Ọlu Ndi-ozi 15:1-41

Lesson 333 - Junior

Memory Verse
“Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozizi-ayi ikuru ayi biakute Kraist ka ewe site n’okwukwe gu ayi ná ndi eziomume” (Ndi Galetia 3:24).
Notes

Nzọpụta Sitere na Kraist

“N’ihi na aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe nke enyeworo n’etiti madu, nke anaghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12). Aha ahụ bụ aha Jisọs. Anyị amụwo nime iheọmụmụ site nime Akwụkwọ nke Ọlụ Ndi-ozi na isi iheòzízí nke Ndịozi bụ Jisọs -- --onye akpọgidre n’obe nke bilikwara ọzọ. Na Jisọs si nándị nwụrụanwụ bilie bụ ihe ngosi na Ọ bụ Ọkpara Chineke dị nsọ. Site ná aha Jisọs Ndiozi jègharịrị náalụ ókè ọlụebube dị icheiche, náahụ kwa ka amụbatara ọtụtụ mmadụ nime èzínaụlo nke Chineke.

Ma Ndịmbaọzọ, ma ndị Juu chọrọ otù ụdị nzọpụta ahụ, na otù ụzọ ahụ kwa. Ha kwupụtara mmehie niile ha, chègharị kwa site ná iheọjọọ niile ha meworo, wee kwere kwa na Jisọs azọpụtawo ha. Ókè añụrị náadị naetiti ndị mmadụ ebe ọ bụla ha kpereekpere rue n’inwe nzọpụta, wee chọta kwa udo n’ebe Chineke nọ.

Ndị Kwere N’Òzízí Ndị Juu

Nime añụrị niile ndịa, enwere ụfọdụ ndị sitere na Judea bịa, ndị chọrọ ịrụgide ndị nke Kraist amụrụ ọhụụ idebe Iwu Moses. Nime ọgbọ niile, site na mgbe enyere Iwu n’ugwu Sainai, ndị nchụàjà Israel edebewo ụfọdụ ụdị náememe dị icheiche. Ma n’oge a ha naeme ka ọ bụrụ ihe anaapụghị ime na ndị Juu niile gaedebe ụkpụrụ niile ahụ. Ọ bụrụ na onye náabụghị onye Juu chọrọ isoro n’okpukpé ndị Juu, onye ahụ aghaghị kwa idebe ụkpụrụ niile ahụ.

Enwere ọtụtụ mkparịtaụka naịrụụka n’etiti ndị mmadụ banyere ihe ndị nke Kraist ọhụụ a kwesịrị ime. Ha ekpewo ekpere bụrụ kwa ndị azọpụtara site n’okwukwe nime Jisọs, wee bụrụ kwa ndị Kraist n’ezie. Ọ bụrụ na ha anọgide n’inwe nleruanya, náagụ Baịbụl ha náekpe kwa ekpere, ha gaedebe ịhụn’anya Chineke nime obi ha. Azọpụtara ha site n’okwukwe, ọ bụghị site n’ọlụ ọ bụla ha lụworo. Ma ndị Juu a náekweghịekwe (ndị náanabataghị òzízí ahụ), ndị anaakpọ ndị náagbaso òzízí ndị Juu, échèghị na ịbụ onye azọpụtaworo ezuwo. Na ndị ahụ gaabụ kwa ndị ebiri ugwu dịka Iwu Moses sị dị.

Nke a bụrị ajụjụ dị óké mkpà, na Pọl, Banabas, na Pita gara Jerusalem ịtụle ya ha na Ndịozi fọdụrụ. Azọpụtawo Ndịmbaọzọ site ná mkwusa nke Pita, n’ekwughị okwu banyere Iwu. Azọpụtara ha site n’okwukwe, ha wee nwe kwa ọñụ nke inwere onweonye nime Oziọma. Gịnị mere nsogbu a gaeji adapụta ugbu a, bụ ndị Juu ibó ndị nke Kraist sitere ná Ndịmbaọzọ ibuarọ nke dịwooro ndị Ju (bụ ndị iwu a maworo arụ) ike ibu?

Ọ bụghị náánị na azọpụtara Ndịmbaọzọ site n’okwukwe, kama edowo kwa ha nsọ, mee kwa ka obi ha dị ọcha. Ha anatawo kwa ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Òle ihe ndịọzọ ha garaachọ karịrị nke a? N’ezie ndịa karịrị ngọzi niile ọ bụla ha nataworo site n’ụzọ nke idebe Iwu. Ma Chineke adịghị akpaòkè n’etiti ndị Juu na Ndịmbaọzọ.

