Ọlu Ndi-ozi 19:1-20

Lesson 338 - Senior

Memory Verse
“Mu onwem nēji miri me unu baptisim n’ezie ka unu we Chègharia: ma Onye nke nābia n’azum kam ike, Onye m’nērugh ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu bapitzim” (Matiu 3:11).
Cross References

I Pọl n’Efesọs

1 Pọl jụrụ ụfọdụ ndị nke Kraist nọ n’Efesọs ma ha anatawo Mmụọ Nsọ site na mgbe ha ji kwere na Kraist, Ọlu Ndi-ozi 19:1, 2

2 Awụrụ ndịa náesoụzọ Kraist mmiri dịka Kraist si kuzie ya, Ọlu Ndi-ozi 19:3-5; 8:16; 18:25

3 Ndịa náesoụzọ Kraist natara Mmụọ Nsọ mgbe Pọl, bikwasịrị ha aka n’isi, Ọlu Ndi-ozi 19:6, 7; 8:17; I Timọti 4:14; 2 Timọti 1:16

4 Pọl gwara ha okwu Chineke n’ụlọnzukọ ha ogologo ọnwa atọ, kwu kwa arọ abụọ n’ụlọ akwụkwọ nke Tiranọs, Ọlu Ndi-ozi 19:8-10

5 Pọl mere ihe ịrịbáàmà dị icheiche, Ọlu Ndi-ozi 19:11, 12; Mak 16:17, 18; I Ndi Kọrint 12:7-11, 29-31

6 Ihe pụrụ ichè mere n’Efesọs nke nyere aha Onyenwe anyị otuto nke ukwuu, Ọlu Ndi-ozi 19:13-17

7 Ihe nke a wetara bụ na ọtụtụ mmadụ kwupụtara mmehie ha n’ìhè wee chigharịkwute Chineke, Ọlu Ndi-ozi 19:18-20; 2:43; 5:5, 11; Ọpupu 15:16; 2 Ihe Emere 17:10; Luk 1:65; 7:16

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nime Ụwa Niile

“Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekèrè èkè ozi-ọma nkem” bụ iwu nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya (Mak 16:15), ọ bụ kwa iwu a ka Pọl naerubereisi mgbe ọ naeje Efesọs site na Kọrint. Efesọs bụ ezigbo ebe ikwusa Oziọma n’ihi ọ bụ obodo ọtụtụ ndị náazụ, náere kwa ahịa naeje, ọ nọchịkwara ụzọ ezi aga Rom ma ọ bụrụ na ị naaga site n’Ọwụwaanyanwụ. Iheọmụmụ anyị mere ka anyị mara na Pọl nọrọ n’Efesọs ihe karịrị arọ abụọ náezisa Oziọma Jisọs Kraist.

Iheọmụmụ anyị naakọwa kwa na ndị niile nọ na Esaia (Asia Minor) nụrụ okwu nke Onyenwe anyị Jisọs, ma ndị Juu ma ndị Grik. Pọl bụ náánị otù onye, n’ezie ọ dịrịghị ya mfé iwerutere ọtụtụ mmadụ Oziọma ahụ. Site n’ịnọdụ n’obodo nke Efesọs a jupụtara na mmadụ ndị náazụ náere kwa mere ka o zute ọtụtụ mmadụ ndị sitere n’akụkụ niile nke Esia. Ọ bụ ezie na Chineke eziwo Filip ka ọ gaa n’ọzara ịgwá onozi Etiopia Okwu Chineke, ọ pụtakwara ìhè n’otùaka ahụ na Onyenwe anyị gafere Osimiri Galili ijekwuru nwoke nke Gerasa, onye ahụ dị n’aka mmụọ náadịghị ọcha. Ma Jisọs na Filip bịaghachiri nime obodo ebe igwè mmadụ nọ mgbe ha lụsịrị ọlụ pụrụ ichè nke ha jere ịlụ.

