Maika 4:1-7; 5:2; 6:1-8; 7:18-20

Lesson 230 - Junior

Memory Verse
“Igātubà kwa nmehie nile ha n’ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri” (Maika 7:19).
Notes

Ndị Amụma Ntà Na Ndị Amụma Ukwu

Onye amụma bụ onye ọ bụla nke náanọchị anya Chineke n’iru ndị ya, maọbụ onye náagwa ndị ya ihe Chineke kpughere ya bụ ihe gaje ime n’ọdịn’iru. Onye mkwusa nke Oziọma kwesịrị ntụkwasịobi bụ onye eziomume bụ kwa onyeamụma nke Chineke dịka Mmụọ Nsọ náekpughere ya. N’ime Testament Ochie anyị naahụ ndị amụma ukwu anọ ndị kwuru ihe banyere ihe dị icheiche gaeme n’ọdịn’iru, na kwa ndị amụma ntà iri na abụọ Akpọghị ha ndị amụma ukwu maọbụ ndị amụma ntà n’ihi na ihe ụfọdụ nime ihe ha dere dị mkpà karị ihe ndịọzọ dere, n’ihi na “ihe ọ bula edeworo n’akwụkwọ nsọ bu ihe si n’obi Chineke puta” (2 Timọti 3:16), ma akpọrọ ha otú a n’ihi ịdị ogologo nke ihe ha dere si dị.

Ihe ọ bụla Chineke kwuru nime Okwu Ya dị Nsọ bụ ihe si n’ọnụ ndịozi Ya pụta gaemezurịrị, náagbanyeghị ma ọ bụ Moses, Devid, Solomon, Maika, otù nime Ndịozi ahụ, otù nime ndịọzọ dere akwụkwọ, ma ọ bụ asịkwa na ọ bụ ebe ọ bụla ná Baịbụl nke anaamaghị onye dere ya. “ọ digh amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mgbe ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwu okwu, mgbe Mọ Nso nēme ka ha kwue” (2 Pita 1:21)

Ebipụtawo Baịbụl nke atụgharịrị ọhụụ. Ma, ụfọdụ ihe agbanwere nime ya adakọtaghị ha na ihe ndị mbụ dị nime Akwụkwọnsọ. Ma Baịbụl ahụ nke anaakpọ “King James Version” bụ nke anabatara karị bụrụ kwa nke zuruòkè. Ọ bụ ọlụ nke òtù ụmụ nwoke jiri obi ha lụọ -- bụ ụmụakwụkwọ na Ndịozi náatụ egwù Chineke ọnụọgụgụ ha ruru iri mmadụ anọ na asatọ bụ ndị ọchịchọ ha bụ náánị ịchọ ụzọ dị mma agaeji chịkọta ihe niile edere n’akwụkwọnsọ ọnụ n’ihi ụmụmmadụ. Chineke agọziwo ya nye nde mmadụ bụ ndị gụworo ya dịka ihe ndụ ná ndụ ha. Ekwuwo ya sị na ihe Baịbụl ahụ anaakpọ “King James Version naalụpụta n’okpukpé anyị na ihe ọgụgụ anyị bụ ihe ọnụ náapụghị ịkọ.”

Ihe Ncheta

Iheọmụmụ a, anyị gaelebe anya nime ọtụtụ iheodide nke otù nime ndị amụma ntà, Maika, onye aha ya pụtara “onye dị ka Jehova.” Onye amụma nke Chineke a jiri olu okwu ya gosipụta ọnọdụ ọjọọ nke Israel na Juda, ma náebukwa amụma banyere ọbịbịa nke otù Alaeze ebi eziomume gaachị. Ndị nke Chineke arọpụtara, Ụmụ Israel, enupuruwo Onyenwe anyị isi ma sikwa n’iwu Ya wezuga onweha ọtụtụ mgbe. Dịka ọ dị ná ndụ ọtụtụ mmadụ taa, ha hụrụ náánị iheọjọọ n’anya ma kpọ kwa eziihe asị (Maika 3:2). Ma emere ka ebere nke Chineke rue ha arụ, ọ bụrụ kwa na ha gaechègharị, Ọ gaagbaghara ha. Ichègharaị bụ ịbịakwute Chineke n’iji obi dị umeala hụ onwe gị dịka onyemmehie, ma rịọ kwa mgbaghara, na inwe mkpebi zuruòkè na ị gaghị akpasu kwa Chineke iwe ọzọ site n’iji mkpachapụanya daa iwu Ya, bụ nke ịhụn’anya na eziomume. Ndịamụma naechetaraha na Chineke kpọputara ha site n’Ijipt ma nyekwa ha Moses, onye naenye iwu, na Eron, onye nchụàjà. Mmeso Ya n’ebe ha nọ bụrị nke obiọma na obiebere. Ha chetakwara mgbe ahụ Belak tụrụ àtụmàatụ ịla ha n’íyì site n’ime ka Belam kọcha ha? Arụgidere Belam n’ike ịgọzi ndị ahụ bụ ndị Chineke chọrọ ịgọzi. N’ezie Ọ bụ Chineke nke obi ebere!

