Lesson 346 - Senior
Memory Verse
“Ngọzi nādiri unu mgbe ọ bula ha nāta unu uta, nēsogbu kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim. Ñurianu ọñu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n’ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n’elu-igwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndi-amuma ndi buru unu uzọ” (Matiu 5:11, 12).Cross References
I Orù na Onyenwe Ya
1 Jisọs dọrọ ndị náesoụzọ Ya akanántị banyere ọtụtụ mkpagbu nke náabịa, Matiu 10:16-18, 21-23; 24:9-14; Luk 21:12, 16, 17; Maika 7:5, 6; Mak 13:9, 12, 13.
2 Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na Chineke gaenye ha okwu kwesịrị nke ha gaeji gọpụ onweha mgbe anaakpagbu ha, Matiu 10:19, 20; Luk 21:13-15; Ọpupu 4:10-12; Jeremaia 1:6-9; Daniel 3:16-18; Jọn 7:46; Mak 12:34.
3 Jisọs kọwaara ndị náesoụzọ Ya iheọmụmụ ahụ dị ukwu na orù adịghị aka Onyenwe ya, Matiu 10:24, 25; Luk 6:40; Jọn 13:13-16; 15:20.
4 Agwara ndị náesoụzọ Kraist ka ha ghara ịtụ egwù ndị ahụ pụrụ igbu arụ, kama ka ha náatụ egwù Onye ahụ nke pụrụ ịla mkpụrụobi n’íyì n’ọkụalammụọ, Matiu 10:16-38; Luk 21:18, 19; Jemes 4:12; Abù Ọma 119:120; Elisiastis 5:7; Jeremaia 5:22; Emọs 5:6.
II Nsogbu N’Efesọs
1 Dimitriọs, bụ onye náakpụ ọlaọcha, kpaliri nguzogide megide mkwusa nke Oziọma nke Jisọs Kraist, Ọlu Ndi-ozi 19:21-28; 2 Timọti 4:14; 3:11, 12.
2 Ndị náeme aghara n’obodo ahụ jidere ndị ha na Pọl so náejéozi ma debe kwa ha dịka ndị adọtara n’agha, Ọlu Ndi-ozi 19:29.
3 Ndị enyì Pọl gbochiri ya iso ndị ahụ náeme aghara banye n’ụlọ egwurịegwú ka ọ ghara itinye ndụ ya nánsogbu, Ọlu Ndi-ozi 19:30, 31; 21:12; Jọn 11:8
4 Odeakwụkwọ nke obodo ahụ mere ka ndị ahụ náeme aghara dajụọ ma zilaga kwa igwèmmadụ ahụ, wee site na nke a gbochie nsogbu nke gaabịakwasịworị ndị ahụ náesoụzọ Kraist, Ọlu Ndi-ozi 19:32-41.
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỌtụtụ Ihe Izendụ nke Dị N’ịbụ Onye Náesoụzọ Kraist
Ekwuwo ya sị, “Nsogbu nābu mgbe nile nnwapụta nke ihe madụ kwere.” Ọ bụrị n’ezie mnwapụta nke ụdị nzọpụta nke dị n’obi ndị ahụ náesoụzọ Kraist. Ụfọdụ enwewo ezi nzọpụta ma bụrụ ndị daramba n’ihi ọtụtụ mkpagbu, wee laghachịazụ site n’isọ Jisọs.
Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs gbara onye ọ bụla ume n’olileanya ụgha ahụ ịsị na ụzọ nke Chineke bụ ụzọ dị mfé, maọbụ na ọ bụ ụzọ nke náachọghị mmadụ inwe ezi mkpebi na ọlụ dị icheiche siriike nke dịrị ya ịlụ. Ilu ahụ nke Jisọs tụrụ banyere nwoke ahụ nke malitere iwu ụlọelu ma o nweghị ike iwuzu ya n’ihi enweghị ezi njikere, kwesịrị ka ọ bụrụ ihe ịdọakanántị nye ndị ahụ niile náeme ọsọsọ ibụ ndị náesoụzọ Ya.(Gụgharịa Iheọmụmụ 149, Akwụkwọ 12, Volum nke III nke Iheọmụmụ Ụbọchị Ụkọ nke Apostolic Faith, “Ọnuahịa Nke Anyị Náaghaghị ịkwụ.”)
