Ọlụ Ndi-ozi 16:9-40

Lesson 334 - Junior

Memory Verse
“Ọ buru na I gēwere ọnu-gi kwuputa Jisọs na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si ná ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi” (Ndi Rom 10:9).
Notes

Inyeaka

“Gabita na Mesedọnia, nyere ayi aka;” Ndia bụ okwu ndị Pọl nuru. ọ hụrụ ọhụ n’abalị. Ọ hụrụ otù nwoke onye Masedọnia náarịọ ya maka inye aka. Ọ chọrọ ka Pọl nyere ya aka ịmụta ihe banyere Jisọs.

Pọl enyeworo ọtụtụ mmadụ aka mgbe o jere njègharị nke mbụ nke ịgbasa oziọma. Ọ nyewooro ha aka ná ihe banyere ihe nke Mmụọ. O kwusawo banyere Jisọs, ọtụtụ mmadụ wee kwerekwa náokwu ya niile. Pọl alụwooro Onyenwe anyị na ndị ya ọlụ. Emeghewo ọtụtụ ụlọ nzukọ, tee kwa ọtụtụ ndịokenye mmanụ n’ụlọ nzukọ ọ bụla.

Masedọnia bụ obodo dị anya dị náofè mmiri. Pọl ọ gaeje obodo dị anya otú a inyere onye ọ náamaghị aka? Ee, Pọl chọrọ ịgbasa Oziọma. O metụrụ ya na ọhụ a bụ òkù pụtara ìhè akpọrọ ya ijé kwusaara ndị Masedọnia Oziọma. Ọ bụghị mgbe niile ka Chineke naenye ndị mmadụ ọlụ mgbe Ọ naakpọ ha òkù ijé lụọọlụ nke Oziọma. Mgbe ụfọdụ anaedepụ akwụkwọ náarịọ maka inyeaka. Mgbe ụfọdụ Chineke na etinye nime obi ndị ya ka ha nwe mmetụ n’obi banyere ndị bi ná otù akụkụ obodo. Mgbe ụfọdụ Chineke naeme ka echèta onye apụrụ ịkpọ ka ọ bịa n’ụlọakwụkwọ ụbọchịụkọ na kwa ekpere dị icheiche nzukọ naenwe. Ọ bụghị mgbe dum ka anaalụọlụ ịgbasa oziọma na obodo dị anya site n’ụlọ. Enwere ọtụtụ mmadụ nọ nso chọkwara inyeaka anyị. Chineke pụkwara iji ụmụntakịrị lụọọlụ ịgbasa Oziọma.

Ịrapụ Ngwangwa

Mgbe Pọl natasịrị ịkpọòkù ahụ sitere na Masedọnia, ọ matara na Chineke chọrọ ka ya jé n’obodo ahụ dị anya. Emere ka o doo Pọl anya na Chineke chọrọ ka jéé kwusaara ndị ahụ Oziọma. Ọkpụkpọoku nke mmadụ pụrụ ido ya anya. Mmadụ pụrụ ịmata uche Chineke. Mgbe mmadụ kpereekpere, n’eji ndụ ya náachụàjà njikere maka ijé maọbụ ịnọdụ, Chineke gaegosi ya ihe ọ gaeme.

Mgbe emere ka uche Chineke pụta ìhè nye Pọl, o wee kpọrọ Silas tinyere onweya ngwangwa ha we bilie ijé Masedọnia. Ọ gaemetụwo yarịị dịka o metụrụ David, onye sịrị “Okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku” (I Samuel 21:8). Pọl na alụrụ Jisọs bụ Eze ndị eze ọlụ, ọ matakwara na ya kwesịrị ịlụọlụ mgbe ohere dị. Ụfọdụ naarapụ ime uche Chineke mgbe o kwesịrị. Mgbe ụfọdụ ha naenwe ihe ndịọzọ ha naachọ ibuụzọ mee tupu ha eme uche Chineke. Mgbe ụfọdụ ha naeche échìchè ogologo oge banyere ya tupu ha achọ irubeisi ime ihe gaatọ Chineke ụtọ. Pọl enweghị kwa àtụmààtụ ọzọ nándụ ya karị kwa ime uche Chineke. Pọl jikere, nọrọ kwa nánjikere irubeisi. Mgbe ọ bụla ohere pụtara ịgbasa Oziọma, na inyere ndịọzọ aka ịmata ihe banyere Jisọs, Pọl jikeere ijé ma nọrọ kwa nánjikere ime ya.

