2 Ihe Emere 30:1-27; 31:1-21

Lesson 340 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gagh-esi kwa n’ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya” ( 2 Ihe Emere 30:9).
Cross References

I Mkpọsa nke Hezekaia Banyere Ememengabiga Ahụ

1 Mgbe emesịrị ịdịọcha nke Ụlọukwu JEHOVA, Hezekaia nyere iwu ka edebe ememengabiga ahụ, 2 Ihe Emere 30:1, 5; Ọpupu 12:1-14; Levitikọs 23:5.

2 N’ihi adịghịọcha nke ndị nchụàjà na ndị Juu ọzọ maka ememe ahụ, edebeghị ememengabiga ahụ n’ọnwa nke mbụ dịka ọ naadị, kama ha debere ya n’ọnwa nke abụọ, 2 Ihe Emere 30:2-4; 29:17, 34; Ọnu-ọgugu 9:6-14.

3 Oriri nke Ememengabiga ahụ ka elefuworo anya ogologo oge, 2 Ihe Emere 30:5; 28:1-4; I Ndi Eze 12:26-28.

4 Esitere n’ọnụ ndị ọgbaọsọ zisaa ozi ahụ gazue Juda na Israel niile, 2 Ihe Emere 30:6-9.

5 Ụfọdụ ndị Israel chịrị ndụmọdụ ahụ nke ịsọpụrụ Chineke ọchị, 2 Ihe Emere 30:10; 36:14-16; Nehemaia 4:1-3; Zekaraia 14:16-18.

6 Ọtụtụ ìgwè mmadụ zara òkù ahụ wee si n’ala eze abụọ ndị ahụ bịa irubeisi n’iwu Chineke, 2 Ihe Emere 30:11, 12.

II Ndebe nke Ememengabiga Ahụ

1 Ọgbakọ ndị ahụ náefè òfùfè wezugara ikpere arụsị niile fọdụrụ, 2 Ihe Emere 30:13, 14.

2 Ịnụọkụn’obi nke ìgwè mmadụ ahụ kpaliri obi ndị nchụàjà; ewe debe Ememengabiga ahụ dịka Iwu si dị, 2 Ihe Emere 30:15, 16.

3 Hezekaia kpereekpere maka ebere Chineke n’isi ndị ahụ ji obi ha niile náaefè Chineke òfùfè ma ha enweghị ike idebezu ihe niile nke Iwu ahụ chọrọ, 2 Ihe Emere 30:17-20; I Samuel 16:7; I Ihe Emere 28:9; Aisaia 1:10-20

4 Emere ememe nke achịcha ekoghịeko ahụ dị ogologo karịa n’ihi ngọzi dị ukwu nke Chineke naawụkwasị ha, 2 Ihe Emere 30:21-23; Ọpupu 12:15-20; 13:6-10; Levitikọs 23:5-8.

III Ọtụtụ Ihe nke Irubeisi n’Iwu Chineke Wetara

1 Eze gbara ndị Livai ume n’ozi ha naejere Chineke, naewere kwa ihe nweta nke aka ya nye maka oriri na ịchụàjà dị icheiche nke naaga n’iru, 2 Ihe Emere 30:22-24.

2 Óké ọñụ na obiụtọ wee dị na Jerusalem, 2 Ihe Emere 30:25-27.

3 Mgbe Ememe Ngabiga ahụ gasịrị, ndị ọ bụla laghachiri n’obodo ha wee mebisịa ebe ikpere arụsị niile, 2 Ihe Emere 31:1.

4 Hezekaia weghachiri ihe ndịọzọ dị nime òfùfè nke Chineke bụ nke elefusiworo anya, 2 Ihe Emere 31:2-19; Ọnu-ọgugu 18:8-32.

5 Ihe gaara Hezekaia nkeọma n’ihi omume ya n’ebe Iwu Chineke dị, 2 Ihe Emere 31:20, 21; 29:2, 10, 11.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Hezekaia, Onye Weghachirị Òfùfè nke Chineke

Mgbe Hezekaia bụ eze rigooro n’ocheeze nke Juda ọ malitere ngwangwa iweghachi ezi òfùfè nke Chineke. N’ọnwa nke mbụ nke nke ọchịchị ya, o meghepụrụ ọnụụzọ niile nke Ụlọ Chineke, wee gbaa ndị Livai na ndị nchụàjà niile ume ka ha doghachi onwe ha nsọ n’ihi ozi ahụ nke Chineke kpọrọ ha òkù ijé.

