Ọlu Ndi-ozi 1:24-28; I Ndi Kọrint 1:11, 12; 3:4-9

Lesson 337 - Junior

Memory Verse
“Otú a, ayi, ndi di ọtutu, bu otù aru nime Kraist, buru kwa n’otù n’otù ihe di n’aru ibe-ayi” (Ndi Rom 12:5).
Notes

Akọwara Onye Apọlọs Bụ

Mgbe Pọl onyeozi nọ na Jerusalem, Apọlọs, onye n’ejere Chineke ozi, sitere na Aleksandra nke dị n’Ijipt jé ileta nzukọ Kraist dị n’Efesọs. Ọ dịghị mgbe ọ bụwororị onye náesoụzọ Kraist, ya mere mkwusa ya na mmalite ya adịghị ka nke Pọl, maọbụ Pita maọbụ Banabas na ndị Kraist ọzọ kwusaworo n’Efesọs. Apọlọs bụ onye Juu, mara kwa ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ nke ọma; ma ọ dịghị ekwusa dịka ndị Farisi, maọbụ ndị na ekpé okpukpé nke ndị Juu (Judaizers), bụ ndị nọgidere n’ikwusa náánị ihe enyere n’Iwu. Apọlọs anụwo mkwusa nke Jọn Onyeọwụmmiri wee kwere.

Ihe Jọn naekwusa bụ “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2). Site n’iheọmụmụ Apọlọs chọpụtara na Mesaia gaabịa; ọ gaagụtaworị site n’akwụkwọ onyeamụma bụ Aisaia na Jọn Onyeọwụmmiri gaabịa dịka “Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si Dozienu ụzọ JEHOVA, menu ka ụzọ atuliri-atuli guzoziere n’ọzara Chineke-ayi.” Ya mere mgbe Apọlọs nụrụ mkwusa nke Jọn o wee kwere.

Ọ gaabụ na Apọlọs biri n’Ijipt mgbe Jisọs n’ezisa oziọma n’ụwa, ọ mataghị kwa na Jisọs abịawo dịka Mesaia ahụ, bụrụ kwa Onye akpọgideworo n’obe, nke si kwara n’ọnwụ bilie. Ọ dịghị ụzọ esi agbasa ozi ga n’ebe dị anya ngwangwa mgbe ahụ dịka ọ dị taa. Tụkwasị, ndị Juu ndị kpọrọ Jisọs asị achọghị ka akụkọ banyere Ya gbasaa maọlị.

Apọlọs Kụziri Ihe Nkeọma Karịa

Mkwusa oziọma nke Apọlọs tọrọ Akwila na Prisila ụtọ bụ ndị ha na Pọl naalụkọọlụ n’Efesọs. “Ọ di ọku na mọ-ya, ọ we nēkwu nēzi kwa nke-ọma ihe niile banyere Jisọs.” Ihe niile ọ mụtara ka ọ naekwu, ọ dịghị kwa ekwu megide ihe Pọl kwusaworo. Ma ọ mataghị na ihe ukwu ahụ nke ọ sịrị gaeme na mgbe nso emeworị. Jisọs abịaworị, nwụọ kwa wee si n’ọnwụ bilie.

Akwila na Prisila wee kuru ya laa n’ụlọ ha, malite kwa wee “kọrọ ya uzọ Chineke nke ọma karị.” Ha kọwara ya n’ezie ihe Pọl kwusara, na Kraist anwụwo n’elu obe dịka àjà mmehie, bilie kwa, ịgosi na Ọ bụ Chi. Ebe ọ bụla Pọl jere o kwusara na Onyenzọpụta ebiliwo n’ọnwụ, Onyenwere ike itiji ike nke mmehie, bụrụ kwa Onye pụrụ ịzọpụta ndị niile kpọkuru Ya n’okwukwe ná nchègharị.

