Abù Ọma 5:1-12

Lesson 343 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA, n’ututu ka I gānu olum; N’ututu ka m’gēdoro Gi ekperem n’usoro, che kwa nche” (Abù Ọma 5:3).
Cross References

I Otù Ekpere nke Devid kpere

1 Ọ naarịọ Jehova ka Ọ nụrụ ákwá ya, Abù Ọma 5:1, 2; 3:4; 65:2; Jemes 5:16.

2 Ọ naekpeekpere ya n’isiụtụtụ, náeché kwa nché n’okwukwe ịnata ọzịzá ya, Abù Ọma 5:3; 88:13; Maika 7:7; Habakuk 2:1.

3 Jehova kpọrọ ndị náalụọlụ ajọomume asị, Abù Ọma 5:4-6; 55:23; Nkpughe 21:8.

4 Devid gaefè Jehova òfùfè site n’ebere na egwù, Abù Ọma 5:7.

5 Ọ naekpeekpere ka edue ya n’ụzọ ziriezi, Abù Ọma 5:8; Ilu 15:19; Matiu 7:13, 14.

6 Ọ naakọwa ọnọdụ nke ndị náemebiiwu wee náebu kwa amụma na ha gaada site na ndụmọdụ niile ha, Abù Ọma 5:9, 10; Luk 11:44; Ndi Rom 3:13.

7 Ọ naegosi ọñụ dịrị ndị náatụkwasị Jehova obi, na ngọzi niile nke náagbaso ha, Abù Ọma 5:11, 12; Aisaia 65:13, 14; Habakuk 3:17-19.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Òfùfè nke Isiụtụtụ

N’Abùọma nke náesota Devid naekwu na ya pụrụ ịdịnaala, rarụụra n’udo n’ihi na Jehova mere ka ya biri ná ntụkwasịobi. Ekpere naadị n’egbughereọnụ ya mgbe o tetara, nye Chineke Onye chébéworo ya n’abalị ahụ niile. Mgbe mmadụ ji egbugbereọnụ nke jupụtara n’otuto rarụụra, ọtụtụ mgbe ọ naeteta n’obi jupụtara n’ekpere na arịrịọ nye Chineke Onye náeché ihe niile nché!

Úrù nke Ịnọgidesiike N’ekpere Náewepụghị Aka Bara

Devid bụ nwoke nke nọgidesirịike n’ekpere n’Ocheeze Amara. Ọ rịọrọ ka Jehova geentị n’okwu ọnụ ya; mgbe náánị okwu ọnụ náezughị, ọ rịọrọ ka ntụgharị uche ya, ọchịchọ ya dị icheiche, na agụụ niile nke obi ya bụrụ ihe Eze ya gaatụle, Onyenwe ya, Onye mkpepụta ya nke bụ Onye eziomume -- na Chineke ya, Onye ndu ya nke anabatara nkeọma, Onyeòkìkè ahụ nke ọ hụrụ n’anya ma náefè kwa òfùfè. Mgbe mkpụrụobi ya nọ ná mkpagbu nke karịrị ọbụná nghọta ya, mgbe ekpuchiwokwara ezi uche Chineke n’ebe ọ nọ, ọ rịọrọ sị, “Ña nti n’olu ntiku m nētiku Gi,” na “isu-udè anāpugh ikwu” (Ndi Rom 8:26, 27).

