Aisaia 2:1-22; Abù Ọma 2:1-12

Lesson 342 - Senior

Memory Verse
“Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si Bianu, ka ayi rigorue ugwu JEHOVA, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzi kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n’okporo-uzọ-Ya nile: n’ihi na Zaiọn ka iwu gēsi puta, okwu JEHOVA gēsi kwa na Jerusalem puta” (Aisaia 2:3).
Cross References

I Mbulielu nke Kraist

1 Onye amụma ahụ kwuru ihe banyere ọnọdụ dị elu nke Kraist na ọbịbịa nke Alaeze Ya, Aisaia 2:1, 2; Abù Ọma 2:6, 7; Maika 4:1; Nkpughe 19:11-16.

2 Mba niile gaabịa n’okpuru ọchịchị nke Kraist n’oge Ọchịchị Pukuarọ, Aisaia 2:2, 3; Abù Ọma 2:8-12; Maika 4:2; Nkpughe 11:15.

3 N’oge nke Alaeze Kraist agha agaghị adị, Aisaia 2:4; Maika 4:3, 4.

II Ọchịchị nke Eziomume

1 Agaekpe ndị niile jụrụ ịnọ n’okpuru ọchịchị nke Kraist ikpé, Aisaia 2:5-9; Abù Ọma 2:1-3; Zekaraia 14:17-19; Nkpughe 19:19-21.

2 Agaeweda mmehie na mpako n’ụbọchị nke Onyenwe anyị, Aisaia 2:10-18.

3 Agaatụfụ arụsị dum, ụmụ Israel gaachọ kwa ebe ha gaezó mgbe Jehova gaebili ime ka ụwa maa jijiji, Aisaia 2:19-22; Abù Ọma 2:4, 5; Nkpughe 6:12-17.

4 Agaebuli Jehova elu, Ọ gaachị kwa n’eziomume na udo, Aisaia 2:17; 25:6-9; 35:1-10; Zekaraia 14:16, 20, 21; Nkpughe 20:4-6

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ná mmalite nke oge, Chineke Atọnimeotù ahụ lere ihe niile O kere anya “ma, le, ọ di mma nke uku.” Emewo mkwadebe dị ukwu banyere ọgan’iru na ọñụ nke ihe niile ekèreekè. Ịdịn’otù nke ihe niile ekèreekè na ihe kpatara ejiri ihe niile bụ ka ha na Chineke dị n’otù, ka ha náeto kwa Ya.

Ịdịn’otù ahụ nke náenye ọñụ a, na ibindụ nke izuòkè ka emebiri mgbe náadịghịanya, otú ọ dị, n’ihi na mmadụ ñarantị ma rube kwa isi n’aghụghọ na ntụpụta dị icheiche nke Setan nke jupụtara ná mmehie. bụ nke esitere n’ọnụ agwọ kwue. Ngwangwa, mkpụrọobi dịndụ, nke náadịghị kwa anwụanwụ nke mmadụ wee bụrụ ihe ekewapụrụ site n’ebe Chineke nọ -- bụrụ ihe nwụrụanwụ nime ajọ omume na mmehie niile. Emebiri ụdị nke izuòkè ahụ nke mmadụ nọrị nime ya, ewee nwee mkpọrọgwụ mmehie nime mkpụrụobi mmadụ, nke a wee náachị ụdị na ndụ nke mmadụ ahụ nke anaamụbeghị ọzọ rue n’ụbọchị taa. Setan gbara mbọ iwere ike nke Chineke na òkìkè Ya, ọ fọdụkwara nke ntà ka o mee nke a; ma Chineke naejigide ike na ikike Ya, otù ụbọchị Ọ gaanapụta ụwa n’agbụ ọjọọ na ọbụbụọnụ nke mmehie bokwasịrị ya. Chineke gaeziteghachị Jisọs n’ụwa ka O wee malite ọchịchị nke alaeze Ya, ịchị ụwa n’eziomume otù puku arọ.