Ndị ụwa naenwe ọtụtụ mgbe ndị náeso ha n’ihi ihe ụfọdụ ma kpalie kwa obi ndị ahụ inwe óké mmasị nke náadị nwaoge n’ihe ahụ n’ihi na ha agwaghị ha iheegwù nke dị n’ụzọ nke ha naabanye. Chineke naekwu eziokwu n’òzùzùòkè ya, Ọ naghị ekpokọta igwèmmadụ nye OnweYa site náagwaghị ha ihe isiike nke gaabịa n’ọdịn’iru. Chineke naekwu eziokwu náagwakọtaghị ya ihe ọ bụla, maọbụ chọọ ya mma n’ụzọ ọ bụla n’ihi ọdịmma nke Oziọma. Chineke matara na ọ bụ náánị ndị ahụ bụ ndị nwere mkpebi siriike ifè Ya náagbanyeghị ihe ọ bụla ọ gaeweta bụ ndị gaatachiobi n’ihe isiike niile rue mgbe ha gaanata okpu nke ndụ, wee gosi kwa onweha dịka ezi ndị náesoụzọ nke Onyenwe anyị.
Jisọs atụfughịoge ịgwa ndị náesoụzọ Ya na ha gaenwe ọtụtụ mkpagbu n’ihi aha Ya. Ebe ọ bụ na Chineke ebuwo ụzọ dọọ anyị akanántị mgbe ọ káerughị banyere ọtụtụ ihe isiike nke gaabịa, o kwesịghị ka o mee anyị namberede, kama anyị pụrụ ikwu dịka Pọl sị, “Edorom ka m’we gọpu ozi-ọma” (Ndi Filipai 1:17). Ma ọ bụghị otú a, Setan, onyeiro nke Chineke na ndị Ya, pụrụ ime ka ụmụ Chineke kwere na Chineke arapụwo ha mgbe nsogbu biliri imegide ha.
Akụkọ mgbe ochie banyere Nzukọ Kraist nwere ezi iheàmà banyere mmezu nke ịdọakanántị nke Jisọs n’ebe ọ dị ukwu banyere mkpagbu ahụ. Akụkọ mgbe ochie naekwu na ọ bụ náánị Jọn Onye ahụrụ n’anya nime Ndịozi irinaabụọ ahụ bụ onye anaegbughị n’ihi okwukwe ya. Site kwa na mgbe ahụ, ọtụtụ ndè mmadụ ewerewo kwa ndụ ha nye n’ihi Oziọma kama ịgọnarị okwukwe ha nwere nime Chineke.
Kraist na Beelzebub
Gịnị mere eji akpagbu ndị nke Kraist? Nke a nwererị ọzịzá pụtara ìhè nime Okwu Chineke. Jisọs sịrị “Ọ buru na uwa akpọ unu asị, unu mara na ọkpọwo Mu onwem asì mgbe ọ kākpọgh unu asì.” (Gụọ Jọn 15:18-28).
Amamikpe nke Chineke n’ebe mmehie dị bụ ihe naebute ọmùmàikpé ná mkpụrụobi nke ụmụmmadụ, nke naalụpụta nime ha ọtụtụ mgbe ibili n’iwe dịọkụ nke sitere ná ekwensu imegide Kraist, imegide Mmụọ nke Chineke, na imegide ndị niile Mmụọ nke Chineke naebi nime ha. Setan bụ onye mbụ nke mehiere megide Chineke; mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, mmehie na iheọjọọ batara n’obi nke mmadụ. Ike niile nke Setan, na ọtụtụ ụkpụrụ nke ọchịchị dị icheiche nke ụwa naemegide Chineke na Kraist, ọ naemegide kwa ndị nke Chineke site na mgbe garaaga. (Gụọ Abù Ọma 2:1-4). Ebe ọ bụ na mmehie ka naadị n’obi ụmụmmadụ; ebe ọ bụ na agwọ ahụ dị ukwu, bụ ekwensu, ka nọ n’ụwa bụrụ kwa onye atọpụrụ n’agbụ ebe ọ bụ na ndị náadịghị asọpụrụ Chineke adịghị alụọlụ dịrị ha ịlụ nye Kraist; otú ahụ ka mkpagbu gaesi náaga n’iru megide Chineke, Ọkpara Ya, ndị Ya, ozi Ya, na alaeze Ya. Ọ bụ eziokwu: “Ọ buru na uwa akpọ unu asi, … ọ kpọwo Mu onwem asi mgbe ọ kākpọgh unu asì.”
