Lesson 338 - Junior
Memory Verse
“Ndi ihe nāgara nke ọma ka ndi ahu bu, nke JEHOVA bu Chineke-ha” (Abù Ọma 144:15).Notes
Pọl Kwuru Okwu Banyere Mmụọ Nsọ
Mgbe Pọl si Kọrint náalọta n’ijè mgbasaoziọma ya nke ugbò abụọ iru Jerusalem, ọ banyere n’Efesọs ileta ha. O kwusara Okwu Chineke nwa oge gwa ndị Juu na Synagogue ha; ha nabata kwara mkwusa ya, wee chọọ ka Pọl nọnyere ha ogologo mgbe. Ma ọ pụghị ịnọgide mgbe ahụ, ma ugbu a ọ naaga ijèmkwusa ya nke ugbò atọ, ọ bịara n’Efesọs wee nọgide ọtụtụ mgbe.
N’Efesọs Pọl hụrụ ndị náesoụzọ Jisọs jiri obi ha niile kwere, wee náesoro òzízí niile ha nụrụ, o wee jụọ ha ma ha anatawo Mmụọ Nsọ. Ha amataghị ihe ọ naekwu. Ha wee za sị, “ayi anugh ọbuná ma enyere Mọ Nsọ.”
Otù Nzọụkwụ Otù Mgbe
Mgbe azọpụtara mmadụ, ọñụ na ejupụta obi ya rue mgbe ọ gaeche na ọ dịghị mkpà ịchọ iru Chineke ọzọ na nwa mgbe. Ma mgbe oge naaga, ọ malite inwe agụụ ihe ọzọ n’obi ya. Mgbe ọ naekpeekpere náeji obi chụọàjà nye Chineke, kwere kwa na odudonsọ, anaeji ọñụ ọzọ nke odudonsọ sitere na Chineke mejupụta ya. O wee dị nsọ! Udo wee biri nime obi ya! Chineke wee mejupụta ya n’ịhụn’anya! Anaenye ya ike dị ukwu karịa ijigidesi okwukwe ike site n’amara ndịa, o wee náemeri mmehie. Eropụwo mkpọrọgwụ nke mmehie.
Onye ọ bụla nke chọrọ ihe kachasị mma n’aka Chineke naanata amara ọzọ. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya tutu Ọ la, ka ha nọgide na Jerusalem rue mgbe ha gaanata mkwà nke Nna, nke bụ Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Jisọs ekpeworị ekpere n’ihi ime ka ha dị nsọ, wee kunye kwa ume nke Mmụọ Nsọ (Jọn 20:22), ma akaejighị Mmụọ Nsọ wụọ ha mmiri. Ihe karịrị ukwu nọ náechere ha. “Agēji Mọ Nsọ me unu Baptism mgbe ọtụtụ ubọchi nāgagh-agabiga site n’ugbu a” (Ọlu Ndi-ozi 1:5).
Ike Iji Jéé Ozi
Enwere ọtụtụ ọlụ ịgbasa Oziọma dịrị ndị náesoụzọ Jisọs. Ha gaachọ inyeaka site n’Eluigwe. Jisọs sịrị: “Ma unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-amam nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ọ bụ ike ahụ nke onye ọ bụla chọrọ ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ náaghaghị inwe.
Azọpụtaghị anyị ka anyị nọdụ ala otù ebe náebindụ nke jupụtara n’udo na afọojuju nke ndụ a. Ngọzi niile nke Chineke dị ebube, Ọ chọkwara ka anyị nwe ọñụ; ma ọ dịghị onye nwere ọñụ dịka onye náejere ndịọzọ ozi. Agọzirị anyị ka anyị bụrụ ngọzi nye ndị ọzọ. Ndị náeso Ya ka ekwere mkwà na Ọ gaanọnyere anyị. “Ya mere ganu me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, … ma le, Mu onwem nọnyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a” (Matiu 28:19, 20).
Ọ bụ ọwụwụmmiri nke a ka Pọl naagwa ndị Efesọs banyere ya. Hà anatawo amara nke a dị ebube gaenye ha ike nke ịbụ ndịàmà n’ụwa niile? Hà anatawo Onye Nkasiobi ahụ, Onye Jisọs kwere ná mkwà na ndụ ha? Gịnị mere ha amataghị na ha pụrụ ịnata ngọzi ukwu dị otú a n’aka Chineke!
Ọwụwụmmiri Nke Mmiri
Pọl jụrụ ajụjụ ọzọ. Ọ bụrụ na ndị Efesọs anụghị banyere Mmụọ Nsọ, ememe dị aña ka ha naeme mgbe anawụ ha mmiri nime mmiri? Jisọs nyere iwu ka anaawụ mmiri “bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ” (Matiu 28:19). Ọ bụrụ na awụrụ ha mmiri n’ụzọ dị otú a, ha gaamaworị na Mmụọ Nsọ dị.