Ụbọchị Ikpeazụ

“Ọ gēru kwa n’ikpe-azu nke ubọchi ndia,” bụ ihe Aisaia onye amụma ji malite amụma ya banyere Alaeze nke Kraist nke gaje ịbịa. N’oge ahụ mgbe mmehie lụsiworo ọlụ ya, o wee dị ka Setan ejikerewo ịlụọlụ mbibi nke ikpeazu ya n’ebe mmadụ na ụwa dị, Jisọs gaapụta ìhè wee gbapụta ụwa pụọ n’ike na ọchịchị Setan. “M’we hu elu-igwe ka ọ gheworo oghe; ma le, inyinya ọcha di, na Onye nānọkwasi ya, bú Onye anākpọ Onye kwesiri ntụkwasi-obi na Onye-ezi-okwu; ọ bu kwa n’ezi omume ka Ọ nēkpe ikpe, nēkpe ikpe, nēbu kwa agha. … Usu niile nke ndi-agha ndi di n’elu-igwe we so Ya n’elu inyinya ọcha, nēyi ezi ákwà ọcha, nke di ọcha nēnwu kwa enwu. Nma agha di nkọ nēsi kwa n’ọnu-Ya puta, ka Ọ wee were ya tigbu mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n’aka nke igwè zùa ha dika aturu” (Nkpughe 19:11, 14, 15). Alaeze nke Kraist gaabụ otù nke ike ukwu naachịachị n’elu ụwa dum. Ihe ahụ nke ndị ọchịagha amaara aha ha lụrụ ọgụ wee laa ndụ ha n’íyì mgbe ha naachọ inweta ya, ka agaenye Jisọs, Ọkpara Chineke n’aka.

Agaenwe agha dị egwù nke gaadị nweoge, iji dozie ụzọ maka ọchịchị eziomume nke Kraist. Ọtụtụ mmadụ gaebuso Onyenwe anyị agha n’ụbọchị ahụ, ma agaala ha n’íyì site ná mmaagha nke sitere n’ọnụ Kraist. Agaeké Setan agbụ, tinye ya n’olulu nke abyss ahụ, ebe ọ gaanọ otù puku arọ, ma ndịisi ndị naejere ya ozi ka agaewere ná ndụ tinye n’ọdọọkụ ahụ. Ndị ahụ bụ ndị gaagbanarị oge ikpe na óké mkpagbu a ka agaakpọbata n’oge nke otù puku arọ ahụ bụ oge nke gaejupụta n’udo nke náenweghị àtụ.

Ụzọ esi Abanye n’Alaeze ahụ

Ọ dị otù ụzọ doroanya nke agọzikwara agọzi nke anaesi abànye n’Alaeze Kraist a dị ebube nke náabịa. Jọn Onyeọwụmmiri bụ onye Chineke sitere n’ọnụ ya gwa ụwa ihe eji abànye n’Alaeze ahụ ya na ụgwọ agaakwụ iji nabata mmadụ: “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2). Jisọs kpọsara ma kwu kwa okwu banyere otù ozi ahụ karịa, O gosikwara na mmezu nke Alaeze ahụ n’òzùzùòkè ya abụghị n’oge ahụ. “Mgbe ndi Farisi juru Ya mgbe ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adigh-abia mgbe madu nēche nche: ha agagh-asi kwa, Le, n’ebe a! ma-ọbu, N’ebe ahu! N’ihi na le, ala-eze Chineke di n’etiti unu” (Luk 17:20, 21).

Mmadụ niile ndị ji obi ha niile nara Jisọs Kraist ma náerube kwa isi n’iwu Ya niile bụ ndị amụbatara n’Alaeze Ya. Ndịa meriri ike niile nke Setan site n’Ọbara nke Nwaatụrụ ahụ na site kwa n’okwu nke ịgbaàmà ha. Ndịa bụ ndị náemeribiga òkè, nwereike ịnwụ ọnwụ nke anụarụ, ma agaeme ka ha si n’ọnwụ bilie, ha na ndị nsọ nke dị ndụ bụ ndị náemeriemeri ka agaewelikọ n’Eluigwe, ka ha na Kraist wee nọọ n’Oriri Ọlụlụnwunye nke Nwaatụrụ ahụ. Mgbe agaekpughe Kraist nye ụwa dịka Eze, ndịnsọ ndịa gaeso Ya rịdata n’elu ụwa, ịbụ ndị ndị nchụàjà nke Chineke na Kraist ma soro kwa Ya chịa otù puku arọ. (Gụọ Nkpughe 19 na 20).

