Ọlu Ndi-ozi 17:1-34

Lesson 335 - Junior

Memory Verse
“Nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa” (Ọlu Ndi-ozi 17:28).
Notes

Ikwusa Oziọma

Pọl na Silas adaghị mbà, náagbanyeghị ọnwụnwa niile ha nwere. Ọzọ kwa ha jere obodo ndị ọzọ dị icheiche iwegara ha ozi ọñụ nke nzọpụta. Nime obodo nke ndị Tesalọnaika ha hụrụ otù ụlọnzukọ nke ndị Juu ebe Pọl nwere ohere ikwusa oziọma. Ọtụtụ ndị Grik, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị we kwere n’okwu niile nke Pọl onye gwara ha ihe banyere ahụhụ nke Kraist na mbilite Ya site ná ndị nwụrụanwụ.

Ma otú ọ dị, ụfọdụ ndị Juu malitere ikwuokwu n’ihi na ọtụtụ mmadụ gere Pọl ntị. Otù ụbọchị otù ìgwè ndịkom jọrọnjọ wetara óké nsogbu na obodo ná achọ Pọl na Sailas. Ha chère na ndịa ji oziọma ná ejègharị nọ n’ụlọ Jason, ma mgbe ha na achọtaghị ha, ndịkom a dị njọ wee kpọrọ Jason kpọgara ndịisi obodo. Ndịa kpọrọ eziokwu asị tiri mkpu sị, “Ndịa bú ndi kpuru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n’ebe a” (Ọlu Ndi-ozi 17:6). Ha gwara ndịisi obodo na Pọl na Sailas na akuzi ihe banyere Eze Jisọs. Ihe dị otú a sogburu ndịisi obodo nke ukwuu, ma na ikpéazụ ha rapụrụ Jason ka ọ laa. Otú ọdị, ndị enyi Pọl kpebiri ka ọ rapụ obodo ahụ iji hụ na nsogbu ọzọ adapụtaghị. N’abalị Pọl na Sailas wee rapụ Beria, ebe eji ọñụ nabata ha, n’ebe ahụ ha gwara ọtụtụ mmadụ karịrị nke mbụ banyere Jisọs.

Mgbe ndị Juu a náemebịiwu dị nime Tesalọnaika nụrụ na Pọl na Sailas na ekwusa Okwu Chineke nime Beria, ha jere ebe ahụ ngwangwa wee kpalie ndị mmadụ. Ọ dị ka afọ anaghịeju Setan rue mgbe o mere ihe niile ọ pụrụ ime iji kwụsị ọlụ nke Onyenwe anyị. Náagbanyeghị nke a akụrụ Okwu Chineke nime obodo ndịa niile, dịka mkpụrụ dị ntakịrị akụnyere nime ala, ọ gaepupụta, tolite kwa, mịa kwa mkpụrụ ná ebe ọ bụla enwere mkpụrụobi agụụ na agụ.

Nime Atens

Pọl wee ga na obodo ukwu nke Atens, Grik, ebe ọ nọ náechere Sailas na Timọti ka ha bịakwute ya. Pọl egbughị oge, site n’ịnọdụ náemeghị ihe ọ bụla, otú ọ dị, ọbụná n’ụbọchị taa, ụmụ Chineke na anọ n’ọlụ mgbe dum nye Onyenwe anyị. Ka ọ na ejègharị na obodo ahụ, akpaliri ya ebe ọ dị ukwu, n’ihi na ọ hụrụ na obodo a jupụtara ná arụsị na ndị náekpere arụsị. Otù onye ekwuwo na ọ dị mfé ịchọta arụsị náAtens karị ịchọta mmadụ. Ụbọchị niile Pọl naaga n’ụlọ nzukọ ndị Juu, na kwa n’ọmaahịa dị icheiche ná agwa ndị mmadụ banyere Jisọs

Ugwu Mas

Ọ tụrụ ndị ahụ n’anya: Gịnị bụ ihe a Pọl naekwu banyere chi nke ala ọzọ a anaamaghị? “Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu?” Ka ụfọdụ nime ha sịrị. Dịka agaasị na okwu niile nke Pọl abaghị urù, okwu efù, okwu nzuzu! Gịnị bụ òzízí ọhụụ a, Pọl? Ị na eweta “ihe nke ndi ala ọzọ na nti ayi.”

