2 Ihe Emere 32:1-23; 2 Ndi Eze 19:14-37.

Lesson 344 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m’gātu egwu? JEHOVA bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m’gātu óké egwu? (Abù Ọma 27:1).
Cross References

I Nnọchigide nke Senakerib na Okwukwe nke Hezekaia

1 Senakerib mara ụlọ ikwu ya imegide obodo Juda niile nke eji mgbidi gbaa gburugburu, 2 Ihe Emere 32:1; 2 Ndi-eze 18:13-16; Aisaia 36:1

2 Hezekaia gbalịsịike ịnapụta Jerusalem, 2 Ihe Emere 32:2-5

3 Okwukwe ya n’ebe Chineke nọ nyeere ya aka ikwuokwu ịgbaume, 2 Ihe Emere 32:6-8.

II Okwu Mkwulu nke Senakerib na Ekpere nke Hezekaia

1 Ekwuru okwu ọjọọ megide Hezekaia na Onyenwe anyị, 2 Ihe Emere 32:9-19; Aisaia 36:2-22; 2 Ndi Eze 18:17-37.

2 Senakerib Zigaara Hezekaia akwụkwọozi nke nkwulu, 2 Ihe Emere 32:17; 2 Ndi Eze 19:8-13; Aisaia 37:14.

3 “Aririọ nke onye eziomume di ike nke-uku n’ilusi ọlu-ike-ya,” Jemes 5:16; 2 Ndi Eze 19:14-19; 2 Ihe Emere 32:20; Aisaia 37:15-20; Abù Ọma 46:1.

III Nzaghachị nke Onyenwe anyị na Mbibi nke Senakerib

1 Aisaia kwuwapụtara okwu banyere ihe nke gaadakwasị Senakerib, 2 Ndi Eze 19:20-34; Aisaia 37:21-35.

2 Ọbịbịa nke mmụọozi ahụ wetaara ndịagha nke Asiria ọnwụ, 2 Ndi Eze 19:35-37; 2 Ihe Emere 32:21-23; Aisaia 37:36.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịdịn’otù

“Mgbe ọ nādigh ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda” (Ilu 11:14). Ngwangwa Hezekaia matara na Senakerib, bụ eze Asiria, naabịa ibuso ya agha, ọ natara ndụmọdụ site n’aka ndịisi na ndi dike ya. Ha jikọtara onweha wee wuzie ebe nile ewusiri-ike ma jikere kwa onwe-ha ịlụọgụ megide Senakerib. Ịdịn’otù nke dị n’oge ọnwụnwa ahụ naekwu nkeọma banyere ntute nke òfùfè nke imemmụọ nke di n’oge ọchịchị nke Hezekaia. Hezekaia mere ihe o nwereike ime wee gwa ndị ya “okwu nābà n’obi-ha.”

Ịgbàume

“Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ” (2 Ihe Emere 32:7). Ọtụtụ mgbe ka okwu ndịa maọbụ ụdị okwu ịgbàume dị otú a meworo ka obi nke ndịagha nke Chineke nwee mkpali ịlụọgụ nke okwukwe gaa n’iru. O nwereike ịbụ na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ nke gbara ọchịchịrị ka anaakpọ ndịgha a ije, mere nwa nke Chineke ekwesịghị ka ọ tụọ egwu, n’ihi na ọ pụrụ iweli anya ya lee n’Eluigwe mata kwa na Chineke “nēchebe ya, o we nādizu n’udo,” bụ onye emeworo ka uche ya dabere na Ya (Aisaia 26:3).

Ùsụ Ndịagha nke Chineke

“Nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya” (2 Ihe Emere 32:7). Eze Asiria nwere ọtụtụ ìgwè ndịagha, ma náanyà kwa isi ọbụná inye Hezekaia ịnyịnya nke dị 2000 (puku abụọ) n’ọnụọgụgụ ịhụ na alụrụ ọgụ ahụ, ma Hezekaia pụrụ ikwu sị, “Nke nọnyere ayi di ọtutu kari nke nọnyere ya.” Ọ bụ ezie na anya ya akaahụghị ịnyịnya na ụgbọala ọkụ ahụ ka ha nọ ya gburugburu dịka ọ dịrị orù nke Elaisha, ma, dịka Elaisha, ọ matara na ha nọ n’ebe ahụ.

Ọtụtụ mgbe anyị naanụ ka ebilimmiri naagbọ ụja, anyị ewee malite ịma jijiji, náechéfu na anyị naefè Onye ahụ nke sịrị, “Rue ebe a ka I gābia, ma i gagh-agabiga ya; n’ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili miri gi nile” (Job 38:11). Ka anyị mata nkeọma na “mgbe onye nkpagbu gābata dika miri-iyi, Mọ nke JEHOVA ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya” (Aisaia 59:19). Ọbúná ma asị na ebilimmiri ahụ pụrụ itiwasị mgbidi niile ewusịrịike ma bupu kwa ọtụtụ ụlọ nke dị ka ha baraúrù nke ewukwasịrị n’elu ájá, ọkọlọtọ nke Onyenwe anyị agaghị ama jijiji mgbe óké ifufè naefe maọbụ daa mgbe ebilimmiri naasụ ụfụfụ.

