2 Ndi Eze 13:1-25; 14:9-16

Lesson 328 - Junior

Memory Verse
“Ọ gādim nọ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!” (Deuteronomi 32:29).
Notes

Mmekọrịta Ọjọọ

Jehoahaz mere “ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA.” Ọ bụụrụ eze Israel arọ irinasaa ma arọ ndị ahụ ewetaghị obi ụtọ. Mgbe mmadụ rapụrụ irubere Chineke isi, ọ gaghị enwe ezi ọñụ. O bụghị náánị na Jehoahaz wetara onweya obi erughịala, kama o wetakwara nsogbu nime ndụ Ụmụ Israel bụ ndị ọ naachị. Onye ọ bụla, site nándụ ọ naebi, naemetụta ndị nọ ya gburugburu. Ọbụná nime ụlọakwụkwọ, nwa ọ bụla jọrọnjọ naewetara ndị nọ ya gburugburu nsogbu, ma nwa dị mma náeme ka ndụ dị ụtọ.

Ụdị

Mgbe niile mmadụ naenwe ọchịchọ onye ọchọrọ ibi ụdị ndụ onye ahụ naebi. Ọ naarọrọ onye ọzọ ọ chọrọ ị dị ka ya. Ụmụ ntakịrị, naele ndị tọrọ ha, náeme kwa ihe ha hụrụ ha naeme. Náarụghịụka, ị hụwo Ụmụ ntakịrị ka ha naekwuokwu náadịghị mma n’ihi na ha nụrụ ka ụmụ nne ha ndị nwoke na ndị nwanyị tọrọ ha naekwu ụdị okwu ahụ. Ụfọdụ ụmụ ntakịrị ndị hụwororị ndị naeme iheọjọọ nime onyonyo, nime cinima, nime akwụkwọ ebe esere ọtụtụ ihe dị icheiche, ma ọ bụ ndụ ọjọọ ndị dị ndụ, esorowo omume ọjọọ niile ndị ahụ ha hụrụ. Site n’ime nke a, ha ewetawooro onweha, na ndịọzọ mbibi weta kwa mbibi nye akụ akpataraakpata.

Baịbụl gwara anyị ka anyị “riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi” (Abù Ọma 37:37). Nke ahụ pụtara na anyị gaeñomi ndụ nke ndị eziomume. Ma, karị nke a, anyị gaeñomi Kraist na onweya, n’ihi na Ọ bụ Ya bụ ihe nlereanya anyị, anyị aghaghị kwa isoro nzọụkwụ Ya niile. (Gụọ I Pita 2:21).

Kama iñomi eze ahụ bụ onye eziomume, Jehoahaz sooro mmehie niile nke Jeroboam onye ọ masịrị ime ka Israel ka o mehie. Ugbò irinaiteghete nime Baịbụl ka edepụtara okwu a banyere Jeroboam: “bú nke ọ jiri me ka Israel mehie.” Nke a bụ onye Jehoahaz soro.

Ihe Nlereanya Náadịghịmma

Nna Jehoahaz bụ Jihu, nwoke ahụ bibiri ndị náekpere Beal, dịka Chineke nyere iwu. O bụ ezie na Jihu rubeere Chineke isi na ime nke a, ma O “lezigh anya ijéghari n’iwu JEHOVA, bú Chineke Israel, n’obi-ya nile” (2 Ndi Eze 10:31). Nna Jehoahaz sooro ihenlereanya ọjọọ nke Jeroboam. N’ihi na Jihu ewepụghị aka n’ikpere nwa ehi ọlaedo ahụ awụrụawụ, Chineke wee kwenye Hazael, bú eze Siria imeri Ụmụ Israel. Mmadụ gaara echè na Jehoahaz gaara amụta iheọmụmụ site n’ihe nnwapụta dị ilu nke nna ya. Agara echè na ọ gara achị ọchịchị ya n’ụzọ dị ichè iji nwe ngọzi nke Chineke, kama ikwe ka ikpe Chineke dakwasị ya. Jehoahaz mekwara otù ụdị mmehie ahụ nna ya mere -- o sooro mmehie niile nke Jeroboam. Jehoahaz natakwara otù ụdị ahụhụ mmehie site n’aka Chineke dịka nna ya natara -- Ndị Siria nọgidere ná ịkpagbu ya.