Ndị Efesọs zara sị na awụrụ ha mmiri nke Jọn. Náánị ihe ntà ka anyị mara banyere ọwụwụmmiri nke Jọn; ma anyị mara na ọlụ ya niile bụ idozi ụmụmmadụ nye ọbịbịa nke Jisọs. Ozi ọ na ekwusa bụ: “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso.” Ọtụtụ mmadụ gbakọrọ ịnụ mkwusa nke Jọn, ụfọdụ wee che na ọ bụ Mesaia ahụ. Ma Jọn zara sị: “Mu onwem nēji miri me unu baptism n’ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n’azum kam ike, Onye m’nērugh ichi akpụkpọ-ukwu-Ya: Onye ahụ gēji Mọ Nsọ na ọkụ me unu baptism” (Matiu 3:11). Ya mere ọwụwụmmiri nke Jọn ezughị òkè.
Mgbe Jisọs lụsịrị ọlụ nke mgbapụta Ya n’ụwa wee laghachị n’Eluigwe, agba ọhụụ malitere. Mgbe ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ dakwasịrị otù narị na iri mmadụ abụọ ahụ n’ụlọ elu mgbe ụbọchị iri gasịrị site na mgbe Jisọs laghachirị n’Eluigwe, oge nke Mmụọ Nsọ malitere.
Nye Ndị Nọ N’ebe DỊ Anya
Ọ bụghị náánị ndị ahụ natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ n’ụbọchị ahụ ka ọ dịrị. Anyị amụwo banyere Ndịmbaọzọ ndị Mmụọ Nsọ dakwasịrị nime ọtụtụ arọ mgbe Pentikọst gasịrị (Iheọmụmụ 290, 304). Nleta nke a Pọl letara ndị Efesọs bụ mgbe iri arọ abụọ na atọ gasịrị site na Pentikọst, ihe dị ka mmadụ irinaabụọ nime ha natara Mmụọ Nsọ. Pita Onyeozi sịrị; “N’ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bụ ndi Onye-nwe-ayi Chineke gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Anyị so na ndị ahụ “nọ n’ebe dị anya,” anyị naanata kwa ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ maọbụrụ na anyị emezue iwu nke Chineke.
Mgbe mmadụ irinaabụọ ndịa natara Mmụọ Nsọ, ha sụrụasụsụ n’ire ọzọ, bụ asụsụ ha náamaghị, dịka narị na iri mmadụ abụọ ahụ sụrụ ya n’ụbọchị Pentikọst. Nke a bụ iheàmà nke Chineke naenye onye ọ bụla natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ rue taa.
Pọl asịghị na ya alụzuwo ọlụ ya mgbe mmadụ irinaabụọ ahụ natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ọ nọgidere náekwusa nime Synagogue banyere Jisọs ka ndị ọzọ kwere natakwa onyinye nke Chineke. Ma dịka o si adị, ụfọdụ adịghị ekwere mgbe agwara ha Oziọma ọ bụ kwa ha naakpata nsogbu. Pọl matara na ọ baghị urù isoro ndị náachọghị ikwere náarụụka; ya mere Pọl kuru ndị kwereekwe bụ kwa ndị náeso ya n’azụ wee ga n’otù ụlọakwụkwọ, ga kwa n’iru izi ha ihe ebe ha náagaghị anụ ịrụụka nke ndị náekweghịekwe. Ya na ndịa chègharịrị nọgidere arọ abụọ, rue mgbe mmadụ niile bi n’obodo ahụ gburugburu, ma ndị Juu ma ndị Grik nụrụ banyere Onyenwe anyị Jisọs.
Ọgwụgwọ Nsọ
Mgbe Pọl kwusara banyere Jisọs o kwusaghị náánị banyere nzọpụta, odudonsọ na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, kama o kwusara banyere ọgwụgwọ nsọ. Karịa nke ahụ, Pọl kwekwara na Chineke gaaza ekpere ya mgbe o kpeere ụmụmmadụ ekpere. Chineke lụrụ ọtụtụ ọlụ ebube dị ukwu n’ihi na Pọl kwere.
Izipụ ịchafọ etere mmanụ kpe kwa ekpere n’elu ya site n’aka ndịozi nke Chineke n’ihi ọgwụgwọ nke ndị nrịanrịa malitere n’oge a. Pọl zipụrụ ịchafọ maọbụ ákwà apron nye ndị ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ náesogbu nọ n’ebe dị anya. Chineke gwọrọ ha. Chineke náanụ náaza kwa ekpere nke okwukwe taa n’ihi ọgwụgwọ nke ndị nrịanrịa, ọtụtụ mmadụ kwa ahụwo mmetụ aka nke ọgwụgwọ Chineke mgbe ha tụkwasịrị ịchafọ ahụ etere mmanụ kpe kwa ekpere n’elu ya n’arụ ha.