M’jikeere ịga, maọbụ ị nọdụ

M’jikeere ị nọchi anyam;

M’jikeere ijéozi, nke ntà, ma ọ dị ukwu,

M’jikeere ime uche Ya.

Na Filipai

Pọl na Sailas siri na Troas nupu ụgbọ, emesịa ha wee bịarue na Filipai, nke bụ isi obodo náakụkụ nke Masedọna ebe ha gara. Ebe ahụ ka ha nọrọ ụbọchị olenaole. Ha tụrụ àtụmààtụ inwe nzukọ ekpere n’akụkụ óké osimiri, nke dị námpụta obodo. Ụfọdụ ndịnyom agbakọwo n’ebe ahụ, Pọl wee malite ịkwusara ha.

Onye Náere Ihe Eji Esiji Ákwàododo

Otù n’ime ndịnyom gere Pọl ntị ka anaakpọ Lidia. Ụlọ ya dị na obodo Tayataira ebe amatara ndị bi nime ya dịka ndị náeme ihe dị icheiche eji esiji ákwà. Nwanyị a bụ onye okpukpé, na onye náakpọ isiala nye Chineke. Ka ọ n’ege Pọl ntị, o wee nụ banyere Ọkpara Chineke, bú Jisọs Kraist. Onyenwe anyị wee kwuokwu nime obi Lidia. O wee kwere ihe niile Pọl kwuru. O wee mepe obi ya, nábata Oziọma, wee bụrụ onye náeso Kraist.

Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ

Apụrụ ịzọpụta mmadụ mgbe o kpereekpere, kwere na ya emechiewo, náarịọ kwa Chineke ka Ọ gbaghara ya, ma n’ekwere kwa na Onyenwe anyị Jisọs Kraist. Mgbe azọpụtasịrị mmadụ, ọ naachọ kwa ka awụọ ya mmiri nke mmiri. Nke a bụ uche Chineke. Ọwụwụmmiri nke mmiri bụ otù akụkụ nke Oziọma, Onyenwe anyị chọkwara ka ndị Ya rubeisi náakụkụ ya niile. Mgbe Onyenwe anyị nyefere Óké Ọlụ nke ijéozi nke ịgbasa ọziọma náaka ndị náesoụzọ Ya, Ọ sịrị: “Ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: n’èzi ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu” (Matiu 28:19, 20).

Nime Baịbụl enwere ọtụtụ ihe nlereanya akpọrọ aha nke ndị nwere nzọpụta, awụkwara mmiri. Ná Ụbọchị Pentikọst mgbe Pita jiri ike kwusaa Oziọma ahụ, “ndi nara okwu ya nke-ọma, emere ha baptism” (Ọlu Ndi-ozi 2:41). Filip kwusara banyere Kraist nye onozi nke Etiopia mgbe ha nọ nime ụgbọala. Mgbe ha bịaruru n’ebe mmiri dị, ọnozi ahụ wee hụ nke ahụ dịka ohere dịrị ya irubere Chineke isi site n’ịwụmmiri nke mmiri. Ọnozi ahụ sịrị “Le, miri; gini nānapu imem baptism?” Filip zaghachiri, “Ọ buru na I ji obi-gi dum we kwere, agēme gi.” (Iheọmụmụ 292). Ha abụọ wee rịda na mmiri ewe wụọ ọnozi ahụ mmiri. O we malite ịga n’ụzọ ya náañụrịọñụ.