Onyeòzízí na Onyenwe anyị
Mgbe mkpagbu dị ukwu megide ndị nke Chineke, ajụjụ dị otú a ka anaajụkarị: Gịnị mere Chineke ji náekwenye ka ụdị ahụhụ na mmekpàarụ dị ukwu otú a bịakwasị ndị nke Ya, ebe ọ bụ na Ọ pụrụ igbochi ya ma ọ bụrụ na Ọ chọrọ? Akwụkwọnsọ enyeghị nkọwa zuruòkè nye ọzịzá nke ajụjụ a n’ụzọ apụrụ ịghọta ya nkeọma, ọtụtụ ihe dị icheiche nke mere ka Chineke náekwenye ka mkpagbu bịakwasị ndị nke Kraist gaabụ ihe anaagaghị enye ọzịzá tutu rue óké ụbọchị ahụ, mgbe Chineke gaeme ka ndị nke Ya mata ihenzuzo ahụ niile.
Jisọs sịrị: “O zuworo onye nēsoụzọ onyeòzízí ka ọ dị ka onyeòzízí ya, na orù ahụ ka ọ di ka onye-nwe-ya.” Site n’okwu dị otú ahụ o kwesịrị ka anyị nwee afọojuju. Chineke anapụghị Jisọs ihe mgbu nke ịhụahụhụ nke óké mkpagbu ahụ bịakwasịrị Ya. Ọ dịrị ezi ihe dị ukwu nke agaemezu site n’ahụhụ nke Jisọs n’aka ndị ajọomume, karịa nke apụrụ imezu ma ọ bụrụ na Chineke gbochiri ụdị mkpagbu ahụ. Ọ bụ eziokwu n’otù aka ahụ n’ebe OnyeKraist ọ bụla nọ kama ọ bụ n’ọtụtụ dị ntà. Chineke pụrụ igbochị ụdị mkpagbu ọ bụla, n’ụzọ ọ bụla o siri bịa, imegide onye ọ bụla maọbụ imegide ndị Ya niile, kama Ọ naekwenye ka ọ bịa ọtụtụ mgbe. O nwere ike ịbụ ihe siriike nye obi mmadụ, ịhụ ụdị iheọma nke gaesi na mkpagbu ahụ pụta mgbe ọ naahụ óké mmerụarụ na nsogbu ka ha náabịakwasị ndị òtù Kraist, na mgbe anaegbochi kwa ikwusa Oziọma, ọbụná ịkwụsị ya. Otú ọ bụla o si dị, Okwu Chineke bụ eziokwu, anyị pụkwara ịtụkwasị obi na ya n’oge a na ebighịebi, na iwere ndụ anyị nye n’ihi eziokwu ya. “Chetanu,” Jisọs sịrị, “okwu Mu onwem gwara unu, orù adigh-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sogburum, ha gēsogbu kwa unu.”
Okwukwe anyị nime Chineke ekwesịghị ka ọ maajijiji, ọbụná ma asị na anaakpagbu anyị rue ọnwụ. “Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebub, hà gesi aña ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Y kari nke-uku?” Ka ọ ghara kwa ịbụrụ anyị ihe ijuanya mgbe anaebo anyị ebubo na anyị naeme iheọjọọ mgbe anyị naeme eziihe.(Gụọ Matiu 12:24-28; Aisaia 5:20).
