2 Ihe Emere 29:1-36

Lesson 339 - Junior

Memory Verse
“Ndi ihe nāgara nke ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, ha na onye nēme ezi omume na mgbe nile” (Abù Ọma 106:3).
Notes

Ọnọdụ Dị Ala nke Juda

Eze Ehaz arapụwo alaeze nke Juda n’ụzọ dị mwute n’obi. O guzobere òfùfè nke arụsị; ma rapụkwa ime ezi ihe ọ bụla na mgbe ọchịchị ya bụ nke gara iwetara ndị ọ naachị ngọzi dị icheiche. N’ihi mmehie ya dị icheiche, na kwa nke ndị ọ naachị, Chineke kwere ka mba dị icheiche nwe ọgan’iru megide ha. N’otù mgbe, ndị agha nke Israel gburu ndị Juda ọnụọgụgụ ha ruru otù narị na puku iriabụọ n’agha (120,000), ma dọtakwa ụmụnwanyị na ụmụntakịrị ọnụọgụgụ ha dị puku narị abụọ n’agha (200,000). Na mgbe ọzọ, Ndị Edom adọrọwo ọtụtụ ndị Juda n’agha. Ndị Filitia adọrọwokwa ọtụtụ mba nke Juda n’agha, ma biri kwa nime ha. Nsogbu a niile dakwasịrị ndị Juda n’ihi na Eze Ehaz emewo ka ndị ahụ mehie.

Iheọjọọ adakwasịwo ndị ahụ mgbe ha gbakutere Chineke azụ. Anyị naagụ n’Akwụkwọ nke Ilu; “Ezi uche nēnye amara: Ma uzọ ndi-nghọgbu bu nání nkume” (Ilu 13:15). Aisaia Onyeamụma dere: “Ọ digh udo diri ndi nēmebi iwu, ka JEHOVA siri” (Aisaia 48:22). Ọ dịghị ezi obiụtọ dị n’ụwa nye ndị ahụ náajụ Onyenwe anyị.

Chineke ekwewo mkwà na ọ bụrụ na ndị ahụ gaakpọku Ya ná nsogbu ha, Ọ gaanapụta ha. Ọ gaeme ka iruuju ha ghọ abụ. Ọ gaewepụ ọnọdụ ọjọọ ha ma mee kwa ka ha nọọ n’obiụtọ. Ma, ha aghaghị ịbịakwute Ya ná nchègharị, n’obi mwute n’ihi mmehie ha megide Ya, ma nwekwa mkpebi ịrapụ mmehie ha dị icheiche.

Mmalite nke Ọchịchị nke Hezekaia

Eze Ehaz nwere otù nwanwoke anaakpọ Hezekaia, onye náadịghị ka nna ya n’ụzọ ọ bụla. Mgbe Hezekaia ghọrọ eze o wee chọọ inweta ngọzi niile bịara site n’ifè Chineke, ma chọọ kwa iwetara ndị ya udo. Ọ gbara náánị arọ iriabụọ na ise mgbe ọ bara n’ọchịchị, ma ọ maworị urù ijere Chineke ozi bara. O mere ihe zirieze n’anya Onyenwe anyị, dịka ezi Eze Devid mere.

Anyị amaghị otú Hezekaia jiri mụta ihe banyere Chineke, mgbe mmadụ niile, tinye kwara nna ya, naefè arụsị dị icheiche ma náewere kwa ụmụ ha nye dịka àjà nsureọkụ nye chị dị icheiche nke ndị ala ọzọ. Ọ gaabụ na ọ gụwo Akwụkwọ Iwu ahụ nke eze ọ bụla náaghaghị ịgụ ma nwe kwa nke akaya. Náagbanyeghị ihe ọ bụla, ọ mawo ihe banyere Chineke, obi ya naanụ ọkụ ime ihe ahụ kwesịrịekwesị, na kwa ifèòfùfè dịka Chineke nyere n’iwu.

N’arọ nke mbụ nke ọchịchị Hezekaia ọ malitere idozi ihe niile site n’ịsacha ụlọ Onyenwe anyị. N’ime arọ irinaisii nke ọchịchị nna ya, ọ dịghị mmadụ ọ bụla bara n’ụlọ nzukọ ifèòfùfè, ma ọ bụ lekọta ihe nke Chineke anya. Ị pụrụ iche échìchè otú Ụlọukwu Chineke gaeruworị unyì ma mebi kwa n’oge ahụ. Eze Ehaz agawokwarị n’iru wee wepụsịa ọtụtụ arịa eji efèòfùfè, ma gbubisie kwa ha; o were kwa otù ebe ịchụàjà nke Chineke mee ebe ịchụàjà nke arụsị; bụ nke gosịrị ịdị ukwu nke asọpụrụghị Chineke ya.