Chineke ezubeghị ka ndị nke Ya bụrụ ndị gaekewapụ onweha site n’ebe igwè mmadụ ọzọ bi n’ụwa dị, kama ọ chọrọ ka ha nọdụ n’ọlụ nke Onyendú ha mgbe niile, naagwa ha okwu ọñụ nke nzọpụta, bụ mmadụ nke fuworoefu nime mmehie. Anyị onweanyị ndị náagbalị n’ụbọchị taa iwere okwu Oziọma Jisọs Kraist gwa ụmụmmadụ, o kwesịrị ka anyị nweta okwu ndụmọdụ site n’omume ndị náesoụzọ Jisọs mgbe ha bara nime ụwa niile izisa Oziọma nke Kraist. Agaghị izi ụmụmmadụ ozi a site n’otù ụzọ ma ọbụ ụzọ ọzọ, ma ọ pụtaghị na anyị niile n’otù n’otù gaejezù ebe niile mmadụ nọ ka ha wee nụ okwu nke Oziọma nke a. Pọl nọgidere n’Efesọs rue ogologo arọ abụọ, náakụzi ihe n’ụlọakwụkwọ Tiranọs, ndị niile nọ n’Esia nụkwara okwu nke Oziọma ahụ.

Awụrụ Ndịnáesoụzọ Jisọs Mmiri nke Nchègharị

N’Efesọs Pọl hụrụ ihe ra ka mmadụ irinaabụọ nime ndị náesoụzọ Jisọs, ndị náamaghị ihe ọ bụla banyere ọwụwụmmiri nke Kraist. Ha bụ ndị nke Chineke n’ihi na ha chègharịrị mgbe ha nụrụ Okwu Chineke nke Jọn Onyeọwụmmiri gwara ha, ewe wụọ kwa ha mmiri dịka o nyere ha iwu. Mgbe ha nụrụ na Onye ahụ nke Jọn kwuruokwu banyere Ya abịawo, ha were ọñụ nara òzízí nke Pọl banyere Kraist, ewe wụọ kwa ha mmiri baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Iheọmụmụ anyị naakọwa na “ewe me ha baptizim iba n’aha Onye-nwe-ayi Jisọs,” nke pụtara na awụrụ ha mmiri dịka Jisọs nyere iwu mgbe Ọ sịrị: “Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim ba n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19). Okwu Chineke emegideghị onweya n’ụzọ ọ bụla maọlị, ihe ekwukwara n’otù ebe nime ya na ihe edekwara n’akụkụ ya nke ọzọ naekwekọrịta.

Ịnata Mmụọ Nsọ

Ajụjụ nke Pọl jụru, “Unu natara Mọ Nsọ mgbe unu kwere?” dị kwa mkpà n’otùaka ahụ. Nzaghachị nke ndị nke Kraist a dị n’Efesọs na ha anụghị ọbụná ma enyere Mmụọ Nsọ, mere ka Pọl jụọ ha ihe ha kwenyere. Échìchè Pọl chèrè nke kpatara ajụjụ a dị mfé ịghọta, na ọ bụrụ na ha bụ ndị náesoụzọ Jisọs Kraist bụrụ kwa ndị awụrụmmiri baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ, ha gaamaworị ihe banyere Mmụọ Nsọ, ha gaanatawo Ya rị ma eleghịanya. N’ụbọchị nke Ndịozi mgbe ochie, nke a bụ nghọta nke onye ọ bụla nime ndị náesoụzọ Jisọs nwere na onye ọ bụla nke kwere na Jisọs, bụrụ kwa onye edeoworo nsọ, kwesịrị ịnata Mmụọ Nsọ.

Jọn Onyrọwụmmiri ghọtara eziokwu a, ikwusa ya bụ kwa otù akụkụ nime ọlụ niile nke ijéozi ya. Mkwupụta ya banyere Kraist bụ nke a: “Mu onwem nēji miri me unu baptizim n’ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n’azum kam ike, Onye m’nērugh ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptizim” (Matiu 3:11).