Nye mbibi nke ha onweha, ọtụtụ mmadụ naarapụ ime mkpebi a dị óké mkpà nke bụ ijere Kraist ozi. Ndị ka n’ọnụọgụgụ arapụwo nnọọ ịghọta óké ịlan’íyì nke ọ pụrụ iweta, bụ ileghara ihe niile ahụ dị óké mkpà anya, bụ nke ha kwesịrị ime ka ha wee nweta ọnọdụ n’Alaeze nke Kraist, ma ọ dịghị ihe ọ bụla agaewere na ọ dị mkpà ná ndụ mmadụ karịa ikpeekpere rue nzọpụta zuruòkè. Onyenwe anyị enyewo ụmụmmadụ ohere na oge ka ha wee jikere obi ha maka ebighiebi. “Mọ Nsọ nāsi, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, unu emela ka obi unu sie ike, dika n’ikpasu-obi-ilu ahu” (Ndi Hibru 3:7, 8). Ndị niile bụ ndị jụrụ ịtụkwasị Kraist obi maọbụ irubere Ya isi nime ndụ a aghaghị iketa òkè n’ọnwụ nke abụọ ahụ. Ndịmmehie ụfọdụ ndị náechègharịghị site ná mmehie ha gaenwe ohere ịnọ n’oge Ọchịchị Otù puku Arọ ahụ. Agaesite n’ebe hụ tụba ha n’ọdọọkụ ahụ: “Nka bu ọnwu nke abua ahu” (Nkpughe 20:14).

Alaeze Ahụ Ebulirielu

Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ banyere ndị nke Kraist nke anụrụ n’ụwa niile nábatara Kraist n’otù; ma otú ọ dị, oge naabịa mgbe mmadụ niile dị ndụ gaanabata Jisọs Kraist dịka Onyenwe anyị. Ndị náesoụzọ Kraist alụwo ọlụ ọtụtụ arọ ndịa ịkpọbata ụmụmmadụ n’alaeze nke Kraist; ma ndọgbu n’ọlụ niile, náagbanyeghị otú o si dị ukwu ma bụrụ kwa nke alụrụ n’ikwesịntụkwasịobi agaghị eme ka Alaeze nke Kraist bịa n’ozuzuòkè ya n’elu ụwa dịka o kwesịrị. Ihe gaeweta nke a bụ ọbịbịa nke Eze ahụ n’OnweYa site n’Eluigwe.

Ndị bi n’ụwa agaghị kwa akpọ Jisọs asị wee kwu kwa banyere Ya sị, “Ayi achọgh ka nwoke a buru eze-ayi” (Luk 19:14); ma mba niile gaeje rue ụlọ nke Onyenwe anyị na Zaion. “Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu JEHOVA, rue ulo Chineke nke Jekob; Ọ gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n’okporo-uzọ Ya nile” (Aisaia 2:3). Ọ bụ náánị Onyenwe anyị ka agaebulielu n’ụbọchị ahụ. Agaemeworị ka nfulielu na mpako nke mmadụ bụrụ ihe ewedara n’ala. Arụsị niile ka Ọ gaekpochapụ kpamkpam. N’ụwa taa ọ bụghị mmadụ niile naefé arụsị nke eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ, ma ihe ọ bụla nke mmadụ hụrụ n’anya karịa Chineke, maọbụ ihe ọ bụla nke mmadụ rọọrọ n’ọnọdụ Chineke, ihe ahụ bụ arụsị aghaghị kwa ịla ya n’íyì n’ụbọchị nke Chineke nke usu niile nke ndịagha.

Oge nke Udo

Tupu ike nke Setan na mmehie abata n’Ogige Iden, ọ bụ udo na ndajụ dị n’ebe ahụ. Ụmụmmadụ, ụmụanụmanụ na ụmụnnụnụ -- ha niile bikọtara n’ịdịn’otù náenweghị nke náatụ ibe ya egwù maọbụ ichè na ibe ya gaemerụ ya arụ. Jehova rọpụtara ahịhịa ndụ ka ọ bụrụ iheoriri nye ụmụanụọhịa na anụufe niile, ma site n’ọbụbụọnụ nke mmehie anụ ụfọdụ wee malite igbu na iri ibe ha dịka nri. Mgbe Kraist gaesi n’Eluigwe bịa, náanọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ, mgbe ọ gaemeri Setan na ike niile nke njọ, agaeweghachị ụmụanụmanụ na anụufe niile n’ụdị mbụ na n’ọchịchọ nke iri ihe ha kwesịrị iri dịka ọnọdụ nke ha dịburị na ya n’Ogide Iden. “Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n’otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha. Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi. Nwa nāñụ ara gēgwuri kwa egwú n’elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubi ka nwa emere ka Ọ rapuu ara gātukwasi aka ya. Ha agagh-eme ihe ọjọ, ha agagh-ebibi kwa, n’ugwu nsọm nile: n’ihi na ihe-ọmuma JEHOVA gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri (Aisaia 11:6-9).

