Ọlụ Ndi-ozi 18:1-22

Lesson 336 - Junior

Memory Verse
“Mu onwem kuru osisi, Apolos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba” (I Ndi Kọrint 3:6).
Notes

Ndị Náakpaákwà Ụlọikwụ

Pọl Onyeozi bụ onye náakpàákwà ụlọikwụ bụrụ kwa onye náejègharị maka ịgbasa oziọma. Mgbe ọ nọ na Kọrint, ọ bụ site n’ịkpàákwà ụlọikwụ ka o ji ná enweta iheoriri. O biri na èzínaụlọ nke Akwila na Prisila ndị náalụ kwa ụdị ọlụ ahụ. Anyị amataghị mgbe Akwila na Prisila jiri bụrụ ndị nke Kraist. Ọ gaabụ na azọpụtawo ha tupu ha arapụ Rom. Ma ọbụ site ná ịlụkọọlụ nke ha na Pọl ka, ha nụrụ banyere Jisọs ewe mee ka ha chègharịa. Ọtụtụ mmadụ n’ebe ha naalụ ọlụ, nụrụ banyere Oziọma nke Jisọs. Site n’ebe analụọlụ akpọwo ụfọdụ òkù ka ha bịa nzukọ. Enye kwara ụfọdụ akwụkwọ nke ndị Kraist ka ha gụọ. Ụfọdụ site n’ịhụ ndụ onye nke Kraist náalụọlụ náakụkụ ha, ajụwo òle nzukọ ị naeje? Ewe gwa ha banyere nzọpụta site ná mmehie. Ijé ụlọakwụkwọ bụ otù ụzọ ọlụ nye nwantà. Ụmụ nke ndị Kraist nwere ohere n’ebe a ime ka ìhè ha nwue. Enwewo ụmụ ntà ndị natara òkù ịbịa ụlọakwụkwọ ụbọchịụkọ site n’aka ụmụakwụkwọ ibe ha. Nke a duuru ha bịakwute Jisọs na nzọpụta.

Oziọma Dịka Uche Si Dị

Pọl ekweghị ka ọlụ ya gbochie ya ijé ná ụlọ nzukọ. Mgbe ndị mmadụ gbakọrọ ná ụlọ nzukọ (ụlọ ekpere ndị Juu) Pọl naagakwa n’ebe ahụ. Pọl ejeghị n’ụlọ nzukọ ndị Juu ikpeekpere dịka ha naeme. O jere ịgwá ha banyere Jisọs. O soro ha “rurita” ụka: nke pụtara na ya na ha kwukọrịtara okwu o wee gwa ha ihe mere ha ga eji kwere na Jisọs. Onyeamụma bụ Aisaia dere: “Biko bianu, ka ayi rurịta uka, bú ihe JEHOVA nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, Ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; o buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, o bu dika aji ọcha ka ha gādi” (Aisaia 1:18).

Ọ bụghị náánị na Pọl soro ndị Juu rụrịtaụka, kama o mere ka ụfọdụ kpe ekpere iji nwe nzọpụta. Ihe banyere ndị Kọrint a bụrụrị Pọl ibuarọ. Ọ matara na ọ bụ ọlụ dịrị ya ịgwa ha banyere nzọpụta. O metụrụ ya na ọ bụ ihe mkwanye ugwù nye ya bụ ịgbaàmà banyere Jisọs. Pọl hụrụ mkpụrụobi niile nke ụmụmmadụ n’anya, ebe ọ bụla o jekwara, ọ na ekwesintụkwasịobi n’ebe Chineke ya na mmadụ ibe ya nọ site n’ịgwá ha banyere Jisọs.

Megide Onweha

Silas na Timọti sonyere Pọl na Kọrint. Ma ihe ha kwusara amasịghị ụfọdụ ndị Juu. “Ha megidere onwe-ha.” Nke a ndị náajụ òzízí nke Jisọs naeme. Ha naemegide onweha; ha na emerụ onweha arụ, n’ihi na náánị ihe ọma ka Oziọma naeme nime ndụ mmadụ. “Ekpegh onye kwere na Ya ikpé: ekpewo onye nēkwegh na Ya ikpé ugbu a, n’ihi na ọ kwegh n’aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya” (Jọn 3:18).

