Lesson 335 - Senior
Memory Verse
“Okwu nke obe buru ndi nāla n’iyi ihe-nzuzu, ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa ike nke Chineke” (I Ndi Kọrint 1:18).Cross References
I Na Teslọnaika
1 Ndịozi ahụ gabigasịrị obodo ntà abụọ wee bịarue Tesalọnaika na otù ụlọnzukọ, Ọlu Ndi-ozi 17:1
2 Pọl kwuru okwu Chineke nime ụlọnzukọ ahụ na Jisọs bụ Kraist ahụ, Ọlu Ndi-ozi 17:2, 3; 9:20
3 Olenaole nime ndị Juu na ọtụtụ ndị Grik kwere, Ọlu Ndi-ozi 17:4; I Ndi Tesalọnaika 2:13, 14
4 Ndị Juu náekwoekworo mere ka obodo ahụ tụọ ùzù, Ọlu Ndi-ozi 17:5-9
II Nnabata na Beria
1 Ezipụrụ Pọl na Sailas site na Tesalọnaika n’abalị ịgaru Beria, Ọlu Ndi-ozi 17:10; 9:223-25; Matiu 10:23
2 Ndị Beria nabatara Okwu Chineke nkeọma, Ọlu Ndi-ozi 17:11, 12; Matiu 13:16; Jemes 1:19
3 Ndị Juu sitere na Tesalọnaika bịara na Beria náakpali igwé mmadụ, Ọlu Ndi-ozi 17:18-21
III Pọl nime Atens
1 Mmụọ nke Pọl kpaliri n’ihi ikpere arụsị ahụ nke dị na Atens, o wee náagwa kwa ha Okwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 17:15-17
2 Ụfọdụ ndị náahụ amamihe n’anya kuuru Pọl jee n’ụlọikpé dị elu, Ọlu Ndi-ozi 17:18-21
3 Pọl kwuru nkeọma n’ezie banyere náánị otù ezi Chineke ahụ dị ndụ, Ọlu Ndi-ozi 17:22, 23
4 Ndị niile náakpọisiala nye Chineke aghaghị ịkpọisiala nye Ya nime mmụọ na eziokwu, Ọlu Ndi-ozi 17:24-29; Jọn 4:23, 24
5 Chineke naagwa mmadụ niile ka ha chègharịa, Ọlu Ndi-ozi 17:30, 31; Jọn 12:46-48; II Timọti 4:1
6 Ozi ahụ nke Pọl ziri na Atens mịrị mkpụrụ ntakịrị nke ahụrụ anya, Ọlu Ndi-ozi 17:32-34
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHENdị Mkwusanjégharị
Jisọs sịrị ndị náesoụzọ Ya; “Mgbe ọ bula ha sogburu unu n’obodo a, gbalaga n’obodo di iche” (Matiu 10:23). N’ezie Pọl, onye bú onye mkwusanjégharị na Onyeozi tinyere iwu a n’omume. N’ijèmkwusa nke abụọ nke a, Pọl na Sailas ejeworị nime Masedọnia n’ihi na ha nụrụ ọkpụkpọòkù nke Mmụọ Nsọ n’akụkụ ebe ahụ. N’obodo Filipai nke bú isi obodo nke Masesọnia, ọtụtụ mkpụrụobi nke agụụnaagụ nara Okwu Chineke nkeọma, ma ndịikpé na ọtụtụ ndị obodo ahụ chọrọ ka òtù NdịKraist a pụọ n’obodo ahụ. Ọ bụ ezie na ya na Sailas agafewo ọtụtụ mkpagbu nime Filipai, ma Pọl matara na Chineke akpọwo ha n’obodo a maka otù nzube.
