Ọlu Ndi-ozi 18:1-22

Lesson 336 - Senior

Memory Verse
“Ọ digh onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbugh nke atọworo, nke bu Jisus Kraist” (I Ndi Kọrint 3:11).
Cross References

I Nzukọ Kraist Nke Dị Na Kọrint

1 Mgbe Pọl bịaruru Kọrint, ọ hụrụ Akwila na Prisila, ndị ya na ha bịkọrọ wee náalụ kwa ọlụ, Ọlu Ndi-ozi 18:1-3; Ndi Rom 16:3, 4

2 Pọl naagwa ndị Juu na ndị Grik okwu n’ụlọnzukọ Ụbọchị Izuike niile, Ọlu Ndi-ozi 18:4; I Ndi Kọrint 2:1-4

3 Sailas na Timọti bịara inyere Pọl aka na Kọrint, Ọlu Ndi-ozi 18:5; I Ndi Tesalọnaika 3:6-9

4 Ndị Juu anaraghị àmà ahụ, ya mere Pọl jere náagwa Ndịmbaọzọ Okwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 18:6, 7; 13:50-52; Matiu 10:14, 15

5 Onyeisi ụlọnzukọ kwere n’Onyenwe anyị, Ọlu Ndi-ozi 18:8

6 Ebe o nwere okwu ịgbaume n’ọhụụ site n’ebe Onyenwe anyị nọ, Pọl nọgidere na Kọrint n’ihe ra ka ọnwa irinaasatọ, Ọlu Ndi-ozi 18:9-11

II N’ụlọikpé nke Galio

1 Ndị Juu were otù obi guzo imegide Pọl, Ọlu Ndi-ozi 18:12, 13

2 Galio anabataghị okwu ahụ n’ụlọikpé ya, Ọlu Ndi-ozi 18:14-16

3 Ndị Grik jidere Sọstenis wee tie ya ihe n’iru ocheikpé ahụ, Ọlu Ndi-ozi 18:17

III Nlaghachị na Jerusalem

1 Mgbe ọ rapụrụ Kọrint, Pọl na Akwila na Prisila jeruru Siria na Efesọs, Ọlu Ndi-ozi 18:18-20

2 Pọl gara n’iru wee jerue Sisaria na Jerusalem, Ọlu Ndi-ozi 18:21, 22

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịnọgidesiike N’ọlụ

Mgbe ọ rapụrụ Atens, Pọl bịaruru Kọrint, ma ọbụghị ya na ndị ya na ha naeso na mbụ so n’ijé a. Timọti esiworị na Beria bịa Atens ma Pọl zighachiri ya àzụ na Tesalọnaika: “Mgbe ayi nāpugh inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n’àzu na Atens; ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n’ozi-ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka ọ we kasi kwa unu obi n’ihi okwukwe-unu” (I Ndi Tesalọnaika 3:1, 2). Mgbe Pọl nọ na Kọrint náechere ndị ya na ha so náejeozi, ọ nọnyere Akwila na Prisila wee soro kwa ha n’ọlụñka ha bụ ịkpà ákwà ụlọikwu. Ọ naekwu kwa okwu Chineke n’ụlọnzukọ n’Ụbọchị Izuike niile, wee náeme kwa ka ndị Juu na ndị Grik kwenye.

Ọlụaka ahụ nke Pọl naalụ emeghị ya ka ọ dị ala n’ezie. Jisọs sịrị, “N’efu ka unu natara, nyenu n’efu” (Matiu 10:8). -- ịdọakanántị ahụ nke Pọl kwere naeme kwa. Pọl agaghịabụrụ onye ọ bụla ibuarọ. Ọtụtụ okpukpé n’ụbọchị taa atụfuwo ùgwù na nsọpụrụ nke ụmụmmadụ kwesịrị inye ha, n’ihi na nime ọtụtụ ihe ọzọ, ọ ghọwo ihe naebo mmadụ ibuarọ nke ukwu. Omume ahụ nke bú ịrịọ ego n’aha oziọma nke Kraist abụghị n’usoro nke atụmààtụ nke Chineke. Ọ rọpụtaworị atụmààtụ nke otùụzọn’ụzọiri iji mee ka Nzukọ Ya náaga n’iru, Chineke chọ kwara ka ndị nke Ya náeso ụkpụrụ ahụ, ọbụná n’ụbọchị taa. Chineke naasọpụrụ náenye kwa ọgbakọ ọ bụla nke naatụkwasị Ya obi ha niile ihe ọ bụla nke naakpa ha. (Maka ebe nlebaanya lee Usoro Iheọmụmụ sitere na Baịbụl, Iheọmụmụ 264; maọbụ, “Otuụzọn’ụzọiri -- Ụzọ Chineke si tọ Ntọala Ego,” mpempe akwụkwọọgụgụ nke ndị Apostolic Faith, Nke 31).

