2 Ihe Emere 29:1-36

Lesson 339 - Senior

Memory Verse
“Umum, ugbu a unu ejehiela; n’ihi na ọ bu unu ka JEHOVA rọputara iguzo n’iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi” (2 Ihe Emere 29:11).
Cross References

I Hezekaia, Eze Juda

1 Nna ya emeghị ihe ziriezi n’anya JEHOVA, 2 Ihe Emere 28:1-4; 2 Ndi Eze 16:1-4

2 Nne ya bụ ada onyeamụma, 2 Ihe Emere 29:1; 26:1, 5; 2 Ndi Eze 18:2

3 O mere ihe zirieze n’anya JEHOVA, ọ bụ ezie na nna ya bụrị ajọ eze, 2 Ihe Emere 29:2; 2 Ndi Eze 18:3-7

II Omume Hezekaia mere Ikwagidesi Ezi Òfùfè Chineke Ike

1 Otù nime ihe mbụ Hezekaia mere ná mmalite ọchịchị eze ya bụ na o meghere ụzọ Ụlọnsọ Jehova, 2 Ihe Emere 29:3; 28:21, 24; 2 Ndi Eze 16:8, 14-18

2 Ndị nchụàjà na ndị Livai malitekwara ido onwe ha nsọ, 2 Ihe Emere 29:4, 5

3 Hezekaia chetara omume ọjọọ nke nnanna ha mere ma kwue kwa otú iwe Jehova si dakwasị Juda na Jerusalem, 2 Ihe Emere 29:6-9; 28:5-8; 2 Ndi Eze 17:13-20

4 Ọchịchọ obi nke Hezekaia bụ ka ha laghachikwute Chineke nime mmụọ na n’eziokwu dịka ha dịrị na mbụ, 2 Ihe Emere 29:10, 11; 6:24, 25; 7:12; I Ndi Eze 8:23, 28-30, 33, 34

III Ókù nke Ndịisi nchụàjà na Ndị Livai zara Náetufughị oge

1 Ndị Livai wee gee ntị n’okwu nke Hezekaia gwara ha wee mee ngwa idebe onweha nsọ, 2 Ihe Emere 29:12-15

2 Ndị Livai na ndị nchụàjà wee mee ka Ụlọukwu Jehova dị nsọ, òtù ọ bụla mere ozi nke enyere ha, dịka Iwu si dị, 2 Ihe Emere 29:16, 17; 23:1-11; Ọnu-ọgugu 1:50-53; 3:5-10; 8:5-26; 18:1-7, 20-23

3 Ewegara eze akụkọ dịmma, 2 Ihe Emere 29:18, 19

IV Iweghachi Ezi òfùfè Chineke nke Hezekaia weghachiri

1 Achụrụ àjà mmehie n’ihi alaeze, na n’ihi ebe nsọ ahụ na n’ihi mba ahụ, 2 Ihe Emere 29:20-40; Ndi Hibru 7:26, 27

2 Mgbe ebuuru àjà mkpuchi mmehie ma were kwa àjà nsureọkụ debe n’elu ebi ịchụàjà, ifèòfùfè na itò Chineke malitere n’otùaka ahụ, 2 Ihe Emere 29:25-30; 23:18; Abù Ọma 40:1-3; 51:12; 81:1-5; 95:1-7; Aisaia 30:29; I Ndi Kọrint 14:15; Ndi Efesọs 5:19, 20; Ndi Kọlọsi 3:16; Jemes 5:13

3 Agwara ndị ahụ ka ha nye onyinye afọ òfùfò ha, n’imejupụta òfùfè Chineke, 2 Ihe Emere 29:31-35; Deuteronomi 12:5-7; 16:10, 11; Ezra 3:4, 5

4 Emere ihe niile ngwangwa ka aghara itufu oge ọ bụla n’iweghachi kwa ezi òfùfè Chineke, 2 Ihe Emere 29:36; I Ndi Eze 19:20; Mak 1:18; Zekaraia 8:21; Ndi Efesọs 5:15, 16; Eklisiastis 9:10

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ọtụtụ Iheodide nke pụtara Ìhè N’ebeọgụgụ a

Mgbe mmadụ malitere ịmụ ihe banyere ndụ Hezekaia, Eze Juda, site n’ebe ahụ nke arọpụtara nime akwụkwọnsọ ka ọ bụrụ ebeọgụgụ nime usoro iheọmụmụ a, ọ naahụ ọtụtụ ebeọgụgụ pụrụ ichè n’etiti ndịọzọ n’ụzọ dị ịtụn’anya. Mgbe ọ naatụgharụuche n’ihe niile ndị edere n’akwụkwọ, ọ naahụ na apụrụ ịmụta ọtụtụ nime omume ọma niile ndịa nke eze mere site na ha.