Lidia na ndị èzínaụlọ ya bụ kwa ndị ọzọ awụrụ mmiri. O nyere Chineke otuto n’ihi ihe Omeere ya. Obi tọrọ ya ụtọ n’ihi o rubewo isi n’iwu nke Onyenwe anyị. O chọrọ imere Onyenwe anyị ihe. O gosịrị obiekele ya site n’inwe ịhụn’anya n’ebe ndị nke Chineke nọ.

Ihụn’anya

Lidia wee rịọ Pọl na Silas ka ha nọdụ n’ụlọ ya, ma ọbụrụ na ha chere na ya kwesịrịntụkwsịobi n’ebe Chineke nọ, bụrụ kwa onye ekwesịrị ịkwanyere ugwù dị otú a. O metụrụ Lidia na ọ bụ mkwanye ugwù ilekọta ndịkom nke Chineke a. O mere ya dịka anaemere ya Onyenwe anyị. Anyị gụrụ: “Ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site ná nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bugh kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihenyeghachi-unu, bú ihe nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist” (Ndi Kọlọsi 3:23, 24). Ụgwọọlụ dịrị ndị náegosi ịhụn’anya n’ebe ndị nke Chineke dị. Ka ha naanata ụgwụọlụ0 ahụ ka ha ganaanụ ka Kraist naasị, “Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 25:40).

Onye Mgbasị

Otù ụbọchị ka Pọl na Silas n’ejé nzukọ ekpere, otù nwa agbọghọ wee náeso ha. Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ dị nime ya, bụrụ kwa onye mgbasị. Ọ náeso ha n’azụ, náeti kwa mkpu. Nke a mere ọtụtụ ụbọchị. O wutere Pọl na nwaagbọghọ a dabara nime ihe ọjọọ dị otú a. Pọl wee baara mmụọ ọjọọ ahụ mba n’aha Jisọs Kraist, ewe nápụta ya site n’aka mmụọ ọjọọ ahụ n’edu ya.

Nwaagbọghọ a bụ onye ọlụ nye ụfọdụ ndị. Ọ naagwa ndị mmadụ ihe gaje ime, ndị ọ na alụrụọlụ wee náenweta ego site na nke a. Mgbe achụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ dị nime ya. ọ pụghị kwa ịlụọlụ mgbaasị ọzọ, ndị goro ya ọlụ wee tufue ụzọ a ha n’esi eweta ego ririnne. Ihe dị otú a amasịghị ndị ahụ. O metụghị ha n’obi imere ya ebere mgbe ahụ mmụọ ọjọọ n’edu ya. Ha meere onweha ebere n’ihi na ha agaghị esi kwa n’ụzọ ọjọọ a dị mfé enweta ego.

Nime Mkpọrọ

Ndị nwe nwaagbọghọ a jidere Pọl na Silas, wee kpọrọ ha ga n’ọma ahịa, ebe enwere ọgbakọ ikpé, wee kwue kwa ihe dị icheiche megide ha. Ha sịrị, “Ndikom ndia … nēme ka obi lọ ndi obodo-ayi miri nke uku.” Ọ bụ ime ka obi lọ mmiri bụ iji ezi ihe kwụsị ọlụ ọjọọ? Nke a ahụ bụ náánị ihe ngọpụ. N’ihi ịkpọasị ha nwere n’ebe Pọl na Silas nọ, ha wee kpalie ndị mmadụ imegide ndị nke Chineke. Náenyeghị ha ohere ikwu ihe ọ bụla, emesoro Pọl na Silas n’ụzọ jọgburu onwe ya, pịa ha ụtarị ọtụtụ ugbò, tụba ha n’ụlọmkpọrọ. Agwara onyenché ụlọmkpọrọ ka o “debe ha nke ọma” n’ihi nke a atụbara ha nime ụlọmkpọrọ dị ime kpọchie ha ọtọsị ike n’ụkwụ.

