Ọlu Ndi-ozi 18:24-28; I Ndi Kọrint 1:11, 12; 3:4-9

Lesson 337 - Senior

Memory Verse
“Onye nāku na onye nākwosa miri bù otù: ma ha abua n’otù n’otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọgbu ọ nādọgbu onwe-ya n’ọlu si di. N’ihi na ayí bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu” (I Ndi Kọrint 3:8, 9).
Cross References

I Ndụ Ịsọpụrụ Chineke nke Apọlọs Nwere, Otù Onyemkwusanjégharị Pụtara na Gboo

1 Akụziri Apọlọs Akwụkwọnsọ, Ọlu Ndi-ozi 18:24, 25; Ndi Kọlọsi 1:10; 2 Timọti 2:15

2 Ọ bụ onyeọkàokwu, ji onyinye ya niile mee ka enye Chineke otuto, Ọlu Ndi-ozi 18:24, 25; Ndi Efesọs 4:8, 11-13; Ndi Rom 12:5-8

3 Ebe ọ dị umealan’obi, o jikere ịnara ndụmọdụ, Ọlu Ndi-ozi 18:26; Ndi Rom 12:10, 16; Jemes 3:13-17

4 Ọ dị ọkụ na mmụọ ya, o wee náekwu, náezi kwa nkeọma, nwe mkwuwaokwu, Ọlu Ndi-ozi 18:25, 26; Eklisiastis 9:10; Ndi Rom 12:11; Ndi Galetia 4:18; Aisaia 62:1; 2 Ndi Kọrint 9:2

5 Chineke gọziri ijéozi ya, náesighịagụgọ kwa ọtụtụ kwere site na ya, Ọlu Ndi-ozi 18:27, 28; I Ndi Kọrint 3:5

6 Pọl were Apọlọs, Pita na ya onweya dịka iheatụ igosipụta óké egwù dị n’iseokwu banyere ndịndú nke ihemmụọ na igosi kwa omume nke ụfọdụ ndị náamaghị ihe n’ụzọ ibuli ndịndú ha elu, I Ndi Kọrint 1:10-13; 3:4-9, 21-23; 4:6

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Apọlọs bụ nwoke nke Chineke gọziri ijéozi ya nke ukwu. Ọ bụ onye ya na Pọl na Ndịozi ọzọ lụkọrọọlụ bụ ndị dọgburu onweha n’ọlụ ime ka amara ụzọ nke nzọpụta a nime Esia, na nime Yurop (Europe) na n’akụkụ niile nke ụwa nke amara n’oge ahụ. Site n’iñomi omume na onyinye niile nke onye nke Chineke a, bú onye Ndịozi niile gbara ezi àmà, ọ gaenyere anyị aka ime ka ndụ anyị baa urù karị n’ijéozi Chineke.

Akụziri ya Akwụkwọnsọ

Apọlọs bụ onye Juu, náagbaghịagụgọ o nwere amamihe ụfọdụ nke Akwụkwọnsọ n’ihi òzízí nke anaezi onye ọ bụla nke amụrụ n’èzínaụlọ ndị Juu kwere n’òzízí ha. Nwa okoro dị otú a gaebu kwa ọtụtụ okwu Moses kwuru na ọtụtụ Abù Ọma n’isi. Èzínaụlọ ahụ naenye Chineke otuto site n’ọtụtụ ekpere ha naekpe n’ọtụtụ ememe ogologo nke dị n’ibi obi ha kwa ụbọchị. Anaedebe ememe dị icheiche náeri kwa nwaatụrụ nke ememengabiga.

Ndị bụ nnenanna taa kwesịrị ịgbaso iheàtụ ahụ na izi ụmụ ha ihe nkeọma n’okwu ahụ nime uche Chineke. Ọ bụ n’ihi na òzízí a bụ ihe arapụworo nke mere ka ajọomume nke ụmụntà jupụta ebe niile.