Okwu nke Ịgbaàmà Anyị
Baịbụl naakọwa ná okwu nke ịgbaàmà anyị nye ndị ahụ nwere ike ịbụ ndị náakpagbu anyị dị nnọọ óké mkpà. Jisọs dụrụ ndị náesoụzọ Ya ọdụ ka ha ghara ichegbu onweha banyere ihe ha gaekwu mgbe anaebo ha ebuboụgha. Chineke gaenye ha ihe ha gaekwu, ọ bụghị kwa ha onweha gaekwu, kama ọ bụ Mmụo Nsọ nke Chineke nke dị nime ha gaekwu okwu amamihe nke Chineke. Ọ sịrị: N’ihi na Mụ onwem gēnye unu ọnu na amamihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgagh-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu” (Luk 21:15).
Jisọs gwara ha, “Ọ gāghọrọ unu àmà” (Luk 21:13). Pọl kwuru ihe banyere Jisọs sị “Onye gbara àmà nkwuputa ọma ahụ n’iru Pọntiọs Pailat” (I Timọti 6:13).
N’ikpeazụ, nime Nkpughe anyị gụrụ: “Ndi ahu we merie ya n’ihi ọbara Nwa-aturu ahụ, na n’ihi okwu àmà-ha; ha ahugh kwa ndu-ha n’anya rue ọnwu” (Nkpughe 12:11). Ebe anyị naenweghị ike ịghọta n’òzùzùòkè ihe mere o ji dị mkpà na anyị gaagbaàmà anyị banyere amara nzọpụta nke Jisọs Kraist nye ndị náemebiiwu, ọ bụ ihe amatara nkeọma na ọ bụ ihe bara óké urù na ihe dị mkpà nke ukwu ka emee ya, na ka anaeme ya dịka Jisọs kwuru, site na Mmụọ Nsọ nke Chineke nke naekwuokwu niile nke Chineke site n’ọnụ anyị.
Anyị matara na Chineke anaghị eme iheọjọọ ka iheọma wee bịa. Chineke anaghị ekwe ka ndị Ya nwee mkpagbu náánị ka ha wee nwee ike gbaaàmà nye ndị náemebiiwu. Ọ dị ọtụtụ ihe nke dị mkpà nime ya karịa náánị nke ahụ, na ịgbaàmà nke OnyeKraist dị óké mkpà n’ụdị oge dị otú ahụ bụ ihe anaapụghị ịgọnarị.
Tụọ Egwù Chineke
Gịnị ka OnyeKraist gaeme mgbe eji ọnwụ náeyi ya egwù n’ihi ikwesịntụkwasịobi ya n’ebe Kraist nọ? “Unu atu-kwa-la egwu ndi nēgbu aru, ma ha apugh igbu nkpuru-obi: kama nātanu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n’iyi n’ọku ala-mọ.” Okwu ndịa gaabụworị okwu nzuzu, ma eleghịanya, ọ bụrụ na ọ bụ onye ọzọ náabụghị Jisọs kwuru ha, ma ha bụ eziokwu na okwu nke nwere ikiké mgbe O kwuru ha. Chineke naahụ ihe niile dịka ọnụahịa ha ruru si dị. Ọ dịghị ewere ndụ mmadụ dịka ihe náadịghị ókéọnụahịa, n’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onye nyere iwu ahụ sị “Gi egbula madu.” Ma otú ọ dị, ụmụmmadụ aghaghị ịdị nánjikere, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, iwere ndụ ha nye n’ihi eziokwu nke Chineke na n’ihi nzọpụta ahụ nke Kraist zụtara kama ikwenyere mmehie na ihe náabụghị eziokwu.
