Ndi Filipai. 4:8

Lesson 341 - Senior

Memory Verse
“(N’ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abugh nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike); ebe ayi nēweda ihe anātule n’obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n’agha iña nti Kraist” (2 Ndi Kọrint 10:4, 5).
Cross References

I Ihe dị Icheiche dị Mkpà N’ịdị Ndụ Nke NdịKraist

1 Pọl gụpụtara ndịnsọ ahụ bị na Filipai ụdị ntozuòkè niile ahụ dị mkpà maka ibi ndụ nke mmeri nime Kraist, Ndi Filipai 4:8.

2 Chọọ ihe niile bụ eziokwu dịka ọ dị nime Jisọs Kraist, bụ ndụmọdụ nke Pọl nye ndịnsọ niile, Ndi Filipai 4:8; Matiu 22: 16; Jọn 7:18; 14:6; 1:14, 17; I Jọn 5:6, 20.

3 Ikwu eziokwu n’ihe niile bụ ụdị ntozuòkè dị ezi mkpà nye OnyeKraist, Ndi Filipai 4:8; Ọlu Ndi-ozi 6:3; Ndi Rom 12:17; 13:13; 2 Ndi Kọrint 8:21; 13:7; I Ndi Tesalọnaika 4:12.

4 Eziomume na iheekperen’ikpé ka agaeleba anya nkeọma ma nye kwa ha ọnọdụ kwesịrị ha ná ndụ mmadụ, Ndi Filipai 4:8; Jenesis 18:19; Deuteronomi 16:19, 20; 2 Samuel 23:3; Abù Ọma 82:3; Ilu 11:1; Matiu 23:23

5 NdịKraist gaagụ ihe ndị ahụ niile dị ọcha n’ihe dị ókéọnụahịa, Ndi Filipai 4:8; I Timọti 4:12; Jemes 1:27; 3:17; 2 Pita 3:1; I Jọn 3:3.

6 Ka ha ra bụ ihe kwesịrị ịhụn’anya kwesịrị ka anaechè échìchè banyere ha, Ndi Filipai 4:8; 2 Samuel 1:23; Abù nke Abù 5:16; Mak 10:21; Jọn 11:36.

7 Ndi Kraist kwesịrị inwe agụụ na ịchọ ka ha bụrụ ndị anaekwu nkeọma banyere ha, Ndi Filipai 4:8; Ọlu Ndi-ozi 6:3; 10:22; 22:12; I Timọti 3:7; 5:10; Ndi Hibru 11:2.

8 Ịdịmma bụ ihe bara óké urù n’ebe ọ bụla anaachọta ya, Ndi Filipai 4:8; Rut 3:11; Ilu 12:4; 31:10; 2 Pita 1:3, 4.

9 Òfùfè nke Chineke agaghị ezuòkè ma ọ bụrụ na inye Chineke otuto adịghị ya, Ndi Filipai 4:8; 1:10, 11; Abù Ọma 33:1; 50:23; Matiu 21:16; Ndi Efesọs 1:6; Ndi Hibru 13:15.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Chee Échìchè Banyere Ihe Ndịa

Isiokwu nke ebe ọgụgụ anyị bụ ndụmọdụ nye NdịKraist “iche échìchè”; na ịdị náechè échìchè banyere isiokwu asatọ dị icheiche; nke aha ha bụ: eziokwu, ihe kwesịrị nsọpụrụ, ihe ziriezi, ihe dị ọcha, ihe kwesịrị ịhụn’anya, ihe ekwuru nkeọma, ịdịmma, na otuto. Uche bụ ọnụụzọ nke esi aba ná mkpụrụobi, ndịiro atọ ahụ dị ukwu nke mmadụ -- ụwa, anụarụ, na ekwensu -- maara nkeọma na ọ bụrụ na apụrụ ime ka uche mmadụ zobe échìchè dị icheiche nke mmehie, mkpụrụobi ahụ gaadaba n’ọnwụnwa ahụ. Ihe ịmaatụ banyere nke a n’oge a ka apụrụ ịhụ site n’otú òtù ndị Kọmụnịzim (Communist Party) si ekwusi okwu ike ka ewere òzízí ha mejupụta akọnauche nke ụmụmmadụ site n’ikuziri ha ụkpụrụ ha dị icheiche nke nsọpụrụ Chineke náadịghị na nke ekweghị na Chineke.