Akụzịworo Apọlọs “Uzọ Onye-nwe-ayi.” Ma eleghịanya, ọ bụ site n’óké ịhụn’anya ya n’ebe Akwụkwọnsọ dị na òzízí nke Mmụọ Nsọ duru ya rue ịmata Ọkpara Chineke. Ọ dịghị ntozùòkè ọ bụla dị mkpà nye onye naachọ ịbụ onye ọlụ n’ijéozi Chineke karị ịlụpụta Okwu ahụ ná ndụ ya bụrụ kwa onye mụtaworo ụzọ Onyenwe anyị nkeọma. Ọ ghaghị ịdị ike n’ihe nke Onyenwe anyị, ọ gaenweta ike ahụ site n’irinri ike nke Okwu ahụ. Mgbe ọ naenye onweya n’aka Chineke, anaeji Mmụọ nke Chineke, jikwa eziokwu ahụ nke Okwu Chineke jikere ya ịlụọlụ ahụ Ọ naenye ka ọ lụọ. Mgbe ahụ, náánị mgbe ahụ, ka ọ gaabụ onye ọlụ nke “ihere nāpugh ime ya.” Amamihe nke Okwu Chineke nyere Apọlọs aka ikwupụta okwu ịgwa ndịọzọ banyere Kraist na amara nke nzọpụta Ya.

Obiumeala

“Ọ mara nání baptizim nke Jọn,” ọ dị mkpà izi Apọlọs n’óké òzízí niile nke Jisọs. Site n’óké mkpagbu nke ndị Juu na Rom, achụpụrụ mmadụ abụọ naatụ egwù Chineke bú ndị náesoụzọ Onyenwe anyị Jisọs Kraist na Rom (Ọlu Ndi-ozi 18:1, 2). Ha bụ ndị náakpá ákwà ụlọikwu dịka Pọl. N’ihi na Pọl “na ha nālu otù ọlu nkà ahu,” o binyere Akwila na Prisila na Kọrint. Pọl bụrụ ha onyeòzízí dị ebube, náenweghị kwa ucheabụọ akụziri ha Oziọma nkeọma. Mgbe Akwila na Prisila nụrụ okwu Apọlọs kwuru n’ụlọnzukọ, ha “kutara ya n’ebe ha nọ, wee kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma karị” (Ọlu Ndi-ozi 18:26). Omume ya gaabụworị nke dị mma, n’ihi na mgbe ọ naaga Kọrint, ụmụnna nime Kraist ndị nọ n’Efesọs mere ka obi dị ya ike, wee degaara ndị náesoụzọ Jisọs n’ala ndị Grik akwụkwọ ịnara ya nkeọma (Ọlu Ndi-ozi 18:27).

Ọtụtụ mmadụ achọghị ka akụziere ha ihe. Ha naeche na amamihe ha nwere ezuworo ha, ọ dịghị ha mkpà ịnara enyemaka Chineke gaenye ha site n’aka otù onye ọzọ bú orù Ya. Ma Apọlọs nara enyemaka ahụ n’ihi nke a ka Chineke mere ya onye naerita mkpụrụobi n’urù.

Ịnụọkụ na Ilezianya

Dịka Pọl onye ya na ya naalụkọọlụ, Apọlọs naanụọkụ na mmụọ ya -- nime mmụọ -- agwara anyị na ọ naekwu naezi kwa nkeọma. Nke a bụ ihe abụọ maramma jikọrọ onweha ọnụ wee mee ka ozi ya gaa nkeọma. Ọtụtụ mgbe anyị naahụ ndị náanụọkụn’obi, ma ha naamafere usoro ọlụ niile nke anaeji ntachiobi alụ, -- bú usoro nke sokwa n’ọlụ nke Mmụọ Nsọ naalụ na nzọpụta nke mkpụrụobi. N’ihi nke a ha adịghị ahụ ihe nlụpụta ahụ kwesịrị isò ịnụọkụ ha. Ịbụ onye náanụọkụ, ma bụkwara onye naelezianya nkeọma bụ ihe kwesịrị ka anyị chọsieike. Anyị kwesịrị inwe ọkụ nke ezi mmasị n’ihe ọ bụla nke anyị naeme, tụkwasịrị nke a, anyị kwesịkwara ịlụọlụ ọ bụla rue ọgwụgwụ ya, ọ bụ ezie na mkpebi dị otú a gaabụrụ anyị ọlụ dị ike na itufu ihe ụfọdụ, bụrụkwa n’ụdị náagaghị atọ anyị ụtọ.

