I Ndi Kọrint 15:1-58

Lesson 327 - Junior

Memory Verse
“Ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (I Ndi Kọrint 15:57).
Notes

Ozi Pọl nye Ndị-Kọrint

Akwụkwọ mbụ na nke abụọ nke ndị Kọrint anaakpọ akwụkwọozi, bụ ozi dị icheiche nke Pọl Onyeozi degara nzukọ dị nime obodo Kọrint, Grik. Pọl anọwo ihe karịrị otù arọ na ọkara nime obodo a naekwusa, námbụ nye ndị Ju, emesịa nye Ndịmbaọzọ, n’oge amalitere nzukọ a. Kọrint bụ isi nke otu obodo bụrụ - kwa otu ngalaba nke ebe nile nke ndị Rom naachi. Ọ bụrị obodo mmebiiwu jupụtara nime ya naebe ọ dị ukwu, ndị bi nime ya bụ kwa ndị naeme mmehie dị icheiche. Ebe ọ dị ha ka ọnwụ ọ bụ ọgwụgwụ ihe niile, ha we naeme omume dịka ndị naasị, “Ka ayi rie ñu kwa n’ihi na echi ka ayi gānwu” (I Ndi Kọrint 15:32).

Ekwuwo ya sị na, ọ bụrụ na ụmụmmadụ gaekweresị ike n’onwe-ha na ha gaanwụ dịka anụọhịa, ha gaamalite n’oge naadịghị anya ibindụ dịka anụọhịa. Ndị bi na obodo Kọrint ebe anadịghị ekpere Chineke kwesịrị ka eme ka o doo ha anya na ọnwụ abụghị ọgwụgwụ ihe niile, Pọl wee bụrụ onye Chineke rọpụtara iburu ozi a dị mkpà jekuru ha. Otú ọdị, ọ bụghị náánị ndị ahụ ka ozi a dịrị, kama ozi a naagakwa n’iru site naokwu Chineke rue nde mmadụ n’ụbọchị taa. Ọtụtụ mmadụ taa naebi nime mmehie ma ha adịghị atụ egwu iwe nke Chineke gaadakwasị ndị naeme iheọjọ otù ụbọchị. “N’ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n’ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma-ọbu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ” (Elisiastis 12:14). Ọnwụ abụghị ọgwụgwụ ihe niile, n’ihi na “Ọ bu Kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mgbe, ma mgbe nka gasiri ikpe eso ya” (Ndi Hibru 9:27).

“Ndị Nke Kraist”

Pọl rụtụrụ ezi okwu ahụ aka nke bụ na Kraist bụ Onye mbụ si n’ọnwụ bilie naarụ nwere ebube; n’ihi nke a anaakpọ Ya “Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu” (Ndi Kọlọsi 1:18). Otù ụbọchị ndị eziomume bú ndị nwụrụ nime Kraist gaesi n’ílì bilie ndị dị ndụ bú ndị náemeriemeri “ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe” (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17). Ndị bú “igwe aturu” nke Kraist na onwe Ya gaeketa otuto Ya n’ọbịbịa Ya, ma agaghị ahụụ nke a dịka “ọgwụgwụ” nke ụwa, maọbụ ikpe nke ikpeazụ. (Lee Nkpughe 20:11-15). Agaeme ka mmadụ niile bilie ọzọ, ma ka anyị ghara iché na agaazọpụta mmadụ niile, n’ihi na ụfọdụ gaebili “iba na ndu ebigh-ebi, ufọdu iba n’ita uta riri nne na oyi agāso ha nke uku mbe ebigh-ebi” (Daniel 12:2) Agaenwe mbiliten’ọnwụ ikpeazụ nke ndị ajọomume; na otú ọ dị, ekwughị ihe banyere mbiliten’ọnwụ nke ikpeazụ, maọbụ ọgwụgwụ nke ụwa nime ebe ọgụgụ anyị a. Ma otú ọ dị, ọ bụ ihe ekwekọrịtara, bụrụ kwa ihe eji okwu a náeso kọwaa: “Emesia ọgwugwu ihe nile gābia” (I Ndi Kọrint 15:24).