Ndị Mmụọ Ọjọọ Kwere
Ụfọdụ ndị Juu n’Efesọs nwara iji mgbasị ha chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụ ihe yiri òfùfè nke ajọ mmụọ n’ụbọchị ndị a. Mgbe ha nụrụ na Pọl ji aha Jisọs chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ha nwara ime otú a. Ma ejibeghị Ọbara Jisọs zọpụta ha, ya mere ha enweghị ike ịnwa iji aha Jisọs lụọọlụ ebube ọ bụla. Ajọ mmụọ ahụ matara Jisọs. Otù mgbe Jemes sịrị: “Gi onwe-gi kwere na Chineke bù otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja” (Jemes 2:19). Ọ karịrị ihe ọtụtụ mmadụ naeme. Ajọ mmụọ nke dị nime nwoke ahụ nke ndị Juu ahụ chọrọ ịchụpụ, sịrị, “Jisọs ka m’matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bù ole-ndi?” Nwoke ahụ nwere ajọ mmụọ wụkwasịrị ndị Juu ahụ, ha wee gbara ọtọ gbapụ n’ụlọ ahụ ná mmerụarụ.
Mgbe ụmụmmadụ nụrụ ihe mere, egwù tụrụ ha, ha wee chọọ ịma banyere Jisọs nkeọma karị. Azọpụtara ọtụtụ nime ha, ha wee chịpụta akwụkwọ mgbasị ha ewee rechapụ ha ọkụ n’iru ọra. Ọ bụrụ ha óké ihe ịchịpụta ọgwụ na ihe niile ha ji efé ajọ mmụọ wee tụfue ha. Ha chere na ha gaeme mgbasị ha, n’ụzọ ha mara iji chụpụ mmụọ ọjọọ, dịka ndị kwere n’ọlụ nke ọchịchịrị naeme n’ụbọchị taa. Ma Oziọma nke Jisọs Kraist nwere ike karịrị nke Setan. Mgbe ọ bụla ndị náefé arụsị lekwasịrị Jisọs anya n’okwukwe, wee kwe ka Ọ zọpụta mkpụrụobi ha, ana etiji ike nke ajọmmụọ. Mmụọ ọjọọ agaghị enwe ike ịchị ha ọzọ, ewee mee ka ha nwe ọñụ. Ifè arụsị apụghị inye mmadụ ọ bụla ọñụ, ma Oziọma nke Jisọs naenye ọñụ.
Oziọma nke Ókéọñụ
Okwu ahụ bụ Oziọma pụtara “ozi-ọma nke ókéọñụ.” Mgbe mmụọozi ahụ kwusara ọmụmụ Jisọs ọ sịrị, “Unu atula egwù; n’ihi na le, anamēzi unu ozi ọma nke oké ọñụ nke gādiri ndi Israel nile” (Luk 2:10). Mgbe Joel Onyeamụma kwuru banyere oge nke Mmụọ Nsọ, ọ sịrị, “Atula egwù, gi ala, te egwú ọñụ, ñuri kwa” (Joel 2:21). Mgbe Jisọs naenye ndị náesoụzọ Ya iwu, Ọ sịrị, “Ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha” (Jọn 13:17).
“Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n’iru n’iru nādi kwa irè,” site na mkwusa nke Pọl. Ebe ọ bụla ebuliri Okwu Chineke elu, Chineke agaghị ịlụọlụ nzọpụta n’obi ụmụmmadụ. Okwu ahụ náakọwa banyere Jisọs, mgbe Ọ sịrị, “Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n’ala, M’gādọrọ kwa madu nile nye Onwem” (Jọn 12:32).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Òlee ebe Pọl jere mgbe ọ malitere ijè mkwusa oziọma ya nke ugbò atọ?
2 Òge ra añaa ka ọ nọrọ n’ebe ahụ?
3 Gịnị bụ ajụjụ ọ jụrụ ndị Efesọs?
4 Gịnị ka odudonsọ naeme nime mmadụ?
5 Gịnị ka anyị naanata mgbe enyere anyị ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ?
6 Òlee mkwà Jisọs kwere ndị gaaga n’ụwa niile kwusa Oziọma?
7 Òle ndị Pita sịrị na eziteere Mmụọ Nsọ?
8 Ugbò òle ka edere ya n’Akwụkwọnsọ sị na enyere Mmụọ Nsọ mgbe ụbọchị Pentikọst gasịrị?
9 Gịnị bụ ihe mere banyere ọgwụgwọ nsọ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’oge Pọl na ekwusa oziọma n’Efesọs?
10 Gịnị ka ajọ mmụọ ahụ gwara ndị Juu ajọomume ahụ?