Mgbe ha rapụrụ Filipai, ndịmkwusanjégharị a gabigara site na Amfipọlisi na Apọlonia ka ha wee bịarue Tesalọnaika, n’ihi na n’obodo ahụ ka enwere ụlọnzukọ nke ndị Juu. Dịka ọ naeme mgbe ọ bụla ohere dị, Pọl bara nime ụlọnzukọ ahụ wee gwa ndị Juu okwu site n’ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ. Isiokwu ihe Pọl naagwa ha mgbe dum bụ ihe banyere Kraist, maọbụ Mesaia, onye ndị Juu niile naele anya Ya. Pọl gosịrị site n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ na Kraist aghaghị ịhụ ahụhụ, wee nwụọ n’elu obe maka mmehie niile nke ụwa, na Ọ ghaghị kwa isi n’ọnwụ bilie maka ịgụ ndị niile kwere na Ya ná ndị eziomume. Náánị mmadụ olenaole n’etiti ndị Juu nke Tesalọnaika kwere n’Okwu nke ndị mkwusanjégharị ahụ bụ ndị Grik ndị náatụ egwù Chineke, na ndịnyom ndị bụ ndịisi nke obodo.
Nzukọ Kraist nke Ndị Tesalọnaika Ahụ
Ọ bụ ezie na ekwere ka Pọl na Sailas dọgbue onweha n’ọlụ náenwegh: mgbochi ọ bụla n’obodo Tesalọnaika n’ihe ra ka náánị izuụkọ atọ, ma Okwu ahụ gbara mkpọrọgwu n’obi nke ndị kwereekwe. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, mgbe ọ naedegara ndị ahụ na nzukọ ahụ akwụkwọ, bụ nke emeghererị site ná ndọgbụ n’ọlụ ha, Pọl sịrị na ha esiwo n’arụsị chigharịkwute ezi Chineke dị ndụ, na ha naechere kwa ọbịbịa nke abụọ Jisọs. Pọl sịkwara na Okwu nke Onyenwe anyị esiwo n’arụ ha dapụta ụda, ọ bụghị náánị na Masedọnia na Akaia, kama “n’ebe ọ bula okwukwe unu n’ebe Chineke nọ apụtawo ìhè” (Lee I Ndi Tesalọnaika 1:8-10).
“Satan we bia kwa.” Site ná mmalite nke oge ka ekwensu malitere iwebata onweya, n’oge ọ bụla na n’ebe ọ bụla ọ hụrụ na Okwu Chineke na nke eziomume naaga n’iru. Nke a bụ nnọọ eziokwu n’ebe ihe banyere Iso Ụzọ nke Kraist dị, n’ihi na ekwensu malitererị ibuso Alaeze nke Kraist agha site n’ọmụmụ Ya. Ekwensu matara na n’ikpeazụ Kraist na alaeze Ya gaemeri ekwensu na ndịozi ya niile mmeri ebighịebi. Jisọs sịrị, “Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na uwa nyem” (Matiu 28:18). Ọ bụ ezie na ọ naadị ka nzukọ Kraist naahụ ahụhụ n’ụzọ n’ezighịezi n’oge ụfọdụ, Chineke naahụzu ihe niile, Ọ mazukwara ihe niile. N’oge na n’ụzọ nke Ya, ọ gaeme ka mmegide ahụ kwụsị, mee kwa ka ọlụ a náaga n’iru dịka o kwesịrị.
Mkpagbu
Nime Tesalọnaika, ndị Juu náachọghị ikwere eziàmà nke Oziọma kworoekworo n’ihi ọgan’iru ahụ nke Pọl na Sailas nwere n’ebe ndị nke kwereekwe nọ. Ndị Juu ndịa kpọkọtara igwè mmadụ ndị náeguzo n’efu n’ọmaahịa wee malite iweta aghara, site nime ka obodo ahụ niile tụọ ụzụ. Ha chọrọ Pọl na Sailas n’ụlọ Jeson; ma ebe ha náachọtaghị ndị mkwusanjégharị a, ha dọkpụrụ Jeson na ụmụnna nime Kraist ụfọdụ ga n’iru ndịisi obodo. Ha tirimkpu sị “Ndia bú ndi kpùru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n’ebe a” (Ọlu Ndi-ozi 17:6). Ekwensu bụ onye kpùruri elu ụwa dum mmadu bi iru n’ọtụtụ arọ garaaga, mgbe o mere ka mmadu mehie site n’ọnwụnwa, ma n’ebe a ọ naachọ onye ọzọ nke ọ gaebo ịtaụta ahụ. Ndịozi ahụ naedozi ụwa n’ezie; ha onweha kwa, site n’ike nke Chineke, naedozi ihe ahụ nke ekpururị iru. Oziọma nke a naeme ka udo dị n’obi nke nwere mgbasasị -- óké ndajụ nye obi nke nwere ebili mmiri ná ndụ ya; o nyewo ndị náadọgbu onweha n’ọlụ na ndị ebowokwara ibu dị arọ izuike; ọ gwọwo arụ na mkpụrụobi nke mmehie ji aka mgbe ha bịakwutere Onyenzọpụta n’ezi nchègharị.