Jehova gaekpe ikpe n’etiti mba niile, Ọ gaàbákwara ọtụtụ mmadụ mbá. Mgbe enwere Eze mmeri dịka Kraist n’isi ọchịchị ifè na ijere Ya ozi, mgbe agaekeworị Setan agbụ tụba ya nime olulu abyss ahụ, ebubo ụgha, ekworo, na mpako niile gaedere duu ọbụná nime ndị mmehie, ọ gaadịrị ụmụmmadụ nfé, onye ọ bụla na ibe ya ibi n’udo. Ngwaagha dị icheiche, mmaagha na ubè, ka agaakpugharị ka ha bụrụ mmaoge na mmaịkwa osisi. “Mba agagh-ebuli mmaagha megide mba, ha agagh amuta kwa agha ọzọ”. Mba dị icheiche emewo ọtụtụ ihe iji weta udo n’ụwa, ma dị ka ha naagbalịsiike inweta udo otú a ka udo ahụ naagbanarị kwa ha wee bụrụ ihe dị ụkọ nke ukwu. N’ụbọchị nke Jehova nke usu niile nke ndịagha, otú ọ dị, udo gaadị n’ebe dum -- n’èzínaụlọ na n’ama dị icheiche, n’obodo na nime isiobodo dị icheiche. Ụlọikpé nke náekwewa di na nwunye agaghị alụ kwa ọlụ, n’ihi na ndụ nke èzínaụlọ gaalaghachị n’ụdị Chineke zubere na ha kwesịrị ịdị.

Ndị Juu

Dịka Jisọs naabịaghachị n’elu ụwa ná mkpughe nye ndị Juu na ndị niile bi n’ụwa, “obi etili ụfọdụ” nke “mere ndi Israel” gaakwụsị. Mgbe ahụ ka agaemezu ihe Aisaia kwuru: “Ulo Jekob, bịanu, ka ayi jégharia n’ìhè JEHOVA” (Aisaia 2:5). Náánị olenaole nime ndị Juu ahụ achụsaraachụsa bụ ndị nábataworo Jisọs dịka Mesaia ahụ nke ekwere ha ná mkwà n’arọ niile ndịa, ma nd Juu dịka otù mba ajụwo ịnara Jisọs dịka Mesaia ha. Óké nsogbu esorowo kwa mba ahụ, nkekankè site n’ụbọchị ahụ mgbe ndịisi ha chọrọ ka akpogide Jisọs n’obe ka Ọ nwụọ, ha wee sị “Ọbara-Ya di ayi n’isi, di kwa n’isi umu-ayi” (Matiu 27:25). Nsogbu dị ukwu karịa ka dị kwa n’iru ha rue, n’ikpeazụ, mgbe ndị Juu ahụ ndị fọdụrụ gaekwere n’Eze ha nke gaanọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha, ma nábata Ya dịka Onye nzọpụta na Ọkpara Chineke. “Ọ gēru kwa, n’ala nke a nile, (ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubie ume; ma uzọ nke-atọ gāfodu nime ya. M’gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n’ọku, M’gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo ndi ahu gākpoku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M’gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, JEHOVA bu Chinekem” (Zekaraia 13:8, 9).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee mgbe Alaeze Kraist gaabịa n’eluụwa:

  2. 2 Òlee ebe isiọchịchị ya gaadị?

  3. 3 Ndị òle nime ndị nọ n’ụwa gaakpọ isiala nye Eze ahụ n’ụbọchị ahụ?

  4. 4 Òlee otú Alaeze Kraist gaesi dị iche site n’alaeze dị icheiche nke enwere n’ụwa nke a?

  5. 5 Gịnị mere Onyenwe anyị jiri rapụ ụlọ Jekob?

  6. 6 Gịnị bụ mmeso nke agaemeso mpako na ịdịelu nke mmadụ n’Ụbọchị nke Onyenwe anyị?

  7. 7 Gịnị gaeme arụsị niile mgbe agaekpghe Onyenwe anyị? Gịnị gaeme ndị niile náekpere arụsị?

  8. 8 Oge ra añaa ka Alaeze Kraist gaanọ n’ụwa?

  9. 9 Òlee otú anyị gaesi mata na anyị na Kraist gaanọ n’Alaeze Ya?