Devid matara na ndịiro ya dị ọtụtụ na náánị nchébé ya nwere bụ nkù nke Onyepụrụ imeiheniile. Nwa Chineke ọ bụla nwekwara ndịiro otú ahụ n’ụbọchị taa. Otù onyeiro dị nye onye ọ bụla mgbe dum -- ekwensu. Anyị naezute onyeiro ahụ n’otù ọgbọagha ahụ ebe Devid zutere ya. Enwere ọtụtụ Golaiat agaezute n’ụbọchị taa. Okwukwe dị kwa anyị mkpà n’iheagha nke ibuagha anyị dịka Devid si nwee okwukwe na Jehova gaeduzi nkume ntakịrị ahụ nke náánị iheagha o nwere zipụrụ, èbè ntakịrị, ka ọ daa n’ebe o kwesịrị nke gaeme ka onyeiro ahụ bụrụ onye emeririemeri. Iheagha nke ibuagha anyị abụghị nke anụarụ, kama ha sitere na Chineke bụrụ ihe pụrụ ịkwada ebe ewusiriike. “Ebe ayi nēweda ihe anātule n’obi, na ihe nile ọ bula di elu nke eweliri elu imegide ọmuma Chineke, ayi nādọta kwa ihe nile ọ bula anēchèputa n’agha iña nti Kraist” (2 Ndi Kọrint 10:4, 5). (Lee Ndi Efesọs 6:10-18

Ichénché

“JEHOVA, n’ututu ka I gānu olum.” Devid kpebiri na ya gaeji oge ya kachasị mma kpeeekpere wee tụgharị kwa uche n’Okwu Chineke, naeme ka échìchè ya dịgide na ya, wee naemegha obi ya nye ya, ka o wee ghọta uche Chineke na àtụmààtụ Ya.

“M’gēdoro Gi ekperem n’usoro” -- M’ga-edozi kwa arịrịọ m n’usoro n’iru Gi. M’ga-eweta otuto niile na ekele; M’ga-eweta arịrịọ m niile, ịrụụka m nile, na arịrịọ amara m nile. Omume nke náegbochi ekpere bụ échìchè nke náagbasasịagbasasị mgbe mmadụ naachọ iru Chineke. Ike niile na nghọta niile anyị nwere -- uche anyị, échìchè anyị niile na ihe niile dị anyị n’arụ -- aghaghị ịbụ ihe achịkọtara n’otù nye Onyenwe anyị. Gịnị ka Chineke gaechè banyere ụdị ekpere ọ bụla nke mmadụ gaekpe mgbe échìchè ya dị n’ọlụ ya, èzínaụlọ ya, nchègbu nke ndụ a maọbụ ihe ọ bụla ọzọ? Ọ bụ ihe dị mma ịrịọ Onyenwe anyị ka O bibie omume ọ bụla dị otú a ma nye kwa anyị ike ikpesiekpere ike na ịchọsị Ya ike. Eluigwe gaamalite imeghepụ; Chineke gaamalite kwa ịlụrụ anyị ọlụ. “Arịrịọ nke onye ezi omume di ike nke ukwu n’ilusi-ọlu-ike-ya” (Jemes 5:16).

Devid sịrị na ya “gēche kwa nche” (maọbụ lee anya n’elu) maka ọzịzá ekpere ya -- were okwukwe legide Chineke anya, legide kwa mkwà Ya niile anya. Chineke ekwuwo, “Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu.” “Ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n’ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọworo n’aka-Ya” (I Jọn 5:14, 15).

Ejighị obi niile kpeeekpere aghọworo mmadụ usoro ekpere; ha naekpeekpere náenweghị olileanya ịnata ọzịzá nye ekpere ha. Ọ bụrụ na ha anataghị ọzịzá taa, ha naechè na eleghịanya ha ganata ya echi. Ịchọ iru Chineke ewee ghọọ ná ndụ ha, ihe anaeme mgbe dum náadịghị enweta ọzịzá ọ bụla. Mgbe mmadụ malitere ịdaba n’ọnọdụ dị otú ahụ ọ ghaghị ịrịọ Chineke ka O wepụta ya n’ọnọdụ ahụ ma meere ya ihe ga naeweta ọzịzá site n’Eluigwe. “Unu gāchọ-sikwam ike, we chọtam, mgbe unu ji obi nile unu achọm” (Jeremaia 29:13).