Anabtara Akụkọ Ahụ

Ọ bụ ezie na Apọlọs bụ onye dị ike ná mkwusa bụrụ kwa onye ọtụtụ mmadụ náesogharị, ma o jiri ọñụ geentị n’akụkọ nke Akwila na Prisila. Ha bụ náánị ndị náakpaákwà ụkọịkwuu, ma Apọlọs chọpụtara na ha nwere ozi nke ndụ, o wee nabata ya, Onye nwere obi ziriezi adịghịachọ ịmata ụdị onye naagwa ya okwu banyere Jisọs. Nwata azọpụtaworo pụrụ iwere ezi mkwuwaokwu kọ akụkọ ahụ dịka okenye. Ị ga echeta akụkọ nwagbọghọ ntà ahụ adọtara n’agha onye gwara Neman onye ekpenta banyere onye amụma n’Israel. Ọ bụ náánị nwagbọghọ ntà adọtara n’agha, ma ọ mara banyere ike nke Chineke Israel, wee ghara ịtụegwù ikwupụta Ya.

Apọlọs Jere Obodo Ọzọ

Mgbe ha nwesịrị nzukọ n’Efesọs, Apọlọs jere Grik ikwusa oziọma, ndị Kraist wee zite ozi kwagidere na Apọlọs naekwusa eziokwu dịka ha nụrụ n’ọnụ Pọl. Pọl natara ozi ahụ site n’Eluigwe.

Lee ka o si dị mma na Apọlọs jiri onyinye nke ọkàokwu ya lụọọlụ iji nye Chineke otuto! Ọ mara ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ nkeọma, o wee nwe ike ime ka ụmụmmadụ mata na Jisọs bụ Kraist ahụ. Mmụọ Chineke mere ka o cheta ihe niile ọ mụtaworo na mgbe garaaga, wee kpughere ya mmezu nke Okwu Chineke.

Ịrụụkà

Apọlọs kwusara oziọma na Kọrint kwa, bụ ebe ọzọ Onyeozi Pọl kwusaworo oziọma. Ụmụmmadụ kwere na mkwusa ya, wee hụ ya n’anya n’ihi eziokwu ọ naekwusa. Ma nsogbu dapụtara n’ihi na ụfọdụ mmadụ rọrọ Pọl Onyeozi kama Apọlọs, nzukọ Kraist wee kewaa.

Pọl wee degara nzukọ dị na Kọrint akwụkwọ wee gwa ha na ihe ha naeme ezighịezi. O kwesịrị ka ha ñaantị n’ozi banyere Jisọs, wee ghara ile onye mkwusa anya n’iru.

Pọl achọghị ka mmadụ hụ ya n’anya karịa onyeọzọ. Ọ bụ Jisọs ka ọ naebuli elu mgbe niile; o jikekwara ịbụ onye akọchara maọbụrụ na agazọpụta náánị ndị Juu. Ọ gwara ndị Kọrint sị: “Ma mu onwem Pọl ji idi-nwayọ na obi-ọma nke Kraist nāriọ unu, mu onye nādi ala n’iru unu mgbe m’nọ n’etiti unu, ma mgbe m’nānọgh enwem obi-ike n’ebe unu nọ: ma ariọm unu, ka m’ghara inwe obi-ike mgbe m’nọ n’etiti unu” (2 Ndi Kọrint 10:1, 2). O ji mkwuwaokwu nke dị iche n’ụzọ Apọlọs ji were ọkàokwu, ma ike Chineke bi nime ya, Chineke were kwara ijéozi zọpụta ọtụtụ mkpụrụobi.

Ọ dịghị onye deworo akwụkwọ amara aha ya n’ụwa karịa nke Pọl Onyeozi. Chineke pụrụ iji ya jee ozi n’ihi na o wedatara onweya n’ala wee nye Chineke otuto nime ihe niile Chineke hụrụ site n’ijéozi ya.

Pọl jụrụ ajụjụ si: “Gini kwa bu Apọlọs? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje-ozi, ndi unu si n’aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwara ha abụa n’otù n’otù” (I Ndi Kọrint 3:5). Ha bụ náánị ọnụ nye Mmụọ Nsọ. Ha kwuru Okwu Chineke tinyere n’ọnụ ha. Ọ dịghị kwa onye agaazọpụtaworị site ná mkwusa nke Pọl maọbụ Apọlọs ma ọbụrụ na Mmụọ Nsọ atụghị ya mmehie ya n’anya. “Ọ bụ mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abagh urù ọ bula” (Jọn 6:63).