Ememengabiga Ahụ

“Mgbe ndị Israel nọ n’ala Ijipt,

Rapu ndi M ka ha la.

“Akpagburu ha karịa ka ha pụrụ ịnagide,

Rapụ ndi M ka ha la.”

Otú a ka otù abụ nke ndị Amerịka si malite. Ọtụtụ abụ nke ndị mbaọzọ dị icheiche, n’otù ụzọ ahụ, rụtụrụ aka banyere otù ihe ukwu nke mere n’Ijipt n’ihe dị ka arọ 1500 tutu ọmụmụ nke Kraist. Óké ihe a bụ ọpụpụ nke ụmụ Israel site n’ala Ijipt, nke malitere site n’otù ememe nke akpọrọ Oriri nke Ememengabiga. Mgbe ndị Israel nọ n’oriri nke ememe ahụ dịka Iwu Chineke si dị n’ebe obibi ha, ọnụma nke Chineke dakwasịrị ndị Ijipt n’ụlọ ha dị icheiche. Mmụọozi nke ọnwụ ahụ gabigara n’ala ahụ wee baa n’ụlọ ọ bụla nke anaahụghị ọbara nke nwaatụrụ ahụ n’awaraụzọ niile na n’ofiereụzọ niile. Chineke ekwuwo, “Mgbe M’huru ọbara ahu Mgāgabiga unu” (Ọpupu 12:13). Ememe ahụ nke atọrọ ntọala ya n’abalị ahụ ka ndị Israel ga náedebe kwa arọ mgbe ha batasịrị n’Ala Mkwà ahụ, akpọkwara Ememengabiga n’ihi mkwà nke a Chineke kwere. N’ụzọ dị otú a ka ha gaeji náechèta nnapụta ahụ Chineke napụtara ha n’Ijipt.

Ndị Juu nke oge a echèfuwo ọtụtụ ememe na usoro nke Iwu Moses, ma ha naaechèta náedebe kwa Ememengabiga. Èzínaụlọ nke ezi onye Juu ọ bụla naeme ememe ya n’abalị ahụ; ha naagụpụta Okwu Chineke ụfọdụ n’olu dị elu, ma ụfọdụ ka ndị ahụ naabụ dịka abụ bụ ndị so n’oriri ahụ mgbe ha naeri iheoriri ndị ahụ nke bụ iheàtụ nke ezi Ememengabiga ahụ. Ọ bụ ememe dị ókéọnụahịa n’obi ndị Juu niile. Akpagbuwo ha ọzọ nime ọtụtụ ọgbọ nke gabigaworo na mgbe nso ma ha naeleanya nnapụta ọzọ.

Mweghachị nke Hezekaia Weghachirị Ememengabiga ahụ

Dịka eze Juda, Hezekaia nwereike ịkpọkọta ndị ọ naachị n’ihi ihe ọ bụla nke o chere dị mkpà nke metụtara alaeze Juda. O nwekwara ikike ọzọ n’ebe ụmụ Israel niile nọ -- ebo iri ahụ nke nọ n’okpuru Eze Hoshea na ndị nke anaakpọ Juda. Dịka eze nke ebo ahụ, ọ dị kwa ya n’aka ịkpọ ndị ahụ arọpụtara n’òfùfè nke Chineke, ọ dịghị ebe ọzọ apụrụ inwe nzukọ ahụ ma ọ bụghị na Jerusalem.

Ọ bụrụ na Hezekaia ezipụghị ndịọgbaọsọ gazue Israel niile ịkpọkọta mba ahụ niile n’Ememengabiga a, ọ pụtara na ọ lụzughị ọlụ ya otú o kwesịrị. Jeroboam, eze mbụ nke ndị Israel mgbe ekewasịrị alaeze ahụ weere ikpere arụsị dochie ezi òfùfè nke Chineke ka ebo iri ahụ ghara ịga Jerusalem ewee kekọta ha na alaeze nke Juda n’otù ọchịchị na n’otù okpukpé. N’ogologo arọ 250 ndịa ebo iri ahụ ejeghị Jerusalem ifé Jehova òfùfè, kama ha gbasooro omume na ụzọ ọjọọ niile nke ikpere arụsị.