Ịdịnsọ maọbụ Ọkụalammụọ

Chineke dị nsọ. Ọ hụrụ ịdịnsọ n’anya ma kpọọ ajọomume asị. Iheọjọọ na Onye kachasị ihe niile elu agaghị ebikọ. Ọ bụ n’ihi nke a ka mmehie náagaghị aba n’Eluigwe. Ọ bụ ezie na Chineke kpọrọ mmehie asị ma Ọ hụrụ mkpụrụobi ndịmmehie n’anya. “Chineke huru uwa n’anya otú a, na O nyere ọbụná Ọkpara Ọ muru nánị Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyi, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16). Chineke enyewo ụzọ nke mkpụrụobi ọ bụla mmehie merụrụ pụrụ isi chègharịa ná mmehie, wee rịọ ka emeere ya ebere, site kwa n’okwukwe nime Ọbara nke mkpuchi mmehie ahụ nke Jisọs Kraist, apụrụ ime ka o nwere onweya pụọ ná mmehie, ewee saa uwe ya nime Ọbara nke Nwaatụrụ ahụ. Mgbe ahụ ka ọ pụrụ ịbà ná mmeri site n’Ọnụụzọama niile ahụ ibinyere Chineke dị nsọ nime Eluigwe dị nsọ rue mgbe ebighịebi.

Devid amataworị na onyenzuzu agaghị eguzo n’iru Chineke. Mmadụ pụrụ ichè na ya nwereike ime onweya onye kwesịrịekwesị iguzo n’iru Chineke site n’ọlụ ọma nke aka ya, ma ụdị mmadụ dị otú a naachọpụta ngwangwa maọbụ ma emesịa na ihe mnweta nke ọlụ aka ya agwụsịwọ. Ireure nke ji nwayọ náabịakwasị ụlọ nke ndụ ọ naewu nke anaewuzubeghị naagbaàmà banyere enweghị nghọta ya site naarapụghị ụzọ nke aka ya na échìchè ya niile ma tụkwasị Chineke obi ka O wee due ya kwa ụbọchị dịka Devid mere ( Lee Luk 14:28-33).

Ma ọ bụrụ na mkpụrụobi ọ bụla anọgidesie ike nime mmehie, wee jụ ebere Chineke, agaachụpụ mkpụrụobi ahụ rue ebighịebi n’iru Chineke dị nsọ, ọ gaghị enwe kwa ohere ibi n’Eluigwe dị nsọ na ibinyere ndị dị nsọ. Akụkụ ọzọ dị icheiche nke Akwụkwọnsọ naeme ka o guzosieike na ndị náalụọlụ mmebiiwu, ndị náekwuokwu ụgha (ndị ụgha niile), ndị agụụ igbummadụ naagụụ na ndịaghụghọ gaenwe òkè ha nime ọdọ ahụ nke eji ọkụ na brimstone náere (Nkpughe 21:8 na Abù Ọma 101:7). Ma ndị ahụ náeso nzọụkwụ nke Jisọs “Onye ọ digh nmehie ọ bula Ọ mere, ahugh kwa aghughọ n’ọnu-Ya” (I Pita 2:22), gaeguzo wee bụrụ “ndi ana-atagh ụta n’iru oche-eze Chineke” (Nkpughe 14:5). Otù onye ekwuwo okwu sị na ọ bu “ịdịnsọ maọbụ ọkụalammụọ.”

Mkpebi nke Devid

“Ma mu onwem, n’uba nke ebere-Gi ka n’gābà n’ulọ-Gi: M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di n’egwu-Gi.” Devid matara na ya bụ onyenzuzu na onye mmebiiwu n’oge garaaga, na ọ bụ nááṅị site n’ebere Chineke ka azọpụtara ya. Pọl Onyeozi dere n’Akwụkwọozi o degaara Taitọs:

“Ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnwegh uche n’oge gara-aga, ndi nēkweyegh, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe utọ di iche iche, nēbi n’obi ọjọ na ekworo ndi-árú nākpọrita ibe-ayi asi.

“Ma mgbe egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n’anya-Ya n’ebe madu nọ,

“O sitegh n’ọlu di iche iche aluru n’ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n’ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme

“Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n’aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi;

“Ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebigh-ebi si di” (Taitọs 3:3-7).