Enweghị Ìhè

N’arọ niile ahụ ọkụ niile dị n’Ụlọ Chineke wee nyụọ. Ị gafewo n’akụkụ ụlọ chọọchị ebe anaadịghị efè kwa òfùfè ọzọ, ebe ahịhịa jupụtara n’ogige ya niile, na kwa iberibe nke window waraawa? Ị gabigawokwa ebe dị otú ahụ n’abalị n’otù mgbe, na kwa mgbe ọzọ eleghịanya, ma ị hụghị ọkụ maọlị? Ọ bụghị ihe mwute? Ị naatụgharị uche ihe ọ gaabụ maasị na arapụrụ ụlọchọọchị niile ma mee kwa ka ha gbaa ọchịchịrị?

Ọ dị ndị nọ n’ụwa taa ndị náachọghị ka onye ọ bụla feè Chineke. Ha naagbalị n’ike ha ịkpọchị ụlọ chọọchị niile, mee kwa ka ọkụ nyụọ nime ha. Chee échìchè otú ụwa a gaejupụtaworị n’ọchịchịrị ma asị na ọ dịghị otù onye náefè Jisọs! Jisọs bụ Ìhè nke ụwa. Jisọs wetara anyị ìhè na ịhụn’anya. Jisọs bụ isiíyì nke ezi obiụtọ niile.

Akpọrọ Ndịnchụàjà na Ndị Livai

Hezekaia kpọrọ ndị nchụàjà na ndị Livai ka ha bịa n’otù ebe ma doo kwa onweha nsọ n’ihi ijéozi nke Chineke. Ụfọdụ ndị nchụàjà gaanọwokwarị n’ifè arụsị, nke gaeme ka ha ghara ịnọ n’ọnọdụ ijére Chineke ozi. Mgbe ha bịakọtara n’otù, Hezekaia wee gwa ha banyere óké iheọjọọ nke ndị bụ nna ha mere na ọlụ ọjọọ niile anaalụ n’ala ahụ. “Nna-ayi-ha mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, bú Chineke-ayi.” Ọ kọwara na nke ahụ bụ ihe mere ọtụtụ iheọjọọ jiri dakwasị ndị ahụ. Ndị mba dị icheiche dị ha gburugburu naakọcha ha, náeme ha ihe ọchị bụ ndị kwesịrị ịbu ndị nke Chineke.

Ka anyị, bụ ndị náekwupụta na anyị bụ ụmụ nke Chineke bi ndụ mgbe niile nke gaeme ka ụwa hụ na anyị bụ nke Ya! Ọ bụrụ na ha apụghị ịhụ oyiyi nke Jisọs nime anyị, mgbe ahụ anyị abụghị ụmụ Ya.

Ọgbụgbandụ nke Hezekaia

Hezekaia chọrọ inwe iruọma n’ebe Chineke nọ ma kpebie kwa ịkwụ ụgwọ ọ bụla iji nweta ngọzi Ya niile. O nwere mkpebi inwe nchègharị nke onweya, na kwa nke ndị ya, ma chụkwa àjà niile, were kwa obi chụọàjà nye Onyenwe anyị ka o wee nweta mgbaghara. O wee chetara Ndị Livai na Chineke arọpụtawo ha ijéozi n’Ụlọukwu Chineke. Ọ bụ ebo Livai bụ ndị gafetara n’ịdịrị Onyenwe anyị na mgbe nwaehi awụrụanwụ nke Eron, bụ mgbe mbụ Israel malitere ifè arụsị. Site na mgbe ahụ ga n’iru, ndị Livai enwewo ọnọdụ pụrụ iche n’ijéozi nke Chineke; ugbu a kwa Hezekaia naakpọ kwa ha ọzọ ka ha bịa n’inyere Onyenwe anyị aka.

Ndị Livai na ndị nchụàjà wee kwenye n’ihe niile Hezekaia kwuru. Ha wee bu ụzọ sacha onweha, mee ka obi ha zueòkè n’ebe Chineke nọ, ma wee malite ọlụ ịsacha ụlọ nke Onyenwe anyị.

Mgbe ọ bụla anyị bịara ifè Chineke òfùfè anyị aghaghị ibu ụzọ chịgharịa site ná mmehie anyị ka ewe sacha anyị pụọ n’ụzọ ọjọọ anyị niile, site n’ịrịọ Jisọs ka O wepụ mmehie niile anyị. Mgbe anyị jiri obi dị ọcha feè Chineke, ijéozi anyị na onyinye niile anyị gaabụ ihe Ọ nabatara.

Ụlọ Dị Ọcha

Alụchara ọlụ niile banyere ịsacha ụlọ nke Onyenwe anyị n’ụbọchị nke irinaisi. Ndị Livai wee jekwuru eze wee sị: “Ayi emewo ka ulo JEHOVA nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọkụ, na ihe-ya nile, na table achicha anēdo n’usoro, na ihe-ya nile. Ihe niile kwa nke eze, bú Ehaz, jụrụ ajụ mgbe ọ bu eze mgbe ọ mekpuru emekpu, ndịa ka anyị doziworo, do kwa nsọ, ma, le, ha di n’iru ebe-ichu-àjà JEHOVA.”