Ịnọgide Nime Mmehie

Baịbụl naakụzi na ikpé Chineke dị n’arụ ndị mmehie. O kwukwara sị “mgbe onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu ya nke ọ meworo chighara, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume, ya onwe-ya gēme ka nkpuru-obi-ya di ndu” (Ezikiel 18:27). Ma Jehoahaz esighị n’ụzọ ọjọọ ya niile chigharịa. N’ihi mmehie niile nke Jehoahaz, Chineke wee nwe ihe megide Ụmụ Israel. Jehoahaz na ndị ya tara ahụhụ n’ihi mmehie niile ha.

Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ụbọchị taa. Ọ bụrụ na ndị mmadụ esighị ná mmehie niile ha chigharịa, ikpé Chineke gaadakwasị ha. Ọ bụrụ na ha kpe ekpere, rịọ maka mgbaghara, Ọ gaazọpụta ha kagbue kwa ikpeọmụma ahụ. Ha gaanata ebere mgbe ha kwupụtara mmehie ha niile wee rapụkwa ha (Ilu 28:13). Mgbe ha nọgidere nime mmhie ha niile, ha abụghị ndị nwere nzọpụta, ha gaata kwa ahụhu mgbe ebighịebi. Ọbụná mgbe ha dị ndụ, ha naata ahụhụ maka mmehie ha niile.

Ikpé

Nke a bụ otù akụkụ nke ikpé Chineke nye Jehoahaz na Ụmụ Israel: “ONYE-NWE-AYI … we nye ha n’aka Hazael, bú eze Siria, na n’aka Ben-hedad nwa Hazael.” Eze Siria abụọ ndị a kpagburu Ụmụ Israel ụbọchị niile nke ndụ ha. Ha bibiri ọtụtụ ndịnyịnya na ọtụtụ ụgbọala. Ha ekweghị ka ndịagha Israel baa ụba n’ebe ọ dị ukwu. Ha bibiri ọtụtụ ndịagha, wee “me kwa ka ha di ka ájá izọkwasi ukwu;” anaeji okwu ndị a egosi na ọ fọdụrụ ihe ntà ka ndịagha niile bụrụ ihe alara n’íyì. Agwara anyị na, n’oge ahụ anaazọcha mkpụrụ n’elu ala kpọrọnkụ, nke mere na ájá anaahụ naala naadị ntà, ọ bụ kwa ájá dị ntà ka anaahụ n’elu mkpụrụ azọcharaazọcha. Ịbụ ihe “emere ka ájá izọkwasi ukwu,” pụtara na ndịagha ahụ fọdụrụ ihe ntà, ka ọ dị ka ebe ihe náadịghị. Ndịiro mere ka ọnụọgụgụ ha dị ala, mee kwa ka ike gwụ ha. Ndịagha dị otú a apụghị ibuso ndịiro ha agha, ha ewetaghị kwa mmeri nye ndị Israel.

Ịchọ Chineke

Nime mkpagbu ya, Jehoahaz wee chọọ Chineke maka inyeaka. Ọ rịọghị maka ịgbaghara ya mmehie ya niile maọbụ rapụ mmehie ya niile. Jehoahaz rịọrọ maka inyeaka n’ihi na ya na ndịya bụ ihe ndị Siria jiri mere ihe mgbakwasị ụkwụ. Chineke wee ledaanya wee nwe ọmiko n’ebe Ụmụ Israel ndị anaakpagbu nọ. N’ihi na Chineke chetara ọgbụgbandụ Ya na Abraham, Aisak, na Jekob. O wee zaa ekpere Jehoahaz. O kwewo mkwà ị bụ Chineke ha na nke ụmụ ha. O kwuwo na Ya gaenye ha Ala Kenean ka ọ bụrụ ha “ihe-onwunwe ebigh-ebi.” O kwewo na Ya gaagọzi ha, ọ bụrụ na ha gaedebe ọgbụgbandụ-Ya, rube kwa isi. (Gụọ Jenesis 17:1-9).

Azara Ekpere

Òlee otú Chineke si za ekpere Jehoahaz? O zigaara Ụmụ Israel inyeaka. Ọ bụghị n’ụzọ inye ha onye ukwu amara aha ya na obodo, maọbụ site n’òtù agha dị aña. Nnapụta bịara mgbe ọtụtụ arọ gasịrị site náaka Jehoash onye weghachiri obodo niile nke Israel, bụ nke ndị Siria nara harị, site kwa náaka nwa Jehoash, Jeroboam, onye weghachiri òkèala niile nke Israel. Chineke “ehichapugh aha Israel n’okpuru elu-igwe: Ọ we si n’aka Jeroboam zọpụta ha (2 Ndi Eze 14:27).