Onyenzuzu bụ onye ahụ nke naajụ Chineke. Onyemaraihe naarọrọ nzọpụta na ndụ ebighịebi. Ìmewo ezi nrọrọ ahụ ka mma? Ma ọ bụghị otú a ị pụrụ ime ya taa. Ọ dịghị onye ọ bụla kwesịrị ebere Chineke, ma Chineke site n’óké ịhụn’anya Ya n’ebe mmadụ daraàdà nọ mere ka ebere Ya rue anyị. Òlee otú anyị gaesi jụ ya?

Ịtụegwù Chineke

Ọ bụ site n’ịtụegwù Chineke ka Devid ji feè Onyenwe anyị òfùfè -- ịtụegwù ka ọ ghara imejọ Onye ahụ dị ukwu, dị nsọ, dị ike nke na Ọ pụrụ iji okwu ọnụ mee ka ụwa a dị -- ịtụegwù ka ọ ghara ịdapụ maọbu ịbụ onye ekewapụrụ pụọ n’ebere na amara nke Chineke. “Ya mere, onye nēchè na ọ nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida” (I Ndi Kọrint 10:12).

Chineke kwesịrị ka atụọ Ya egwù nime nsọpụrụ. Devid nwere mmetụta nke a n’obi, wee sị, “M’gākpọ isi ala n’ebe ulo uku nsọ Gi di n’egwu-Gi.” Onye amam-ihe ahụ sịrị: “Tua egwù Chineke, debe kwa ihe nile O nyere n’iwu: n’ihi na nka bu ọlu madu nile.”

Ekpere maka Odúdú

Devid kpereekpere ka Onyenwe anyị due ya n’ụzọ ahụ guzoziri eguzozi nke dị kwa warara bụ nke eziomume. Ọ matara na ọ dị ọtụtụ ụzọ dị n’akụkụ, nke náeduhie kwa eduhie. Ọ dị ọtụtụ ihenduhie dị n’etiti ndị okpukpé nke ụwa taa: òtù nzuzo ụgha dị icheiche, okpukpé ụgha dị icheiche n’akụkụ niile Jọn naekwu sị, “Ọtutu ndi-nduhie apuwo ba nime uwa” (2 Jọn 7). Ụwa jupụtara ná nduhie. Ndịozi (Ministers) òle n’ụbọchị taa naeguzo n’elu ebe anaekwusa okwu Chineke (Pulpit) náekwupụta na ọkụalammụọ dị, náekwu kwa site n’okwu niile nke Jisọs, “Ọ buru na unu echègharigh, unu nile gāla n’iyi otú ahu” (Luk 13:3)? Mmadụ òle náadọ akanántị megide mmehie a jọgburu onweya nke náachịachị n’ụwa taa -- ịkwaiko nke ndị lụworo di na nwunye? Ọtụtu oche nke ụlọnzukọ jupụtara ná ndịkom na ndịnyom bụ ndị ha na nwunye onye ọzọ bi maọbụ ndị ha na di onyeọzọ bi. Mmadụ òle naekwupụta n’elu ebe anaekwusa okwu Chineke na, “aghaghị ịmụ unu ọzọ?” na mgbe amụrụ unu ọzọ, unu aghaghị idozi ụzọ unu? Mmadụ òle naekwu na aghaghị ido unu nsọ ka unu wee nwee obi dị ọcha, dị kwa nsọ, nke emebiworo mkpọrọgwụ nke mmehie nime ya? Adịghị ekwupụta isiokwu ndịa dị óké mkpà n’ọtụtụ pulpit (n’elu ebe ana-ekwusa okwu Chineke). Ma otú ọ dị, eziokwu ndịa dị na Baịbụl Chineke, Baịbụl ñaekwu kwa na, ọ bụrụ na onye ọ bụla gaatụkwasị ihe maọbụ wepụ okwu nime okwu Chineke, ọ gaghị enwe òkè n’ebe Chineke nọ. “Atukwasila ihe n’okwu-Ya niile, ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha” (Ilu 30:6). (Lee kwa Deuteronomi 4:2; 12:32; Joshua 1:7; Nkpughe 22:18, 19).

