2 Ndi Eze 20:1-18; 2 Ihe Emere 32:26, 31-33.

Lesson 345 - Senior

Memory Verse
“Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile: Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-ngbu di nimem, Durukwam n’uzọ ebigh-ebi” (Abù Ọma 139:23, 24).
Cross References

I Ọrịa nke Hezekaia Mgbe Juda nọ námkpà

1 Ndịagha Senakerib baramba imegide Jerusalem, 2 Ndi Eze 20:6; 18:17.

2 Aisaia gwara Hezekaia na ọ gaanwụ n’ọrịa ya, 2 Ndi Eze 20:1; Aisaia 38:1,

3 Hezekaia kwaraákwá n’iru Chineke, 2 Ndi Eze 20:2, 3.

II Chineke nke Náalụ Ọlụebube

1 Chineke zighachirị Aisaia inyeghachị ọzịzá, 2 Ndi Eze 20:4-6.

2 Agwọrọ Hezekaia, 2 Ndi Eze 20:7; Jemes 5:14, 15; Ọpupu 15:26.

3 Chineke nyere iheịrịbaàmà, 2 Ndi Eze 20:8-11; Mak 16:17, 18

III Ọnwụnwa nke Hezekaia

1 Hezekaia nabatara ndịozi sitere na Babilon, 2 Ndi Eze 20:12, 13; 2 Ihe Emere 32:31.

2 Hezekaia mere ka obi ya dị elu, 2 Ihe Emere 32:25, 26; Abù Ọma 101:5; Ilu 6:17.

3 Aisaia baara Hezekaia mba wee kwuokwu banyere ndọtan’agha nke ndị babilon gaadọta ha, 2 Ndi Eze 20:14-18.

4 Hezekaia wee nwụọ, 2 Ihe Emere 32:32, 33.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ike nime Adịghịike

Enyere Pọl ogwu n’anụarụ ya ime ka ọ dị umeala. Ugbò atọ ka ọ rịọrọ Onyenwe anyị arịrịọ ka O wepụ ya, ma okwu ndịa ka ọ nụrụ: “Amaram ezuworo gi: n’ihi na emewo ka ikem zu okè n’adigh-ike” (2 Ndi Kọrint 12:9). Ọ bụ eziokwu pụtara ìhè na mgbe ọnwụnwa na ọrịa -- mgbe anyị náadịghịike -- ndabere anyị na Chineke naesiike karịa, anaeme kwa ka ike Chineke pụta ìhè.

Ọkụ nke Onyennụcha ahụ

Hezekaia bụ eze náasọpụrụ Chineke, nwoke ji obi ya niile feè Chineke òfùfè; ma, náagbanyeghị nke a, o zutere ọtụtụ ọnwụnwa iji nwapụta ya na ime ka o nwee obi dị umeala. Senakerib ji ụsụ ndịagha Asiria niile bịa imegide ya; mbibi chere alaeze nke Juda n’iru. Ka o wee guzogide ọnwụnwa a, Hezekaia mere onweya ka ọ dị ike nime Onyenwe anyị. Ime ka ihe sieike karịa, ọ bụ kwa n’oge a anọchigidere ya n’agha ka Hezekaia rịaraọrịa rue ịnwụanwụ. Otú ọ dị, iwetara ya ọbụná óké obi ịdamba, ezitere Aisaia Onyeamụma ịgwà eze a gbara arọ 39 (iriatọ na iteghete) ka o dozie ụlọ ya, n’ihi na ọ gaje ịnwụ.

Lee otú ụbọchị ahụ gaesi dịworị ka ihe gbaraọchịchịrị nye eze ahụ mgbe Aisaia wetara ya ozi banyere ọnwụ ya, wee laa! Ọ gaadịworị ka alammụọ niile ebiliwo imegide ya, eluigwe wee ghọọ ọlabras n’elu isi ya. Hezekaia wee che iru ya ná mgbidi, wee kwáaákwà nke ukwu site n’ịdịilu nke obi ya. Lee otú ọzịzá ahụ si bịa ngwangwa ma dị kwa ike, mgbe Chineke hụrụ na orù Ya nọ n’iheegwù nke ọnwụnwa ọkụ ahụ imeri ya. Ọ dị kwa mgbe Abraham weliri mma ya igbu náánị otù nwanwoke o nwere, mmụọozi nke Onyenwe anyị wee si n’Eluigwe kpọọ òkù wee gbochie ya. Ka ụmụ Chineke niile mara na Onye nnụcha nke Livai maara ọlaedo Ya, na Ọ gaghị ekwe ka ọkụ ahụ nwusie ike karịa otú achọrọ ya iji nụchaa ụmụ Ya!