Ọbụná mgbe ọ naadị ka agaasị na ogweaka nke anụarụ dị ike, òlee nke karịrị n’ike, ihe ekereèkè, kaọbụ Onye ahụ kere ya? Ọ bụrụ na otù okwu nke sitere n’ọnụ Onye òkìkè ahụ pụrụ ime ka ihe ahụ dị, otù okwu nke Ọ gaekwu ọ pụghị ime ka ihe ahụ ghara kwa ịdị? Anyị ndị O kereèkè anyì gaatụ egwù ịtụkwasị Chineke obi banyere arụ anyị n’oge ọnwụnwa na n’oge nsogbu wee náechè na ogweaka nke anụarụ dị ike karịa Okwu Ya nke siriike? Ànyị gama jijiji n’ịgbọụja nke ekwensu ebe anyị matara na ọ gaghị aga n’iru karịa otú Chineke nyere ya ike? Chineke ekwuwo sị, “M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli” (Ndi Hibru 13:5).

Ọtụtụ Ebubo

“Ndi Juda we dabere onweha n’elu okwu niile nke Hezekaia, bú eze Juda.” Lee otú onyeiro ahụ si kwue okwu nleli! Ewoo, lee ọtụtụ ebube ọ naebo mgbe ọ hụrụ na ndị ahụ naatụkwasị Chineke obi! Ị pụghị ịnụ ka ọ naasị, “Ị ga-anwụ n’ezie ma ọ bụrụ na imeghi ihe ọ bụla banyere ya! Ị ga-anwụ site n’oké ụnwụ! Ị ga-anwụ site n’akpịrị ịkpọ-nku! Chineke anọnyeregh Hezekaia, Chineke naeweso ya iwe! Lenụ ebe ifè òfùfè niile Hezekaia kwatuworo na ebe ichụàjà niile nke o bibiworo!” Ọtụtụ mgbe onyeiro naatụ aka n’ebe ụfọdụ ọ hụrụ na iruabụọ dị dịka agaasị na ya onwe ya bụ ezi iheatụ nke ezi okpukpé nke NdịKraist. Ọ bụ eziokwu na Hezekaia wezugara ebe niile dị elu, ma o mere ya dịka àtụmàtụ nke Chineke si dị. N’ime ka iwe ya dị elu karịa, Senakerib kwuruokwu mkwulu sị na ya nwere Jehova n’akụkụ ya na Jehova asịwo ya, “Rigo imegide ala nke a, bibie ya” (2 Ndi Eze 18:25).

Ịgbánkịtị

“Ma ndị Ju gbara nkiti, ha azagh kwa ya okwu: n’ihi na ihe eze nyere n’iwu bu nka, si, unu azala ya” (2 Ndi Eze 18:36). Ọ baghị urù mmadụ na ekwensu ịrụrịtaụka. I kwesịghị ịzaghachị ya okwu ọ bụla. Nime ebubo ụgha na nkọcha nile, Jisọs azaghachịghị “ọbuná rue otù okwu” (Matiu 27:14); Maikael kwa bụ onyeisi ndi mmụọozi zaghachirị Setan, “Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba” (Jud 9). Ịrụrịta ụkà nke gị na ndị náemegide okwukwe gị abaghị urù ọ bụla. Arụlaụka maọbụ iseokwu, kama “buru-kwa-nu ndi edoziworo mgbe dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju banyere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwù gọpu” (I Pita 3:15).

Ekpere nke Hezekaia

N’oge nsogbu Hezekaia wedara onweya n’ala, dọwa uwenwụda ya niile, yikwasị kwa ákwà mkpe, wee jee n’ụlọ Jehova. O zipụkwara ozi ịkpọ Aisaia, bụ Onye amụma ahụ dịike nke Chineke, ka o soro ya kpeeekpere. O wutara ndịkom ndịa dị nsọ ịnụ na ekwuluru Chineke nke Israel, were kwa Ya tụnyere chi niile nke ndị alaọzọ ndị bụ ọlụ aka nke ndị mmehie. Mgbe ọ gbasara akwụkwọozi ọjọọ ahụ nke Senakerib dere n’iru ya, Hezekaia rịọrọ Chineke ka O chebe Jerusalem “ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu JEHOVA, bú Chineke, nání Gi” (2 Ndi Eze 19:19).

