Emos 1:1-5; 2:4-8; 4:11-13; 5:18-20; 7:10-17; 8:4-13; 9:11-15

Lesson 329 - Junior

Memory Verse
“Egwù JEHOVA di ọcha, nēguzo rue mgbe ebigh-ebi Ikpe nile nke JEHOVA bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n’otù” (Abù Ọma 19:9).
Notes

Site N’ịbụ Onyeọzụzụatụrụ baa n’ịbụ Onyeamụma

Ọtụtụ mgbe nime akụkọ banyere Ụmụ Israel, Chineke naeziga ndịamụma ijé gwa ndị Ya arọpụtara banyere ihe dị icheiche gaeme n’ọdịn’iru. Ebe ọ bụ na Ụmụ Israel náalaghachikarị n’ikpere arụsị, ozi niile nke onyeamụma nye ha naabụkarị ịdọakanántị banyere ikpé.

Otù nime ndịamụma ahụ bụ Emos, onyeọzụzụatụrụ sitere na Takoa, nwa obodo ntà nke site na ya rue nandịda nke Jerusalem bụ ihe dịka maịlị iri. O jebeghị ụlọakwụkwọ nke ndịamụma, amụghị kwa ya naèzínaụlọ ndị amaara aha ha; ma Chineke lereanya n’obi ya wee hụ na ọ bụ onye Ya pụrụ ịtụkwasịobi isite n’aka ya nye Israel ozi nke sitere n’Eluigwe.

Ọ bụghị na ọ naadị Emos ụtọ ịgwa ndị Israel banyere iruuju niile gaabịa kwasị ha, ma gịnị ka ọ gaeme ebe ọkpụkpọ òkù nke Chineke dakwasịrị ya? “Onye-nwe-ayi JEHOVA ekwuwo, Ọ bu onye nāgagh-ebu amuma?” (Emos 3:8). Ugbò irianọ ka anyị gụrụ nime amụma o buru sị: “Ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta.” Emos ekwughị ihe ọzọ ma ọ bụghị ihe Chineke gwara ya kwue.

N’ihi Mmebiiwu Atọ

Mba niile ndị Emos buru ụzọ gwa okwu bụ mba niile ndị mere Israel ihe ọjọọ. Mgbe Chineke kpọrọ Abram ịbu nna nke mba ndị Juu, O kwuwo sị: “M’gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bụ kwa onye nākọcha gi ka M’gābu ọnu” (Jenesis 12:3). Ọtụtụ mba náekpere arụsị emejọwo Israel, ma mmehie ha niile ka arịbaworo ámá. Ugbua agaje ịta ha ahụhụ n’ihi ha. “N’ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n’ihi anọ, ka M’nāgagh-eme ka ahuhu-ya laghachi azụ.” Ọtụtụ mgbe ka Emos jiri okwu ahụ kwue okwu: “N’ihi njehie atọ” ….. na-kwa n’ihi anọ,” nke naakọwa na ọ bụghị náánị n’ihi otù mmehie maọbụ abụọ ka agaje inye ha ahụhụ, kama na ha emewo ọtụtụ iheọjọọ ọtụtụ ugbò nke kwesịrị ka enye ha ahụhụ n’ihi ya. Ọ bụ ezie, na ọbụná otù mmehie gaewetara onyemmehie amamikpe. Ndị ikpé mara dị aña ka ndịa náaghaghị ịbụ bụ ndị a meworo ọtụtụ mmehie.

Obi tọrọ ndị Israel ụtọ ịnụ banyere ikpé niile gaje ịdakwasị ndị náekpere arụsị, ma ha weere onwe ha dịka ndị nke Chineke arọpụtara ha na Ya nwere mmekọrịta nke anaagaghị emebi. Ha nwere obi na Chineke n’ihi iwere otuto aghaghị inyere ha aka náagbanyeghị mmehie niile ha.

Enwere ụfọdụ mmadụ n’ụbọchị taa ndị naechè ha ha bụ ndị nke Chineke arọpụtara, nakwa náagbanyeghị otú mmehie ha naeme ra, na ha ka bụ kwa ụmụ Chineke, na ha gaaba kwa n’Eluigwe. Ma Baịbụl sịrị: “nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu” (Ezikiel 18:4), náagbanyeghị onye ọ bụ.

