kraist. Onyenwe anyị ejidewo yarị n’ụzọ mgbe ọ naaga Damaskọs o wee tie mkpu, “Onye-nwe-ayi gini ka ị nāchọ ka m’me?:(Ọlu Ndi-ozi 9:6).

Ọzịzá nke enyere onyenche ahụ dị mfé: “Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọpụta kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulọ gi.” Onyenche ụlọmkpọrọ ahụ nọ n’obi amamikpé dị arọ n’ihi mmehie ya niile na nime omume nke gosiri na ọ pụrụ ikwere site n’ala obi ya. Ọ bụ ikwere site n’obi-okwukwe nke naanabata nrubeisi zuruòkè nye Chineke n’uju ya -- nke ahụ naeweta nnapụta nke ọmụmụọhụụ. Ọtụtụ mmadụ naewere náánị okpokoroisi nara eziokwu ahụ naeche na azọpụtawo ha, ma náánị nke ahụ apụghị iwetara ha ọmụmụọhụụ. Okwu Chineke sịrị: “Ọ buru na I gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agazọputa gi: n’ihi na anēji obi kwere rue ezi-omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa” (Ndi Rom 10:9, 10).

Lee abalị nke ihe ncheta dị otú a! Nke mbụ nzukọ ekpere ahụ, nke náeso ya bụ ịbụabụ, alaọmajijiji ahụ nzọpụta nke onyenche nke ụlọmkpọrọ ahụ na ndị ụlọ ya niile, ọsịsa nke ọnya náagba ọbara etipụtara Pọl na Sailas, ịwụmmiri, nke ikpeazụ òkèoriri ebe mmadụ niile were ọñụ náeto Chineke n’ihi nzọpụta Ya dị ukwu.

Nke a bụ agha nke ihe nke mmụọ dị ukwu nke mbụ na mmeri mbụ nke emeriwororo Chineke site n’aka ndị mkwusanjégharị abụọ ndịa n’ala Yurop n’oge mmalite nke Nzukọ Kraist. Yurop bụ ebe ebu ụzọ kwadobe ka ọ bụrụ ọgbọagha n’ihi ọtụtụ ịgbámgbá n’etiti ndịagha Ekwensu na nke Kraist anyị. Agha ahụ naaga kwa n’iru, ma otù ụbọchị ụfọdụ ndị nsọ egburuegbu gaeguzo ná mmeri n’elu ájá nke mbaukwu ahụ náefufe ọkọlọtọ sarambara nke Jisọs Kraist Eze ha. Ụbọchị ebube!

Mgbe arọ iri gwụsịrị Pọl dere Akwụkwọ Ozi ya dị ebube nye ndị Filipai nke naakọwa óké ịhụn’anya nke o nwere n’ebe Lidia na èzínaụlọ ya nọ, nye kwa onyenche ụlọmkpọrọ ahụ na ndị ụlọ ya, na n’ihi ndị ahụ niile azọpụtara na Filipai. O dere sị:

“Anamekele Chineke ná ncheta nile m’nēcheta unu,

“Mgbe nile n’arirịọ nile m’nāriọrọ unu nile nāriọ ahu nime ọ.ñụ,

“N’ihi nnwekọ unu nwekọrọ n’izisa ozi-ọma site n’ubọchi mbu rue ugbu a;

“Ebe m’tukwasiworo obim n’otù ihe nka, na onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisọs Kriast:

“Dika ọ ziri ezi ka m’tukwasi uchem n’ihe a banyere unu nile, n’ihi na enwerem unu n’obim ebe unu nile bu ndi nēsom n’inwekọ amara ma nime agbum ma nime ngopu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.

“N’ihi na Chineke bu Onye-ama nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n’obi-ebere nke Kraist Jisọs”

“Ya mere, umu nnam m’huru n’anya ndi agu unu nāgusikwam ike, ọñum na okpu-ezem, guzosienu ike otú a nime Onye-nwe-ayi, ndi m’huru n’anya” (Ndi Filipia 1:3-8; 4:1).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka okwu ahụ naapụta ma anyị sị òkù nke Masedọnia?

  2. 2 Òle ebe mbụ nke ekwusara Oziọma ahụ na Yurop?

  3. 3 Òle onye Yurop mbụ chègharịkwutere Kraist?

  4. 4 N’ihi gịnị ka ejiri tụọ Pọl na Sailas mkpọrọ?

  5. 5 Gịnị ka Akwụkwọnsọ kwuru banyere ndị dibịa afa?

  6. 6 Òle ebe ndịmgbasị ndịa naenweta ike ha?

  7. 7 Kwue otú esiri zọpụta onyenche ụlọmkpọrọ ahụ?

  8. 8 Okwu dị añaa ka ndị ikpé ahụ zigara Pọl na Sailas n’ụtụtụ echi ya?

  9. 9 Òle otú Pọl siri zaa onye ikpé ahụ okwu?

  10. 10 Kpọọ aha ihe asatọ dị mkpà nke mere n’abalị ahụ Pọl na Sailas nọ nime ụlọmkpọrọ.