Jisọs gwara ndịnáesoụzọ Ya ọtụtụ mgbe na Ya gaezitere ha Onyenkasiobi bú Mmụọ Nsọ mgbe Ọ lakwusiworo Nna Ya n’eluigwe. (Lee Jọn 14:16-26; 15:7-15). Okwu ikpeazụ Ọ gwara ndịnáesoụzọ Ya tutu Ọ rịgoro n’Eluigwe bụ iwu nke a: “Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n’isi unu: ma nọdunu n’obodo a, rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:49). Anyị naagụ kwa otú a n’Ọlu Ndi-ozi: “Mgbe Ya (Jisus) na ha zukọrọ Ọ we nye ha iwu ka ha ghara isi na Jerusalem pụọ, kama ka ha chere nkwà nke Nna Ya, nke unu nuru n’ọnum, ka O kwuru. N’ihi na Jọn jiri miri me baptizim n’ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptizim mgbe ọtutu ubọchi nāgagh-agabiga site n’ugbu a” (Ọlu Ndi-ozi 1:4, 5). Ndịa bụ náánị ebe olenaole nime ọtụtụ ebe nime Akwụkwọnsọ nke náegosipụta eziokwu ahụ na ndị niile kwereekwe kwesịrị ịnata ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ.

“Ùnu natara Mọ Nsọ mgbe unu kwere? bụ ajụjụ nke ndị nke Kraist niile taa kwesịrị ịza É na ya. Ọ bụrụ na ike adịghị nime nzukọ ụfọdụ taa, maọbụ nime ndụ mmadụ ụfọdụ, ihe wetara nke a bụ erubeghịisi nye iwu Jisọs nyere nke náasị: “Nọdunu … rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu.” Mgbe Pọl bikwasịrị ndị nsọ a bi n’Efesọs aka n’isi wee kpeeekpere, ha natara Mmụọ Nsọ wee sụọ kwa asụsụ n’ire ọhụụ dịka Mmụọ Nsọ mere ka ha kwue, dịka ndị ahụ nwetawokwara n’ụlọ elu n’ụbọchị Pentikọst. N’ụbọchị ndịa, anyị bụ ndị edoworo nsọ gaasụ kwa asụsụ n’ire ọhụụ dịka Mmụọ Nsọ naeme ka ha kwue mgbe anyị natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ ahụ. N’ihi nke a anyị aghaghị ijéijè n’ìhè nke Okwu Chineke, na irubeisi nye ụkpụrụ Ya niile, ma ọ bụrụ na anyị gaedebe ike ahụ nke anyị natara n’aka Chineke mgbe ejiri Mmụọ Nsọ wụọ anyị mmiri.

Iheịrịbaàmà na Ọlụebube Dị Icheiche

Ná izisa Okwu Chineke nke Pọl zisara pụrụ ichè abụghị ihe anaenocha. Iheọmụmụ anyị naagwa anyị na Chineke sitere n’aka Pọl lụọ ọlụebube dị icheiche. Otú ọ dị, oge ọlụebube agafebeghị! Jisọs Kraist dị otùaka ahụ nyahụrụ na taa, e, rukwa mgbe niile ebighịebi; ihe Chineke mere na mgbe garaaga, Ọ pụkwara ma jikere ime n’ụbọchị taa. Mkwà nke Onyenwe anyị nye ndị nke Ya bụ nke a: “Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n’aham ka ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha añua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gagh-emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike” (Mak 16:17, 18). Nzukọ Kraist ezobewo mkwà ndịa dịka ihe dị óké ọnụahịa ma nime ọgbọ ndịa Chineke egosiwo ikwesịntụkwasịobi n’okwu Ya. Nime oge ọhụụ ndịa, anaagwọ ndị ọrịa náalụ kwa ọlụebube site n’ike ukwu nke Chineke.