N’alaeze nke ndịda, ihe agaghị kwa nkeọma ọtụtụ oge dịka o kwesịrị site na mgbe ekewasịrị alaeze ahụ, n’ihi na “mgbe emere ka ala-eze Rehoboam guzosie ike, mgbe ọ di kwa ike, na ọ rapuru iwu JEHOVA, ya na Israel nile” (2 Ihe Emere 12:1). Ugbu a, mgbe anaachọ iweghachị ezi òfùfè ahụ ọzọ, ọ bụ ihe zirieze ka eze ahụ onye ọ dị n’aka ya iweghachi ya mee ka ndị Israel niile mata ka ha niile wee bịa rita úrù nke siere ná ngọzi Chineke nke anaeleanya na ọ ghaghị ịdị.

Ọ dịghị mfé idebe Ememengabiga ahụ n’oge o kwesịrị n’ihi na emebeghị ka Ụlọukwu Chineke dị ọcha tutu ụbọchị Ememengabiga ahụ wee gafee. Hezekaia chọpụtara n’Iwu Moses na ọ bụ náánị otù ihe pụrụ ime ka aghara idebe Ememengabiga ahụ n’ụbọchị nke irinaise n’ọnwa nke mbụ. Otù ihe a bụ ma ọ bụrụ na emeghị ka ndị ahụ dị ọcha n’oge Ememengabiga ahụ. N’ihi nke a, Hezekaia rịọrọ inyeaka nke Chineke wee kwupụta na agaeme Ememengabiga ahụ n’ọnwa nke abụọ, na ọ bụghị n’ọnwa nke mbụ.

Ndụmọdụ nke Hezekaia dị mma. O wee degara ndị Israel akwụkwọ sị, “Unu ekwesila olu-unu ike dika nna-unu-hà mere; ma nyenu JEHOVA aka-unu, ba n’ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mgbe ebigh-ebi, fè-kwa-nu JEHOVA, bú Chineke unu òfùfè, ka ìwe-Ya nke di ọku we si n’ebe unu nọ chigharia.” Ebo iri ahụ nke Israel amaliteworị idetụ ọnụma Chineke ire, ọ bụ kwa náánị ọnwa olenaole mgbe nke a gasịrị ka emere ka ndọtan’agha na mgbasasị ha zueòkè. Adọrọghị ndị Juda n’agha wee rue mgbe ihe dịka otù narị arọ na iriise gasịrị, nke ihe kpatara ya bụ na ụfọdụ ndịeze Juda naasọpụrụ Chineke na kwa ọtụtụ ntutemmụọ nke enweworo n’alaeze ahụ. Chineke naekpuchi ndị náatụ egwù Ya. Ndị náasọpụrụ Chineke ka Ọ naelekọta kwa. Eziokwu ndịa dị irè n’ụbọchị taa dịka ha dị n’ọgbọ ndị garaaga, ọ dịịrị anyị taa dịka ọ dịịrị ụmụ Israel.

Mbibi nke Ikpere Arụsị

Ma ọ bụghị ndị Israel niile zara òkù ahụ Hezekaia kpọrọ ha ịbịa na Jerusalem. “Ha we nāchi ha ọchi, leli kwa ha anya. Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n’Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.” “Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem … bú nkpọkọta bara uba nke-uku.”

Mmadụ ndịa, ndị obi ha, náagbaghịagụgọ nweworo ọchịchọ ogologo oge inwe ohere nke mmekọrịta n’etiti ụmụnna ha ndị okwukwe ha na òfùfè nke ezi Chineke ha bụ otù, enweghị mmasị n’ebe okpukpé ahụ nke ndịeze ha mepụtara iji gbanwere ezi okpukpé nke Chineke nọ. Mgbe emere ka ezi òfùfè nke Chineke guzosieike ha enwekwaghị oge ọ bụla maọbụ ịnụọkụ n’obi ikpere ihe ọ bụla ọzọ náabụghị Chineke nke dị ndụ. Ha wee tidasịa ebe ịchụàjà niile nke dị na Jerusalem, wee kpofue ha n’ebe ikpofu ihe nke ọrammadụ dị n’ọdọ mmiriiyi Kidron. Mgbe ahụ, mgbe ha mesịrị ememengabiga ahụ wee náalaghachị n’ụlọ ha dị icheiche, ha “puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, gbutu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe ichụ-àjà nile, ma ka ha pua na Juda na Benjamin nile, na n’Efraim kwa na Manase, rue mgbe emere ka ha gwusia.”