Gịnị mere Jehoahaz ji chọọ inyeaka Chineke? Apụrụ iché na ọ garaachọ inyeaka na nwa ehi ọlaedo ahụ awụrụawụ bụ nke o kpere, féé kwa òfùfè. Ma ha bụ náánị arụsị náapụghị imere ya ihe ọ bụla. Site n’ịchọ Chineke, anapụtara ndị ya site náibibi ha kpamkpam. Chineke nyere ha ohere ọzọ ichègharị laghachi na okpukpé nke náánị ezi Chineke dị ndụ.

Mkpuchi na Inyeaka

Mgbe dum n’ụbọchị taa anaanapụta ndịmmadụ site ná ihe mmerụarụ, na site kwa ná ọnwụ mberede n’ihi ekpere niile nke ndị ha bụ ndị nke Kraist. Chineke náanapụta ha maka otù ihe -- ka ha wee chègharịa, nwekwa nzọpụta, jekwara Chineke ozi. Ọtụtụ ugbò Chineke azawo ekpere ndị anaazọpụtabeghị. Ịza ekpere mmadụ, naewuli okwukwe onye ahụ, naezi kwa ya ọlụ dịrị ya inye Chineke ekele na kwa ijere Ya ozi.

Anyị naagụ na Chineke gaabịaru anyị nso mgbe anyị jekwuru Ya n’ekpere. “Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso” (Jemes 4:8). Onye dere Abù Ọma sịrị “Ịbiaru Chineke nso dim nma Edowom ebe-ngbabàm n’Onye-nwe-ayi, bú JEHOVA, Ka m’we kọ akukọ banyere ije-ozi-Gi nile” (Abù Ọma 73:28).

Ma Jehoahaz, site n’ikpere arụsị dị icheiche, nọgidere ná ime mmehie n’iru Chineke. Nwa ya onye nọchiri ya náịbu eze, mekwara ihe jọrọnjọ n’anya Jehova. “O sighi na-nmehihe nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie wezuga onwe-ya, kama o jere ije nime ha.”

Nwa Jehoahaz onye nọchiri ya n’ịbụ eze Israel, ka akpọrọ Jehoash, nke amatakwara dịka Joash. Ọ dị kwa nwoke ọzọ nke aha bụ kwa Joash. Ọ bụ nwa Ehazaia bụ eze Juda. Anyị amụwo ihe banyere Joash, bụ nwata eze nke Juda (Iheọmụmụ 319). Nwa Jehoahaz ka anyị naakpọ kwa Jehoash.

Elaisha

Ụbọchị niile nke ndị ahụ, Elaisha bụ onyeamụma nke Onyenwe anyị. N’ụbọchị ikpeazu nke ndụ ya ọ rịaraọrịa. Jehoash bụ eze Israel wee jee ileta ya. Eze jere igosi nsọpụrụ o nwere n’ebe onyeamụma nke Chineke nọ, na kwa ijé gosi otú ọrịa Elaisha si náewute ya. Jehoash wee kwue okwu ndị ahụ Elaisha na onwe ya kwuru. O kwuwo ha mgbe ahụ ejiri óké-ifufe bulie Elaija elu rigorue Elu-igwe ( 2 Ndi Eze 2:11, 12). Nnam, nnam, ụgbọala Israel, na ndi-inyinya-ya.” Náenweghịobiabụọ, okwu ndịa naegosi na, Onyeamụma a site n’ekpere na okwu ndụmọdụ emeworo ụmụ Israel ihe dị ukwu karịa nke ndịagha ha meworo. Dịka Elaisha ugbu a. Ọ bụ ezie na Jehoash naekpere arụsị dị icheiche, ma o kwenyere na ọ bụ site náaka Elaisha bụ onyeamụma nke Onyenwe anyị ka Israel jiri nwe mmeri niile ha nwere. Eze gosịrị na ya nwere okwukwe nime ekpere na okwu niile nke Elaisha.

Otù Ụta na Àkú

Tupu Elaisha anwụọ, ọ gọziri Jehoash. Ọ bụ n’ụzọ dị otú a ka o si mee: Elaisha gwara Johoash ka o were ụta site na windo gbapụ àkụ naakụkụ ọwụwaanyanwụ. Elaisha wee tụkwasị aka ya abụọ náelu aka abụọ nke eze ka ọ naachọ ịgba àkụ ahụ. Ọrịa mere ka aka abụọ Elaisha ghara ịdị ike, ma emere ka ha dị ike site ná Onyenwe anyị. Elaisha wee gwa eze ka ọ gba. Ka àkụ ahụ fepụrụ baa n’ikuku, Elaisha wee sị na nke a bụ “àkú nzọpụta Jehova nwere.”