Aha Jisọs Zọpụtara

“Aha ọzọ dị iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12). Ntọala nke mkwusa nke ndị Kraist niile bụ na Kraist bụ Ọkpara Chineke. Ike dị n’aha Kraist agaghị akariworị nke onye amụma ọ bụla maọbụ onyemkwusa amara aha ya ma ọbụrụ na Jisọs abụghị Chi. Pọl sịrị, “Ma ọ buru na emegh ka Kraist si n’ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu” (I Ndi Kọrint 15:14). Nke a pụtara na ọ bụrụ na Kraist abụghị Ọkpara Chineke, ọ baghị urù ikwusa oziọma Kraist. Ma Kraist ji arụ ebube si n’ọnwụ bilie, otú a agaeme ka arụ niile nke ezi ndị Kraist nwụrụ n’okwukwe dị kwa ndụ “ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi.”

Pọl gwara ndị Rom na Kraist bụ “Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n’ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n’ọnwu nke ndi nwuru anwu” (Ndi Rom 1:4). O mere ka ịbụ Chi Ya pụta ìhè site n’ịtọgbọ ndụ-Ya, wee were kwa ya ọzọ -- bụ ihe onyeamụma nke ụwa ọ bụla, maọbụ, onye nchụàjà maọbụ eze ọ bụla náapụghị ime.

Pọl, na Apọlọs, na Pita (bụ onye akpọrọ Kifas) kwusara ntọala niile nke eziokwu nke Oziọma, o wee tọọ ụmụmmadụ ụtọ ịña ha ntị n’ihi ụzọ dị icheiche ha ji che eziokwu ndịa n’iru ha. Ihe niile ha kwusara bụ iwuli nzukọ Kraist dịka ụlọ. Ọ bụ agụụ ha inyere ụmụmmadụ aka ijikere maka izute Jisọs, ha adịghị ekwusa iji nara otuto nye onweha.

Ọlụ Dịrị Ọra

Ọnọdụ dịrị orù Chineke ọ bụla, ọ dịghị kwa ihe gaebute ekworo megide mmadụ ọ bụla. (N’ezie, onye ọ bụla ekworo dị nime ya atụfuwo Mmụọ Chineke nime ya). Mmadụ niile náejere Chineke ozi nwere otù olileanya. Otù onye naakụ mkpụrụ nke Oziọma, onyeọzọ wee bịa site námkwusa nke ya kwọsa ya mmiri. Ka oge naaga iheọkụkụ ahụ gaachọ ka efopụ ahịhịa dị ya gburugburu. Ọ gaabụ na mkwusa nke onyeọzọ gaeme ka “ahịhịa” ahụ puta ìhè na ndụ nke onye chọrọ ka eropụ ya. Mgbe niile onyeozi ahụ naekwusa Okwu Chineke ahụ n’izuòkè, wee náebindụ dịka Okwu ahụ si dị, náewepụghị ihe maọbụ mee ihe megdidere eziokwu ahụ, ọ bụ orù nke Onyenwe anyị, kwesị kwa ka aña ya ntị nabata kwa ijéozi ya, náatụleghị onye ọ bụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye ka Apọlọs bụ?

  2. 2 Ebee ka Apọlọs si bịa?

  3. 3 Òlee otú o si kwusaa mkwusa n’Efesọs?

  4. 4 Gịnị ka Akwila na Prisila gwara Apọlọs?

  5. 5 Gịnị bụ nghọtahie enwere na Kọrint?

  6. 6 Gịnị ka Pọl kwuru n’akwụkwọozi o degaara ndị Kọrint banyere onweya na ijéozi nke Apọlọs?

  7. 7 Gịnị bụ isi ihe nke Pọl na Apọlọs naekwusa?