Pọl ekwusaworo ndị Juu n’ikwesịntụkiwasịobi. Ọ bụrụ na ha chọrọ ịjụ Jisọs, nke a ahụ gbasara ha, bụrụ kwa ọchịchọ nke akaha. Pọl alụwo ọlụ dịrị ya site n’ịgwa ha banyere nzọpụta, na kwa ikpere ha ekpere. Jisọs agwaworị ndị náesoụzọ Ya sị: “Ebe ọ bula nke nānaragh unu nke-ọma, ebe ha anugh kwa okwu unu, mgbe unu nāpu n’ebe ahu tichapu ájá di n’okpuru ukwu unu ka ọ buru ha àmà” (Mak 6:11). Pọl “fechapuru uwe-ya” dịka ihe àmà megide ndị Juu bụ ndị “n’emegide onwe-ha.”

Nzukọ Nke Enwere N’ụlọntà

Ná akụkụ ụlọ nzukọ enwere nwoke nke bi n’ebe ahụ anaakpọ Justọs. Eleghịanya Pọl na enwe nzukọ ekpere n’ụlọ ya mgbe ọ rapụrụ ụlọnzukọ ndị Juu, n’ihi na ndị Juu achọghị kwa ịnụ banyere Jisọs ọzọ. Enwere ụfọdụ ndị chọrọ ịnụ mkwusa nke Pọl; mgbe ha nụrụ, ha siri na okpukpé ochie ha pụta. Otù nime ha bụ Krispọs, onyeisi ụlọnzukọ, ya na èzínaụlọ ya. Eleghịanya mgbe azọpụtara ya n’oge náadịghịanya anapụrụ ya ọnọdụ ahụ o ji. Mgbe emesịrị anyị gụrụ banyere nwoke ọzọ nke bụ kwa onyeisi nzukọ.

Ọnụnụ na Ikwere

“Ọtutu madu n’etiti ndi Kọrint we kwere mgbe ha nuru, ewe me ha baptizim.” Nke a na egosi anyị mkpà ọ dị bụ izisa Oziọma, ịgbáàmà, na ịgwa ndịọzọ banyere Jisọs. Òlee otú mmadụ gaeji kwere ma ọ bụghị na ọnụrụ banyere Jisọs? Eleghịanya ị chọrọ inwe enyi, ma ọ bụ na ndị mụrụ gị soro gị ga n’ụlọekpere ewe zọpụta ha. Ị gwawo ha banyere Jisọs.

Pọl chọpụtara na ọ bụghị ndị niile nụrụ banyere Jisọs kweere. Otú ahụ ka ọ dị kwa taa. Aga enwe kwa ndị dị otú a bịara ụlọakwụkwọ ụbọchịụkọ. Ha nụrụ banyere Jisọs nime ụlọakwụkwọ; ha bụrụ abụ ahụ banyere Ya, ha mụrụ iheọmụmụ banyere Ọkpara Chineke, ma ọ bụ ha niile nwere nzọpụta? Ị nwewo nzọpụta?

Ịgbàume

Mgbe Pọl ka nọ na Kọrint, Onyenwe anyị gbara ya ume site n’ọhụụ. Onyenwe anyị gwara Pọl ka o kwueokwu ná atụghị egwù, n’ihi na agaghịemerụ ya arụ. Ọ gwakwara Pọl na enwere na Kọrint ọtụtụ ndị kwereekwe na efè kwa Kraist. Onyenwwe anyị sịrị, “Atula-egwù, … n’ihi na Mu onwem nọyere gi.”

Chineke naeji okwu ndị dị otú a mkwà dị nime ya, náagbá ndị Ya ume mgbe dum. Ọ naadọ ndị Ya akanántị mgbe ha kwesịrị ka adọ ha akanántị, náagbá kwa ha ume mgbe ha chọrọ agbamume. Chineke gbara ụmụ Israel ume mgbe ha gara ibu agha megide ndị iro ha, bụ ndị nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha karịrị nke ha. Ọ sịrị, “Atula egwu ha; n’ihi na JEHOVA bú Chineke gi, nọyere gi” (Deuteronomi 20:1). Mgbe Joshua gara agha ibuso ọtụtụ ndị eze agha, Onyenwe-anyi kwukwara otù okwu ịgbàume ahụ nye ya: “Atula egwu n’ihi ha” (Joshua 11:6). Jisọs mere ka ndị náesoụzọ Ya hụ Ya anya mgbe ha nọ ná ebilimmiri. Ọ sịrị “Nwenu obi-ike; ọ bu Mu” (Matiu 14:27). Otú ahụ kwa, nime arọ niile, ọbụná rue taa. Onyenwe anyị na anọnyere ndị náeso Ya ịgbá ha ume n’oge ọ dị mkpà.

Pọl nọrọ otù arọ na ọkara na Kọrint. N’oge a ọ kụziiri ndị mmadụ Okwu Chineke. Ọtụtụ ndị Kọrint wee kwere. Náarụghịụkà nke a bụ mmalite nke nzukọ dị na Kọrint. Ọ bụghị onye ọ bụla nụrụ okwu Pọl kweere banyere Jisọs. Ọ bụghị náánị na ụfọdụ nwere obiabụọ, kama ha wetakwaara Pọl nsogbu.