Okwu ndịa pụtara ọtụtụ ugbò n’oge ijéozi nke Pọl Onyeozi. Ọfọdụrụ nke ntà ka ọ bụrụ ná akwụkwọozi ya niile nye ndị Galetia metụtara isiokwu a aka. Ọ sịrị: “A ndi Galetia ñenwegh uche; ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n’anya unu, dika Onye akpọgidereri n’obe?” (Ndi Galetia 3:1). Azọpụtawo ha site n’ikwere na Jisọs. Gịnị mere ha gaeji achọ ịlaghachiazụ ugbu a náememe niile nke Iwu? “Ùnu sitere n’ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ ma-ọbu na unu sitere n’ọnunu nke okwukwe nata ya?”

Eziomume Site N’okwukwe

Ọbụná n’oge Abraham, okwu náachị bụ, “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu” n’ihi na “Abraham kwere Chineke, ewe gụa nke ahu nye ya n’ezi omume” (Ndi Galetia 3:6). Ọ dị mfé inwe nzọpụta ọbụná mgbe anaenyebeghị Iwu.

Chineke na Abraham wee gbaandụ, mkwekọrịta. Ọ sịrị na ọ bụrụ na Abraham gaerubere Ya isi, rapụ obodo ebe ndị mmadụ naekpere arụsị, wee bata nime Kenean, site na ya na agaagọzi mba niile nke ụwa. Otù ụbọchị na Ya gaezite otù onye n’èzínaụlọ Abraham onye gaabụ Onyemgbapụta. Onye ahụ bụ Jisọs.

Abraham amaghị ogologo oge ọ gaewe tupu Jisọs abịa, ma o kweere na Chineke: ma site na okwukwe ya nime Jisọs, azọpụtara Abraham. Ọ bụ mgbe otù puku na naarịarọ ise gasịrị site na mgbe a ka amụrụ Jisọs, ma Ọ sịrị: “Obi tọrọ Abraham utọ nke uku ihu ubọchim: ọ we hu ya, ñuri kwa ọñụ.” Emere ka Abraham ñụrịa ọñụ site n’ikwere na Jisọs, dịka mụ na gị na enwe ọñụ mgbe azọpụtara anyị site n’okwukwe nime Ya.

Iwu Ahụ bụ Onyeòzízí

Ị hụwo na apụrụ ịzọpụta ndị mmadụ mgbe akanyeghị Iwu, gịnị mere eji nye ya? Pọl gwara ndị Galetia na etinyere ya n’ihi njehie niile rue mgbe Jisọs gaabia. Jisọs bụ “mkpụrụ” ahụ ekwere Abraham ná mkwà, onye agaesite na ya gọzie mba niile nke ụwa.

Ma ụmụ Abraham niile, ndị Israel, enweghị ụdị okwukwe o nwere. Ha chọrọ ihe agaegosi ha dịka ihe ozizi ha gaahụ anya banyere Kraist ahụ n’abịa. Ha dịka ụmụ ntakịrị ndị náchọ onye gaagwa ha ihe ha náagaghị eme: “Gị emela … ” N’ihi nke a Chineke we nye ha Iwu.

Ọ bụ mgbe narị arọanọ na iri atọ (430) gasịrị site na mgbe Chineke na Abraham nwere nwekọrịta, ka O zutere Moses ná Ugwu Sainai wee nye ya Iwu. Ndị ahụ wee nụ ka Chineke n’ekwuokwu site n’Eluigwe, wee kwere na ha gaerubeisi ná ihe niile O kwuru. Nke a bụ ọgbụgbandụ nke abụọ, mkwekọrịta ọzọ, náeso nke ahụ Chineke na Abraham mere.

Pọl sịrị na Iwu bụrị “onye-ozizi-ayi ikuru ayi bịakute Kraist, ka ewe site n’okwukwe gu ayi ná ndi eziomume.” Ụfọdụ naagwa anyị na Iwu ahụ gaanọ náadị irè rue oge ọchịchị nke Otùpukuarọ mgbe Jisọs na ndị Juu gaagba ọgbụgbandụ ọhụụ. Ma ihe Pọl kwuwapụtara bụ na ọ gaabụ mgbe Jisọs bịara. “Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọgh ọzọ n’okpuru onye-òzízí.” (Ndi Galetia 3:25). Ọ bụrụ na azọpụtawo ndị a site n’okwukwe nime Jisọs, Iwu, maọbu “onye-òzízí,” adịghị kwa mkpà ọzọ ikuru ha bịakwute Kraist.

