Hosea 11:1-12; 14:1-9

Lesson 331 - Junior

Memory Verse
“JEHOVA nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha” (Abù Ọma 34:18).
Notes

Onye Amụma Ntà

Hosea, nwa Beeri, nwere ozi nye Ụmụ Israel. Ọ bụ onye amụma nke Onyenwe anyị n’oge mgbe Aisaia. Emos na Maika bukwara amụma. Ọ bụ ezie na amara Hosea dịka onye amụma n’akụkụ ugwu alaeze ahụ, Ụmụ Israel niile nwere òkè n’ozi ahụ. Hosea buru amụma ihe dịka iri arọ isiii. N’ime arọ ndị ahụ Jeroboam, nwa Joash (mgbe ụfọdụ onye anaakpọ Jehoash), chịrị n’Israel; mgbe Uzaia, Jotham, Ehaz, na Hezekaia bụ eze nke Juda.

Ọlụ Nke Onye Amụma

Ọ dị mkpà na agaenwe ndị amụma. Ọ dị mkpà inwe ụmụ okorọbịa ndị Chineke kpọrọ ezi ndị ahụ ozi-Ya. Chineke tụkwasịrị ndị amụma ahụ obi na ha gaekwu okwu ahụ Ọ chọrọ ka enye Ụmụ Israel.

Ndị amụma ahụ dọrọ ha akanántị banyere ikpé nke Chineke. Ha tụrụ ha mmehie ha n’anya, ma mekwa ka ha mata na ha abawo n’ụzọ ikpere arụsị. Ha gwakwara ha banyere mkwà dị icheiche nke Onyenwe anyị maka ngọzi, maọbụrụ na ha laghachị wee feè Chineke. Nke a bụ ọlụ dịrị onyeamụma. Hosea nwere ntụkwasịobi n’ọlụ ya nye Chineke na nyekwa Ụmụ Israel.

Ụzọ Ọjọọ DỊ Icheiche

Dịka anyị naatụgharịuche banyere Ụmụ Israel na ndịeze ha, n’oge nke Hosea, anyị naahụ otú Chineke na ndị amụma Ya si were ntụkwasịobi dọ ha akanántị, Jeroboam, eze Israel mere ihe jọrọnjọ n’anya Onyenwe anyị site náesighị ná mmehie niile nke Jeroboam nke ọzọ ahụ, onye mere ka Israel mehie, wezuga onwe ya (2 Ndi Eze 14:24). N’oge ahụ mwedan’ala nke ndị Israel dị “ilu nke-uku; ọ digh kwa onye ebochiri-egbochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru, ọ digh kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere” (2 Ndi-Eze 14:26). Chineke ekwewo kwa na agaghị ehichapụ aha Israel maọli, n’ihi ya O mere ka ọ bụrụ Jeroboam ka ejiri napụta Israel n’aka ndịiro ha.

Ekpenta

Anaecheta Uzaia dịka eze onye emere ka ekpenta dakwasị mgbe ọ bara n’Ụlọukwu Chineke isure ihensureọkụnáesi isiụtọ. Site n’ime ihe dị otú a o mehiee megide Chineke. Isure ihe nsureọkụnáesi isiụtọ n’Ụlọukwu Chineke bụ ọlụ na ohere dịrị náánị onye nchụàjà. Onyenwe anyị enyeworo Uzaia aka n’ụzọ dị ebube ma na mgbe ọ dị ike obi ya we dị elu rue mbibi (2 Ihe-emere 26:15, 16). Ekpenta nke Uzaia mere ka ekewapụ ya site n’ebe niile ezi ihe dị ná ndụ ya - èzí-na-ulo-ya na ulo-ya, ọlụ-ya na kwa ala-eze ya, na kwa ofufe-ya n’ihi na “ebipuru ya site n’ulo JEHOVA.” Mmehie, dịka ekpenta nke Uzaia, ekewapụwo ọtụtụ mmadụ si n’ebe eziihe dị. Emesoghị Uzaia n’ụzọ naezighịezi. Ọ gaanụworị okwu nke Chineke si n’ọnụ Hosea wetara ya, ma náagbanyeghị nke a o chegharịghị.