Ndị Mkpagbu Nwere Akụ

Mgbe Emos kwusịrị okwu amamikpé megide ndị n’ekpere arụsị, o wee tụgharịa n’ebe ndị Israel nọ wee gwa ha ihe Chineke nwere megide ha. N’oge a Israel bụ mba náemerịemerị, nwekwara ojujuafọ n’ike ha nwere. Enwere ọtụtọ ndị ọgaranya nime obodo ndị náemefu akụnaụba otú ọ masịrị ha, náemegbu kwa ndị ogbenye. Ndị Israel a náeré kwa mmadụ dịka orù.

Isiokwu mkwusa nke Emos bụ eziomume nke Chineke. Chineke chọrọ ka ndị nke Ya hụrịta onweha n’anya, nwe obiebere n’ebe ndị ogbenye nọ, inyere ndị nọ ná mkpà aka, ma nkekanke, ikpéikpé ziriezi. Emos kwuru kwukwasị gwa ndị mmadụ na iji bie ndụ nwere ọñụ iji nwe iheụtọ na iruọma nke Chineke, ha aghaghị ịdị mma n’ebe ibe ha dị hụkwa ebere n’anya.

Ndị ahụ náechè maka náánị nke onweha na nke èzínaụlọ ha, náetinye oge ha niile iji nweta ihe nye náánị onweha adịghị enwe ọñụ. Ndị nwere ọñụ bụ ndị ahụ náenye ndịọzọ ihe, náagbalịkwa inyere ndị nọ ná mkpà aka.

Ekwere Mkwà Ngọzi, Ma Ọ Bụrụ

Chineke ekwuwo n’ezie na Israel bụ ndị nke Ya arọpụara. “N’ihi na ndi nsọ ka i buru JEHOVA, bú Chineke-gi; ọ bu gi ka JEHOVA, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n’elu ala” (Deuteronomi 7:6). Ma enyewo ha mkwà niile nke ngọzi náánị ma ọ bụrụ ha gaerubeisi ná ihe niile nke Chineke nyere n’iwu. Emos aghaghị ịgwa ha ugbu a na ha aghaghị idebe iwu niile ndị ahụ, n’ihi nke a, na ha ekwesịghị ịnata ngọzi niile ndị ahụ ha cherè na ọ bụ nke ha.

Mgbe Moses kwuru na Chineke gaedebe ọgbụgbandụ nke Ya na ndị hụrụ Ya n’anya, ọbụná rue puku ọgbọ, O tinyere, “Ọ nākwughachi kwa ndi nākpọ Ya asi n’iru ha, ime ka ha la n’iyi” (Deuteronomi 7:9, 10).

Ikpé niile nke Chineke aghaghị imezu. Ihe ọ bụla Chineke kwuworo gaemezu. Nnenanna pụrụ imenyere ụmụ ha egwù mgbe ụfọdụ na ha gaenye ha ahụhu n’ihi nnupuisi, ma mgbe nwa ahụ mesịrị nnupuisi, ha echezọ inye ahụhụ ahụ. Ma ọ bụghị otú a ka ọ dị n’ebe Chineke nọ. Ihe O kwuworo gaemezu. Nlezinaya dị añaa ka anyị náaghaghị inwe iji nrubeisi n’ụkpụrụ niile nke Chineke nyeworo anyị nime Baịbụl, ka anyị wee nwe iheụtọ nke ngọzi niile O kwere ná mkwà, kama ịnata ahụhu nke ikpé niile nke gaabaịkwasị ndị náenupuisi.

Ntị Niile Emechiri

Okwu niile nke Emos adịghị ndị Israel mma, ha wee sị ka ọ ghara ịgwa ha okwu n’ụzọ dị otú ahụ. Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa adịghị achọ ịnụ ihe banyere ikpé niile nke Chineke, ma ikpé niile ahụ aghaghị ịbịa, ọbụná ma asị na ha anụghị ihe banyere ha. Ọ dịghị mkpà na ịga amata banyere iheegwù dị n’iru, ka i wee wezuga onwegị n’ebe ọ nọ? Asị n’ụlọ gị naagba ọkụ, ị gaachọ ka ndị mmadụ ghara ịgwa gị banyere ya n’ihi na ọ bụ akụkọ náadịghị ụtọ? Ọ dịghị mkpà ka ị mara eziokwu ka i wee kpọọ ụlọọlụ náemenyụ ọkụ tupu ụlọ gị abụrụ ihe ọkụ laran’íyì?