Akpọghịdị aha ndị ahụ n’ebe a, bú ndị ahụ eliri n’ílì ha,bú ndị chere na ha gagbanarị ikpé Chineke náenweghị nzọpụta. Pọl naekwu nime ebeọgụgụ a banyere mbiliten’ọnwụ dị ebube nke ndị bụ “ndi nke Kraist.” Kraist nwụrụ n’ihi mmehie niile anyi, ewe lie Ya, O wee bilie ọzọ n’ụbọchi nke atọ (I Ndi Kọrint 15:3, 4); n’ihi na aha ọzọ dị ichè adịghị kwa n’okpuru Eluigwe, nke enyeworo n’etiti mmadu, nke anaghaghị izọpụta anyị nime ya, ma ọ bụghị aha Jisọs (Ọlu Ndi-ozi 4:12). Ka onye ọ bụla ghara ichè na ọlụ ọma náánị gaeme ka ya keta òkè ndụ ebighịebi; ka onye ọ bụla ghara inwe olileanya na ya gaeketa òkè ebube nke Eluigwe, na ebughị ụzọ chègharịa ná mmehie niile ya, ewe ji Ọbara Jisọs Kpuchie ha.

“Anagha Ya N’adighike”

Mgbe Chineke kere Adam, Ọ kpụrụ ya site náaja nke dị naala aha ahụ bụ Adam pụtara ájà uhie. Chineke wee gwa ya sị, “Ajà ka i bu, ọ bu kwa ájà ka i gālata” (Jenesis 3:19). Nime isi nke irinaise a, Pọl naeme ka o doo ndịnsọ niile na ndịmmehie niile anya na Kraist siri n’ọnwụ bilie, na oge naabịa mgbe agaenwe mbilite n’ọnwụ nke ndị niile eliworo n’ílì bụ ndị arụ ha ghọrọ ájà.

Pọl jiri eziokwu a dị mkpà tụnyere mkpụrụ nke akụrụ naala. Okwu a o jiri kọwa ihe n’ebe a maramma nke ukwu karị ịsị eliri! Dịka mkpụrụ akụworo n’ala si anwụ, nke ọhụụ wee pupụta site na nke ahụ nwụrụanwụ, otú ahụ ka ọ naadị mgbe eliri onye nsọ nke Chineke nime ílì. Anụarụ ya naalaghachiri ájà, na mgbe opi ikpeazụ ahụ dara, anụarụ ọhụụ nke náagaghị anwụanwụ nwere ebube gaesite n’ílì pụta. Lee olileanya dị ebube onye nke Kraist nwere! Arụ ọhụụ a agaghị anwụanwụ, maọbụ rịa ọrịa ma ọ bụ nọọ náadịghị ike. “Anāgha ya n’ire-uré ….. n’ihe-ihere …. N’adigh-ike ……aru nke nkpuru-obi nāchi;” ma “anēme ka o si n’ọnwu bilie n’eregh-uré …..n’ebube ….n’ike …. Aru nke Mọ di nime ya nāchi” (I Ndi Kọrint 15:42-44).

Mkpụrụmbụ na Owuweiheubi

Ná oge iwu, elere ndị mmadụ anya iwetara Onyenwe anyị mkpụrụmbụ niile nke ihe onwunwe ha: ehi, atụrụ, ọká, mmanya, mmanụ na aji nke atụrụ (Deuteronomi 18:3, 4). Mkpụrụmbụ niile bụ náánị ihengosi, ma ọ bụ akụkụ ntà nke owuweiheubi fọdụrụ náabịa. Ya mere Kraist, bụ onye naeweta ndụ bụ Mkpụrụmbụ niile nke ndị siworo n’ọnwụ bilie. Dịka Adam bụ onye wetara ọnwụ, otú a Kraist bụ onye wetara ndụ. “Nihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu” (I Ndi Kọrint 15:22).

Pọl depụtara na “Kraist nwuru n’ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di; na eli-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n’ọnwu nilie n’ubọchi nke atọ, dika ihe edeworo n’akwukwọ nsọ si di” (I Ndi Kọrint 15:3, 4). Ihe niile edeworo banyere Kraist site náaka ndịamụma mgbe ochie mezuru. Okwu Chineke doroanya, nke mere na, ọ dịghị eziokwu banyere ọnwụ Kraist, Olìlì na mbiliten’ọnwụ, ma ọ bụ ọbịbịa Ya nke ugbò abụọ, maọbụ akụkụ ọ bụla nke akwụkwọnsọ ka agaenwe obi abụọ nime ya. Tinyere akụkọ banyere mbiliten’ọnwụ nke ndị dere Oziọma nyere, akpọkwara aha ọtụtụ n’Baịbụl bụ ndị jiri anya ha hụ ihe niile mere, nke Pọl na onweya bụ otù onye nime ha, ọ bụ ezie na ọ sịrị, “Mu onwem dikarisiri ntà n’etiti ndi-ozi, … Esoburum nzukọ Chineke” (I Ndi Kọrint 15:9). Ọ dịka na o siiri ya ike ịgbaghara onweya mgbe o chetara mmehie ya niile garaaaga.