O wee “nēzi kwa nke-ọma ihe nile banyere Jisọs.” Ọ dị mma ime ka amara na Jisọs nwụrụ, wee si n’ọnwụ bilie ọzọ; na Ọ bụ Ọkpara Chineke n’ezie, na ọ bụghị náánị “otù nwa Chineke,” dịka ntụgharị nke Baịbụl nke oge ọhụụ a naekwu. Náánị ma ọ bụ Ọkpara Chineke, ọmụmụ-Ya, ọnwụ-Ya n’elu obe, mbiliten’ọnwụ Ya na òzízí Ya bụ iheefu. Náánị Onye ahụ bụ Chineke bịara n’oyíyí mmadụ pụrụ ịgbaghara, wee wepụ mmehie n’obi mmadụ.

Agbamume

Apọlọs nwere mkwuwaokwu dị ezimma. Ọ tufughị mgbe ịba n’ebe sikarịrị ike nke okpukpé ndị Juu wee zie òzízí banyere Kraist. Mgbe Akwila na Prisila zisịrị ya ihe, o wee gwa ndị Juu na Kraist abịawo dịka Onyenzọpụta nke ụwa, na ọ bụ kwa Mesaia ha. O ji mkwuwaokwu kọwaa ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ, wee mee ka ọtụtụ mmadụ kwere Eziokwu ahụ. Ọ laghị azụ ikwupụta aha otù Onye ahụ ọ maliteworo ịhụn’anya nke ukwu. N’ihi nke a ọtụtụ mmadụ ririnne nụrụ ozi ahụ dị nsọ karị ndị pụrụ inụwo yarị ma ọ bụrụ na darambà inwe mkwuwaokwu banyere ihe nke Chineke.

Ịdịn’otù

N’oge emesịrị, mgbe Pọl nọ n’ijè ya nke mkwusanjégharị nke atọ, o deere ụmụnna nime Onyenwe anyị bi na Kọrint akwụkwọozi nke Mmụo Nsọ debeworo anyị rue taa. Agaècheta mgbe anaagụ akwụkwọozi nke mbụ a nke enyere NdịKraist na edere ndụmọdụ ndịa iji mee ka edozie ajọomume ụfọdụ ha lefuru anya n’ụlọnzukọ ha. Ụfọdụ nime ihe ndịa nke ọ mara ikpé megide bụ mmehie n’ezie -- mmehie ndịa nke ndị ahụ naeme, bú ndị azọpụtaworo mgbe garaaga ndị soworo n’òtù nke arụ ndị kwereekwe, ma ha naachọ kwa ịnọgide n’òtù a ebe ọ pụtara ìhè na ha etufuwo nzọpụta ha n’ihi mmehie niile nke ha lezirianya náeme. Ndịa nke náadịghị asọpụrụ Chineke bụ ndị naeweta ọgbaaghara nime nzukọ.

Ụfọdụ ihe ọzọ Pọl dere abụghị mmehie kama ha bụ omume dị icheiche maọbụ ọchịchọ dị icheiche nke pụrụ iduba mmadụ nime mmehie maọbụ mbulielu nke anụarụ maọbụ ọgbaaghara nke pụrụ iwezuga uche ndị ahụ n’ebe Chineke nọ. Pọl dekwara banyere ọchịchọ nke anụarụ dị n’obi ụfọdụ nke kwesịrị ka ewere Ọbara Kraist sachapụ, na ihe dị egwù nke otù nime ihe ndịa gaabụrụ ndị ahụ dị ọcha site n’ebe ihe ndịa dị.