Nnapụta

Ná abalị ihe n’emebeghị na mbụ mere. Ndị mkpọrọ ndịọzọ nụrụ abụ nke otuto dị icheiche na ekpere nke inye Chineke otuto. Ndịkom abụọ azụ ha naagba ọbara, ndị etinye kwara ụkwụ ha n’ọtọsị, ha ka pụkwara itò Chineke? Ndịkom abụọ ndịa emesoro n’ụzọ jọgburu onwe ya ha pụkwara ikwere na Chineke. Ndịkom abụọ ndịa taworo ahụhụ n’emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, ha pụkwara ịtụkwasị Chineke obi? Náarụghịụka, ha mere ihe ndịa, Chineke wee nụ otuto na ekpere niile ha. Na mberede óké alaọmajijiji wee dị. Ụlọ mkpọrọ wee maa jijiji, ọbụná rue na ntọala ya. Agbụ niile nke ndị mkpọrọ ka atọpụrụ. Ọnụ ụzọ niile wee mepee.

Onyenche Ụlọmkpọrọ

Onyenche ụlọmkpọrọ wee teta n’ụra ya. Mgbe ọ hụrụ ka ụzọ niile ghereoghe, o wee chee na ndị mkpọrọ niile agbalagawo. Ọ chọrọ iwere mmaagha ya tigbue onweya. O metụrụ ya náezie na ya ga atụfu ndụ ya, ebe ya náaghaghị enwe ike ikwu ihe banyere ndị mkpọrọ niile ahụ, nkekanke, abụọ ndị ahụ nọ nime -- ime ụlọmkpọrọ. Pọl tiri mkpu sị, “Emerula onwe-gi aru.” Mgbe ahụ onyenche nke ụlọmkpọrọ wee sị ka ewetara ya ọkụ ka ya we hụ ndịmkpọrọ niile. Ọ wee baa nime-ime ụlọ mkpọrọ, ebe dị oyi, ìhè na ikuku náadịghị bụ ebe edebererị Pọl na Silas. Ọ matara na ha bụ ndịkom nke Chineke. Ọ mata-kwara na ha pụrụ inyere ya bụ onyemmehie aka. Mgbe ọ kpọpụtara ha, ọ we jụọ sị, “Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m’me ka ewe zọputam?”

Nzọpụta

Pọl na Silas wee gwa onyenche ụlọmkpọrọ na èzínaụlọ ya banyere Onyenwe anyị. Ha wee kwere ná okwu niile ha nụrụ ewe zọpụta ha. Awụkwara ha mmiri dịka nnabata nke okwukwe ha kwere nime Jisọs, na iji kwa gosi ọlụ nke ime ahụ alụrụ nime ndụ ha.

Onyenche nke ụlọmkpọrọ gosịrị ịhụn’anya n’ebe ndịkom a dị bụ ndị nyeere ya aka chọta Jisọs. Ọ kpọọrọ ha ga n’ụlọ ya. Ọ sara ọnyà ha niile, we nye ha iheoriri. Le otú o si nwe ọñụ ná nzọpụta ya! Le otú obi tọrọ ya ụtọ na azọpụtara èzínaụlọ ya! Le otú o si nwe iheụtọ ya na ndịkom nke Chineke ịnọ!

Ịhụn’anya N’ihi Kraist

Náarụghịụka, obi tọkwara Pọl na Silas ụtọ n’ihi na ha agbawoàmà rue nzọpụta nke ọtụtụ mkpụrụobi. Gịnị ka ọ pụtara na etiri ha ihe, ebe ha nwere ike ịgwa ụfọdụ mkpụrụobi banyere Jisọs? Gịnị ka ọ pụtara na etinyewo ha n’ụlọmkpọrọ, ebe ọ lụpụtara nzọpụta nke onyenche ụlọmkpọrọ na èzínaụlọ ya? Pọl na Silas amaliteghị iruuju n’ihi ahụhụ ha. Ha agbapụtaghị n’ezi iji gbalaga mgbe ọnụụzọ niile mepesịrị. Nke gbasara ha bụ ime uche Chineke n’ihi nzọpụta nke ọtụtụ mkpụrụobi. Ndịa bụ ezi ndịkom nke Chineke bụrụ kwara anyị ihenlereanya dị mma. Ọ na emetụ anyị ebe ọ dị ukwu ịhụ na azọpụtara ndịọzọ? Ànyị n’etò Chineke mgbe anyị naahụ ahụhụ? Ànyị na edere duu mgbe anaakpagbu anyị? Otù nime okwu ekwuru náelu ugwu bụ: “Ngọzi nādiri unu mgbe ọ bula ha nāta unu uta, nēsogbu kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim. Ñurianu ọñu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n’ihi na ugwọ-ọlụ-unu di uku n’elu-igwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndi-amuma ndi buru unu uzọ” (Matiu 5:11, 12).