Mkpụrụ nke Abraham

Ndị Juu naasị na ha bụ ụmụ nke Abraham. Ha gwara Jisọs sị, “Nna-ayi bu Abraham” (Jọn 8:39). Ma Pọl sịrị: “Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n’aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di” (Ndi Galetia 3:39). Mgbe anyị sitere n’okwukwe nime Jisọs bụrụ ezi ndị nke Kraist, anyị onweanyị kwa abụrụwo mkpụrụ nke Abraham. Iwu nke ewebatara mgbe Chineke na Abraham gbasịrị ndụ nke dị kwa rue mgbe Jisọs bịara, adịghị kwa irè n’ebe nzọpụta anyị dị.

Pọl gara n’iru ịgwa ndị Galetia na ọ bụrụ na ha naagbalị ịlụpụta nzọpụta ha site n’idebe Iwu, na ha bụ ndị dapụworo n’amara. “Atọpuru unu n’aru Kraist” (Ndi Galetia 5:4).

ọl matara ihe ọ naekwu maka ya. O jiwo ikwesịntụkwasịobi mụọ ihe banyere Iwu, kpagbu kwa ndị nke Kraist n’ihi na o chèrè na ha adịghị edebe Iwu. Ma ọ sịrị na ya mere ya náamaghịama, n’ihi nke a na Jisọs emeworo ya ebere wee gbaghara ya. Chineke egosiwo ya na ọ bụ nime Kraist ka emezuru Iwu, na ọ dịghị kwa mkpà ọzọ.

Ọ dịịrị Pọl ike ịrapụ okwukwe ya ochie, ka o wee nwe ike ịghọta otú ọ gaesi kọwaara ndịọzọ ihe dị iche n’etiti oge nke Iwu na n’oge nke Amara. Ọ sị na Kraist emewo ya ihenlereanya nye ndịọzọ gaekwere na Jisọs (I Timọti 1:16).

Pọl mekwara nkọwa niile ahụ ọzọ nime akwụkwọozi ya nye ndị Hibru bụ ndị nke Kraist. Ndị Hibru bụ ndị naeji obi ha dum n’edebe Iwu, ma Pọl gwara ha na ọ bụ náánị onyinyo nke ihe niile náabịa. Atụkwasịrị ya nye ha rue “mgbe aga-emegharị ihe,” oge mgbe Jisọs gaabịa. Àjà niile nke anaawụfu ọbara na ha bụ otù akụkụ nke Iwu. Ha niile bụ iheòzízí anaahụ anya maọbụ onyinyo, nke Jisọs dịka Nwaatụrụ nke Chineke. Mgbe Jisọs wụsịrị Ọbara Ya, ọ dịghị kwa mkpà ọ dị ọzọ iji ọbara anụmanụ chụọàjà dị icheiche.

Ọgbụgbandụ Ọhụụ

Mgbe enyesịrị Iwu n’Ugwu Sainai, Chineke wee sị: “Le, ubọchi nābia, ka Onyenwe anyị kwuru, mgbe Mu na ulo Israel na ulo Juda gāba ọgbugba-ndu ọhu; ọ bugh dika ọgbugba-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha gbara n’ubọchi M’jidere ha n’aka isi n’ala Ijipt dupụta ha; … N’ihi na nke a bụ ọgbụgba-ndu nke Mu na ulo Israel gāba mgbe ubọchi niile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M’gētiye iwum n’uche-ha, ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ: M’gābu-kwa-ra ha Chineke ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi” (Ndi Hibru 8:8-10).

Nke a bu ọgbugbandụ nke Chineke na ndi Juu gaagba mgbe ha nabatara Ya dịka Mesaia ha; ma site n’okwukwe nime Jisọs anyị náenwe iheụtọ nke ọgbụgbandụ a ọbụná ugbu a. Ndị Juu ekweghị na Jisọs ugbu a, ya mere inwe iheụtọ nime ọgbụgbandụ, agaghị abụ nke ha ugbu a dịka mba. Ma ka ha ra bụ ndị azọpụtaworo site n’okwukwe bụ ndị nketa nke ọgbụgbụndụ a. Mgbe Jisọs bịara n’ụwa wee nye onweYa dịka ihe ịchụàjà, Ọ sịrị “Le abịawom ime ihe I nāchọ, Chineke” site n’ime nke a, O wepụrụ ọgbụgbụndụ nke ochie, Iwu ahụ wee were nke ọhụ ahụ dochie ya (Ndi Hibru 10:9).