Emos náagbalị inyere Ụmụ Israel aka. Ọ chọghị ịhụ na ha tara ahụhụ. Ma ha ejighị mgbalị ya niile kpọrọ ihe, ọbụná ndị okpukpé enweghị ihe ha jiri mgbalị ya kpọrọ. Onyeisi nchụàjà zigaara eze ozi na Emos bụ onye náemekpá obodo ya arụ. Emos ebuworị amụma na eze gaanwụ, na ndịiro gaadọrọ kwa ndị Israel n’agha, ma nke a bụ eziokwu, ma ọ bụghị Emos kpatara ya. Chineke naezipụ ikpé dị icheiche n’ihi mmehie niile nke Ụmụ Israel.

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa Ọ dọrọ ndị mmadụ akanántị ka ha chègharịa, ma ọ bụghị otú a ha gaala n’íyì. Ha egeghị ya ntị, kama ha sịrị, “Wepunu Ya.” Ha wee gbue Ya dịka ha gbuworị ọtụtụ ndịamụma ndị buru Ya ụzọ. Ma n’oge náadịghị anya okwu niile O kwuru malitere imezu; tupu iriarọanọ agabiga, ihe karịrị otù ndé ndị Juu anwụwo, ọtụtụ ndé wee hụ ahụhụ dị óké ilu. Ka anyị cheta mgbe niile na ihe niile Chineke kwuworo gaemezu.

Emere Ebere

Ụfọdụ nime ikpé niile Chineke gwara Emos ka o kwupụta jọrọnjọ nke ukwu nke mere na Emos malitere ikpere ndị ahụ ekpere. “Onye-nwe-ayi JEHOVA, biko gbaghara: Jekob, ò gesi aña guzosie ike? N’ihi na onye ntà ka ọ bu.” Emos rịọrọ ka emeere ndị Israel ebere. Chineke nụrụ ekpere ahụ wee wezuga ikpé ahụ. Ma náagbanyeghị nke a, Israel echègharịghị kwa. Ewezugawo ikpé n’ebe ọdị ogologo site n’ebe obodo anyị nọ, n’ihi na ákà nwere ọtụtụ mmadụ ndị náekpe ekpere maka ebere Chineke. Ákà nwekwara ndị agaazọpụta. Ma anyị amaghị ogologo oge nwezuga ikpé a gaanọ. Otù ụbọchị Chineke pụrụ ịsị, “Ozuwo.” Ọ gaewepụ ndị eziomume Ya site n’ụwa, ma ọnụma niile nke mkpagbu gaetiwa naarụ ndị jụrụ ịñantị.

Ọhụụ DỊ Icheiche

Ikpé niile mbụ nke Chineke nyere Emos bụ site n’okwu ọnụ. Ma ka oge naaga, mkpughe ahụ wee dịwanye ike, Chineke wee gosi Emos ọhụụ ihe niile náabịa. N’ikpeazu Emos wee hụ Onyenwe anyị n’ọhụụ ka O guzo n’akụkụ ebe ịchụàjà náekwupụta na ndị mmehie niile gaanwụ. “Ọ buru na ha egwubà n’ala-mọ, site n’ebe ahụ ka akam gēwere ha; ọ buru kwa na ha arigorue elu-igwe, M’gēme ka ha si n’ebe ahu ridata ….. ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n’ala oké osimiri, site n’ebe ahu ka M’gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha” (Emos 9:1-3).

