Lesson 332 - Junior
Memory Verse
“Mu onwem bu JEHOVA, ọ digh kwa onye ọzọ di” (Aisaia 45:5).Notes
Nrubeisi na Nnupuisi
Site n’ụbọchị nne fúféré isi ya nye nwa ntakịrị ya, wee sị ya “È-è,” ụbọchị ahụ ka nwa ahụ gaamalite ịmụta na ọ dị ihe ya na ekwesịghị ime. Ka ọ naeto n’eme okenye ọ naamụta na ọ dị ihe ụfọdụ apụrụ ịnwa ya ka o mee, nke ọ matara na ya ekwesịghị ime; na kwa ihe ndịọzọ nke ya kwesịrị ime ma anaanwa ya ka ya lefuru ha anya. Otú ọ dị, anyị matara na ụmụntà ndị nwere nzọpụta naadị mma, náerube kwa isi, ma ndị ahụ náenwebeghị nzọpụta, naenupuisi mgbe niile nye ndị mụrụ ha, ndịnkụzi, maọbụ ndịọzọ bụ ndị nọ na ọchịchị. Ka anyị were nwantakịrị oge a kwue banyere ụmụntà ndị náenwebeghị nzọpụta.
Ọ bụrụ na ụmụntakịrị nọgide ná nnupuisi, ọ gaeru mgbe, ọbụná nna nke nwekarịsịrị ndidi náaghaghị inye ha ahụhụ. N’ezie, ọ bụ ọlụ dịrị ndị nnenanna hụrụ ụmụ ha n’anya igosi obiebere ha ebe ọ dị ukwu ịhụ na ha baara ụmụ ha mba mgbe ha kwesịrị ka abaara ha mba, n’ihi ọdịmma nke ụmụntà ahụ na ọdịn’iru.
Chineke, Onye bụ kwa Onye obiebere, nna nke ịhụn’anya n’ebe ụmụ Ya nọ, dị kwa mma náebe ndị náerubere Ya isi nọ; ma dịka kwa ka nna nke ụwa, ọ ghaghị kwa ịbara ụmụ Ya mba, mgbe ha kwesịrị ka abaara ha mba.
Nnupuisi nke Israel
Ka anyị cheta ihe ndị ahụ Chineke gwaworo ụmụ Israel ka ha ghara ime, nke ha mekwara náagbanyeghị ịdọakanántị Ya niile. Ọ kpọpụtawo ha pụọ ná Ijipt, site na okpuru eze ahụ náemebiiwu bụ Fero ọtụtụ arọ garaaga ma gosi kwa ha na Ya bụ Chineke ha. N’ụzọ pụtara ìhè Ọ siwo, “Gi enwela chi ọzọ tinyerem” (Ọpupu 20:3). Ọtụtụ ugbò ha emebiwo iwu ahụ; ha atụwo chi ọzọ dị icheiche egwù bụ náánị iheatụrụatụ na arụsị dị icheiche. Mgbe ahụ, dịka agaasị na Chineke adịghị eleanya site ná Eluigwe, ha emewo ihe náadịghịmma na nzuzo. Ha kwesịrị ịmata na Chineke hụrụ ha ka ha n’eme ihe ndị ahụ akpụrụakpụ náeguzobe ha “n’elu ugwu ọ bula di elu, na n’okpuru osisi ndu ọ bula” (2 Ndi Eze 17:10). “We suru ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’ebe ahu n’ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere … ha me-kwa-ra ihe ọjọ dị icheiche ikpasu JEHOVA iwe” (2 Ndi-eze 17:11). Chineke asịwo, “Unu emela ihe a” ( 2 Ndi Eze 17:12), ha kwesị kwara icheta. Ọzọ kwa, ha wee mee nwaehi abụọ fe-kwa kpakpando niile, ọnwa, na anyanwụ, jeere Baal ozi bú nke Elaija nwapụtara na o nweghị ike ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, maọbụ ikwuokwu.
Ọkpụkpọ Okù nke Mmụọ Nsọ
Mgbe Chineke sịrị, “Chigharịa” ha ekwesie olu ha ike, maọbụ ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha jiri isiike guzogide olu Chineke. Okwu Ya sịrị, “Onye anābara nba ọtutu mgbe ma ọ nēkwesi olu-ya ike, n’otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ digh kwa ngwọta di” (Ilu 29:1). Amaokwu ahụ ka bụ kwa eziokwu.
Ụfọdụ ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa naaga n’iru nime mmehie, ha náachọghị ichịgharịkwute Chineke. Mgbe niile ha naaga ekpere náaga kwa ụlọakwụkwọ nke ụbọchị ụkọ ma mgbe akpọrọ ka abịa n’ocheeze amara, ha na agbapụ n’ezi kama ijé ná ocheezeamara maka ikpeekpere. Ụfọdụ ndịnnenanna naarịọ ụmụ ha ka ha nye Chineke obi ha; mgbe ụfọdụ onyeozi nke Chineke gaagwa nwa okorọbịa maọbụ nwagbọghọ okwu maka inye Chineke obi ya, ma ọ gaajụ. Ọ naeme dịka ụmụ Israel mere ọ “na ekwesi olu ya ike” ma ọ bụ site ná isiike ọ na eguzogide òkù nke Chineke.
Ahụhụ Ahụ
Ka anyị hụ ihe mere ụmụ Israel. Nke mbụ, Chineke kwenyere ka eze sitere na obodo anaekpere arụsị, Asiria, bịa manye ndị ahụ ka ha rapụ ụlọ ha niile na ala ha wee jee na ala ndịọzọ, eleghịanya ịbụ òrù nke ndị Asiria. Anyị gụrụ na Onyenwe anyị, “siri n’iru Ya chupu ha” (2 Ndi Eze 17:20). O nweghịkwa ike ịnọgide náele mmehie na mmebiiwu ha anya.