N’obi nke ezi nwa Chineke ọ bụla, ọ dịghị ọchịchọ ime ihe ọzọ dị ya mkpà ma ọ bụghị ifè ezi Chineke òfùfè. Agaghị enwe ihe ọ bụla agaeji gbanwe Oziọma nke Jisọs Kraist n’ebe onye ahụ nọ. Ọ gaenwe ntachịobi bụrụkwa onye náenyere ndị náadịghịike aka, nwee kwa ogologo ntachịobi na obiebere n’ebe ndị chọrọ inyeaka na ndụmọdụ nọ, ma n’otùaka ahụ ọ gaejidesi kwa òzízí niile nke Okwu Chineke ike. Ọ bụrụ kwarị na ndị wetaara ya Oziọma ahụ na mbụ, maọbụ ndị mmụọozi sitere n’Eluigwe, gaabịa ịgwa ya na Oziọma ahụ adịghị kwa irè maọbụ na ọ naghị alụsịkwa ọlụ ike ọzọ, ọ gaghị anabata ha. Ọ maara onye o kwere na ya, ma kwesị kwa ike na Chineke nwereike idebe ihe enyefere Ya n’aka idebe wee rue ọgwụgwọ ihe niile.

Ezi nwa Chineke ọ bụla maara na Chineke adịghị agbanweagbanwe, na emewo kwa ka Okwu Ya guzosieike n’Eluigwe rue mgbe ebighịebi (Abù Ọma 119:89). N’ihi nke a, ezi nwa Chineke naatụkwasịobi ya n’Okwu ahụ na mkwà ahụ, wee nọgidesieike náagbanyeghị ọnụọgụgụ nke ndị nọ ya gburugburu bụ ndị náadaghachịazụ n’okwukwe. Ọ bụ olileanya na mkpebi a dị ike naebubiga onye nke Kraist n’oge ahụhụ ọ bụla, wee durue ya n’ụlọ ya dị n’eluigwe n’ikpeazụ. Lee otú o si bụrụ ihe ịgbaume mgbe anaahụ ikwesịntụkwasịobi dị otú a n’ụwa taa n’obi na ndụ nke olenaole ahụ kwesịrị ntụkwasịobi ndị Chineke rọpụtaworo! Lee kwa otú o si bụrụ ihe dị ebube ịhụ na ọbụná n’oge gbakarịsịrị ọchịchịrị nke akụkọ banyere ebo iri ahụ nke Israel, na otù mmụọ ahụ dị n’obi ìgwè mmadụ ahụ dị ukwu ndị jere Jerusalem ifé Chineke nke Eluigwe òfùfè!

Ihe dị Icheiche nke Mweghachị nke Ezi Òfùfè ahụ Lụpụtara

Chineke naasọpụrụ irubere Okwu Ya isi. Irubeisi dị mkpà karịa àjànsureọkụ na àjà ọzọ dị icheiche (I Samuel 15:22).

Agaghị agwọworị onye ìsì ahụ nke oge Jisọs ma ọ bụrụ na o rubeghị isi n’okwu niile nke Onyeòzízí ahụ wee sachapụ ụrọ ahụ n’anya ya. Ọ bụrụ na Neaman onye Siria erubeghị isi jee sụnye onweya ugbò asaa nime Jọdan dịka onye nke Chineke gwara ya agaghị emeworị ka o si n’ekpenta ya dị ọcha. Ọkụ nke Chineke agaghị adaworị n’elu ebe ịchụàjà nke ọla ahụ mgbe amalitere òfùfè nke Ụlọukwu ahụ ma ọ bụrụ na Moses elezịghị anya ịhụ na o mezuru ihe niile dịka egosịrị ya n’elu ugwu ahụ. Nrubeisi dị mkpà ma ọ bụrụ na anyị gaanata ngọzi nke Chineke. Mgbe Chineke naenye iwu, mgbe ahụ bụ oge irubeisi! Ọ bụ kwa ihe dị mma irubeisi náatụfughị oge, o kwesịghị iguzo náatụle maọbụ náenyocha ihe ahụ, ebe ọ bụ uche Chineke pụtara ìhè.