Ụbọchị Nke Onyenwe anyị

Ndị Isael naele anya maka ụbọchị Onyenwe anyị. Ha chere na Chineke gaawụkwasị ndị náekpere arụsị ikpé n’ezie, ma were ọchịchị nke ụwa niile nye Israel. Ma Emos dọrọ ha akanántị sị: “Jikere izute Chineke-gi” Ọ sịrị na ụbọchị Onyenwe anyị gaabụ ụbọchị óké ọchịchịrị, ọ bụghị ụbọchị ìhè. Ọ bụrụ na ha naeche na ha gaje inweta ihe gaegbò mkpà n’ụbọchị ahụ, ha gaadị ka nwoke ahụ si n’iru bear gbalaga wee gbaba n’aka ọdụm; maọbụ onye ahụ bara nime ụlọ ya, náeche na ya gaenwe ihe gaekpuchi ya, ma n’ebe ahụ agwọ wee taa ya. Agwọ ịta ya dị njọ karịa na bear tara ya. Náánị otù ụzọ dị iji si n’iwe Chineke gbapụ, nke ahụ bụ ichègharị ma sikwa ná mmehie niile chigharịa.

Náagbanyeghị otú ndị mmadụ si náekwu banyere Baịbụl, na asị kwa na ha bụ ndị nke Kraist, ọbụrụ na amụbeghị ha ọzọ, ọ dịghị olileanya dịrị ha ịgbanarị ikpé niile nke dịrị ha.

Ụnwụ nye Okwu ahụ

Emos kwuru banyere oge agaenwe ụnwụ nke gaakarị ụnwụ nke ihe oriri. Ndịmmadụ naata ahụhụ nke ukwu mgbe ha náenweghịike inweta iheoriri; ma ha naeche na ha pụrụ ime nkeọma ma ewezuga Baịbụl. Ma oge naabịa mgbe ndị mmadụ gaawagharị site na ụsọ óké osimiri rue na nke ọzọ, ọbụná iji ọsọ, ịgbalị ijé nụ Okwu Chineke. Ndị niile ndị náejighị ịmụ iwu niile nke Chineke kpọrọ ihe, ndị jiworo òzízí niile nke Jisọs mere ihe ọchị, ndị kwuworo dịka ndị Juu kwuru si, “Wepunu Ya,” gaachọ ịnụ eziokwu, ma ha agaghị enweike ịchọta ya. Olileanya náánị ha nwere gaefunarị ha.

Anyị aghaghị ijisi Okwu Chineke ike! Okwu Chineke bụ Ìhè anyị iduru anyị gabiga ụwa nke a náagbụghị enyì anyị náenweghị ihe mgbu baa n’inwe Otuto. Nke a bụ nkasị obi anyị n’ebe a. Ọ bụ nri anyị site n’Eluigwe, ọgwụgwọ nye anụarụ anyị, ike anyị n’ihi ọlụ niile.

Otùpukuarọ

Emos kwukwara na olileanya dịrị ndị Israel. Ọ bụ ezie na Chineke gaeme ka ikpé niile ndịa dakwaị ndị Israel, ma náagbanyeghị nke a, Ọ gaazọpụta ndị fọdụrụ. Olenaole gaechigharịkwute Chineke wee nwe ihe ụtọ na ngọzi niile nke Kenaen mgbe agaewepụ ịbụọnụ. “M’gēme kwa ka ndim adọtara n’agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọgbọrọ n’efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ñua manya-ha; ha gēme kwa ubi agbara ogige, rie nkpuru-ha. M’gāku kwa ha n’elu ala-ha, agagh-eropu kwa ha ọzọ na-ala-ha nke M’nyeworo ha; otú a ka JEHOVA, bú Chineke-gi, siri,”

Emos kwesịrịntụkwasịobi n’ịgwa Israel banyere ikpé ọkụ niile gaadakwasị ha, ma Chineke nyere ya ọñụ nke ijidesi olileanya nke ọchịchị Otùpukuarọ ike, bú nke ndị niile náebindụ eziomume nime Kraist Jisọs gaenwe ọñụ nime ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye bụ Emos?

  2. 2 Gịnị bụ ntozuòkè nke o nwere iji bụrụ onyeamụma?

  3. 3 Ònye ka Emos buru ụzọ gwa okwu?

  4. 4 Gịnị mere ikpé gaeji adakwasị mba ndị ahụ?

  5. 5 Gịmị mere Israel jiri chee na agaghị enye ha ahụhụ?

  6. 6 Gịnị ka ndị Israel kwere banyere ụbọchị nke Onyenwe anyị?

  7. 7 Gịnị ka Emos kwuru banyere ụnwụ nke Okwu Chineke?

  8. 8 Gịnị ka Chineke gaemere ndị Juu n’oge ọchịchi nke Otùpukuarọ?