Ihe ịmaatụ ọzọ bụ ụdị ngosi nke ndị náere ahịa n’ụbọchị taa naeme iji gosi ngwáahịa ha n’ụzọ ọ bụla ha pụrụ iji, nke ha naeme mgbe niile ma náanọgidesi kwa ike n’ịkọwa ngwaahịa ụfọdụ n’ụzọ gaeme ka ọ dịgịde n’uche ụmụmmadụ. Ndị ụlọọlụ náemepụta mmanya náaban’anya na sịgá rere siga ha karịsịa n’otù arọ site n’imefu ego dị ọkpụrụkpụ iji mee ka ndịnyom kwenye na ọ bụ iheziriezi ịñụ (isè) sịgá.

Ebe anaere akwụkwọ mgbasaozi nke oge a nke anaewepụta n’ọnwan’ọnwa naejupụta n’akwụkwọ nke edere akụkọ ure dị icheiche. Anaetinye ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa n’ọnwụnwa n’akụkụ niile site n’okwu nrafu nke ụlọọlụ ndịa dị icheiche ndị jupụtara n’omume ọjọọ iji ree ahịa ebe ha naachọ ka ha náere ngwaahịa ha karịsịa, náagbanyeghị omume ọjọọ nke ọ naeweta. O, lee otú ọ gaesi bụrụ ihe dị mma ma ọ bụrụ na ndị nnenanna bụ ndị nke Kraist gaeleba anya ịma ụdị akwụkwọ ụmụ ha naagụ, ma náenye ha nri na eme kwa ka uche ha guzosieike kwa ụbọchị site n’ịgụpụtara ha ihe edere na Baịbụl!

OnyeKraist ekwesịghị ịtụegwù maọbụ ichè na Baịbụl ya abụrụwo ihe mgbe ochie na o nwekwaghị ihe agaeji ya mee n’oge dị ugbu a. Onye dere Baịbụl bụ Chineke, Ọ bụ kwa Onye ike Ya náadịghị agwụagwụ. Otù puku arọ dị ka otù ụbọchị n’ebe Ọ nọ. Okwu Chineke adịghị eme ochie, ọ ka naenye kwa aka ma náemeri site n’ibindụ nke OnyeKraist n’oge dị ugbu a dịka na ọ naemeri site na mgbe garaaga. Ndumọdụ na ịdọakanántị nke Pọl nye ndịnsọ nọ na Filipai ka ha “nāgụkọ ihe ndia” ka bara óké úrù dịka ọdịworo na mgbe garaaga.

Amara oge nke Pọl nkeọma n’ihi óké mmefu ego na mmehie. Náagbaghịagụgọ enwere ọtụtụ ihe ịman’ọnya nye OnyeKraist nke oge Pọl dịka ọ dịwororị n’ọgbọ niile ọ bụ ezie na, n’oge mmalite nke iso ụzọ Kraist, enweghị ụdị ihe iji mee ka mmadụ náenwe obi ụtọ dịka enwere n’oge dị igbu a -- dịka t. v., redio, ihe onyonyo dị icheiche (cinema) -- ma ohere nke ibindụ ná mmehie dị kwa ka ọ dị taa. Nwa ụlọakwụkwọ ọ bụla nke naamụ ihe banyere akụkọ ụwa nke oge ochie maara omimi nke ajọomume na aghụghọ nke jupụtara n’obodo n’oge niile nke Ndịozi. Ma gịnị bụ ihe adụrụ NdịKraist nke oge ahụ ọdụ ime iji guzogide ihe dị otú ahụ? Chee échìchè banyere ihe nke Chineke -- na ihe ndị ahụ dị nsọ nke dị kwa mma!

Ọ bụ ihenzuzu ichè na OnyeKraist nwereike ịdị náechè ụdị échìchè dị icheiche nke náemegide Mmụọ nke Chineke na ihe niile nke Chineke ma náaga kwa n’iru náejigide ọbụná n’ụzọ dị ntà ezi òfùfè nye Chineke n’ime obi ya. “N’ihi na dika o si echè échìchè ná nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di” (Ilu 23:7). Otù onye ekwuwo na “madu agaghị” adị mma n’ụzọ ọ bụla karịa akwụkwọ dị icheiche nke ọ naagụ.” Enwere náánị otù Akwụkwọ kachasị mkpà nye OnyeKraist, nke ahụ bụ kwa Baịbụl. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla ganaagụ ma náatụgharị kwa uche n’okwu nke Chineke kwa ụbọchị n’ịkwesịntụkwasịobi, mkpụrụobi ya na uche ya gaabụ ihe anaewuli elu náazụ kwa nkeọma. Baịbụl bụ akwụkwọ ọgụgụ kachasị ukwu nke enyeworo mmadụ n’aka. Ọ naadị rue ebighịebi, bụrụ kwa isiiyi nke ụkpụrụ niile nke eziomume nime ndụ mmadụ. Ọ bụ mkpughe nke Chineke na eziomume Ya, ọ bụ ike kachasị ukwu nke pụrụ iduzi mmadụ n’ezi ụzọ nke Chineke ziriezi OnyeKraist aghaghị, dịka ebe ọgụgụ anyị naenye n’iwu, itinye ezimkpebi na nlezianya n’ichè échìchè banyere ihe niile nke Chineke.