Ọtụtụ Ohere

Nke a bụ ebe mbụ akpọrọ aha Akwila na Prisila nime Akwụkwọnsọ. Agwaghị anyị ma ha bụ ndị nke Kraist mgbe Pọl jere ka o binyere ha, ma ha ghọrọ ezi ndịagha nke Oziọma. Ọ bụghị ihe ịtụn’anya na ịnụọkụn’obi nke ndụ Pọl na omume ya nwereike izulite omume nke onye nke Kraist nke mesịrị pụta ìhè na ndụ ndịa. Ọ bụ ezie na Pọl hụrụ na ọ dị mkpà ka o were aka ya náalụọlụ, ma ọ naeji ohere ọ bụla nke o nwere -- ọbụná n’ebe ọ nọ n’oche naalụ ọlụ -- náekwusa Oziọma ahụ nke ọ hụrụ n’anya nkeọma.

Akwila na Prisila mụtara nnọọ ọtụtụ ihe site n’aka Pọl, mgbe náadịghịanya ha wee bụrụ ndị ndụmọdụ tozuru òkè nke Okwu Chineke. Mgbe ezigaara Pọl ebe ọzọ dị icheiche, ịlụọlụ, Akwila na Prisila bụ ndị nwereike ime ka ọlụ nke Oziọma náaga n’iru n’ebe nke ha nọ.

N’otùaka ahụ, iheọmụmụ niile nke ndịozi ndịa jupụtara na Mmụọ Nsọ naezi anyị n’ụbọchị taa gaabụ ihe anyị gaamụta náeme kwa. Mgbe emeghere ebe ọlụ ọzọ na ohere ọhụụ, mgbe akpọkwara ndịozi ochie ahụ nọ n’ọlụ ka ha bịa nata ụgwọọlụ ha, otù onye kwesịrị ịnọ n’ọnọdụ imemmụọ kwesịrị ekwesị ka o wee nọchie ọnọdụ ahụ. Ka anyị jụọ onweanyị ajụjụ a: “Gini mere onye ahu nēnwegh ike ibu Mu onwem?” Ihe niile naadabere otú esi mụta ma naeme kwa ha nkeọma bụ iheọmụmụ niile nke Oziọma a nke anaezi nime ọtụtụ arọ niile ndịa.

Ọlụ nke dịrị Onye ọ bụla

Mgbe Sailas na Timọti si na Mesodọnia ridata ịbịa nyere Pọl aka na Kọrint, Pọl naenwe mwuta n’obi, ọ naagwasi kwa ndị Juu ike na Jisọs bụ Kraist. Ịgbaàmà nke Pọl banyere Onyenzọpụta ahụ nke siri n’ọnwụ bilie bụ eziokwu na ihe naeweta mkpali nke obi. Ndị Juu biliri n’usoro imegide Pọl, gaa kwa n’iru n’ikwu okwu nkulu megide ya; ya mere Pọl fechara uwe ya wee sị ha, “Ọbara unu di n’isi-unu, mu onwem di ọcha: site n’ugbu a m’gāgakuru Ndi Mbaọzọ.”