Ebe ọ bụ n’ihi mmehie ka eji chụpụ ha n’ala ha, ezuwo ime ka ha chigharịkwute Chineke. Anyị na echeta na anyị anụwo banyere nwa mmefu onye gbapụrụ náụlọ na náebe nna ya hụrụ ya n’anya nọ. Mgbe o mefusịrị ego niile o nwere, ọ malitere icheta kwa ụlọ ọzọ, ma n’oge náadịghịanya ọ laghachikwutere ndị náechere ya, náelekwa anya ịhụ ya.
Ndị Nineve kweere onyeamụma nke Chineke wee chègharịa site ná mmehie ha. Ma ọ bụghị otú a ka ndịa bi na Samaria mere. Otù onye nchụàjà bịara náagbalị ikuziri ha, ma ha nọgidere náaga n’iru nime mmehie ha. Eguzobere arụsị dị icheiche nke ndị ahụ kpọrọ isi nye: otù nime ha dịka ewú, nke ọzọ ókéọkụkụ, nkịta, ịnyịnyaibu, ịnyịnyamule, nnụnụoluogologo, na kwa ókéọhịa. Náánị cheéchìchè banyere ụdị ikwàemò gaadị na ụdị okpukpé dị otú a! Anyị gụrụ na “JEHOVA ka ha nātu egwu, ma chi di iche nke aka ha ka ha nēfe” (2 Ndi Eze 17:33). Okpukpé ha wee bụrụ njikọtaọnụ nke iheọma na iheọjọọ. Okpukpé dị otú a dị njọ karịa na ọ dịghị nke anaekpeekpe maọlị. Otù nwaagbọghọbịa naaga n’ụlọekpere n’ụbọchị ụkọ, ma ná ụbọchị ndịọzọ nime izu, ọ naeje cinima, na n’ebe ọzọ dị icheiche anaeme mmehie, ma Chineke gosịrị ya na Oziọma na ihe nke ụwa adịghị ejikọta onwe ha.
Ọ gaabụ na náánị egwù Chineke ka ụmụ Israel naatụ, ma ha enweghị nsọpụrụ n’ebe Ọ nọ, ha enweghị kwa obi ifè Ya òfùfè. Enyere anyị iwu sị: “Tua egwù Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n’iwu: n’ihi na nka bụ ọlu madu nile” (Eklisiastis 12:13). Ha enweghị ọchịchọ idebe iwu niile nke Chineke, nke a bụ ihe mere Onyenwe anyị jiri “ju ha” ma “weda ha n’ala” ma “nye ha n’aka ndi nāpunara madu ihe, rue mgbe O siri n’iru Ya chupu ha” (2 Ndi Eze 17:20).
Nime obodo anyị nke mepereanya ndịmmadụ adịghị akpọ isiala nye arụsị nke osisi na nke ejiri nkume mee; ma otú ọ dị, anyị amụwo nime iheọmụmụ garaaga na mmadụ ọ bụla maọbụ ihe ọ bụla anyị hụrụ na anya karịa Chineke bụ arụsị nime ndụ anyị. Otù ihe apụrụ ịkpọ arụsị pụrụ ịbụ inwe ọchịchọ nke ịba na ụwa mgbe ọ bụla inwe “ihe-ụtọ-ya.” Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa na enwe ihe mgbochi site ná ebe ndị nnenanna ha bụ ndị nke Kraist nọ, ma náagbanyeghị nke a, mgbe niile ha na enwe àtụmààtụ nke onwe ha ịba nime mmehie iji hụ ihe iheụtọ nke ụwa gaeweta, mgbe ha toruru arọ ụfọdụ. Ọtụtụ ndịntorọbịa emewo nke a ma o wutere ha icheta ụbọchị mbụ ha sitere ná nkụzi nke nnananne ha jehie.
Ebere na Ikpé
Ọ bụ eziokwu na Chineke bụ Chineke nke ebere, nke ịhụn’anya, na nke ọmiko, “O zubegh ka ndi ọ bula la n’iyi, kama ka madu nile bia rue nchèghari” (2 Pita 3:9). Kama ọ bụ kwa Chineke nke ikpé na nke náabọọbọ; ma mgbe “iko nke ajọ omume” nke ụwa ochie a juru, Ọ gaezipụ mbibi naebe ndị náemebiiwu nọ.
Nwoke, nwanyị, okorọbịa ma ọ bụ nwaagbọghọbịa ọ bụla náenweghị nzọpụta nọ n’ihe egwù nke iwu gaje ịbịa na mgbe náadịghị anya. Ka onye ọ bụla n’ejikerebeghị izute Onyenwe anyị n’udo, chọọ iru Ya taa, n’ihi na “ugbu a bu oge anānara madu nke ọma; le, ugbu a bu ụbochi nzọputa” (2 Ndi Kọrint 6:2).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Gịnị ka eze ndị Asiria mere Israel?
2 Gịnị mere Chineke ji kwe ka nke a dakwasị ụmụ Israel?
3 Òlee nke bụ iwu mbụ nime iwu iri?
4 Kwue otú ndịa ji mebie iwu a.
5 Gịnị mere mgbe otù nime ndị nchụàjà bịara Asiria”
6 Ònye ka ha gara atụegwù fè kwa òfùfè?
7 Onye ka ndị mmadụ taa gaatụegwù? Ha náeme otú ahụ?
8 Kpọọ aha ụfọdụ ihe ndị pụrụ ịbụ arụsị nime ndụ anyị?