Oké Iheọjọọ

Mgbe etiri Uzaia ekpenta, nwa ya, Jotam, wee bụrụ eze. O “we me onwe-ya ka ọ di ike, n’ihi na o doziri uzọ-ya nile n’iru JEHOVA, bú Chineke-ya” (2 Ihe Emere 27:6). Jotam mere ihe zirieze n’anya Chineke ma ndị ahụ “nēbibi onwe-ya” (2 Ihe Emere 27:2). Nke a gaabụwọrị nrọrọ nke ndị ahụ. Hosea kwesịrịntụkwasịobi n’ime ka ha ghọta mmehie ha na ahụhụ náeso mmehie. Ehaz chịrị ha Juda mgbe Jotam chichara. Ọchịchị ya bụ ọchịchị ọjọọ, ọchịchị iheike na ifè arụsị (2 Ndi Eze 16:3, 4). “Ma na mgbe nkpagbu ahu akpagburu ya, ọ mekpuru emekpu kari imegide JEHOVA” (2 Ihe Emere 28:22). Mebiri ụlọ Onyenwe anyị, kpọchie kwa ọnụụzọ ya niile, me wuo kwa ebe ịchụàjà dị icheiche n’akụkụ niile nke Jerusalem (2 Ihe Emere 28:24).

Mgbe ọnwụ nke Ehaz gasịrị, Hekekaia wee bụrụ eze Juda. Ọ bụ ya bụ nwoke ahụ agwara ka o dozie ụlọ ya n’ihi na ọ gaje ịnwụ. Hezekaia kpereekpere. Chineke gwọrọ ya ọrịa ya, ma tinyere ya arọ irinaise na ndụ ya. Ọ tụkwasịwo Chineke obi, náeweugaghị onwe ya n’iso Ya; “Ma ọ bugh dika nmeso emesoro ya ka Hezakaia nyeghachiri; n’ihi na obi-ya di elu” (2 Ihe Emere 32:25).

Ozi Nke Hosea

Gịnị bụ ozi nke Hosea nye ndịeze a na ndị ha niile? Ọ bụ ozi ime ka ha mata na ha nwere mkpà nzọpụta. Ichègharị bụ mmadụ isi na mmehie niile ya wezuga onweya. Mgbe mmadụ chègharịrị ọ naenwe ihe mgbu n’obi ma nwekwa mwuta n’ihi ndụ ochie ya; ọ naenwe ọchịchọ ịgbanwe n’ụzọ ka mma; ọ naarịọ mgbaghara, ma nwe kwa njikere idozi ihe niile dị ná ndụ ya bụ nke megidere Chineke na kwa mmadụ ibe ya. Nke a bụ ozi nke Hosea nye ndị ahụ bụ ndị ndú ha jupụtara ná mmehie. Ọ gwara ha mkpà ọ dịrị ha ịlaghachikwute Chineke ma fè kwa Ya. O chetakwara ha oké ihe dị icheiche nke Chineke mere ha site kwarị na mgbe ahụ esi n’Ijipt kpọpụta Ụmụ Israel. Hosea rụtụtụ aka n’ihe ahkụ jọrọnjọ ná ndụ ha.

Dịka Nwatakịrị

N’inye ozi nke Onyenwe anyị, Hosea were Israel tụnyere nwa nye Chineke onye nọ dịka Nna ya. Dịka nna náakụziri nwa ya ịga ijè site n’ijide ya aka, otú a ka Chineke kụziri Israel. “Ka ọ ga” Ụmụ Israel adabereworị na Chineke inyere ha aka, ịkwagide ha, na ịkụziri ha.

N’ala Ijipt, Ụmụ Israel bụrị ndịorù, ịlụrụ Fero ọlụ. Onyenwe anyị napụtara ha n’ịbụ orù ahụ. O wepụrụ ibu arọ ha, ma nye kwa ha nri. Dịka anaewepu eriri yoke n’okpuru agba nke ịnyịnya ibu ime ka ha rie nri, Onyenwe anyị ewepụworị ibuarọ nke Israel ma nyekwa ha nri. Onyenwe anyị zitere Ụmụ Israel manna ka ha rie. (Ọpupu 16:15). Ma ha wee cheta azụ, cucumber, leeks, melon, onions, na garlic bụ nke ha riworo n’Ijipt. Ha tamuru megide Chineke Onye náenye ha nri, rue mgbe enyere ha ahụhụ n’ihi ntamù ha. (Lee Iheọmụmụ 99).