Ihe a niile bụ náánị ihe Hezekaia chọrọ ịnụ. Obiụtọ dị añaa ka o nwere na ugbu a ezi òfùfè alaghachiwo na Juda! N’isi ụtụtụ o wee kpọkọta ndị ọchịchị niile nke obodo, ma rigorokwa n’ụlọ nke Onyenwe anyị. N’ebe ahụ ndị nchụàjà chụrụàjà nke ọtụtụ anụ dịka Iwu nke Moses si dị, n’ihi mmehie nke eze na nke ndị ahụ niile.

Abụ nke Otuto

N’etiti ndị Livai ka arọpụtara ụfọdụ èzínaụlọ ịbụ ndị náakpọụbọ na ndị náabụabụ n’Ụlọukwu Chineke. Ugbu a ha nọ ná njikere kwa, ime akụkụ nke dịrị ha n’òfùfè nke Chineke. “Ma na mgbe amalitere isure àjà nsure-ọkụ, amalitere ịbù-abù JEHOVA, na ifù opi nile, na ịkpọ ihe nile bụ ụbọ Devid, bú eze Israel.” Mkpọkọta nke nzukọ niile wee kpọisi ala, ndị ọbụabụ wee bụ kwa abụ, ewe fụ kwa opiike: ihe a niile gara n’iru rue mgbe esurechara àjà nsureọkụ. Anyị naagụ na Testament ọhụụ, “Kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe niile unu nāriọ” (Ndi Filipai 4:6).

Ọñụ dị aña dị n’obi ndị ahụ! Ha pụ kwara ịbụabụ ọzọ. N’ụbọchị taa òfùfè nke ndị Kristian bụ náánị òfùfè nke naabụ nnọọ abụ. Ụfọdụ ndị òfùfè nweike inwe abụ iruuju ha na kwa nke ili ozù ha; ma obiụtọ, abụ nke jupụtara n’ọñụ bụ àkàrà ejiri mara òfùfè nke ndị Kraist.

Ọñụ dị añaa ka ndị Juda nwere mgbe ha bụrụ abụ otuto ha nye Chineke nke Eluigwe! Ha kpọrọisi ala nye Ya, ndị ọbùabù ha kwa “we to Chineke ná ọñụ, ha we rube isi kpọisi ala.” Ụbọchị ọñụ dị añaa ka ọ bụ na Juda! Emewo ka obi ndị ahụ chịgharịa site n’ifè arụsị na ọlụọjọọ, ha achọpụtawo kwa nzọpụta site na Chineke.

Inyeekele

Ugbu a ebe Chineke wụsaworo ngọzi ukwu dị icheiche n’arụ ndị ahụ, ha aghaghị ịsị, “Imela.” Mgbe ahụ Hezekaia wee kpọ ndị nchụàjà ka ha weta àjà ekele, naaja nsure ọkụ nke ijiobichụọàjà. Site otú a enwetara ọtụtụ àjà n’aka ndị ahụ bụ ndị ji obi ha niile chigharịkwute Chineke, rue mgbe ọ náadịghị ndị nchụàjà gaelekọta ha anya. Ọ bụghị ndị nchụàjà niile doro owneha nsọ nye Onyenwe anyị. “Ndi Livai nwere obi ziriezi karị ndị nchụàjà ido onwe-ha-nsọ.” Ọ naabụ ihe mwuta ịhụ na mgbe ụfọdụ ndịmmadụ ndị ji obi ha niile hụ Onyenwe anyị n’anya, ma chọ kwa ịmazu Okwu Chineke, naanọ n’obiilu n’ihi ụfọdụ ndịozi nke Chineke (Ministers) ndị náadịghị ekwusa ihe niile edere na Baịbụl ma ọ bụ jigidesie ọkọlọtọ nke ịdịnsọ ike.

Ndị nwe obiụtọ bụ ndị ahụ náalụkọ ọlụ n’ịdị n’otù nke okwukwe, ndị ji obi ha niile nye n’ijere Chineke ozi n’ekweghị nzuzu ọ bụla nke ụwa bịa n’ime ndụ ha na òfùfè ha. Ka Chineke nyere onye ọ bụla nime anyị aka ka anyị nwe ike mee ka ihe nsọ niile nke Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị, ka anyị wee rita urù ná mmekọrịta anyị na Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ụdị eze Ehaz bụrị?

  2. 2 Òlee otú Hezekaia jiri malite ọchịchị ya?

  3. 3 Arọ òle ka Hezekaia gbara mgbe ọ malitere ọchịchị?

  4. 4 Gịnị bụ ọlụ mbụ dịrị ndị nchụàjà na ndị Livai mgbe ha dozichara onweha?

  5. 5 Kọwa òfùfè nke naesote nsacha nke Ụlọụkwụ Chineke.

  6. 6 Gịnị bụ akụkụ ọlụ dịrị ndị ọbụabụ na ndị naakpọ ụbọ n’ijéozi ahụ.

  7. 7 Òlee òfùfè amara dịka òfùfè náabụabụ?

  8. 8 Òlee ndị bụ ndị nwere obiụtọ?