Ikpé - Ebere - Obiumeala

N’isi nke isii, amaokwu nke isii, n’iheọmụmụ anyị, ọ dị ka agaasị na mkparịtaụka ahụ gbanwere, o wee dị kwa ka ndị ahụ naajụ Onyenwe anyị sị: Gịnị ka m’gēji bịa ma kpọ kwa isiala n’iru-Gi? m’gēji nwa-atụrụ dịka àjànsureọkụ? Ma ọbụ ọ gaadị Gị mma iji àjà ndịọzọ -- ọtụtụ puku atụrụ maọbụ ọtụtụ puku mmiriiyi nke manụ? Dịka agaajụ sị, Anyammiri ákwá ọ pụrụ izu n’ihi mmehie? Ọtụtụ onyinye, hà gaezu ihichapụ mmehie emeworo?

Mgbe ahụ Maika wee zaa sị na O gosiwo harị ihe niile ná mgbe garaaga; okwesịkwaghị ka ha jụọ ajụjụ ọ bụla, ma agaasị na ha anụbeghị. “Ọ bu kwa gini ka JEHOVA nāchọ n’aka-gi, ma-ọbugh nání ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije? (Maika 6:8).

Ikpé, ebere, obiumeala -- Chineke chọrọ ha niile n’aka anyị taa. Iji eziomume na ụzọ ziriezi nwe mmekọrịta nke mmadụ na ibe ya; ebere, nnagiderịta, obiebere na ọchịchọ zuruòkè ime eziihe nye ndịọzọ. Ọ bụghị náánị na o kwesịrị ka anyị rubere Iwu Ọlaedo ahụ isi, “Dika unu nāchọ ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu” (Luk 6:31), ma anyị ganaecheta kwa iwu a, “Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere” (Luk 6:36).

Ná “iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije” chọrọ ịnọgide n’ekpere na ịbụ onye náanọ nanché, ka mkpụrụ obi onye ahụ na uche ya ghara inwe nganga. “Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n’obi: n’ihi na ndi ahu gēketa uwa (Matiu 5:5).

Mgwọta nye Mmehie

N’ala a ebe enwere ohere ịgụ Baịbụl, anyị ekwesịghị ịbụ ndị náamaghị ihe Chineke chọrọ n’aka anyị. Nzọukwu mbụ bụ mmadụ ichègharị na ịbu onye azọpụtara site n’ọbara nke Jisọs. Ihe ngọpụ agaghị adị nye onye ọ bụla náabịa n’iru Ya n’ụbọchị ikpe ma ọbụrụ na Ọbara Jisọs adịghị n’obi ya. Egọ, eziomume nke onweonye, onyinye buru ibu, ma ọ bụ óké ibeakwa, agaghị akwụ ụgwọ mmehie, ma “Ọbara Jisọs, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (I Jọn 1:7).

Betlehem

Otù amụma pụrụ iche nime ọtụtụ amụma nke Maika buru bụ ihe o kwuru banyere ebe ọmụmụ nke Jisọs. Maika sịrị na náagbanyeghị na Betlehem bụ ebe dị ntà n’ọtụtụ ma bụrụ kwa ebe ọtụtụ mmadụ náebighị, na kwa ebe náadịghị mkpà n’ihe nke ụwa, na ọ bụ ebe dị mkpà karịsịa n’ihe nke imemmụọ, n’ihi na ọ bụ ya ka arọpụtara ịbụ ebe ọmụmụ nke Onye ahụ eteremmanụ. Anyị naecheta dịka anyị mụworo na mgbe ọmụmụ nke Jisọs na Betlehem, mgbe ndị amamihe ahụ si n’Ọwụwaanyanwụ bịara na Jerusalem, Herod bụ eze jụrụ ndịisi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ebe ekwesịrị ịmụ Kraist. Ọzìzá ha bụ, “Na Betlehem,” ha wee gwa ya okwu ahụ nke Maika onye amụma kwuwororị n’ọtụtụ arọ garaaga.