Arapụrụ Ha

N’ụtụtụ echi ya ndịisi wee zipụ ozi sị “rapu ndikom ahu ka ha la.” Ma Pọl emeghị ngwa ịrapụ. Emewo ha iheihere, meso kwa ha n’ụzọ jọgburu onweya, ebe “anaamaghị ha ikpe.” Atụbawo ha n’ụlọ mkpọrọ n’ụzọ megidere iwu náagbanyeghị na ha bụ ndị Rom. Emejọwo ha n’iru ọtụtụ ndị mmadụ, ma anaachọ ịrapụ ha n’ụzọ dị nwayọ. Pọl sịrị “Ka ha onwe-ha bia duputa ayi.” Mgbe ndị ikpé nụrụ ihe ndịa, ha wee tụọ egwù. Ha akpawo nganga, n’enweghị kwa obiebere, ma ugbu a Onyenwe anyị ewedawo ha n’ala. Dịka ha n’achọ igosi na Pọl na Silas adịghị ihe ọjọọ ha mere, ndịikpé ahụ jere n’ụlọ mkpọrọ wee kpọpụta ha. Ha wee rịọ ka Pọl na Silas rapụ obodo ahụ. Náarụghịụka obi mara ha ikpé n’ihi iheọjọọ ha mere, ọ di ha mkpà nke ukwu ka emechie okwu niile ahụ.

Site n’ịgwa Pọl na Silas ka ha rapụ obodo ahụ, ha naagwa ndị kwusara nzọpụta ka ha rapụ ha. N’ụzọ dị otú a, ha tufuru ohere dịrị ha ịnụ Oziọma n’oge dị ka nke a. Ọ dịghị onye matara ma ndịa ha nwekwara ohere ọzọ maọlị iji nụ mkwusa nke Pọl maọbụ ịnụ ihe banyere nzọpụta.

Ha na Ndịnsọ

Emeghị ka egwù tụọ Pọl n’ihi ịhụ ahụhụ. Ya na Silas esiteghị na obodo ahụ gbapụ ọsọsọ, n’ịtụ egwù na agaapịa ha ihe ọzọ. Ha kpachapụrụ anya jiri nwayọ we ga n’ụlọ Lidia. Ọ gaabụ na n’ebe ahụ ha kọrọ ihe banyere mkpọrọ ha gara, na kwa banyere nzọpụta nke onyenche nke ụlọmkpọrọ. Mgbe ha na ndịnsọ kwurịtasịrị okwu, were kwa okwu nkasịobi kasịrịta onweha obi, Pọl na Silas we rapụ Filipai we ga n’ebe ọzọ nime Masedọnia ebe Chineke gaachọ kwa ka ha kwusa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ okpụkpọòkù Masedọnia?

  2. 2 Ònye ka akpọrọ òkù ahụ?

  3. 3 Gịnị ka ọ pụtara?

  4. 4 Òlee otú Lidia si nụ banyere nzọpụta?

  5. 5 Òlee otú o si gosi obiekele ya n’ebe Chineke nọ?

  6. 6 Gịnị mere eji tinye Pọl na Silas n’ụlọmkpọrọ?

  7. 7 Gịnị ka ha mere na etiti abalị?

  8. 8 Òlee otú Chineke si za ekpere ha?

  9. 9 Gịnị mere onyenche ụlọmkpọrọ?

  10. 10 Gịnị ka Pọl na Silas mere mgbe akpụpụtara ha site n’ụlọmkpọrọ?