Hezekaia “mere ihe ziri ezi n’anya JEHOVA, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere. Ọ …meghere uzọ ulo JEHOVA, me ka ha di ike. O we me ka ndi nchu-àjà na ndi Livai bata, si ha, Nurunum, ndi Livai; ugbu a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo JEHOVA, bú Chineke nke nna-unu-hà, nsọ.” Edekwara n’akwụkwọ na ọ sịrị, “Ọ di n’obim ka ayi na JEHOVA, bú Chineke Israel, gba ndu” na ọ gara n’iru igwasi ndi Liva ike sị: “Unu ejehiela: n’ihi na ọ bu unu ka JEHOVA rọputara iguzo n’iru Ya.” Ndị Livai we “chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba,” “Ma na mgbe amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibu abù JEHOVA …Nkpọkọta ahu nile na-akpọ kwa isi-ala, ndi-ọbụ abù nābu-kwa, ndi nāfu opi nāfu-kwa: anēme ihe a nile rue mgbe achubiri àjà-nsure-ọku. Hezekaia wee ñuria, ya na ndi-ya nile, ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n’ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.”

Ebe niile ndịa agụrụ gosịrị ịnụọkụn’obi na obi dị ọcha nke eze na ndị ya, nke ka nke nye ebo ahụ nke Chineke rọpụtaworo ịlụọlụ Ya. Ha gosiri na ntị Chineke ghereoghe mgbe niile ịnụ ákwá nke onye náechègharị nime omume ọjọọ ya, na O jikere n’oge niile iwukwasị ngọzi Ya n’elu ndị chọrọ ebere Ya. Ha naegosi na Chineke naahụ ndị niile ji obi ha niile náesoụzọ Ya n’anya; ndị were ozi Ya dịka ihe dị mkpà karịsịa ihe ọ bụla ọzọ nime ndụ ha.

Eze bụ Nwata nke Ihe Náanụọkụ n’obi

Hezekaia nwere ihenketa dị ala. Nna ya bụrị onye náefe arụsị, onye were ụmụ ya nye dịka ihe ịchụàjà n’iru arụsị apịrịapị na onye wuru ụlọ arụsị niile ndịa n’akụkụ niile nke Jerusalem. Nna Hezekaia na ndịeze náamaghị Chineke na obodo dị icheiche nke náamaghị Chineke gbara ndụ, wee pụnara Ụlọnsọ Chineke ọtụtụ ihe dị ókéọnụahịa dị nime ya iji egbo mkpà nke eze ndịa náamaghị Chineke. O merụrụ ebeịchụàjà nke ọla ma kwere ka ihe náadịghị nsọ na alụghụlụ jupụta n’Ụlọnsọ Chineke.

Ma mgbe Hezekaia rigoro n’ocheeze, mgbe ọ gbara iriarọabụọ na ise, o nyere iwu ka edo ebe niile ọcha nke malitere n’ebe ziriezi. Ka ụmụaka nke oge a ghọta ihe site n’omume nke Hezekaia. Ọbụná mgbe ihe dum dịrị njọ, otúọdị, nwa okorọbịa a were onwe ya nye Chineke na ihe banyere Ụlọ Chineke Ọ hụwo ajọ ihe niile dị n’ifè arụsị, wee bụrụ kwa onyeàmà nime èzínaụlọ ya banyere óké ahụhụ nke ifèòfùfè nduhie wetara. Ọ hụwo kwa mmegide dakwasịrị obodo ya n’ihi mmeri n’agha nke ndịiro ha meriri ha; bụ mmeri nke sitere n’ịrapụ ezi Chineke ha. Ma náatụghị uche na ọ bụ nwatà, o guzosịrị ike n’omume ya n’ebe Chineke nọ.

Ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ dị ka Hezekaia natara otù ndụmọdụ ahụ Pọl, onyeozi nyere nwaokorọbịa ahụ, bú Timọti n’oge dị n’iru. Pọl dere “Ekwela ka onye ọ bula lelia nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-àtù n’okwu, n’ibi-obi, n’ihun’anya, n’okwukwe, n’idi-ọcha” (I Timọti 4:12). N’ọgbụgba arọ, Hezekaia bú nwatà, na ọ kweghị ka nke a gbochie ya n’ịlụ ọlụ dịrị ya. O were onweya nye Chineke, Chineke wee nọnyere ya: n’ihi nke a, mgbe mmekpaarụ dakwasịrị ya nime ndụ ya, ọ pụrụ ịgwá Chineke: “Biko, JEHOVA, biko, cheta otú m’jéghariworo n’iru-Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya Gi ka m’meworo” (Aisaia 38:3). Ọbụná n’oge ihe ndakwasị ahụ, o mebeghị agadi; ya mere tule otú o si dị óké mkpà ná mmalite ndụ onye ọ bụla kwesịrị ka adị ya n’ụzọ ọ gaejupụta n’ọlụ ọma, ka o wee bụrụ mgbe ihe mberede dapụtara, ọ gaele anya n’azụ n’obiike, na Chineke gaatule ọlụ ya niile ma wee zaa ekpere ya nke ọ naekpe.

Mkpà Ọ dị ka Mmadụ Nwe Obi Ziriezi

Ụfọdụ ndị biri n’oge Hezekaia pụrụ ịsị na ezi ọhụụ a náachụso náánị ụkpụrụ nke ndọrọndọrọ obodo ka o wee nweta obi ndị elefuruanya n’oge ọchịchị nna ya, mgbe ha hụrụ ịnụọkụn’obi na óké ime ngwangwa nke o mere n’idozi Ụlọnsọ Chineke. Maọbụ, ha pụrụ ikwu sị na o nwere ịhụn’anya n’ebe ihe banyere ọlụ ñka nke iwu ụlọ nke mere na ọ chọghị ịhụ ka Ụlọnsọ ọma Chineke ahụ bụ ihe elefuruanya ka ọ dakpọsịa. Ndị ahụ nke pụrụ ikwuworị okwu dị otú a bụ ndị ahụ yiri ndị ụfọdụ dị n’oge ugbu a, ndị ọbịbịa ha n’ụlọ nzukọ bụ náánị iji ya mata ọtụtụ mmadụ n’ihi ọgan’iru nke ọlụ ha, maọbụ iji ya mee ka ha bụrụ ndị amara aha ha n’etiti ọtụtụ mmadụ, maọbụ ndị ahụ nke náagụ Baịbụl dịka akwụkwọ akụkọ irò nke ụwa, náekwere kwa na ọbụ akwụkwọ mmụta kachasị elu, ma ha enweghịike ịhụ ya dịka Okwu nke Chineke dị ndụ, nke náadịgide kwa rue mgbe ebighịebi. Ma n’oge náadịghịanya, ndịa niile nke pụrụrị ikwuokwu mmegide náenwghị ntọala aghaghị ịbụ ndị mesịrị kwere na ọ dị ezigbo échìchè nime omume niile nke Hezekaia karị ka ha chèworo.

Hezekaia sịrị, “Ọ di n’obim ka ayi na JEHOVA, bú Chineke Israel gba ndu.” Atụmààtụ nke Hezekaia tụrụ nime ndụ ya zuruòkè. Obi ya ziriezi! Ihe niile o mere ná mmalite ọchịchị ya abụghị maka ịnara otuto nke ụwa, ọ bụghị kwa ka amara aha ya, maọbụ n’ihi inweta ike nke ọchịchị. Ihe niile ọ naeme bụ iji nye Chineke otuto (I Ndi Kọrint 10:31). Ọ chọrọ ka ya na Chineke dị námma, ọ chọkwara ka ndị ya laghachikwute Chineke. Ọ hụrụ óké iwe dị ọkụ nke Chineke naaga ịdakwasị mba ahụ. Ọ matara na ọ bụ náánị nzọpụta nke Chineke gaanapụta ha site n’iwe ọkụ ahụ, na ihe mbụ agaeme n’ime ka obi ụmụmmadụ laghachikwute Chineke bụ iweghachị ezi ifèòfùfè nke Chineke. Ya mere, omume mbụ ya bụ ihicha na imezi ụlọ nke Chineke, ma apụrụ iluzi ọlụ a nkeọma site náánị n’aka ndị ahụ nke Chineke rọpụtaworo maka ọlụ ahụ -- ndị nchụàjà na ndị Livai.