Njikọ nke Ịhụn’anya

Onyenwe anyị ji ịhụn’anya dọrọ Ụmụ Israel. Nye Onwe Ya. O jighị aka ike dọrọ ha dịka anaadọkpụrụ anụ jee n’otù ebe. Otù ụzọ ahụ ndị dị mma si eme ka ndịọzọ kwere n’ime ihe ka Chineke si eme. O jighị aka ike me ka ha feè Ya. Chineke hụrụ Ụmụ Israel n’anya.

Chineke gaadọrọ mmadụ niile nye n’onwe Ya n’ihi na Ọ bụrụ ha n’anya. Ọ bụ ịhụn’anya Ya nye anyị mere ka O zite Ọkpara Ya, Jisọs Kraist, ka Ọ bụrụ ihe ịchụàjà n’elu obe ka ewe zọpụta anyị. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyi, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16).

Nrọrọ Gị

Chineke naenye onye ọ bụla ọkpụkpọòkù iso Ya. Onye ọ bụla aghaghị ịrọrọ onye ọ gaefe. Chineke adịghị amanye onye ọ bụla n’ike iè Ya. Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ naenwe mmetụta na ha aghaghị ime ihe ụfọdụ ime ka obi tọọ ndịọzọ ụtọ n’ihi na ha naatụ óké egwu. Ha naefe ndịọzọ n’ihi “njikọ” nke egwù. Ndị nke Chineke náeso Ya n’ihi ịhụn’anya Ya.

Asị na ọ bụ Chineke ka ọ dịrị ime nrọrọ, mmadụ niile gaabụworị ndị nke Kraist. Chineke mere akụkụ nke dịrị Ya ime mgbe O mere ụzọ nzọpụta. Onye ọ bụla gaarọrọ n’etiti ifè Chineke ma ọ bu ifè Ekwensu. Ọ dịghị nrọrọ ọzọ dịrị onye ọ bụla. Mmadụ aghaghị ịhụ Chineke n’anya ri nne, ma ọ bụ hụ Ekwensu n’anya. “Ọ digh onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n’ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asi, hu ibe-ya n’anya; ma ọ bugh otú a o gējide otù lelia ibe-ya anya. Unu apugh ibu orù Chineke na àku” (Matiu 6:24).

Ụzọ nke Aka Ha

Hosea gwara ndị ahụ na ha chọworị ụzọ nke aka ha. Chineke emeworo ha ihe ukwu, ma zipụtakwara ha ịhụn’anya dị elu. Ma náagbanyeghị nke a ha “wee nọgide na ndaghachi-azụ.” Ndị Israel naeso Chineke na nwa mgbe ntà. Emesịa ha ewee chọ ụzọ nke aka ha. Ihe izè ndụ dị na mmadụ ịchọ náánị ụzọ nke aka ya, n’ihi “uzọ di nke ziri ezi n’iru madu, na nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu” (Ilu 16:25). Ndị amụma nke Chineke rịọrọ ndị ahụ ka ha laghachikwute Chineke, ibuli elu na ifè Ya. Nke a bụ ihe ahụ nke Hosea naemerị. Náagbanyeghị nke a, ndị Israel chere iru n’ụzọ nke aka ha.

Ịhụn’anya Chineke baraụba nke ukwu bụ nke mere O jiri gwa ndị Israel sị, “M’gēsi aña rara gi nye?” O nwere mwute n’obi n’ihi ndaghachiazụ ha. Ma Chineke bụ onyeobiebere na onye nwere ogologo ntachịobi. O wee sị, “M’gagh alaghachi ibibi Efraim (Israel): n’ihi na Chineke ka M’bu, abughm madu.” Ụzọ nke Chineke adịghị ka ụzọ nke mmadụ. Ụfọdụ mmadụ, n’iwe ha, gararị igbochi ma ghara kwa inye ha ohere ọzọ ichègharị.

Ụgha na Nduhie

Ndị Israel ekwuwookwu ụgha na nduhie site n’ikwe Chineke mkwà bụ nke ha naakwụghachịghị. Ha ekweworị Chineke ọtụtụ mkwà bụ nke ha náemzuzughị. Ọtụtụ mgbe, na mgbe akụkọ nke ndị Israel, ha laghachikwutere Chineke ma kwekwa mkwà irubere Ya isi. N’ụzọ ihe atụ, mgbe Joshua sịrị, “Ma mu onwem na ulom, ayi gēfè JEHOVA òfùfè,” ndị ahụ chọrọ ime nke ahụ, kwa.