Ọ bụ ezie na ime ka anwụọọnwụ nke anụarụ a site n’aka ndị náemebiiwu gaadị ka agaasị na ọ bụ ihemgbu nke kachasị ukwu nke pụrụ ịdakwasị anyị n’ala ndị dị ndụ, ma Chineke naagwa anyị ka anyị ghara ịtụegwù ọnwụ nke arụ a, maọbụ ihe mmadụ pụrụ ime anyị. Óké egwù ahụ nke dị n’obi mmadụ kwesịrị ịbụ náánị n’ebe Chineke nọ Onye pụrụ na Onye gaatụba arụ na mkpụrụobi nke ndị mmehie nime ọkụalammụọ. Ihe ọjọọ kachasị nke mmadụ pụrụ ime bụ ịtụnye ihemgbe na ahụhụ n’anụarụ mmadụ na nwa oge. Ma Chineke pụrụ ịtụba mmadụ n’ebe ọ gaahụ ahụhụ ebighịebi, bụ ebe ihemgbe ya na ahụhụ ya náenweghị nsọtụ, nke náenweghị kwa ọgwụgwụ. Ma onye nke Kraist, ebe ọ naamata na ahụhụ ọ bụla nke ọ gaahụ n’ihi Kraist gaabụ náánị ná nwa oge, gaabụ onye nọgidesịrịike ịgọpụ Oziọma, ọbụná rue ọnwụ. “Ihe di oké ọnu-ahia n’anya JEHOVA ka ọnwu nke diri ndi ebere-Ya bu”; ọ bụrụ kwa na anaenwe ihemgbu n’ebe a n’ihi aha Jisọs, Chineke gaagwọ ihemgbu anyị na ọnyá anyị, ebighịebị gaeweta kwa ngọzi ya niile nye ndị ahụ nke gaanọgide n’ikwesịntụkwasịobi rue n’ikpeazụ.
Nwanne Megide Nwanne
N’ụbọchị taa Okwu Chineke naemezu nnọọ dịka Jisọs kwuru: “Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n’ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua ọnwụ.” N’obodo China na Korea bụ ndi kwere na Kọmunizim (Communist), na mba niile ọzọ nke dị n’okpuru ọchịchị ndị Russia, ọ bụ ihe náeme kwa ụbọchị na ụfọdụ nime ndị sitere n’otù èzínaụlọ naekewa megide ndịọzọ n’ihi okwukwe ha dịka NdịKraist maọbụ n’ihi òzízí na ihe dị icheiche nke ha kweere nke náemegide Kọmunizim (Communism).
N’ime China na Korea, egbuwo ọtụtụ èzínaụlọ n’ihi na achọpụtara na ha bụ ndị enyi nke ndị náesoụzọ Kraist, maọbụ n’ihi na ha nwere Baịbụl maọbụ akwụkwọabụ. Ụbọchị nke ndị Kraist naebuagha megide mmehie, ụwa, anụarụ, na ekwensu agabigabeghị. Ịdọakanántị na ndụmọdụ dị icheiche nke Jisọs dịkwaara anyị n’ụbọchị taa dịka ha dị n’oge ahụ mgbe O kwuru ya na mbụ nye ndị náesoụzọ Ya. “O zuworo onye nēso uzọ onye-ozízí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Gịnị mere ọtụtụ mkpagbu ji ebili megide NdịKraist?
2 Gịnị mere ha jiri kpagbue Jisọs?
3 Gịnị mere Chineke jiri kwenye ka ndị náemebiiwu kpagbue Jisọs?
4 Chineke Ọ pụrụ igbochi ụmụmmadụ ịkpagbu ndị nke Ya?
5 Gịnị mere Chineke naekwenye mgbe ụfọdụ ka akpagbue ndị nke Ya?
6 Gịnị ka NdịKraist kwesịrị ikwu mgbe anaemejọ ha?
7 Gịnị ka OnyeKraist gaeme mgbe anaabamba iwepụ ndụ ya?
8 Ònye ka anyị gaatụ egwù Ya karịa?
9 Gịnị bụ ihe mmerụarụ kachasị nke mmadụ pụrụ ime anyị?
10 Gịnị ka Chineke pụrụ ime mmadụ nke mmadụ náapụghị ime?
11 Gịnị ka ị chere Jisọs bu n’obi mgbe O kwuru: “O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya?”