N’ebe isiọlụ dị icheiche nke Apostolic Faith, anaenweta akwụkwọozi site n’akụkụ ụwa dum, náarịọ maka ekpere, mgbe ụfọdụ, ha naarịọ kwa maka ichafọ agọziriagọzi maka ndị ọrịa. Ihe Chineke mere otù onye, Ọ gaemere onye ọzọ; site kwa n’ihe mgbakwasịụkwụ n’Ọlu Ndi-ozi 19:12 anaezigara ndị nrịarịa na ndị náahụjuanya ichafọ ndịa. Anaedokwasị ichafọ eteworo mmanụ n’Aha Onyenwe anyị n’elu Baịbụl asaghereasaghe, ndịozi nke Chineke ewe bikwasị aka na ya wee kpeeekpere ka Chineke gwọọ onye ọ bụla nke gaanata ya ọrịa ya. Nzaghachị nke ndịa náede akwụkwọ naarịọ banyere ekpere na ichafọ etere mmanụ dị ebube! Enwere ọtụtụ ịgbaàmà náenweghị ihe isiagụgọ site n’ọnụ ndịkom na ndịnyom nweworo ọgwụgwọ nke arụ ha n’aka Chineke site n’ekpere na ijéozi nke ichafọ etere mmanụ olive.

Ibikwasị Aka N’isi

Site n’arọ 1906 mgbe mmiriòzùzò nke ikpeazu zoro, ọtụtụ okpukpé ụgha dị icheiche ebiliwo iduhie ụmụmmadụ site n’ezi ọlụ nke Chineke. “Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-ama! ọ buru na ha adigh-ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ digh chi-ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20). Dịka Okwu Chineke si kwu, anyị gaanwapụta ihe niile na onye ọ bụla site n’Okwu Chineke, ọ bụrụ kwa na ha adịghị ka “otù a ka Onye-nwe-ayi kwuru,” ha bụ ụgha na nduhie. Enwewo na mgbe garaaga, enwekwara taa, ndị náasị na ha nwere onyinye na ike dị aña nke náadịghị dịka Okwu Chineke si dị. Ọtụtụ nime ndị nduhie ndịa naekwupụta na ha nwere “onyinye” nke ibikwasị mmadụ aka n’isi, ha naekwu kwa na ha pụrụ inye mmadụ Mmụọ Nsọ site n’ibikwasi ndị náachọ ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ aka n’isi. Ọ bụ ihe nwuta na ndịamụma ụgha ndịa eduhiewo ọtụtụ mmadụ. Ọ bụrụ na ụmụmmadụ anatawo ihe ọ bụla site n’aka ndị nduhie ndịa, n’ezie ọ bụghị Mmụọ Nsọ.

O nweghị ebe ọ bụla nime Okwu Chineke nke nwere ibikwasị mmadụ aka n’isi dịka otù nime onyinye nke Mmụọ Nsọ. Akwụkwọnsọ ekwughị n’ebe ọ bụla na Pọl maọbụ Pita, maọbụ onye ọ bụla n’etiti Ndịozi nwereike dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na Mmụọ Nsọ dakwasịrị mmadụ ndịa mgbe Ndịozi bikwasịrị ha aka n’isi. Emere ka ibikwasị aka n’isi bụrụ ụzọ ezi edo otù onye maọbụ ọtụtụ mmadụ nsọ maka ijéozi na ịlụọlụ Chineke. Rue ụbọchị taa, ndịokenye na ndị náejéozi nke nzukọ Kraist naebikwasị ndị nrịarịa aka n’isi mgbe ha náekpere ha ekpere maka ọgwụgwọ nke arụ ha, na n’ido Ndịozi n’ụlọ Chineke nsọ n’otùaka ahụ kwa; ọtụtụ mgbe ndịozi na ndịọlụ nke nzukọ Kraist naebikwasị aka ha n’isi ndị náachọ nzọpụta maọbụ ọlụ omimi ọzọ nke amara nime ndụ ha. O nweghị onye ọ bụla bụ ezi onye Chineke gaekwu na ya nwereike inye onye ọ bụla Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ bụ Onye nke atọ nime Ebube atọ ahụ nke dị n’otù Chineke, ọ dịghị kwa mmadụ ọ bụla náachị Ya maọ bụ pụrụ ịchị Ya. Ụmụmmadụ naenweta ike nke Mmụọ Nsọ n’ihi na ha naekpeekpere, náenye Chineke ndụ ha, náewetara Chineke ihe ọlụ nke edoro nsọ. Ndị náanata ike nke Mmụọ Nsọ bụ náánị ndị edoro nsọ, Mmụọ Nsọ adịghị adakwasị ụmụmmadụ n’ihi na otù onye bikwasịrị ha aka n’isi.