Eziihe na Iheọjọọ

Iheọmụmụ nke iheọjọọ nke onyemmehie nwetaworo site n’ime mmehie naabụ ọbáakwụkwọ [Library] nke échìchè nke pụrụ ịghọrọ ya onyeiro kachasị mgbe emere ka o chègharịa. Nzọpụta bụ onyinye nke Chineke, site kwa n’amara nke Chineke anaanapụta ụmụmmadụ site ná mmehie ha ma sachaa kwa ha n’Ọbara nke Kraist. Ma otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ọ bụla gaejidesi nzọpụta ya ike mgbe ọ natasịrị nzọpụta otù mgbe site n’aka Chineke, ọ ghaghị itinye óké ịgbámbọ. Ọ dịghị mma ka OnyeKraist bụrụ onye umengwụ n’ụzọ niile nke ndụ náenweghị mgbalị ọ bụla iji mee ka Mmụọ nke Chineke were ọnọdụ nime obiya. Otù onyensọ nke mgbe ochie kwuru okwu banyere mkpà ọ dị ịlụpụta nzọpụta nke onweanyị site n’ịkpachapụanya, sị: “Ọ dịghị mmetuta ọma ọ bụla dị elu nke ime obi, ọ dịghị kwa oge ọ bụla arọpụtara iji nwee óké ọñụ na nke iji nwee mmekọ nke gaenwe ike iwere ọnọdụ nke ịnọgidesiike na nke ịlụsiọlụ ike bụ nke náemeri n’ihe niile, náemerị kwa, dịka ọ bụ kwa náánị ihe pụrụ imeri, ọbụná na nke a kwa.”

Nnabata nke Iv nábatara ntụpụta nke ekwensu ime ihe ọjọọ bụ ihe butere ọdịda nke mmadụ. Ịñantị ná ntụpụta dị icheiche nke Setan bụ nnọọ otù nzọụkwụ ka ọ fọdụrụ ịba ná mmehie ahụ n’onweya. “Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di,” abụghị ịdọakanántị èfù. Onyeamụma ahụ kwuru sị, “I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n’udo” (Aisaia 26:3).

Aghaghị icheta na izobe échìchè ọjọọ n’obi gi gaeme ka anyị bụrụ ndị ikpémara n’iru Chineke n’ihi ime ụdị omume ahụ. Ọ bụ ikpéọmụma nke ọgbọ ahụ ndị nọ tupu ijummiri na “Jehova we hu na ihe ọjọ nke madụ riri nne n’uwa Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke échìchè obi-ya bu náni ihe ọjọ ogologo ubọchi nile” (Jenesis 6:5). (Gụọ Deuteronomi 29:19, 20; Matiu 15:19). Chineke kwuru okwu banyere ndị Israel sị na Ya gaeme ka iheọjọọ bịakwasị ha, ọbụná mkpụrụ nke échìchè ha dị icheiche, n’ihi ọjụjụ nke ha jụrụ iwu Ya (Jeremaia 6:19). Ọzọ kwa Chineke gbaraàmà megide ndị Israel na ha ejesowo isiike nke obi ha (Jeremaia 9:14). Chineke duuru Ezikiel nime mmụọ wee gosi ya ajọomume nke ndị Israel ebe ha naenye mmehie ọnọdụ nime échìchè nke obi ha (Ezikiel 8:12). Ọ bụ eziokwu n’ezie na uchè bụ ọnụụzọ nke esi abá ná mkpụrụobi.

Ịchèéchìchè Banyere Chineke

Chineke maara échìchè niile nke onye ajọomume na nke onye eziomume. Mkwà ọtụtụ ngọzi ka ekwere ndị ahụ náechè échìchè banyere aha Ya. Anyị gụrụ: “Mgbe ahu ndi nātu egwu JEHOVA nēkwurita okwu, otù onye na ibe-ya: JEHOVA we ña nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu JEHOVA, ndi nēchē kwa échìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru Ya” (Malakai 3:16).