Jisọs bụ Onyeisi Nchụàjà anyị. Nime akwụkwọ Ndị Hibru anyi gụrụ na ekewapụrụ ịbụ onye nchụàjà Ya site n’usoro nke Iwu. Jisọs bụ “onye-nchu-àjà rue mgbe ebigh-ebi dika usoro Melkizedek si di” (Ndi Hibru 7:17). Ndị nchụàjà n’oge Iwu sitere naagbụrụ Eron, nke pụtara na mgbe ha mere okenye, ha nwụrụ. Ma Jisọs anyị náadị ndụ rue mgbe ebighịebi. Ọ nọ n’Eluigwe ugbu a, náarịọ Chineke ka Ọ gbaghara onye ọ bụla náekpeekpere ka azọpụta ya.

Ị hụrụ otú Jisọs si dị ukwu karị ndị nchụàjà niile ahụ jere ozi n’oge nke Iwu? Otú a ka nzọpụta anyi n’okpuru amara si dị ukwu karị okpukpé ahụ jupụtara náememe dị icheiche na okpuru Iwu.

Ụlọikwu nke Devid

Jisọs náabịa ọzọ n’oge mkpughe Ya ịmalite Alaeze Ya náelu ụwa. N’ụbọchị ahụ Ọ gaewugharị “ulo-ikwu nke Devid daworo ada.” Mkwà Chineke nye Devid bụ na, ọ bụrụ na ọ gaeji mkwesịntụkwasịobi jègharịa na ndụmọdụ niile nke Onye Kachasị Iheniile, na agaene ka ụlọ ya guzosieike rue mgbe ebịghịebi. Site ná nnupuisi nke ụmụ ndịkom nke Devid, emere ka alaeze ahụ tufue ụgwọ o nwere; ma n’oge ọchịchị nke otùpukuarọ, agaeme ka o guzosieike ọzọ, ma Jisọs, onye sitere náagbụrụ Devid n’anụarụ, gaabụ Eze nke ndị bụ eze, na Onyenwe ndị nwe mmadụ.

Edoziri Okwu Ahụ

Ná mmechi nke nnọkọikpé ahụ na Jerusalem, ezigaara nzụkọ dị icheiche ebe nsogbu a dịworo akwụkwọozi, náakọwara ha na ekéghị ndị nke Kraist agbụ idebe Iwu Moses, kama ka ha “rapu ihe nile achuru n’aja nye arusi, na ọbara, na anu anyagburu-anyagbu, na ikwa-iko.” Jisọs emezuwo Iwu, ma ugbu a ndị ahụ nọ n’okpuru Amara, ma Jisọs n’onwe-Ya kọwara na obibi ndụ nke ndị Kraist were ogo dị elu n’okpuru Amara karị ka ha dịịrị n’okpuru Iwu.

Ewere ozi a wegara nzukọ ndịa, onye ọ bụla wee ñụrịaọñụ nime ntụpụta nke Mmụọ Nsọ duziri ndịkom a nọ na Jerusalem ịtụpụta

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka mmadụ pụrụ ime iji nwe nzọpụta?

  2. 2 Site ná aha onye ka eji azọpụta anyị?

  3. 3 Gịnị ka ekwere n’òzízí nke ndị Juu?

  4. 4 Gịnị ka ha naagwa ndị ọhụụ kweere na Kraist, ndị ọ naatọụtọ na azọpụtawo ha?

  5. 5 Site na gịnị ka eji zọpụta Abraham?

  6. 6 Gịnị bụ ihe mere eji nye Iwu?

  7. 7 Ònye bụ “mkpụrụ” nke Abraham?

  8. 8 Òlee mgbe eji mezue Iwu?

  9. 9 Ònye bụ Onyeisi Nchụàjà anyị?

  10. 10 Ọgbụgbandụ dị añaa ka Jisọs na ndị Juu gaagba n’oge ọchịchị nke Otùpukuarọ?