Chineke emewo ka ndịọzi Ya na ndịàmà Ya bụrụ ndị gaahụ ihe banyere ndị ha bi n’etiti ha, na ndị ha na ha naalụkọọlụ. Chineke sịrị onyeamụma ahụ: “Nwa nke madu, onye-nche ka M’doworo gi nye ulo Israel; I gānu kwa okwu site n’ọnum, dọ ha aka-na-nti site nam” (Ezikiel 33:7). Chineke naagwa ọbụná karịa otú ahụ nye ndị nke Kraist n’ụbọchị taa: “Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem” (Mak 16:15). “Riba onwe-gi na ozizi-gi ama. Nānọgide n’ihe ndia: n’ihi na n’ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi” (I Timọti 4:16). Ọ bụrụ na onye nke Kraist gaabụ onye kwesịrịntụkwasịobi n’izisa ozi nke nzọpụta na nke olileanya nke Chineke, ọ gaanapụta mkpụrụobi ya. Anyị onweanyị, dịka ndị nke Kraist, ànyị naalụ ọlụ anyị nkeọma dịka o kwesịrị n’izisa ozi a nye ụwa? Anyị nwere ike isoro Pọl kwue n’ezie sị, “ọbara-unu di n’isi-unu; mu onwem di ọcha?” Ka Chineke nyere onye nke Kraist ọ bụla aka iluzu ọlụ a!

N’ime kwa ka Pọl dị ike n’ijéozi ya na Kọrint, Onyenwe anyị gwara ya okwu site n’ọhụ n’abalị: “Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi: n’ihi na Mu onwem nọnyere gi, ọ digh kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n’ihi na enwerem ọtụtụ madu n’obodo a.” Pọl gaechèrị na ndịiro ya dị ọtụtụ dị kwa ike, ma Onyenwe anyị mere ka ọ ghọta na Ọ gaanapụta Pọl nime ihe ndịa niile. N’ịgbaume dị otú a bụ náánị ihe Pọl chọrọ. Ya onwe ya na ndịozi ibe ya nọgidere na Kọrint ihe ra ka otù arọ na ọnwa isi, naezi ndị bi n’obodo ahụ Okwu Chineke.

Okwu Chineke nke Siriike

Mgbe ụfọdụ ndịkom na ndịnyom naenwe mmasị ikwujọ onyeozi nke Chineke nke naekwuwaokwu, site n’ike dị ukwu na site n’ịnụọkụ n’obi. Ọ dị onye nwereike itule n’obi ya ka Pọl ji olu dị nwanyọ maọbụ olu nke náenweghị mgbanwe mgbe ọ sịrị ndị Juu nke ndị Kọrint, “Ọbara-unu di n’isi-unu; mu onwem di ọcha: site n’ugbu a m’gāgakuru Ndi Mba-ọzọ” Anyị matara nkeọma na okwu a nwere otitemmanụ nke Mmụọ Nsọ, n’ihi na Pọl naeme ihe Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya n’iwu: “Onye ọ bula nke nānaragh unu nke-ọma, nke nānugh kwa okwu nile unu, mgbe unu nāpu n’ulo ahu ma-ọbu n’obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu” (Matiu 10:14). Ndị Juu ndị bi na Kọrint akpọghị okwu dị ike nke Pọl kwuru ihe ọ bụla, ma otú ọ dị, o nwere ihe okwu ahụ lụpụtara. Pọl kewapụrụ onweya site n’ebe ụlọnzukọ ahụ dị, o wee ba n’ụlọ Justọs, onye ụlọ ya dị ụlọnzukọ ahụ ezi nso, n’ebe ahụ ka o kwuru okwu Chineke. N’oge náadịghị anya, Krispọs, onyeisi ụlọnzukọ, ghọrọ onye kwereekwe na onye náeso ụzọ Onyenwe anyị. Otú ahụ ka ntute siri malite na Kọrint; n’ihi na mgbe ọtụtụ mmadụ nụrụ ihe banyere nchègharị nke Krispọs, ha kwere, ewe wụọ ha mmiri.

Ọtụtụ mgbe, ndịozi ahụ ndị naeme ka ndị naege ha ntị nwe ntị náakọọkọ naenwe igwè ndị náeso ha karị ndịozi ahụ ndị náekwu Okwu Chineke ahụ nke anaagwaghị ihe ọ bụla, ma ntị náakọọkọ agaghịeme ka mmadụ bụrụ ezi onye nke Kraist. Ezi onye nke Kraist bụ mmadụ ahụ onye naeme Okwu Chineke niile; ma tutu mmadụ abụrụ onye nke naeme okwu ahụ, ọtụtụ mmadụ bụ ndị ọ naadị mkpà ka mmadụ naagba ha ume n’ịlụọlụ ahụ. Okwu Chineke nke siriike, nke ekwuru site n’ike na otitemmanụ nke Mmụọ Nsọ, bụ ngwaọlụ dị ebube iji gba ndị Kraist ume ka ha naaga n’iru n’óké mgbalị ha nye Onyenwe anyị. Okpukpé Kraist n’ụwa niile n’ụbọchị taa chọrọ ọtụtụ mmadụ ndị dị ka Pọl, ma náánị ndị mkwusa olenaole hụrụ amamihe n’anya ndị naebugoro onweha n’okpokoromkwusa n’ọgbọ anyị a.