Nime ihe niile ndịa anyị pụrụ ịhụ na Hezekaia mere omume zirieze. Ọ gaabụ ihe náabaghị urù inwe ụlo ekpere ehichapụworo unyi niile na adịghịọcha niile, ma ọ bụrụ na ndị náaga ekpere n’ebe ahụ edoghị onweha nsọ n’ọlụ ahụ, n’imezu ihe niile n’usoro n’ịlụ ọlụ ha kwa ụbọchị kwa ụbọchị. Ọ dịghị onye gaeleworị anya ike na nnonye nke Chineke ka ọ pụta ìhè nime Ụlọ Chineke ma ọ bụrụ na ndị náejéozi n’ụlọ Chineke bụ ndị náemebiiwu maọbụ na ha ewepụtaghị onweha ichè ịlụ ọlụ ha. Hezekaia ibu ụzọ kpọkọta ndịnchụàjà na ndị Livai bụ nnọọ ihe amamihe dị nime ya.

Anyị gụkwara n’akwụkwọ na ndịa arọpụtaworo zakwara òkù a n’ụzọ dị icheiche dịka ọnọdụ obi ha si dị. Apụghị ịmanye mmadụ amanye ka o feè Chineke; apụghị kwa isite n’inye ya iwu kwaba ya nime eziomume. Itụegwù náánị apụghị ime ka ọ bụrụ onyeozi kwesịrịntụkwasịobi n’iburu obe ya wee soro Jisọs. Ndi Livai zara òkù ma doo kwa onweha nsọ dịka iwu Chineke si dị.

Dịka anyị naamụ banyere ntọala dị ukwu nke nzọpụta, anyị naachọpụta na ọ dị ụzọ abụọ nime onyinye ukwu nke abụọ ahụ nke anaenye onye ọ bụla mezuru ọchịchọ niile nke Chineke, mgbe agụsịrị ya n’onye eziomume site n’okwukwe. Akụkụ mbụ nime onyinye nke odudonsọ a bụ nke anyị náaghaghị ime n’onweanyị. Akụkụ nke abụọ bụ nke ahụ Chineke naeme n’OnweYa. Akụkụ nke mbụ ido onweanyị nsọ nime iji obi chụọàjà nye Chineke. Anyị naejemi nime ijiobichụọàjà dị omimi n’oge a karịa ka anyị bu n’uche na mbụ. Mgbe ụfọdụ inyebiga onweanyị ókè a maọbụ idebe onweanyị ichè n’ụzọ dị otú a ka anaakpọ odudonsọ nke ememe -- mmadụ ido onweya nsọ. Akụkụ nke abụo bụ ọlụ nke iji Ọbara sachapụ, nke Chineke naalụ, nke náewepụ ezughịòkè nke amụrụ anyị nime ya wee náeme kwa ka anyị dị ọhụụ n’oyiyi Onye ahụ kèrè anyị; nke a ka anaakpọ odudonsọ zuruòkè. Jisọs kpereekpere sị, “N’ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe ha nsọ n’ezi-okwu” (Jọn 17:19). Jisọs, dịka Àjà nke mmehie na adịghịọcha anyị, nyere OnweYa maọbụ were onweYa chụọàjà ka ewe sachapụ anyị n’ọnọdụ mmehie nke amụrụ anyị nime ya -- ka anyi wee bụrụ ndị edoro nsọ.