Ndị Juu nke Tesalọnaika ndịa mere ka ịtụ ụzụ dị n’obodo ahụ niile, ma ha tara ndị mkwusanjégharị nke Kraist ụta na ha naagbarù udo obodo náekpugharị kwa ụwa iru. Ha naekwu na ha naasọpụrụ, naedebe kwa ọchịchị nke Sisa, ebe ọ bụ ezie na onye ọ bụla nke bụ onye Juu n’ezie achọghị ịnọ n’okpuru ọchịchị nke ndị ala ọzọ. Ndahie na amamikpe n’ihi mmehie naeme ka mmadụ bụrụ onye naekekọ òkè n’ebe ndị ọ naachọghị ka ya na ha nọkọ. Omume na échìchè nke mmadụ enwebeghị óké mgbanwe site n’oge nke ndị Tesalọnaika, n’ihi na mmadụ nọ náachọpụta kwa ihengọpụ ha gaenye bụ ihe gbochiri ha ifè Jisọs Kraist. Ekwensu na ndị náekweghịekwe nke ụwa dị ka ha naeme ihe ọ bụla ha nwereike iji gosi na onye nke Krasit, na okwukwe ya abụghị ezie; ma mgbe anaakpagbu onye nke Kraist sieike, otú ahụ ka ìhè nke isoụzọ Kraist naamụwa karị, ewe mee ka ịma mma nke Oziọma ahụ pụta ìhè. Ọtụtụ ebubo ụgha ka eboworo okpukpé ndị nke Kraist, ma ọ dịghị nke achọpụtara bụ eziokwu nime ha. Ndịisi obodo mere ka Jeson na ndịọzọ nọ n’aka mbe, mgbe emesịrị, ha rapụrụ ha ka ha laa; n’ihi na ọ dịghị nnọọ mmebiiwu ọ bụla nke agaasị na achọpụtara n’ebe ha nọ.
Iheọmụmụ Baịbụl
Ụmụnna nime Kraist zipụrụ Pọl na Sailas ngwangwa n’abalị igaru Beria, bú obodo nke ahụrụ n’ụlọnzukọ ọzọ. Ndị Beria gosịrị na ha bụ ndị dị iche n’ebe ndị Tesalọnaika nọ, bú ndị sogburu ndị mkwusanjégharị nke Kraist ndịa naagbasa oziọma. Ha bụ ụdị mmadụ ndị anaachọachọ n’ụwa, ọbụná n’ụbọchị taa. Ha jiri obi ha niile nara Okwu Chineke, wee ná enyocha kwa ihe niile edeworo n’Akwụkwụnsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndịa nke Pọl na náekwu dị otú a, maọbụ na ọ dịghị. Ụdị iheọmụmụ a nke sitere n’Akwụkwọnsọ aghaghị ịmụpụata iheọma, n’ihi na Oziọma nke Jisọs Kraist naeguzoro ezi nnyocha ọ bụla n’ụzọ zùrùòkè. Ngwangwa ọtụtụ mmadụ -- ndị Juu na ndị Grik, ndịkom na ndịnyom -- kwere ezi àmà ahụ na Jisọs bụ Kraist ahụ. Ọ dịghị onye ọ bụla nime Beria nke dị ka agaasị na ọ naemegide Oziọma n’ụzọ ọ bụla, ma ụdị iheọma dị otú a agaghị agabiga n’efu náenweghị nguzogide ọ bụla sitere n’ebe ekwensu nọ. Akụkọ nke ntute ahụ na Beria ruru na Tesalọnaika, ndịkom ọjọọ nke obodo ahụ wee bịa kwa na Beria ịkpali igwé mmadụ megide Ndịozi ahụ. Pọl, onyeọkaokwu na onye ndú nke ndịòtù Kraist ahụ dị ka agaasị na ọ bụ ya ka elegidere anya ná mkbagbu ahụ; ya mere ụmụnna nime Kraist zipụrụ ya site n’obodo ahụ, ma Sailas na Timọti nọgidere n’ebe ahụ wee náezi ndị ahụ chègharịrị ọhụụ eziokwu dị omimi nke okwukwe nke ndị nke Kraist.