Nchébé nke Pọl

Pọl ebelataghị Okwu Chineke nke ọ naekwu nye NdịKraist ọbụná n’ikwusa rue ọtụtụ ọnwa. Ọ bụrụ na ọ dị otú a, ndị Juu gaechéfuworị Pọl, ma n’ikpeazụ ha biliri ọzọ imegide Onyeozi a dị ike nke Ndịmbaọzọ. Ha nwere otù nguzo imegide Pọl, wee kute ya n’iru ochieikpe nke Galio. Dịka mkwà O kwere Pọl si bụrụ eziokwu, na ọ dịghị iheọjọọ ọ bụla gaadakwasị ya nime Kọrint, Chineke mere ka Galio ghara ịnabata ebubo ahụ niile, ọ nabataghị kwa ikpé ahụ n’ụlọikpe ya. Ebubo niile ahụ bụ ebubọ ugha n’ezie, nke mere na ndị Juu enweghị ike iweli aka ha megide Pọl. Ọ nọgidere “ọtutu ubọchi ọzọ” tutu o wee rapụ ụmụ nna ndị nọ na Kọrint na ijéghachi na Siria site n’ụgbọmmiri.

Ijéru Jerusalem

Akwila na Prisila soro Pọl jerue Efesọs, Pọl bara n’ụlọnzukọ nke obodo a wee gwa ndị Juu okwu. Náagbaghịagụgọ ụfọdu nime ndịa kwenyere, n’ihi na ha rịọrọ Pọl ka ọ nọnyere ha oge dịkarịrị anya. Akwila na Prisila nọgidere n’Efesọs, eleghịanya ka ha wee zi ma dụ kwa ndị nke Kraist chègharịrị ọhụụ ọdụ, ma Pọl gara n’iru n’ijè ya wee kwe Ndị Efesọs mkwà, na ọ gaalaghachikwute ha ọzọ, ma Chineke kwe. Pọl wee nupu ụgbọ jee Sisaria, site n’ebe ahụ o wee jerue Jerusalem wee kele kwa nzukọ Kraist. O mesịrị laghachị n’Antiọk.

Otú ahụ ka ijè nke abụọ nke ijéozi nke Pọl siri gwụ. Ọ bụ ezie na ọ hụrụ ọtụtụ ọnwụnwa siriike n’obodo niile na n’ebe niile o kwuru Okwu Chineke, Pọl ritara ọtụtụ mmeri nke náadịgịde n’urù. Esitere n’aka ya nwe nzukọ anọ na nwaoge ntakịrị a; akwụkwọozi niile nke ndumọdụ nke Pọl degara nzukọ ndịa, site n’odudu nke Mmụọ Nsọ, abụworị ndụmọdụ nke Kraist n’ọgbọ niile náeso iji wee rịta urù nke ihemmụọ. Mgbe Onyenwe anyị naedu, ihe niile aghaghị ibi nkeọma n’ikpeazụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kpọọ aha ndị Juu abụọ ndị Pọl hụrụ na Kọrint, ndị mesịrị ghọọ ndịKraist nke náenyeaka?

  2. 2 Gịnị bụ ọlụaka nke Pọl?

  3. 3 Gịnị mere Pọl jiri kewapụ onwe ya n’ebe ụlọnzukọ ndị Juu dị?

  4. 4 Ònye bụ Krispọs? Gịnị bụ ihe o mere?

  5. 5 Òlee otú Pọl siri nwe ịgbàume ịga n’iru n’okwu ọ naekwusa na Kọrint?

  6. 6 Ò bụ oge ra añaa ka òtù NdịKraist a nọrọ na Kọrint?

  7. 7 Òlee ụzọ Galio siri nyere Pọl aka?

  8. 8 Òlee ebe ka Pọl jere mgbe ọ rapụrụ Kọrint?