Eboroebubo

Otù oge akpọrọ Pọl ga n’iru oche ikpé nke Galio, bụ onyeozi nke ndị Rom sitere ná Akaia. Eboro ya ebubo na ọ naeme ka ndị mmadụ kpeere Chineke n’ụzọ megidere Iwu. Tupu Pọl gaekwuokwu ọ bụla, Galio agwaworị ndị na ebo ya ebubo okwu. Ọ sịrị na ya agaghị ege ha ntị ma ọ bụrụ na ihe ha na ekwu metụtara okpukpé ha. Galio ebe ọ bụ onyeozi nke ndị Rom, anọghị na ọnọdụ ikpeikpé banyere okpukpé nke ndị Juu. Iwewere ya na ha na ewetara ya okwu nke ya na enweghị ike ikpezi. Galio wee mechie ikpé ahụ, ma chụpụ ndị ahụ n’iru ocheikpé. Mgbe ahụ ụfọdụ ndịGrik ndị nọ náele anya, jidere Sostenis. Dịka onyeisi ụlọnzukọ, ọ gaabụworị onye isi nke ndị Juu ndị bowororị Pọl ebubo. Ndị Grik tiri Sostenis ihe n’iru ocheikpé ahụ. Galio etinyeghị anya na ihe naeme, o mekwara ka ọ gbasaghị ya na anaemeso ndị Juu dịka ha bu n’uche imeso Pọl.

Ọgbasaghịm

Galio anọghị náakụkụ nke Pọl. Ma Pọl ma ndị Juu, ọ dịghị ndị ọ nọnyere. O mere ka ọ gaasị na ọgbasaghị ya bụ ihe naeme, ọ dịghị kwa nke ọ bụla nime òzízí ndị ahụ o tinyere anya. Eleghịanya nke gbasara ya bụ ime ihe gaatọ Klọdiọs bụ onye ọchịchị Rom ụtọ, bụ onye mere ya onyeisi nke Akaia. Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa adịghị egosi mmasị n’òzízí niile nke ihe nke mmụọ. Ihe náamasịkarị ha bụ ime ihe gaatọ ndị ha na ezute n’ụlọọlụ ha ụtọ. Ụfọdụ náechè na ọ dịghị mkpà ịnọnyere Kraist maọbụ ịnọnyere ndị náemegide Ya. Okwu Chineke naakụzi na ndị náanọnyereghị Kraist, na emegide Ya (Matiu 12:30). Ka anyị naamụ Baịbụl anyị na ahụ na ọ dịghị ụzọ nke nọ náefù. Náánị ụzọ abụọ ka akpọrọ aha ụzọ nke dị warara ná eduba na ndụ ebighịebi, ebe nke dị obosara na eduba ná ọnwụ na mbibi (Matiu 7:13, 14).

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ, tinyere ụmụ ntà, adịghị amata na ha aghaghị ịrọrọ ma ha gaefè Chineke maọbụ na ha agaghị efè Ya. Ha pụrụ ichè na ha pụrụ ịrapụ ime nrọrọ ọ bụla, ma ọbụrụ na ha rapụ ịrọrọ Kraist, ha arọrọwo Ekwensu dịka Onyenwe ha. Ha pụrụ ịdị náaga ụlọakwukwọ nke ụbọchịụkọ, ga kwa ụlọ nzukọ, ma náenwe kwa àtụmààtụ ijere Chineke ozi mgbe emesịrị; ma ha abụghị kwa nke Onyenwe anyị, n’ihi na ha arapụwo ikpéekpere iji nwee nzọpụta. Ha abụghị nke Jisọs, Eze nke ndị eze, rue mgbe agbaghara ha mmehie niile ha, ha wee ná ebiri Jisọs ndụ ha kwa ụbọchị.

Ihe ndapụta a mere n’iru Galio emeghị ka egwù tụa Pọl, maọbụ ka o si na Kọrint gbapụ. Ọ nọkwara ná ebe ahụ na nwa mgbe oge ihe ndịa mesịrị, ná ekwusa, ná agbasa kwa Oziọma. Oge bịara mgbe Pọl nwere mmetụ na ya aghaghị ịga n’iru nime ijè ya nke ịgbasa Oziọma.