Devid matara na ndị ụwa naele ya anya. Ọ chọrọ ka ihe ọ bụla nke o kwuru ma mee kwa bụrụ ihe gaenye èzínaụlo nke Chineke ùgwù ma wetakwara aha ahụ dị ukwu nke Nna ya nke bi n’eluigwe otuto: “Warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole na ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya” (Matiu 7:14).

Akpọrọ Ajọomume Asị

Abù Ọma a naagwa anyị na Onyenwe anyị kpọrọ “ndi nile nālu ajọ ihe” asị. Ọ bụrụ na mkpụrụobi ọ bụla agaa n’iru ịnupụisi megide ọkpụkpọòkù nke Chineke nke jupụtara n’ebere maka nchègharị, wee náezube ịnọgide nime mmehie, ịdịnsọ nke Chineke aghaghị iguzosiike. “Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, onye nāpugh kwa ilegide nmegbu anya” (Habakuk 1:13).

Onyenwe anyị mere ka ọkụ na brimstone zokwasị Sọdọm na Gọmọra n’ihi na mmehie ha dị arọ nke ukwu. N’ụbọchị Nọa, ajọomume nke mmadụ ririnne nke ukwu, nke a mere ka Chineke chègharịa na O mere mmadụ n’ụwa, o wee wuta Ya n’obi. Chineke naenwe mwuta n’ụbụchị taa n’ihi ndị náalụọlụ nke ajọomume, ikpé nke eziomume Ya gaadakwasị kwa ụwa ọzọ n’oge náadịghị anya.

Ngọzi dị Icheiche nke Dịrị Ndị Eziomume

“Ma ka ndi nile nāgbabà nime gi ñuria, ka ha tie nkpu ọñu rue mgbe ebigh-ebi, n’ihi na i nēkpuchi ha ndò: ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n’anya tọ ha utọ nime Gi.” Ndị eziomume nwere mkwà zuru ezu ime ka ha náañụrịọñụ ehihie na abalị. Ịbụ onye emere ka o nwere onweya site ná mmehie naeme ka obi ahụ jupụta n’udo. mkwà nke ndụ ebighịebi naeme ka mkpụrụobi ñụrịaọñụ. Olileanya nke Eluigwe naeme ka mmadụ were itimkpu kpọsaa otuto nile nke Chineke. Pita naekwu na nzọpụta a naeme ka anyị ñụrịa ọñụ “n’ọñu nke anāpụghị ịkọwa, jupụta kwa n’otuto.”.

Nwa Chineke bụ onye ekwensu kpọrọ asị bụrụ kwa onye ndịmmehie naeleda anya. Ma ọ bụ onye Nna hụrụ n’anya, onye Jisọs naéchènche, onye Mmụọ Nsọ naakasị kwa obi. O nwere olileanya ahụ dị ngọzi nke ịhụ Jisọs anya otù ụbọchị na ibi ebighịebi n’obodo ọma ahụ náenwuenwu nke Jọn hụrụ ka o si n’ebe Chineke nọ náarịdata site n’Eluigwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee mgbe Devid kpọkuru Onyenwe anyị n’ekpere?

  2. 2 Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ịnọgidesiike n’ekpere náesepụghịaka?

  3. 3 Gịnị mere Devid jiri kpeeekpere maka odúdú nke Chineke?

  4. 4 Ụdị egwù dị añaa ka Devid nwere mgbe ọ naaga ifeòfùfè n’Ụlọukwu Chineke?

  5. 5 Gịnị bụ mmeso nke Chineke n’ebe ndị náemebiiwu nọ?

  6. 6 Nime ndụmọdụ ònye ka ndị náemebiiwu gaada?

  7. 7 Gosi ihe dị iche n’etiti onye náemebiiwu na onye eziomume?

  8. 8 Kpọọ aha ihe ụfọdụ náeme ka onye eziomume ñụrịaọñụ.