Eleghịanya ụfọdụ mmadụ apụghị ịhụ otú ezi ihe gaesị na Betlehem pụta; ma mgbe ụfọdụ Chineke naarọrọ ihe ntà ime ha ka ha dị elu karị ihe ukwu. Anyị naagụ ihe banyere Filip onye gwara otù nwoke anakpọ Nataniel, “Ayi ahuwo Ya … Jisọs Onye Nazaret.” Ma Nataniel ekwereghị na ezi-ihe ọ bụla pụrụ isí na Nazaret pụta, bụ ebe Jisọs biri dịka nwaokorọbịa. Ma mgbe ọ hụrụ ma nụ kwa olu Jisọs, O wee sị, “Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel” (Jọn 1:49). Otù Eze amụrụ na Betlehem ma wee biri na Nazaret! N’ezie mgbe niile Chineke naarọrọ “ihe nke nādigh, ka Ọ we me ka ihe nke nādi ghara idi irè” (I Ndi Kọrint 1:28). Óké Eze bụ Herod chèrè n’ezie na ọ bụrụ na agaamụ eze ọ gaabụ na Jerusalem; ma Maika sịrị na “Betlehem.”

Olileanya Nke Dịn’iru

N’isi nke anọ Maika naekwu banyere Alaeze eziomume nke agaeguzo n’eluụwa, anyi amụwo kwa banyere Ọchịchị nke Pukuarọ nke Kraist n’eluụwa -- otùpukuarọ nke udo pụọ n’agha mgbe ndịmmadụ “gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ogè, na ubi-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi” (Maika 4:3). N’oge ahụ Eze nke ndịeze na Onye nwenu nke ndịnwenu, náagbanyeghị naamụrụ ya nime obodo ntà Betlehem, gaachị Ndị Ya n’Ugwu Zion.

“Onye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, …O jigidegh iwe-Ya rue mgbe ebigh-ebi, n’ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu. O gēchèghari, nwe obi-ebere n’aru ayi; …. I gātuba kwa nmehie nile ha n’ebe dikarisiri omimi nke óké osimiri” (Maika 7:18, 19). Mkwà nke Chineke nye Abraham naadịgide: “Eme-kwa-ra Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob … Ọzọ kwa, emewom ka ọgbugba-ndum guzosie ike n’ebe ha nọ, inye ha ala Kenean” (Ọpupu 6:3, 4).

Ọ bụ ezie na Ụmụ Israel atụfuworị onwunwe nke Ala Kenean, Chineke naenyeghachị kwa ha ya azụ na mgbe ụbọchị ikpeazụ niile ndịa. Ndị Juu, ndị nke Chineke arọpụtara, náalaghachị na ala ha ọsọsọ, amụma nke Maika kwa bụ nke náekwu banyere ụbọchị ikpeazụ ndịa naemezu “N’ubọchi ahu, (Ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta) M’gēme ka ha zukọta ….. ọ bu kwa nwayi ahu nke achupuru achupu ka M’gāchikọta …. M’gēme kwa .... Ya bú onye emere ka ọ nọ n’ebe di anya ghọ mba nwere ume: JEHOVA gābu kwa eze ha n’ugwu Zaion” (Maika 4:6, 7). Eluụwa niile náechere oge puku arọ nke udo ahụ nke gaadị n’ụwa. Ị naekpe ekpere dịka Kraist kuziri anyị ka anyị kpee, “Ka Ala-eze Gi bia?”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ onye amụma?

  2. 2 Ị pụrụ ịgụpụta ọtụtụ ndịamụma ọzọ tinyere Maika?

  3. 3 Òlee obodo agaeme ka Alaeze ahụ guzo na mgbe ọchịchị nke pukuarọ nke Kraist?

  4. 4 À gaenwe agha na mgbe ahụ?

  5. 5 Ụzọ dị añaa ka Ndị Israel jiri gosipụta enweghị obiekele n’ihi obiọma nke Chineke n’ebe ha nọ?

  6. 6 Òlee ebe Akwụkwọnsọ naegosi anyị na emezuworị amụma a?

  7. 7 Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee taa?

  8. 8 Gịni bụ mkwà Jehova kwere nye Abraham, nye Aisak ma nye kwa Jekob?