Ndịinyeaka

Ọ bụ ezie na Pọl rapụrụ ndị náesoụzọ Onyenwe anyị na Kọrint, ma o chéfughị ha. O kpeere ha ekpere. O zipụrụ ndị ozi ọzọ inyere ha aka. Pọl jikwara ọtụtụ akwụkwọozi gba ha ume, abụọ nime ha ka edere nime Baịbụl amataara dịka Ndị Kọrint nke Mbụ na nke Abụọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ Pọl malitere nzukọ dị na Kọrint, ma ọ naraghị otuto ọ bụla nye onweya. Ọ matakwara na ndị ọzọ nyere aka, ma ọ bụ Chineke ka otuto na nsọpụrụ dịrị. Pọl sịrị, “Mu onwem kuru osisi, Apolọs kwọsara ya miri, ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba” (I Ndi Kọrint 3:6).

Site na Kọrint Pọl wee baa n’ụgbọ ịga Siria. Mgbe ụgbọ ahụ kwụsịrị n’Efesọs, eleghịanya ijè abalị asatọ maọbụ iteghete, Pọl wee ga n’ụlọ nzukọ ndị Juu ịgwa ha banyere Oziọma nke Jisọs. Prisila na Akwila esoworị Pọl ga Efesọs. Ha bụ ndị enyi nime Kraist ndị ha na Pọl bikọworo. Ọ kpọrọ ha “ndi enyem akam nime Kraist Jisus.” Ọ dịka mmadụ abụọ a náeso Kraist nyere onweha kpamkpam n’ọlụ Onyenwe anyị. Eleghịanya ha nọdụrụ ná Efesọs ebe anaenwe òfùfè nrò n’ụlọ ha (I Ndi Kọrint 16:19). Emesịa ọ gaabụ na ha gakwara biri na Rom ebe ụlọ ha bụ kwa ebe anaefè òfùfè nrò (Ndi Rom 16:3-5).

Ma Chineke Kwe

Ndị Efesọs ka chọkwara ịnụ Okwuchukwu nke Pọl na ekwu, ha wee rịọ ya ka ọ nọnyere ha nwa mgbe ntà. Ma o metụrụ Pọl na ya aghaghị ịnọ na Jerusalem n’oge ememe nke okpukpé náabịa. O kwere mkwà na ya gaabịaghachị ná Efesọs ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị. Anyị pụrụ ịmụta iheọmụmụ a site náaka Pọl: Ọ sịrị, “Ma Chineke kwe.” Pọl emeghị àtụmààtụ dị ichè, maọbụ kwe mkwà dị icheiche ná ebughị ụzọ chee ihe Onyenwe anyị na àtụmààtụ nke Ya bụ. Pọl kwukwara otù ụdị okwu a nye ndị Kọrint mgbe o chere na ya gaalaghachị ebe ahụ ọzọ. Ọ sịrị, “Anamele anya na m’gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe” (I Ndi Kọrint 16:7). Nime akwụkwọ ozi nke Jemes anyị gụrụ na “nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu” (Jemes 4:15). Ná iheọmụmụ anyị ọzọ, anyị gaamụ banyere nlaghachị Pọl ná Efesọs.

Pọl jere Jerusalem. Ebe ahụ ka edoro ịbụisi nke ọlụ Oziọma. Pọl kelere ndị náesoụzọ Onyenwe anyị nọ ná nzukọ dị na Jerusalem. Eleghịanya ọ kọọrọ ha otú ijè ya si dị, dịka ya na Banabas mewororị ná ngwụsị nke njèm nke mbụ nke Pọl jere maka izisa Oziọma. “Ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye Ndi Mba-ọzọ” (Ọlu Ndi-ozi 14:27). Site na Jerusalem, Pọl wee gaa ná Antiọk ebe o mechiri njèm ya nke abụọ nke ijé Oziọma.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òle ebe ka Kọrint dị?

  2. 2 Gịnị mere Akwila na Prisila ji rapụ Itali?

  3. 3 Kpọọ aha ndịkom abụọ ndị ji ịkpá ákwà ụlọikwụ ná enweta ihe ha gaeri.

  4. 4 Gịnị ka Pọl mere mgbe ndị Juu “megidere onwe ha”?

  5. 5 Ònye ka Justọs bụ?

  6. 6 Kpọọ aha nwoke ahụ ya na èzínaụlọ ya kweere n’Onyenwe anyị?

  7. 7 Oge ra añaa ka Pọl nọrọ na Kọrint?

  8. 8 Gịnị bụ ọhụụ Chineke ziri Pọl mgbe ọ nọ na Kọrint?

  9. 9 Gịnị mere Pọl ji chọọ ịga Jerusalem?

  10. 10 Òlee ebe Pọl mechiri njèm ya nke ugbò abụọ nke ijé izisa Oziọma?