Nime Atens
Mgbe ọ rapụsịrị Beria, Pọl bịaruru Atens, ebe ọ nọ zie Sailas na Timọti ozi ka ha bịakwute ya ọsọsọ. Mgbe Pọl naechere ndị ya na ha naalụkọọlụ n’Oziọma, óké iwe naewe mmụọ ya nime ya, mgbe ọ hụrụ ka obodo ahụ jupụtara n’ikpere arụsị. Agwara anyị site n’akụkọ ụwa, na Atens jupụtara n’arụsị karị obodo niile ọzọ nke dị na Grik niile -- dịka agaasị na ọ dị ọtụtụ arụsị na Atens dịka mmadụ si dị kwa ọtụtụ n’ebe ahụ. Nke a dịkarịrị ukwu karị ka Pọl pụrụ ilefuru anya; mgbe ọ nọ kwa náechere Sailas na Timọti, ọ naagwa ndị Juu okwu n’ụlọnzukọ, ọ naagwa kwa ndị ya na ha naezute n’ọmaahịa okwu kwa ụbọchị.
Ọlụ nke Mkwusa nye Ụmụmmadụ N’otù n’otù
Ya mere Pọl abụghị náánị onye mkwusanjégharị na onye naagbasa oziọma, ọ bụ kwa onye ọlụ nye onye ọ bụla ọ naezute -- otù nime ọkpụkpọ kachasị elu na nke naamịkarị mkpụrụ n’ihe nke Chineke nye ụmụmmadụ n’otù n’otù abụrụwo ihe naamị ezi mkpụrụ karị nime akụkọ nke Nzukọ Kraist, ma ọ bụ ihe dịkarịrị mkpà bụrụ kwa ihe ziriezi n’ọgwụgwụ ụbọchị ndịa gbara ọchịchịrị nke ọgbọ nke ndị Kraist. O nwere otù ụbọchị mgbe ọtụtụ narị mmadụ natara onyinye a bú ọmụmụ ọhụụ n’ebe ocheeze amara nke óké ntute na nke ebe anaagbasa oziọma, ma ugbu a ndị náabịakwute Kraist naabịa nnọọ dịka agaasị na ọ bụ n’ihi mmetụta nke ndị ahụ naalụọlụ nke ịgwa ụmụmmadụ okwu Chineke mmadụ na mmadụ. Pọl jere n’ahịa kwa ụbọchị ịgwa ndị niile gaege ya ntị okwu Chineke.
Onye ahụ siri Nrianyasị Ukwu zipụrụ ndịorù ya ka ha gaa n’ama niile na n’ụzọ ntà niile nke obodo kpọbata ndịogbenye, ndịọlụsị, ndịngwụrọ, na ndịísì; na n’ụzọ niile na ogige niile ka ha rugide kwa mmadụ ka ha bịa n’oriri ahụ edoziworo (Luk 14:16-23). Eze nke Otuto enyewo kwa ndịorù Ya iwu ka ha mee otú ahụ, ka ha kpọbata mmadụ niile n’óké oriri ahụ nke O naedozi. Anyị naekpeekpere ka Onyenwe anyị meghepụ anya anyị ịhụ óké ọlụ a, nke dị mkpà nke bụ ọlụ nke náamịpụta kwa mkpụrụ n’ubi vine Ya. Onye ahụ nke nọ n’ámá, onye náelekọta ụlọahịa, onye náewe mmadụ n’ọlụ, onye ọlụ ibe gị, onyeagbataobi gị, onyenkụzi -- onye ọ bụla ka agaewere nke gaenwe kwa ike gee ntị n’Oziọma ahụ nke jupụtara n’okwu olileanya na ọñụ, nke otù nime ndịorù nke Chineke gaekwu n’onwe ya.