Iheịrịbaàmà na Ọluebube dị icheiche

Lee otú ọlụ niile nke Onyenwe anyị si dị ebube! na kwa ịdị ukwu nke nnapụta Ya mgbe O setipụrụ aka Ya! Site n’iheịrịbaàmà na ọlụebube dị icheiche O mere ka Hezekaia mara Ya. Mmụọozi nke mbibi gabigara eze Juda wee tigbue ụsụ ndịagha Asiria, wee rapụ Senakerib ka o wee laghachị na Nineve ná mgbarụiru, na n’iruihere, mgbe ada Zaion bụ ụmụ agbọghọ náamaghị nwoke naefufe isi ha náachị kwa ya ọcha ịkwáemọ.

Ọ bụghị náánị ihe ndịa bụ ihe pụrụ iche nke mere n’oge ahụ anaapụghị ichefuechefu, n’ihi na Chineke zighachikwara Aisaia ịgwá Hezekaia na Ya gaagwọ ya ma tụkwasịkwara ya arọ iri na ise ná ndụ ya. N’iji gosi na ozi ya sitere n’ebe Chineke nọ, Aisaia tikuru Onyenwe anyị, Chineke wee mee ka anyanwụ laaazụ n’ụzọ ọwụwaanyanwụ n’ike ya ihe ra ka nkeji irianọ, ihe Ehaz eji agụ oge gaadịworị ka ihe náadịzighị n’ọnọdụ ya mgbe onyinyo laghachiri azụ nzọụkwụ iri. Lee ụdị ibobo nke a gaanwụworị ndị bi n’elu ụwa n’arụ mgbe ha hụrụ ka anyanwụ naalaghachị azụ n’ijè ya na mbara eluigwe! Ka ndị náekweghịekwe kwáá ihe a mere emò ma ọ bụrụ na ha chọrọ; ma Chineke nke Hezekaia bụ Chineke nke kèrè anyanwụ, ụwa na mbara eluigwe; ọ bụ kwa Ya mere ụwa niile ka ha náejeijè ha; mgbe Ọ chọrọ, Ọ pụrụ ịtụgharị ijè a iwetara ndị náekweghịekwe mgbagwojuanya.

Otuto

Lee ụdị ọñụ nke gaadịwori, na otú ụlọukwu nke Chineke gaamaworị jijiji nke ukwu n’ụbọchị nke atọ mgbe Hezekaia nyere Chineke ekele n’ihi nnapụta na n’ihi arọ irinaise nke atụkwasịrị ná ndụ ya! “Ala-mọ adigh-ekele Gi, ọnwu adigh-eto Gi: ndi nārida n’olulu adigh ele anya ezi-okwu-Gi. Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m si eme ta,” bụ okwu nke sitere n’ọnụ eze ahụ nke anụrụ n’ọnụụzọ niile na n’ogige niile nke Ụlọukwu Chineke.

Ọgwụgwọ

Ịrịọ Onyenwe anyị arịrịọ maka ọgwụgwọ dịka Hezekaia mere abụghị ihe mgbagwojuanya n’ebe ụmụ Chineke nọ. Onyenwe anyị ekwewo mkwà, “Mu onwem bu JEHOVA nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26). N’Okwu Ya, enyere ndị náahụjuanya ndụmọdụ ka ha kpeeekpere, agwara onye arụ náadịghịike ka ọ “kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:14, 15). Ike nke ọgwụgwọ Ya ka náapụta ìhè n’ebe ndị ahụ tụkwasịrị Ya obi nọ.

Anaakpọkwasị ọbụbụọnụ n’isi ndị ahụ náeme ka anụarụ bụ mmadụ bụrụ ogweaka ha, ndị jụrụ ịtụkwasị Chineke obi. Chineke were iwe megide Esa onye “nāchọgh JEHOVA, kama ọ chọrọ n’etiti ndi-dibia” (2 Ihe Emere 16:12). Esa achọtaghị ọgwụgwọ, wee nwụọ; ma Hezekaia kpereekpere wee dị ndụ. Ụfọdụ mmadụ gaegosi mbadamba fig ahụ Aisaia gwara Hezekaia ka ọ tụkwasị n’elu iheofifi ahụ dịka iheàtụ nke ịgbaso ụzọ ndị ụwa si agwọ ọrịa. Ọ dịghị mgbe ọ bụla elereanya na fig pụrụ ịgwọ iheofifi ahụ, maọbụ mmiri Jọdan pụrụ ịgwọ ekpenta. Ụrọ ahụ nke Jisọs tere n’anya nwoke ahụ kpuruìsì abụghị ihe eji agwọ ìsì maọbụ mmanụ olive ahụ ndịokenye nke nzukọ Kraist naete mmadụ n’iru. N’irubeisi n’okwu nke iwu ahụ, na okwukwe nke ekwere na Chineke naeme ka arụ dị onye náarịaọrịa ike, ọ dịghị kwa inyeaka ọ bụla dị mkpà iji mezue nzube Ya. Ka ndị niile náefeè Chineke tụkwasị obi ha náánị nime Ya “onye nāgwọ ọrịa-gi nile” (Abù Ọma 103:3).