Ha mara na Chineke esiworị n’Ijipt kpọpụta ha ma ha wee chọkwa ifè Ya. Ha wee sị, “JEHOVA, bú Chineke ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti” (Joshua 24:15, 24). Mgbe ọnwụ Joshua gasịrị, ha wee jụ Chineke ma fè kwa arụsị dị icheiche. Ọtụtụ mgbe ndị Israel mere nke a.

Nke a bụ eziokwu, ma ọ bụghi náánị Ndị Israel; ụfọdụ n’ụbọchị taa adịghị edebe mkwà ha kwere Chineke. Mgbe ha kpereekpere maka nzọpụta ha na ekwe mkwà ifè Chineke òfùfè, ma ha adịghị eme ya ugbu a. Ọtụtụ mgbe ka ndịmmadụ naarịaọrịa ha na ekwe Chineke mkwà, ma ọ naadị ka ụfọdụ naechezọ ihe banyere mkpebi ha na mkwà ha mgbe Chineke gwọchara ha, ha wee dị kwa ike. Na mgbe nsogbu na iheọjọọ, ụfọdụ mmadụ ekwewo Chineke mkwà dị icheiche, bụ nke ha náadịghị edebe. Ihe ndịa, hà abụghị ụgha na nduhie? Devid sịrị: “M’gākwughachi Gi nkwam nile m’kwere Gi, nke egbugbere-ọnum abua ji saghepu, nke ọnum kwu-kwa-ra, mgbe nkpà dirim” (Abù Ọma 66:13, 14).

Ekpere

Hosea mere ka ha mata nke a, igosi ha na ọ dị mkpà ka ha chègharịa. Ha enweghị obiekele n’ihi ihe niile Chineke meworo ha. Mgbe mmadụ gụkọrọ ngọzi niile ya ọ gaamata na ya ji Onyenwe anyị ụgwọ ririnne nke mere na ọ ghaghị ijere Ya ozi ma fè kwa Chineke. Ànyị náenye Chineke ekele n’ihi ihe O meworo anyị? Ma ọ bụ ànyị bụ ndị náadịghị enwe obiekele, ndị náadịghị agụkọ ngọzi Ya nye anyị?

Ọ bụghị náánị na Hosea gosiri ha mkpà ọ dịrị ha inwe nzọpụta ma ọ gwakwara ha otú ha gaesi nweta ya. Ọ gwara ha ihe ha gaeme, ma dụ kwa ha ọdụ iwegara Onyenwe anyị okwu -- ịgwa Onyenwe anyị okwu na inye Ya iji obichụàjà niile. Nke a bụ ikpeekpere. Kama iji anụọhịa chụọàjà, ha wee were “ọtụtụ nwa atụrụ awụrụanwụ” nke bụ otuto na ọtụtụ mkwà nye Chineke. Hosea wee gwa ha ka ha sị, “Asiria agagh-azọputa ayi, ọ bugh n’elu inyinya ka ayi gānọkwasi.” Nke a pụtara na ha nwere ọchịchọ ịtụkwasị Chineke obi kama ịdabere n’ụmụmmadụ dịka ha naeme na mbụ. Ha kwesịrị ikwenye na Chineke kama ịtụgharịuche n’ọlụ nke aka ha ịbụrụ ha chị. Onyenwe anyị nwere nlekwasị anya na ndị niile azọpụtaworo gaatụkwasị Ya obi, ma nabatakwa Ya dịka onye náánị bụ ezi Chineke na nke dị ndụ.