N’ụbọchị ndị a nke enweghị nsọpụrụ nke anyị náebi nime ya, ọ bụ ihe siriike ná ndụ ụmụmmadụ ịnabata ịdị óké ọnụahịa nke ihe ndị ahụ dị icheiche dịka eziokwu nke náadị nime obi, ikwu eziokwu, ikpé ziriezi, ịdịọcha, na ịdịmma. Otú ọ dị, ọ dịghị ịbámba ọzọ megide mmehie nke dị arọ ma dị kwa nkọ dịka ndụ dị ọcha nke dị kwa nsọ nke OnyeKraist naebi. Nime otù akwụkwọ nke aha ya bụ “ Ọlụ dị icheiche nke Jọn Wesley” anyị hụrụ échìchè dị otú a ka edepụtara ya: Mgbe iheọjọọ dị icheiche naegbebata n’ụbá, o wee dị kwa ka mmụọ na ndụ nke okpukpé náachọ ịfùèfù mgbe ahụ ụzọ kasị mma iji guzogide ụdị ọnwụnwa ahụ bụ ka ndị ụkọChukwu (na OnyeKraist ọ bụla n’oge a) mee onwe ha ka ha bụrụ ndị amaara nkeọma na ndị bụ ihenlereanya pụtara ìhè nye ihe niile ahụ nke náeguzogide eziomume -- ime ka ngọnarị nke onweha na ndụ ha dịka ndị eluigwe bụrụ ihe doroanya, na nke pụtara ìhè, ma bụrụ kwa ihe náabá mbá mgbe dum megide ọchịchọ efu niile.

Échìchè anyị bụ ihe náegosipụta ọchịchọ nke mkpụrụobi anyị na iheonwunwe anyị. Anyị gaekwupụta échìchè ndị ahụ mgbe náadịghịanya maọbụ mgbe emesịrị, ndụ anyi kwa gaegosi ihe anyị naechè; n’ihi na ihe anyị naechè ka anyị bụ (Ilu 23:7). Site n’iche échìchè banyere ihe ndị a nke gaeme ka anaekwu nkeọma banyere anyị, anyị gaenweta ha dịka ihe nke aka anyị. Ịchè échìchè dị ukwu banyere ha gaeme ka ha ghọọ otù akụkụ nke mkpụrụobi anyị. Eziokwu na ikpé ziriezi gaaba n’ụmị na n’ọkpụkpụ anyị. Anyị gaamụta inwe mmasị na ntozuòkè ihe ahụ niile nke náewulielu nke naakpali kwa mmụọ rue nzọpụta nke mkpụrụobi anyị. Mkparịtaụka anyị gaabụ n’ihe nke dị n’eluigwe, nnwekọrịta anyị gaabụ kwa n’etiti anyị na ndị ahụ kwenyere n’otù ihe ahụ. Anyị na Chineke ga náenwe nnwekọ n’ihi na “madu abua gāyikọta je ijè, ma ọ buru na ha ezutegh?” (Emos 3:3).

“Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n’anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, ọ buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia” (Ndi Filipai 4:8)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịni bụ ihe asatọ ahụ nke enyere OnyeKraist iwu ịdị náechè échìchè banyere ha?

  2. 2 Òlee ihe o ji dị mkpà ka anaechè échìchè banyere isiokwu ndị ahụ?

  3. 3 Òlee ihe mere ndị mgbasa akụkọ nke ngwáahịa ji náachọsiike ka enweta uche ụmụmmadụ?

  4. 4 Gịnị bụ ọnụụzọ nke esi ábà mkpụrụobi?

  5. 5 Ànyị pụrụ ịbụ otù ihe na mkpụrụobi anyị, ma bụrụ kwa ihe ọzọ n’uche anyị?

  6. 6 Òlee otú ekwensu naesi agbalị irute mkpụrụobi nke ụmụmmadụ site n’ọnwụnwa?

  7. 7 Ikpé mmehie ọ naama anyị mgbe anyị naezobe mmehie

  8. 8 Òlee ụdị akwụkwọ nke OnyeKraist kwesịrị ịdị náagụ?

  9. 9 Baịbụl ọ ka naenye kwa ezi ndụmọdụ banyere ịdịndụ nke NdịKraist n’ụbọchị taa? Kọwaa ọzịzá gị?

  10. 10 Gịnị ka ị ghọtara na ịdịmma bụ? Kọwaa ihe ịdịmma, na ikpé ziriezi bụ?