Ekweghịekwe

“Ma otù onye gasi, Èsi aña eme ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie? Ọ bu kwa aha aru gini ka ha ji bia?” (I Ndi Kọrint 15:35).

Pọl zara ajụjụ a site n’ịkpọ ndị ahụ ndị nzuzu; náezie ọ bụ nzuzu mmadụ ịgọnarị ihe bụ eziokwu n’ihi na ọ ghọtaghị, “ otú o si dị.” Ụfọdụ mmadụ naeji amamihe ntà na ike ntà ha nwere naatụ ike Chineke, ha adịghị kwa anabata ihe ha naapụghị ịkwọwa. Ka anyị soro nime ndị naakaahụghị ma ha kwere (Jọn 20:29).

Ọ dị mgbe Mmụọ nke Onyenwe anyị buuru Ezekiel bụ onyeamụma ga nime otù ndagwurugwu jupụtara n’ọkpụkpụ ndị ahụ kpọrọ nkụ - Mmọ Nsọ wee jụọ ya sị, “Ọkpụkpụ ndia, hà gādi ndu?” (Ezekiel 37:3). Ezekiel wee za sị, “Onye-nwe-ayi JEHOVA, Gi Onwe-gi-mara.” Anyị pụrụ ịgụ akụkọ ahụ wee mara na Chineke mere ka akwara dịkwasị ha, na anụarụ mee kwa ka akpụkpọarụ kpuchie ọkpụkpụ niile ahụ, emesịa ifufe wee kukwasị ha, ha wee dị ndụ -- “buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne.” Enyere ọhụụ a iji mee ka o doo Ezekiel na anyị onweanyị anya, bụ ike Chineke nwere iji mee ihe ndị ahụ dịka ihe anapụghị ime.

Olileanya Anyị

Opiike naadasị ụda ike bụ olu ebu ụzọ nụ, tupu anụ olu Chineke mgbe enyere ndị mmadụ iwu náelu ugwu Sainai. “Olu opi-ike ahu we nādasi ike nke uku,” óké egwù wee dakwasị n’obi ndị ahụ nụrụ opiike ahu (Ọpupu 19:16-19). Otù ụbọchị opiike ikpeazụ gaada, mgbe anụrụ olu opiike ahụ, arụ ndị eziomume ahụ nwụrụanwụ gaesi ná ílì bilie, arụ ndị nsọ dị ndụ ka agaagbanwe baa naarụ náagaghị anwụanwụ, nwekwara ebube (I Kọrint 15:52, 53).

Ndị nwoke, ndị nwanyị, ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa ndị azọpụtara n’ezie, ndị edoro nsọ, jikwa Mmụọ Nsọ na ọkụ wụọmmiri, ndị náebindụ náatọ Chineke ụtọ, náeji ọñụ náelepụ anya oge mgbe Jisọs gabịa. Ọ dịghị egwù agaahụ nime obi ndị ahụ jikereworo “izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu igwe” anyị na ndịnsọ, ndị siworo n’ílì bilie na “Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:17). Asị na Jisọs anọọdụ, asị kwa na ụfọdụ ndị dị ndụ taa gaanwụ ga n’ílì, échìchè banyere nke a adịghị ewetara ndị náemeriemeri egwù, n’ihi na ọnwụ atụfuwo ihe “ọgbụgba” ya. Ha ga ebili ọzọ n’ụbọchị mbiliten’ọnwụ. Ya mere “Ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu” (I Ndi Tesalọnaika 5:10). Nke a bụ olileanya anyị dị ebube, náakpali kwa mmadụ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ọ bụ ndị òlee hụrụ Kraist mgbe O si n’ọnwụ bilie?

  2. 2 Òlee ihe ọzọ náegosi na O sị n’ọnwụ bilie?

  3. 3 Gịnị ka “mkpurumbụ” pụtara?

  4. 4 Òlee otú esi were ọnwụ tụnyere mkpụrụ akụrụakụ?

  5. 5 Gịnị gaeme ndị agbapụtara mgbe opiike gaada?

  6. 6 Ọ bụ gịnị ka anaakpọ “iheọgbụgba nke ọnwụ”? kọwa.

  7. 7 Gịnị naechere ndị nke Kraist mgbe ọnwụ gasiri? Gịnị na echère ndịmmehie?

  8. 8 Gịnị ka ichere gaara abụ ọnọdụ anyị, ma asị na Kraist esighị n’ọnwụ bilie?

  9. 9 Gịnị bụ ihe kachasị mkpà nye anyị ime?