Ọlụ nke Anaejighị obi niile Lụọ

Elaisha gwakwara Jehoash ka o were àkụ ndị fọdụrụ tie náala. Jehoash náejighị ịnụọkụ n’obi tiri ala ihe náánị ugbò atọ. Elaisha wee baara ya mbá n’ihi omume anaejighị obi niile mee. Agwara Jehoash na ọ gara enwe mmeri zuruòkè n’ebe ndị Siria nọ ma ọ bụrụ na o tidara ala ihe ruru ugbò ise maọbụ ugbò isii. Ma ebe o si otú a dị, na ọ bụ náánị ugbò atọ ka ọ gaemeri ndị Siria n’agha. Mgbe Elaisha nwụrụ, okwu niile nke amụma ya mezuru. Ọtụtụ ugbò ka Jehoash buru agha megide Ben-hedad nwa Hazael bụ eze Siria. Ọ bụ náánị ugbò atọ ka Jehoash meriri n’agha dịka okwu onyeamụma nke Onyenwe anyị si dị.

Jehoash enweghị ịnụọkụn’obi maọbụ agbamume iji mee ka nsogbu nke ndụ maọbụ agha niile bịarue nánjedebe. O yiri ụfọdụ mmadụ n’ụbọchị taa, ndị náekpeekpere na nwa mgbe banyere ụfọdụ ngọzi, maọbụ ihe nwapụta site n’ebe Chineke nọ, ma n’oge náadịghị anya ike wee gwụ ha. Ha adịghị anọgide n’ekpere rue mgbe ha natara ọzízá, maọbụ, ha dịka ndị naanọdụ n’ụlọ, maọbụ ndị náala oge n’íyì náekwuokwu náabaghị n’ihe ha na ụmụ ntà ndị nwoke na ndị nwanyị ibe ha, mgbe ha kwesịrị ịnọ náeme ka ohere ha nwere ijéozi nime oziọma náaga n’iru, site n’ịkpọ ụbọ, ịbụ abụ, ịgbara Jisọs ama, ikpeekpere, inyere ndị ọrịa na ndị nọ ná mkpà aka, ịmụta ọlụaka ha nke ọma, iji mee ka ha wee ba urù nime ọlụ nke nzukọ.

Ibuli Elu

Ihe ndapụta mere n’oge ọchịchị nke Jehoash, mgbe Chineke mere ya ngwa ọlụ iji wetara Amazaia bụ eze Juda ikpé. Amazaia “mere ihe zire eze n’anya JEHOVA, ma ọbụghị site ná obi zuru òkè.” Amazaia wee jee buru agha megide ndi Edom, wee merie kwa ha n’agha. Mgbe ọ latara n’agha, o wee were arụsị niile nke ụmu Seir. O burughị ha laa n’ụlọ ya idebe dịka onyinye nke náechetara mmadụ banyere ihe mereeme. O guzobere ha elu ịbụrụ ya chị dị icheiche. O naakpọisi ala nye ha, náesure ihensureọkụ náesiìsí ụtọ nye arụsị niile ndị ahụ náenwebeghị ike ịnapụta ndị ahụ n’ekpere ha site n’aka Amazaia.

Obi Amazaia wee bulie ya elu ịnyaisi. O dịka o chefuru okwu niile nke onye nke Chineke ahụ Onye gwara ya sị “di ike ibu agha: … n’ihi na ike di nime Chineke inye aka na ime ka asu ngọngọ” (2 Ihe Emere 25:8).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee otú Jehoahaz na Jehoash si nwe mmekọrịta?

  2. 2 Ònye ka ha weere dịka ihe nlereanya ha gaagbaso?

  3. 3 Gịnị mere Jehoahaz ji chọ Chineke?

  4. 4 Gịnị mere Chineke ji zaa ekpere ya?

  5. 5 Ọ bụ onye meere Ụmụ Israel ihe karịrị nke ụgbọala, na ndịịnyịnya ha meere ha

  6. 6 Gịnị mere Jehoash ji ga leta Elaisha?

  7. 7 Gịnị bụ okwu niile nke ibuamụma nke Elaisha kwuru nye Jehoash?

  8. 8 Kwue ihe mere onye ahụ nwụrụanwụ atụbara nime ílì Elaisha.

  9. 9 Òlee mgbe obi Amazaia buliri ya elu ịnyaisi?

  10. 10 Gịnị mere Jehoash jiri merie Amazaia n’agha?