Dịka anyị naaga n’iru n’iheọmụmụ anyị, anyị naahụ na ndị Livai malitere ọlụ ha ngwangwa, mgbe ha dozuworo onweha nsọ -- were kwa onweha doo ichè -- dịka Hezekaia gwara ha. Otú a kwa ka ndị nchụàjà ụfọdụ mere, ma edere n’akwụkwọ banyere ndịọzọ nime ndị dị iche sitere n’agbụrụ Eron na ha “edogh onwe-ha nsọ: n’ihi na ndi Livai zuru-òkè nime obi-ha ido onwe-ha nsọ karịa ndi-nchu-àjà.” Ndịnchụàjà ahụ náejighị obi ịnụọkụ za òkù ahụ nke ijikere onweha ijere Chineke ozi, apụghị ịlụ ọlụ ha n’ọnọdụ ha mgbe egburu iheeji chụọàjà; kama ọ bụ ndị Livai ndị obi ha dị ọcha ná njikere nime mmụọ na n’ọkpụkpọ ha, lụrụ ọlụ ahụ.

Ekpere n’ihi Mgbaghara Mmehie, na Ọzịzá nke Chineke

Ebe ọ bụ otù nime ọlụ mbụ nke eze ọ bụla nke ndị Chineke arọpụtara bụ ịmụ Iwu Chineke na iwere aka ya depụta ha n’akụwụkwọ ka o wee ghọta ihe niile enyere n’Iwu nkeọma, anyị pụrụ ịsị na Hezekaia mererị otú a. Cheta kwa na Hezekaia nyere iwu ka achụọ àjà mmehie “n’ihi ala-eze, na n’ihi ebe nsọ ahu, na n’ihi Juda.” Nke a pụtara na ọ chọrọ ka Chineke gbaghara ha mmehie niile nke garaaga. Agaghị agụpụ ndịọlụ na èzínaụlọ eze. Agụnyere ọbụná ndị ahụ niile náejere Chineke ozi. Échefughị kwa mba ahụ n’onweya.

Lee kwa otú Hezekaia náenwetaghị náánị otù ihe ịchụàjà enyere n’iwu, kama otú o chere nime obi ya na eleghịanya ụdị mmehie ndị ya mehiere chọrọ iheàjà dị ukwu karịa ka elereanya; o wee weta otù ụdị anụ okpukpu asaa. N’okwu banyere ịdịmkpà nke ndụ ebighịebi, Hezekaia ejighị ihe ọ bụla n’ụwa nke a kpọrọ ihe. Ọtụtụ mmadụ naabịakwute Chineke náarịọ Ya banyere onyinye nke ndụ ebighịebi, ma mgbe ha naeme nke a, ha naechè ọnụọhịa nke ihe ụwa ọ gaefu ha n’ịkwụ ụgwọ nke ịnata ngọzi ndụ ebighịebi n’aka Chineke.

Ọ dị ọnụahịa dịkarịrị elu nke apụrụ ịchọ n’aka anyị n’inweta ndụ ebighịebi n’aka Chineke? Náánị ịgbanarị ahụhụ nke ọkụalammụọ ezuwo ịbụ ihe mkwụghachị ụgwọ nye àjà ọ bụla mmadụ pụrụ ịchụ, maọbụ ọnụahịa mmadụ pụrụ iji urù nke ụwa, iheụtọ, ọnọdụ, maọbụ àkụ kwụọ. Ma Chineke naekwe anyị mkwà dị ukwu na anyị agaghị ahụ ahụhụ nke mgbe ebighịebi, ma ọ bụrụ na anyị ewere obi etiwaraetiwa na nke dị nwayọ bịakwute Ya. Chineke naenye anyị olileanya nke ndụ ebighịebi, na ọtụtụ ohere inweta ụgwọọlụ dị icheiche na ọñụ ebighịebi nke anyị náeleghị anya ha.

Ụfọdụ mmadụ naeche na otù mkpirikpi ọlaọcha maọbụ ihe yiri ha, otù uwe maramma nke ụdị eji mee ya naemegide òzízí nke Baịbụl, añụrị ụwa enwere nime nkeji elekere olenaole, ịnara iruọma nke mmadụ efù onye ya onweya náaghaghị iguzo n’iru ocheikpé Chineke, maọbụ iwere obi ha niile nye, bụ ihe dị ókéọnụahịa karịa ngọzi niile Eluigwe nke Chineke náeche ha n’iru. Mgbe ụfọdụ ụmụmmadụ naakpachara anya tufue olileanya niile banyere Eluigwe nke echere ha n’iru wee rọrọ ihe ụfọdụ ahụ nke ike gaagwụ ha nime ha na nwaoge mgbe ahụ ha etufue ha n’ọnọdụ trinket ọhụụ ụfọdụ, maọbụ iheụtọ nke ụwa nke ha gaeme kwa ngwa che échìchè banyere ha dịka ihe náabaghị urù. Ma onye obi ya zuruòkè gaahụ ezi ọnụahịa ahụ nke dị n’àkụ ụwa, mgbe ha eji tụnyere ọnụahịa nke Eluigwe, wee soro ụzọ nke ziriezi, wee chụọàjà niile kwesịrịekwesị, kwụọ kwa ụgwọ jurueju ka o wee nata iruọma na ngọzi nke Chineke.