Ọzịzá Ahụ

Chineke zaghachirị Hezekaia na Ọ nụwo ekpere ya, wee kpughee kwa n’otù mgbe ahụ, ihe mere Senakerib jiri nwee ike imeri mba niile ọzọ. Ịdịike ya niile dị ka ihe náabụghị ihe mgbe onyenwe anyị kpughere na mba niile ahụ o meriri dị ka “ọka chanwuru achanwu tutu o tolite” (2 Ndi Eze 19:26). Ọtụtụ mgbe ka Onyenwe anyị meworo ka amata na Ya onwe Ya náachịachị n’alaeze nke mmadụ. Obi emere ka o sieike nke Pharaoh guzogidere Chineke rue mgbe ebibiri Ijipt. Nebukadneza buliri onweya elu site ná mpako na nganga rue mgbe Chineke chụpụrụ ya n’alaeze ya napụ kwa ya akọnauche ya. Belshesa nọgidere n’oriri na ọñụñụ nime mmehie rue mgbe mkpịsịaka nke Chineke dere ihe banyere ọgwụgwụ ọjọọ ya n’elu mgbidi ụlọ. Ka Senakerib na ndị niile náachịisi n’ụwa mata na “ọ digh onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edogh ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo” (Ndi Rom 13:1). Setan apụghị ịgan’iru karịa otú Chineke nyedebere ya ike. Senakerib hụrụ ñkò nke jidere ya n’imi na bridle nke náejide egbugbereọnụ ya wee laghachi n’iru ihere n’ala nke aka ya.

Mmụọozi nke Ọnwụ

Akụkọ banyere otú Onyenwe anyị si zipụ mmụọozi Ya ka o kpochapụ ndịagha nke Asiria ndị ọnụọgụgụ ha dị 185,000 (otù Puku na narịiriasatọ na ise), tinyere ndị dike niile bụ dimkpà, na ndị ndú na ndị ọchịagha, ka akọrọ nkeọma n’abụ a nke náeso, bụ nke Mazi Byron dere:

MBIBI NKE SENAKERIB

Onye Asiria ahụ bịakwasịrị ìgwè-atụrụ ahụ dịka anụọhịa wolf,

•sụ ndịagha ya naenwuenwu n’agwa nke anụnụ na olaedo;

Onwunwu ọcha nke ube dị ka kpakpando n’elu oké osimiri,

Mgbe ebili mmiri naacha anunụanụnụ náamali n’elu ogbummiri nke Galili.

Dịka akwụkwọ nke ọhịa n’oge ụdummiri

Ahụrụ ụsụ ndị agha ahụ na ọkọlọtọ ha mgbe anwụ dara

Dịka akwụkwọ nke ọhịa n’oge ọkọchị,

•sụ ndịagha ahụ n’échí ya kpọnwụrụ wee fesasịa.

N’ihi na Mmụọozi nke Ọnwụ gbasara nku ya n’elu ifufeọkụ ahụ

Wee kukwasị ume n’iru onyeiro ahụ mgbe O naagafe;

Anya ndị ahụ nọ n’ụra wee dịka ihe nwụrụanwụ ma jụọ kwa oyi,

Ma obi ha nke náekuri ume wee dere duu rue ebighịebi!

N’ebe ahụ kwa ka ịnyịnyaibu ahụ tọgbọrọ saghee imi ya,

Ma ikuume nke nganga ya esighi kwa na ya pụta:

Ùfụfụ ọcha nke ọ gbọpụrụ ná mgbalị ya ikute ume wụsara n’elu ala,

Jụ kwa oyi dịka ụfụfụ nke mmiri si n’elu ugwu.

N’ebe ahụ ka onye náagba Ịnyịnya ahụ tọgbọrọ ghasasịa naacha kwa anwụanwụ,

ịgịrịgị dịkwasị n’ìkùanya ya, na kwa nchala n’elu ngwaagha ya;

Ụlọikwu niile dere kwa duu, ọkọlọtọ niile nọdụụrụ onweha,

Ebulịghị kwa ngwaagha, afụghị kwa opiike.

Ndịnyom nke Ashur ndị di ha nwụrụ náeti mkpu ákwá,

Etiwasịkwara arụsị niile nke dị n’ụlọ Baal;

Ịdịike nke Ndimbaọzọ ahụ, anaejighị mmaagha merie mgbe ọ bụla,

Agbazewo dịka snow n’otùntabianya nke Onyenwe anyị lere ya anya!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka Hezekaia mere iji napụta Jerusalem?

  2. 2 Òlee otú Hezekaia pụrụ isi kwue na “nke nọnyere ayị dị ọtụtụ karị nke nọnyere ya”?

  3. 3 Òlee otú ndị ahụ si mee omume banyere okwu ahụ Hezekaia kwuru?

  4. 4 Kwue ọtụtụ ụzọ dịka i nwere ike icheta nke Senakerib jiri mehie nime ebubo ahụ nke o boro Hezekaia na Chineke.

  5. 5 Gịnị mere eze Asiria jiri nwee ike ibibi ọtụtụ mba dị icheiche?

  6. 6 Ònye ka Hezekaia gwara ka o soro ya kpeeekpere?

  7. 7 N’ihi ònye ka Chineke jiri kwue na Ọ gaechebe Jerusalem?

  8. 8 Mmadụ òle ka mmụọozi nke Onyenwe anyị gburu?

  9. 9 Gịnị bụ ọkwá nke ndị ahụ egburuegbu

  10. 10 Gịnị mere Senakerib