Mpako

“Ma ọ bugh dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n’ihi na obi-ya di elu” (2 Ihe Emere 32:25). Ebe emere ka o nwetaghachị arụike, wezuga kwa nnọchigide nke ndị Asiria, ewee tụkwasịrị ya àkụ na nsọpụrụ, Hezekaia kwesịrị ijé nwayọnwayọ n’iru Onye kèrè ya bụ Onye lụwooro ya óké ọlụ dị ebube. Otú ọ dị, mgbe ndị ụkọ sitere na Babịlọn ji onyinye bịa, ọ bụrụ ya ọnwụnwa dị ukwu. Site ná mpako ya dị elu o gosịrị ha àkụ niile o nwere. Chineke zigara Aisaia bụ onyeamụma Ya ọzọ ijekwuru Hezekaia, n’oge a n’okwu ibámbá n’ihi nzuzu ya.

“N’iru ntipia ka npako nāga, ọ bụ kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga” (Ilu 16:18). Ihe niile nke Hezekaia na ndị Juda gosịrị site ná mpako ha ka agaanapụ ha. Akụ niile ahụ nke meworo ka ha fụlie onweha elu ka edebeworo ịdaba n’aka ndịkom Babịlọn bụ ndị ha nyaworoisi n’iru ha. Ka Chineke nyere anyị niile aka ịmara na mpako bụ iheárụ n’anya Chineke. “Ijiji nwuru anwu nēme ka manu onye nāsugwa manu-otite nke nēsì ísì utọ sie ísì ọjọ, re kwa ure: otú a ka nzuzu ntà di arọ kari amam-ihe, kari kwa nsọpuru” (Eklisiastis 10:1).

Obi Umeala

Hezekaia naara ịbámba ahụ nke sitere n’ebe Chineke nọ, dịka onye dị ukwu n’ezie, o wedara onweya n’ala; Chineke mekwara ka ndọta n’agha nke ndị Juda ghara ịbịa ngwangwa nke mere na ọ bịaghị n’ụbọchị nke Hezekaia. N’ezie Chineke náasọpụrụ onye dị umeala “nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mụọ-ha” (Abù Ọma 34:18). Chineke nábatara ogbummadụ ahụ, ọbụná Ehab, mgbe o wedara onweya n’ala n’ịbámba nke Elaija; Ọ nụkwara ekpere Manase bụ onye mere ka Jerusalem jupụta ná nwụsị ọbara náemeghị iheọjọọ, n’ihi na o wedara onweya n’ala nke ukwu. Mgbe dum anaeme ka ebere Chineke rute ndị ahụ náeweda onweha n’ala ma kwere kwa na ikpé mara ha n’iru Ya. “Wedanu onwe-unu n’iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu” (Jemes 4:10). Ị tozuola n’ịdịukwu na ị pụghị ịdị ntà?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Mụọọ usoro akụkọ ndụ nke Hezekaia ma kọwaa otú i si mara na ọrịa ya bịara n’ihe dịka mgbe ahụ Senakerib naebuso ndị Juda agha.

  2. 2 Kọọ ihe ụfọdụ Hezekaia meworo n’oge ọchịchị ya tupu ya arịaọrịa.

  3. 3 Arọ òle ka Hezekaia gbara mgbe ọ malitere ịrịaọrịa?

  4. 4 Òlee otú ịnọọdụ Chineke ra tupu Ya zaa ekpere nke Hezekaia banyere ịgwọ ọrịa ya?

  5. 5 Òlee ihe ụfọdụ dị nime Akwụkwọnsọ nke mere anyị ji náatụkwasị Chineke obi banyere ọgwụgwọ anyị?

  6. 6 Òlee otú anyị si mara na nzọụkwụ ebe nrigo iri nke iheịgụ oge Sundial bụ nkeji irianọ?

  7. 7 Gịnị bụ ọlụ mbadamba fig ahụ lụrụ n’ọgwụgwọ Hezekaia?

  8. 8 Chọpụta amụma ndịọzọ eburu banyere ndọtan’agha ahụ ga Babịlọn.

  9. 9 Gịnị gbochiri ọnụma Chineke ịbịakwasị Jerusalem n’oge ọchịchị nke Hezekaia?