Ndị ahụ wee kpebie na agaakpọ nwoke a ga n’elu ugwu Mas, nke bụ ụlọ ikpé kachasị n’obodo Atens. N’ebe ahụ n’iru nnọkọikpé nke Areopagọs ajụrụ Pọl ajụjụ site ná aka ndị elereanya na ha bụ ndị nwekarịsịrị amamihe na Grik. Mgbe ahụ Pọl wee guzoro n’iru ndi niile ahu gụrụ akwụkwọ wee sị, “Mgbe m’nāgabiga, … M’we hu otù ebe-nchu-àjà … ENYERE CHI NKE ANĀMAGH AMA.” Na ya bịara ịgwa ha banyere Chi a bụ Chi nke kèrè ụwa na ihe niile. Ọ bụ na ha anụbeghị banyere Chi nke náadịghị ebi ná ụlọ nsọ eji aka wue? Ha ekwesịghị ichè na ezi Chineke a dịka ọlaọcha, na ọlaedo, ma ọbụ arụsị nkume nke mmadụ mere. Pọl sịrị na oge nke Chineke lefuuru amaghị ihe ha anya agawo, na ọ gaghị adị ka otú ahụ ọzọ; ugbu a Chineke na agwa mmadụ ka ha niile chègharịa n’ebe niile. Pọl wee gwa ha ihe mere ha gaeji si ná mmehie niile ha chègharịa: n’ihi na Chineke nwere otù ụbọchị O debere nke Jisọs gaabịaghachị n’ụwa ikpé ndị mmadụ ikpé n’ihi ihe niile ha mere ná eluụwa. Chineke mere ka Jisọs si ná ndị nwụrụanwụ bilie ịbụrụ ha Onyenzọpụta, ma Onyenwe anyị anọghị “n’ebe di anya n’aru onye ọ bula nime ayi” (Ọlu Ndi-ozi 17:27), bụ ihe Pọl kwuru. Ọ bụrụ na ọ dị ike ịchọta Onyenwe anyị, ọ bụghị n’ihi na ọ dị anya site n’ebe anyị nọ, kama ọ bụ n’ihi na omume anyị dị anya site n’ebe Ọ nọ. Ọ nọ mgbe dum ná echéré onye mmehie ka o chègharịa che Ya iru maka mgbaghara.

Ndị Náakwaemò

Ndịkom Aten hà kweere okwu niile ndịa Pọl kwuru? Ụfọdụ nime ha kwara akụkọ banyere mbiliten’ọnwụ Jisọs site ná ndị nwụrụanwụ emò. Náánị chè échìchè maka ndị náejighị eziokwu nke mbiliten’ọnwụ, nke bụ olileanya nke ndị Kraist kpọrọ ihe, ná eji kwa ya eme ihe ọchị! Pọl dere, “Ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, okwukwe unu bu ihe efu” (I Ndi Kọrint 15:17). Ndịọzọ wee sị ka Pọl bịaghachị n’ụbọchị ọzọ mgbe ahụ ihe ọ naekwu pụrụ ịmasị ha.

Ọ dịka ụfọdụ mmadụ ha naeche na otú nke ntakịrị ha matara banyere Onyenwe anyị na Oziọma ra, otú ahụ ka ajụjụ ha gaazaghachị ra. Ụfọdụ ndịntọrọbịa chere na ha gaadị mma karịa ma ọ bụrụ na ha apụ ịga n’ụlọ nzukọ, ka ha ghara inwe nnukwu ajụjụ ha gaazaghachị banyere óké ọmụma ma ọbụ ìhè nke Okwu Chineke ha gaenwe. Ma eziokwu dị nime ya bụ na ha gaaza ajụjụ banyere eziokwu niile dị nime Okwu Chineke niile, n’ihi na eziokwu ndịa nọ inweta ha. Ka anyị tụa egwù ka anyị ghara ịtụfu ohere ọ bụla iji nụ maọbụ ịmụ ihe banyere Onyenwe anyị, n’ihi na ọ dịghị ihe ngọpụ ọ bụla gaagafe ikpé nke Chineke n’óké ụbọchị ahụ.

Ọ bụ náánị olenaole kweere ná okwu niile nke Pọl banyere Jisọs, ma anyị na agụ okwu mwute ụfọdụ, “Otú a ka Pọl siri n’etiti ha pụa.”

Ụbọchị naabịa mgbe Kraist gaachị ndị ahụ náachọghị ịzá òkù nke Chineke ọchị, kwakwa ha emò. “Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m’gāchi ọchi; M’gākwa emò mgbe óké egwù-unu nābia” (Ilu 1:26). Ụbọchị ahụ nke Pọl kwuru banyere ya … ma Chineke debeworo nke Ọ gaekpe ndị bi n’ụwa ikpé n’ihi mmehie ha … erubeghị. N’ụbọchị ahụ ọ gaghị abụ náánị ndị Atens, ndị Grik, ndị Tesalọnaika ma ọbụ ndị Beria gaanọ náenweghị ihe ngọpụ, kama ọtụtụ mmadụ nime ụwa niile gaeguzo n’iru Onyeikpé nke eziomume n’ekpuchị ọnụ ha. Akọọrọ ha akụkọ nke Oziọma ma ha emegheghị obi ha nabata ya. Ka Chineke nyere anyi aka ka anyị nwee ntị náanụ ihe na obi ná anabata akụkọ banyere Jisọs na ịhụn’anya Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ isiokwu nke Okwu Chineke Pọl kwuru?

  2. 2 Kwue ihe banyere omume ndị Juu nke Tesalọnaika n’ebe Pọl nọ?

  3. 3 Gịnị ka Pọl mere mgbe o ruru Aten?

  4. 4 Gịnị bụ aha ha kpọrọ Pọl ná Aten?

  5. 5 Kwue ihe banyere Okwu Chineke ekwuru n’elu Ugwu Mas?

  6. 6 Gịnị ka Ugwu Mas pụtara?

  7. 7 Òle iwu megidere ikpere ihe akpụrụakpụ nke ọlaọcha, ọlaedo, na nkume?

  8. 8 Ndị ahụ hà kweere ná okwu niile nke Pọl banyere mbiliten’ọnwụ nke Kraist?

  9. 9 Gịnị ka Pọl kwuru banyere ekwereghị ná mbiliten’ọnwụ?

  10. 10 Gịnị ka mbiliten’ọnwụ nke Kraist bụrụ anyị taa?