Ọ bụ ihe doroanya na Chineke nụrụ ekpere nke ndịa na nke eze ha. “Mgbe amalitere isure àjà-nsure-ọkụ, amalitere ibu abù JEHOVA …Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi ọbu abù nābù kwa, ndi nāfu opi nāfu kwa: anēme ihe a nile rue mgbe achubiri àjà-nsure-ọku.”

Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ nwereike itinye ókéọñụ dị otú a nime obi mmadụ dịka ịmara nkeọma na agbagharawo mmadụ mmehie niile nke mgbe garaaga, na amamikpe nke mmehie agabigawo, na o nwereike ibindụ dị ọcha dịka ịdịelu nke ụkpụrụ Chineke si dị na dịka ọchịchọ niile nke ime obi ya si dị. Mmadụ pụrụ igbuikpere n’ala n’ụlọ ekpere nime óké mwuta nke dị n’obi ya n’ihi na Setan abụrụwo onye nke náachị ndụ ya, ma na mgbe ahụ site n’otù ekpere nke obi etiwaraetiwa na nke egwepịaraegwepịa o wee mata na etijipụsiwo ike ahụ nke náachị ndụ ya, na ewepụwo kwa mkpọrọ niile nke jideworo ya. N’oge ahụ ka abụ otuto náamalite. Mgbe ahụ ka anaakụnye ọñụ nke Eluigwe nime obi ahụ. Mgbe ahụ ka anaenye ya olilenya ọhụụ. Site na mgbe ahụ gaa n’iru ọ ghọwo onye ekèrè ọhụụ, nwa nke Eze -- nwa nke Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Nna Hezekaia, ọ bụ onye eziomume ka ọ bụ onye náemebiiwu?

  2. 2 Nne Hezekaia bụ ada onyeamụma nke Chineke, Òlee eze ọzọ nke ndụ onye nke Chineke a metụtakwara?

  3. 3 Àrọ ole ka Hezekaia gbara mgbe ọ malitere ịchịeze? Gụọ I Timọti 4:12, ma kwue otú esi mejupụta amaokwu nke a ná ndụ Hezekaia?

  4. 4 Gịnị bụ ihe mbụ Hezekaia mere banyere òfùfè nke Chineke?

  5. 5 Gịnị bụ iwu nke Hezekaia nyere ndị nchụàjà na ndị Livai?

  6. 6 Ụfọdụ nime ndị nchụàjà azaghị òkù otú achọrọ ka ha zaa. Gịnị ka nke a furu ha n’ohere ọnọdụ ọlụ nke Chineke? Ònye nọchitere anya ha ka ọlụ nke Chineke wee gaa nkeọma?

  7. 7 Gịnị ka Hezekaia kwuru sị na ọ dị n’obi ya?

  8. 8 Gịnị bụ okwu ndụmọdụ Hezekaia kwuru nye ndị Livai banyere nrọpụta nke Chineke rọpụtara ha ịlụọlụ Ya?

  9. 9 Òlee ndị achụrụàjà mmehie n’ihi ha?

  10. 10 Kwue otú ndị nchụàjà na ndị Livai siri doo Ụlọ Chineke ọcha, na otú, site nime nke a, ha jiri soo Iwu Chineke.

  11. 11 Gịnị bụ ihe dị iche n’odudonsọ nke ememe na odudonsọ zuruòkè? Òle nime ha abụọ bụ nke anyi n’imezupụta? Òle bụ nke Chineke?

  12. 12 Gịnị bụ ọnọdụ na ọlụ nke uri na ịbụabù nwere nime òfùfè Chineke n’oge a? Òle mgbe ịbụabù ahụ malitere?