Agọziri ndị niile ahụ rubereisi n’oge Hezekaia. “Ọñụ uku we di na Jerusalem.” “Ndi nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahụ: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.” Ndị ahụ niile rubeere Chineke isi n’ihe banyere mkpụrụmbụ niile nke owuweiheubi ha. Ha kwụrụ otùụzọn’ụzọiri niile ha. Ha wetara onyinye afọòfùfò niile. Mgbe ha mesịrị ihe ndịa, Onyenwe anyị gọziri ha karịa, ma mee ka ihe gara ha nkeọma n’ụzọ niile. Emere ka òkè nke ndị nchụàjà na ndị Livai rute ha dịka Jehova nyere n’iwu, nke a mere ka ha nwee ike ijéozi ha na ifè òfùfè nke Chineke nke atọworo ntọala ya n’ihi ọgan’iru nke ihe imemmụọ na nke ihe náadị nwaoge nye ọra mmadụ ahụ. N’ihi nke a anyị pụrụ ịhụ na agọziri mba ahụ okpukpu abụọ n’ihi na ha debere iwu niile nke Chineke.

Lee ka okwu eji mechie iheọmụmụ anyị si dị ebube! Edere na Hezekaia “we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n’iru Jehova, bú Chineke ya. Ma n’ọlu ọ bula nke ọ malitere n’òfùfè nke ulo Chineke, na n’iwu, na n’ihe nile enyere n’iwu, ichọ Chineke-ya, ọ bụ obi-Ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.”

Ebe a ka anyị naahụ isiihe nke náeweta ọgan’iru náakụkụ ọ bụla nke ndụ. Ọ bụrụ na anyị eme ihe ahụ nke bụ “ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu” n’iru Chineke anyị; ọ bụrụ na anyi ewere obi anyị niile jee ozi ọ bụla nke anyị malitere ijé n’Ụlọ Chineke, ma n’Okwu Chineke, iwere ịnụọkụn’obi niile chọọ Onyenwe anyị -- ọ bụrụ na anyị emee ihe ndịa niile anyị gaabụ ndị agọziriagọzi nime mmụọ bụrụ kwa ndị ihe naagara nkeọma. Nke a bụ Okwu Chineke. Nke a bụ kwa mkwà Chineke. Ọ dị onye ọ bụla, maọbụ ìgwè mmadụ ọ bụla pụrụ ikwe anyị mkwà na inye anyị ihe karịrị nke ahụ? Ọ dịghị mgbe ọ bụla ihe ọ bụla gaakarịrị mkwà dị icheiche nke Chineke, n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla nke karirị ngọzi dị icheiche nke Chineke. Ezi nwa Chineke ọ bụla naasị:

“Ònye ka m’mwere n’elu-igwe ma ọ bugh Gi? Ma-ọbugh Gi ọ digh onye ihe-ya tọworom utọ n’uwa” (Abù Ọma 73:25).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee otù ememe ndị Juu dị mkpà nke iheọmụmụ anyị naekwu ihe banyere ya? Ugbò ole ka aga náeme ememe a?

  2. 2 Gịnị mere eji ghara idebe ememe a mgbe o kwesịrị n’oge a? Hezekaia, ò mere ihe ziriezi n’ịgbanwe oge eji eme ememe a?

  3. 3 Òlee ikike Hezekaia nwere, dịka eze nime Juda náánị, izigara ndị Israel akwụkwọ iwu a?

  4. 4 Òlee otú Hezekaia si ziga akwụkwọ a?

  5. 5 Òlee ihe ha mere n’ebe iwu ahụ dị?

  6. 6 Òlee ihe mkpọkọta ahụ mere n’ebe niile anaekpere arụsị?

  7. 7 Gịnị mere mgbe ndị ahụ rubereisi n’iwu Chineke wee debe Ememe Ngabiga ahụ?

  8. 8 Òlee ụkpụrụ ndịọzọ dị icheiche nke Chineke nke edebere mgbe emesịrị Ememengabiga ahụ?

  9. 9 Òlee otú anyị gaesi meso ndị niile ahụ gaagba mbọ iduhie anyị site n’ebe ezi Oziọma ahụ dị?

  10. 10 Gịnị ka ekwuru n’amaokwu ikpeazụ nke iheọmụmụ anyị banyere Hezekaia? Òlee otú o si bụrụ ezi ihenlereanya nye anyị?