Ọtụtụ Mkwà

Chineke náekwe mkwà ebere nye ndị niile gaeghègharị n’ezie ndị náekwupụta mmehie niile ha ma rapụkwa ha (Ilu 28:13). Onyenwe anyị nọ nso ndị ahụ náenwe mwuta n’obi n’ihi mmehie niile ha, Ọ naazọpụtakwa ndị azọpiaworo (Abù Ọma 34:18). Tinyere ebere, ekwekwara mkwà ọtụtụ ngọzi ọzọ nye ndị ahụ náechègharị ma sokwa Chineke. Hosea kwuru na Chineke gaadịrị Israel ka igirigi. Agwara anyị na n’ọwụwaanyanwụ anaenwe igirigi ri nne, ime ka ala dee mmiri. N’ọtụtụ ebe ọzọ anaenwe nnukwu mmiriòzùzò, ma n’ala ebe Israel biri igirigi bụ mmiri nke náenye ndụ. N’ụzọ ihe nke imemmụọ, Chineke kwere mkwà izite mmiri nke gaetute obi ma mee kwa ka ọ naeto. Ị pụrụ ịchọpụta ụfọdụ amaokwu n’Akwụkwọnsọ ebe náekwu banyere Mmiri nke Ndụ?

Osisi Akụrụakụ

Hosea jiri onye naanata “igirigi” ahụ tụnyere osisi akụrụakụ. “Ọ gāma ifuru dika urodi, gbasa nkpọrọgwu ya nile dika Lebanon.” Ima ifuru dịka urodi -- otù mkpọrọgwụ mgbe niile naepupụta ọtụtụ urodi! Mkpọrọgwụ dịka Lebanon - ọtụtụ cedar nke Lebanon naeme ka mkpọrọgwụ - ha too ogologo baa nime ala dịka ogologo ha si dị n’elu! “Ịma-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsi gādi ka Lebanon.” Ịmamma dịka Olive -- mgbe niile osisi ahụ naeru akwụkwọ ndụ igosi ndụ na ịmị mkpụrụ! Ísìụtọ dịka Lebanon -- enyere ísì nke okokoosisi na osisi dị icheiche dịka ihe náesi ísìụtọ! Apụghị iji náánị otù osisi tụnyere ndị nke Chineke. Anaejikọta ihe dị icheiche ejiri mata osisi dị icheiche kwue ihe banyere ha ịma ifuru nke urodi mkpọrọgwụ tobara nime ala nke cedar, mkpụrụ na ịmamma nke Olive.

“Ha gēme ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine.” Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya ihe nkọwa dị otú a. Gụọ ihe Jisọs kuziri banyere “ọka wheat” bụ nke dara n’ala ma nwụọ kwa. (Jọn 12:24). Jisọs gwakwara ndị náesoụzọ Ya banyere vine ahụ náama ifuru náamị kwa mkpụrụ (Jọn 15:1-7).

Ndịezi mmadụ maọbụ Ndịajọmmadụ

N’ihi mkwà a niile dị icheiche, ma tinye kwa ndịọzọ, ọ dịghị ihe ngọpụ ọ bụla dịrị onye ọ bụla iso Onyenwe anyị. Onye ọ bụla pụrụ iso Efraim kwue, “Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ?” ma ọbu n’okwu nke-ya, “N’ihi gịnị kam gaeji nọgide ná mmehie?” Akwụkwọ nke Hosea naeji échìchè, na ewere náánị ụdị mmadụ abụọ mechie: ndị ezi mmadụ na ndị ajọ mmadụ; ndị ahụ náeso Onyenwe anyị na ndị ahụ náeje n’ụzo nke aka ha. Dịka enwere mkwà dị ebube dị icheiche nye ndị náerubeisi, enwe kwara mkwà dị icheiche dị ụjọ nye ndị náadịghị erubeisi. Òlee ụdị mmadụ ị bụ? “Ụzọ nile nke JEHOVA ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma nd-njehie gāsu ngọngọ nime ha.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka onye amụma “ntà” pụtara?

  2. 2 Gịnị bụ ozi Hosea nye Ụmụ Israel?

  3. 3 Òlee otú Ụmụ Israel jiri meso Chineke?

  4. 4 Òlee otú ha jiri gosi enweghị obiekele?

  5. 5 Gịnị ka Chineke meworo ha?

  6. 6 Gịnị bụ nchègharị?

  7. 7 Ònye ka ọ dịrị ichègharị?

  8. 8 Òlee otú mmadụ gaesi chọ Chineke maka nzọpụta?

  9. 9 Gịnị bụ ihe dị mkpà n’ịdị ogologo nke mkpọrọgwụ cedar?

  10. 10 Òlee otú ịhụn’anya nke Chineke ra n’arụ mmadụ?