Pọl chọpụtara na ụfọdụ nara ndị ndú ụfọdụ nkeọma ma kpọọ ndịọzọ iheefu. Ụfọdụ naasị, “Mu onwem bu nke Pọl;” ndi ọzọ naasi, “Mu onwem bu kwa nke Apolọs,” maọbu “Mu onwem bu kwa nke Kifas” ma ndị ọzọ pụrụ ịsịkwa, “Mu onwem bu kwa nke Kraist.” Pọl, n’ụbọchị ya, chọpụtara óké iheegwù dị n’omume dị otú a. Nke mbụ ọ chọpụtara na omume dị otú a sitere n’anụarụ. Esemokwu na ọgụ naesite na ya mgbe niile. N’ebe Pọl nọ, nke a pụtara na nkewa dị na nzukọ nke ndị kwereekwe ahụ, na egbochiri Mmụọ Chineke ịlụ ọlụ Ya n’etiti ha.

Ọ dị ụfọdụ taa bụ ndị náachọ ka ụfọdụ ndị mkwusa gwa ha Okwu Chineke, ka ụfọdụ kpere ha ekpere ka ewe gwọ ha ọrịa, ka ndị ụfọdụ kpere ha ekpere ka ewe zọpụta ha, ka ụfọdụ dụọ ha ọdụ. Ọ bụrụ na Pọl na Apolọs nọ n’ebe a, ha pụrụrị ịkpọ ndị dị otú a “ndi bu nání anu-aru.” Pọl dere sị “Ekewo Kraist èkè? ọ gābu na akpọgidere Pọl n’obe n’ihi unu? Ma-ọbu na emere unu baptizm ibà n’aha Pọl” (I Ndi Kọrint 1:13). “N’ihi na mgbe ọ bula otù onye nāsi, mu onwem bu nke Pọl; ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bụ nke Apolọs; ùnu abughi madu efu? Gini kwa bu Apolọs gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n’aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwara ha abua n’otù n’otù. Mu onwem kuru osisi, Apolọs kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba … N’ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu; unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu” (I Ndi Kọrint 3:4-6, 9).

Anyị mara na agaewere “ọñu nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi” bụ ndị náeje ozi, ndị Chineke doro ná nzukọ; “nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a” (Ndi Filipai 2:29), “Ka unu were kwa ihu-n’anya sọpuru ha gabiga òkè nke-uku ri nne n’ihi ọlu-ha” (I Ndi Tesalọnaika 5:13), “Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua” (I Timọti 5:17), náekwenyenụ ha náedokwanu onweunu na okpurù ha dịka ndị ahụ “nāmu anya n’ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju banyere unu” (Ndi Hibru 13:17). Ma ndị nke Chineke agaghị asị na onye nke a dị mma karị ibe ya; n’ebe ndịa náejere Chineke ozi nọ, n’ụzọ gaeweta nkewa na ịlụọgụ nime nzukọ nke ndị kwereekwe. Ndị òtù nzukọ ahụ agaghịanara ozi onye ahụ náejeozi dịka okwu si n’ọnụ mmadụ ahụ kama ha gaanara okwu ahụ dịka ozi sitere na Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ebe bụ obodo Apolọs? Òlee ebe ka amụrụ ya?

  2. 2 Gịnị bụ onyinye pụrụ iche nke enyere nwoke a -- onyinye nke o ji lụsieọlụ ike n’ijéozi Chineke?

  3. 3 Gịnị ka nke a naegosi, “Ejiri okwu ọnu zi Apolọs ụzọ Onyenwe anyị”?

  4. 4 Ekwuru na Apolọs “dị ọku na mọ ya.” Òlee onyinye ọzọ dị ukwu o nwere nke mere ka ịnụọkụ ya n’ihe Chineke zue òkè

  5. 5 Òlee ndị nụrụ okwu Apolọs kwuru n’Efesọs? Ọ bụ gịnị ka ndịahụ mere ya? Òle omume nke nsọpụrụ Chineke Apolọs gosiri mgbe ndị ahụ náesoụzọ Kraist bịakwutere ya?

  6. 6 Pọl kwuru banyere onweya sị na ya kụrụ osisi, na ya bụ onyeisiọkà nke maraihe. Òlee akụkụ nke o nyere Apolọs n’okwu nkọwa ndịa nke ekwuru n’ụzọ iji tụnyere ihe.

  7. 7 Òlee otù nime ihe ahụ niile náeweta nkewa na ịlụọgụ n’etiti nzukọ nke ndị kwereekwe?