N’Aha Jisọs

Ihe pụtara ìhè mere n’Efesọs nke nyere Kraist otuo n’ebe ọ dị ukwu, wee mee kwa ka ọtụtụ mkpụrụobi bịakwute Chineke. Ndị Juu asaa bụ ndị náejégharị nwara ịchụpụ ndịmmụọ ọjọọ site n’aha Jisọs onye Pọl naekwusa. Mmụọ ọjọọ ahụ mara aha Jisọs Kraist na nke Pọl, ma ọ jụrụ ndị Juu ndịa nke náejégharị ịchụpụ mmụọ ọjọọ sị: “ma unu onwe unu bu ole ndi?” Nwoke ahụ nke nwere mmụọ ọjọọ wee lụsi ndị Juu ahụ ọgụ n’ebe ọ dị ukwu wee tie ha niile ihe nke ukwu nke mere na ha gbalagara. Amara nke a n’Efesọs niile, óké egwù wee tụọ ọtụtụ mmadụ, ebuli kwara aha Jisọs Krais elu nke ukwu, nke mere na ọtụtụ pụtara ìhè wee kwupụta mmehie ha, wee nara kwa Oziọma. Ọtụtụ ndị náeme mgbasị kpokọtara akwụkwọ ha, wee rechapụ ha ọkụ n’iru ọra mmadụ, ọnụahịa akwụkwọ ndịa bụ ihe dị ka Puku ọlaọcha iriise (50,000).

“Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n’iru n’iru nādi kwa irè.” Mgbe eji ike nke Mmụọ Nsọ náekwu Okwu Chineke, anaazọpụta mkpụrụobi, anaeme ka ndị ọrịa na ndị na ahụjuanya dị ike, anaanapụta kwa ndị mmụọ ọjọọ náemekpaarụ taa, n’ihi na Jisọs Kraist (Okwu ahụ) “di otù aka ahu nyahuru na taa, e ru kwa mgbe nile ebigh-ebi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere Efesọs ji bụrụ ezigbo ebe dịmma ikwusa Oziọma?

  2. 2 Àrọ ole ka Pọl nọdụrụ n’Efesọs?

  3. 3 Òlee otú anyị si mara na ndịa náesoụzọ Jisọs nọ n’Efesọs amataghị ihe ọ bụla banyere ọwụwụmmiri nke Kraist?

  4. 4 Gịnị mere Pọl ji wụọ ha mmiri ọzọ ebe ọ bụ na awụwo ha mmiri dịka Jọn Onyeọwụmmiri ji kuzie?

  5. 5 Gịnị mere Pọl jiri jụọ ma ha anatawo Mmụọ Nsọ?

  6. 6 Gịnị mere anyị gaeji wee chee na Chineke chọrọ ka ndị nke Kraist niile nata ike nke Mmụọ Nsọ?

  7. 7 Òlee ebe nime Akwụkwọnsọ, ka Nzukọ nke Apostolic Faith si nweta ike izipụrụ ndị nrịarịa ichafọ maọbụ ákwà epron nke ekpekwasịrị ekpere n’elu ya?

  8. 8 Gịnị bụ nzube nke mbikwasị aka nzukọ Kraist naebikwasị mmadụ?

  9. 9 Gịnị mere na ndị Juu ahụ nke náejégharị ịchụpụ mmụọ ọjọọ enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’aha Jisọs?

  10. 10 Gịnị ka enweghị ike ha n’ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ wetara?