Igwé Ndịmbaọzọ Náegentị
Ijéozi nke Pọl mmadụ na mmadụ dubara ya rue ebe sara mbara karị. Ụfọdụ ndị náahụ amamihe n’anya bụ ndị Epikurean na ndị Stọik zutere ya wee kuru ya jee n’iru Aropagọs, bú ụlọikpé kachasị elu nime Atens. Nime ụlọikpé a ka agaanụ òzízí nke Jisọs Kraist ma kpebie kwa ma agaanabata ya, maọbụ na agaghị anabata ya; n’ihi na ndịkom nke Areọpagọs, maọbụ Ugwu Mas, naekpebi ikpé n’elu maọbụ n’isi òfùfè ọhụụ ọ bụla nke anaewebata na Atens.
Ndị Epikurean na ndị Stọik nwe nkwekọrịta n’ihe olenaole, ma ha naenwe nkewa n’ọtụtụ ihe ọzọ. O nweghị ndị ọ bụla nime ha kwenyere na ndụ ọzọ dị mgbe mmadụ nwụrụ ná agbaghịagụgọ okwu Chineke nke Pọl kwuru banyere mbiliten’ọnwụ nke Jisọs na olileanya nke Nzukọ Kraist mere ka ndịa náajụ ajụjụ nke ịkwaemò bịakwasị ya. Otù ihe nke kwesịrị ọjịja bụ na ndị Atens chọrọ ịnụ ihe banyere isoụzọ nke Kraist tutu ha ekpebie ma o kwesịrị. Ọtụtụ mmadụ n’ọgbọ nke a naekwu nnọọ ihe bụ uche ha, náekpé kwa isoụzọ nke Kraist ikpé náebughị ụzọ mata ihe banyere ike ya nke o ji agbapụta ndụ nke mmehie, maọbụ udo, ọñụ, na olileanya nke Oziọma gaenye mkpụrụobi nke mmadụ.
Ozi nke Chineke
Mgbe Pọl nagwa ndị Juu okwu banyere Kraist, o jiri akụkọ niile banyere mmeso nke Chineke n’ebe Ụmụ Israel nọ. O kwuru okwu banyere ịchụàjà niile, ibuamụma niile na olileanya niile nke onye Juu ọ bụla nke náatụgide Mesaia ahụ aka; onye ọ bụla gaenwe kwa ike ghọta ihe ọ naekwu banyere ya, ma ha kwere maọbụ na ha ekweghị. Ma n’Ugwu Mas, n’etiti ikpere arụsị, ọ bụ banyere gịnị ka Pọl gaekwu wee mee ka aghọta ihe ọ naekwu? Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bula ha gārara unu nye, unu echegbula onwe-unu otú unu gēkwu ma-ọbu okwu unu gēkwu” (Matiu 10:19). N’oge hour ahụ Pọl natara ọtụtụ okwu amamihe sitere na Mmụọ Nsọ, n’ihi na okwu ọ bụla nke siri n’ọnụ ya pụta naapụta dịka ọkụ, bụrụ kwa ihe ndịa nke naefe ihe ha náamaghị náaghọta nkeọma. Okwu banyere òkìkè nke Chineke ma ọchịchị nke ihe niile ekèrèèkè kụdara ndị Epikurean na ndị Stoik otù aka ahụ -- ha ekweghị n’okwu ahụ. Okwu nke Pọl kwuru megide ikpere arụsị, na ịchụ ọtụtụ àjà na onyinye dị icheiche iji gbochie iwe nke chi dị icheiche metụrụ onye ọ bụla nke bụ onye Atens n’obi -- ha niile nọ n’ọmụmaikpé. Ndịkom nke Atens bụ ndị gụrụ onweha dịka ndị dị iche n’ebe mmadụ niile nọ, ma Pọl gwara ha na Chineke kerè mba niile site n’otù ọbara -- na mmadụ bụ ụmụ, iheòkìkè, nke Chineke. Ebe ekère mmadụ n’oyiyi nke Chineke, o kwesịghị ka mmadụ náeche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaedo, maọbụ ọlaọcha, maọbụ nkume; ihe apịrịapị site na nke a na ihe dị n’obi mmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ifè Chineke, ha agaghị ịchọ Onyenwe anyị wee “chọta” Ya, n’ihi Ọ nọghị n’ebe dị anya n’arụ onye ọ bụla nime anyị. Ndị náakpọ isiala nye Chineke aghaghị ịkpọisiala nye Ya nime mmụọ na eziokwu.
Chineke lefuru oge niile nke amaghị ihe anya, ma ugbu a Ọ naagwa mmadụ ka ha niile chègharịa n’ebe niile. “Ezí ìhè ahu Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè” (Jọn 1:9), nēnye ìhè ya nke ukwu, ma mmadụ nọ kwa náenweghị ihengọpụ ọ bụla maka ọchịchịrị ahụ nke ha nọ nime ya rue ugbu a. Pọl gwara ndị Atens na ụbọchị ikpé naabịa nye ndị ahụ náachọghị ichègharị -- na Chineke arọpụtawo otù ụbọchị ahụ, rọpụta Onyeikpé, na O nyekwara mmadụ niile ihe ha gaeji kwere nke a ebe O mere ka Onyeikpé ahụ si n’ọnwụ bilie. Lee ka o si dị mkpà ịnabata ozi nke Oziọma nke a!
Ọ bụghị N’efù
Pọl ji ike ya niile kwue okwu megide mmehie na ikperearụsị nke ndị Atens, ma n’ile anya, náánị mkpụrụ ntà ka ọ mipụtara. Mgbe ndịkom nke Ugwu Mas nụrụ okwu banyere mbiliten’ọnwụ, ụfọdụ were ya mee iheọchị, ndịọzọ wezugara ụbọchị nke mkpebi, site n’ikwe mkwà na ha gaanụ olu Pọl ọzọ banyere okwu ahụ, ma eleghịanya ha abịarughị na mmazu nke eziokwu nke Kraist. Pọl rapụrụ obodo Atens náaghọta n’ezie na ndị Grik a bụ ndị naahụ amamihe n’anya gaewere okwu nke Kraist dịka ihenzuzu, ma nke a emeghị ka Onyeozi ahụ nke náadịghị atụegwù daa mba n’obi ya. Ọ gara n’iru n’ọlụ ya ịchọ ọtụtụ ebe ọzọ na ndị gaanabata ọkpụkpọòkù nke Oziọma. Otú ọ dị, mgbalị niile nke Pọl ná Atens abụghị n’efu; n’ihi na ndịkom ụfọdụ kwere na Jisọs wee, “rapara n’aru-ya,” nke otù nime ha bụ Daionisiọs, otù nime ndịikpé nke ụlọikpé dị elu nke Ugwu Mas. Emere ka anyị ghọta na nwoke a bụ onye Pọl ziri ihe nkeọma na onye mgbe emesịrị, ya onweya ghọrọ Onyenlekọta mbụ (bishop) nke nzukọ Kraist dị ná Atens. Chineke naewere ọnọdụ nke otù mkpụrụobi dịka ihe karịrị ụwa niile; ya mere ọ ghaghị abụ ihe ijuanya na O zigaara Pọl site n’Atens ka o jee nweta mmadụ olenaole ndịa.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Gịnị mere Pọl jiri gabiga Amfipọlis na Apọlinia náagwaghị ha okwu Chineke?
2 Gịnị bụ ụdị nnabata nke anabata Pọl na Sailas n’obodo Tesalọnaika?
3 Gịnị mere ndịozi ahụ jiri rapụ Tesalọnaika?
4 Òlee ụzọ ndị Beria jiri dị iche n’ebe ndị Tesalọnaika nọ?
5 Ụzọ mmadụ ole dị icheiche kwenyere n’akụkọ nke NdịKraist nime Beria?
6 Gịnị mere Pọl ji rapụ Beria?
7 Gịnị mere ejiri kpalie mmụọ Pọl mgbe ọ jere Atens?
8 Gịnị mere na Areopagọs, maọbụ n’Ugwu Mas?
9 Òlee ụzọ Chineke jiri nye mmadụ niile ihe ha gaeji kwere na ụbọchị ikpe naabịa?
10 Mmadụ ole soro òzízí Pọl na Atens?