Ọlu Ndi-ozi 20:1-38

Lesson 347 - Senior

Memory Verse
“Akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n’ebe mu onwem nọ, ka n’we gbazue ọsọm, jezu kwa ozi nke m’natara n’aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke” (Ọlu Ndi-ozi 20:24).
Cross References

I Njèm nke Pọl n’Efesọs rue Kọrint na Ịlaghachị na Troas

1 Pọl naagabiga site na Troas ịga Masedọnia mgbe ụzụ ahụ kwụsịrị n’Efesọs, Ọlu Ndi-ozi 20:1; 2 Ndi Kọrint 2:12, 13.

2 Ọ bịara na Kọrint nke dị nime Gris, Ọlu Ndi-ozi 20:2.

3 Ọ laghachirị na Troas, Ọlu Ndi-ozi 20:3-6.

II Njèm nke Pọl site na Troas rue Militọs

1 Yutikọs siri na window nke ụlọelu nke atọ nke dị n’ụlọ ahụ daa n’ala mgbe Pọl naekwuokwu Chineke, Ọlu Ndi-ozi 20:7-9.

2 Emere ka ọ dị ndụ ọzọ, Ọlu Ndi-ozi 20:10-12.

3 Pọl gara Militọs, Ọlu Ndi-ozi 13:13-17.

III Ndụmọdụ nke Pọl nye ndịokenye nke Efesọs

1 O chetaara ndịokenye ahụ ihe banyere okwu Chineke ọ gwara ha na òzízí o ziri ha n’obi dị umeala, Ọlu Ndi-ozi 20:18-21; Taitọs 2:7, 8.

2 Ọ dịghị ihe ịkwaụta nke dị n’ọpụpụ ya, Ọlu Ndi-ozi 20:22-27; 2 Timọti 4:7.

3 Adụrụ ndịokenye ahụ ọdụ ka ha náazụ ìgwèatụrụ ahụ, ma dọọ kwa ha akanántị banyere ndị ajọomume, Ọlu Ndi-ozi 20:28-32; 2 Timọti 3:1-5; 2 Pita 2:1-3.

4 Enweghị anyaukwu nke dị ná ndụ Pọl bụ ihe atụ nye mmadụ dum, Ọlu Ndi-ozi 20:33-35; 1 Saumel 12:3.

5 O kwubiri okwu ndụmọdụ ya site n’ikpeekpere, Ọlu Ndi-ozi 20:36-38

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mmụọ nke Mkwusanjégharị nke Pọl

“N’ike nke iheiriba-ama na ọlụ-ebube di iche iche, n’ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezizuwom ozi ọma Kraist” (Ndi Rom 15:19). Otú a ka Pọl degara akwụkwọ na Rom mgbe ọ nọ na njèm nke atọ nke mkwusanjégharị a. Ilirikọm, nke dị ihe karịrị otù puku maịlị site n’okporoụzọ nke sitere na Jerusalem, dị nnọọ n’ofè mmiri n’Itali. Ebe ọ bụ na o jezuwo ala niile dị gburugburu Jerusalem na Itali, Pọl chọrọ ịgabiga ugbua a site na Rom rue spain na ala niile dị ha gburugburu. “Ma ugbu a, ebe m’nēnwegh ebe ọ bula n’akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga; mgbe ọ bula n’gāga Spain m’gbiakute unu” (Ndi Rom 15:23, 24).

N’okwu olenaole ndịa, anyị hụrụ ọtụtụ ebe nke Chineke a jezuworo, ma otú ọ dị ọ ka naagụ obi ya agụụ iwere oziọma ahụ rue n’akụkụ ọzọ dị icheiche nke ọ naejebeghị na mbụ. N’ezie o nwere nọọ mmụọ nke nkwusanjegharị nke naadịghị achọ ịkwụsịakwụsị. Ọ dịghị ihe ndọgbun’ọlụ niile ahụ nke ọ naadọgbu onweya n’ụzọ niile bụ, ma ọ bụrụ na ọ gaenweike ikwusa Kraist na ịkụ mkpụrụ nke Oziọma ahụ n’ala náamị mkpụrụ, nke ọ náadịbeghị onye jere na ya nke mbụ.

Njèm ahụ site n’Efesọs

N’ịrapụ Efesọs mgbe óké ụzụ ahụ nke Dimitriọs kpatara kwụsịrị, Pọl buliri njèm ya site na Masedọnia rue Kọrint nime Gris; mgbe ahụ ọ kwụsịrị njèm ahụ wee malite ịlaghachị na Jerusalem ebe ọ chọrọ isi soro ụgbọmmiri gaa Rom. Otù nime ebe mbụ ọ kwụsịrị site n’Efesọs bụ Troas. Ọ kọwara sị, “Mgbe m’biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mgbe emeghererị ọnu-uzo nime Onye-nwe-ayi nyem, mọm adigh nfé ma-ọli, n’ihi na ahughim Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpeazu, we pua je Mesodọnia” (2 Ndi Kọrint 2:12, 13). Anaekwenye na ebe ọzọ ọ nọrọ bụ na Filipai, ebe ọ nọ kwa degara Ndị Kọrint akwụkwọozi nke abụọ nke okwuru nime ya sị: “Mgbe ayi bia-kwa-ra na Mesedonia, anu-aru-ayi adigh nfé ma-ọli, kama anākpagbu ayi n’akuku nile, ilu-ọgù di n’èzi, egwu di nime. Otú ọ di, Onye ahu nke nākasi ndi di ala obi, bú Chineke were ọbibia Taitọs kasi ayi obi” (2 Ndi Kọrint 7:5, 6).

Iheisiike dị Icheiche

Luk, onye dere Akwụkwọ nke Ọlu Ndi-ozi, edeghị ihe dị ukwu banyere ọtụtụ ihe nke mere, ma ná mmalite nke ijéozi Pọl, Chineke ekwuwo, “Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghagh ihu n’ihi aham” (Ọlu Ndi-ozi 9:16). N’ezie ndụ nke Pọl Onyeozi ahụghị ihe ahụhụ náadịghị na ya dịka ọ naejégharị site n’otù ebe rue ebe ọzọ n’ụkwụala maọbụ n’ụgbọmmiri. Akwụkwọozi nke o degara ndịKọrint naegosi n’ụzọ dị ntà ọtụtụ ahụhụ nke ọ hụrụ. “N’ihi na, umu-nnam, ayi achọgh ka unu ghara imara ihe banyere nkpagbu anyi nke akpagburu anyị n’Esia, na eboghuru anyị nkeukwu rinne karị ike anyị, ya mere anyị nwebigara obi abụa ókè ma anyi gādi kwa ndu: e, ayi we ghara itukwasi oi n’onwe anyi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndị nwuru anwu si n’ọnwu bilie: Onye dọputara ayi n’oké ọnwu di otú a, Ọ gādoputa kwa ayi” (2 Ndi Kọrint 1:8-10). Ọ bụ ezie na ọnwụ chere Pọl iru, ma ọ pụrụ ịsị “Nkpagbu ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nee kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ di kwa ebigh-ebi” (2 Ndi Kọrint 4:17). “Anākpagbu ayi n’akuku nile, ma adigh-akpagbubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma adigh-arapu nání anyi; anātuda ayi n’ala, ma adigh-ala ayi n’iyi; ayi nēbughari n’aru-ayi mgbe nile ogbugbu nke Jisọs, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisọs puta ìhè n’aru-ayi” (2 Ndi Kọrint 4:8-10). Ọ gaenyere anyị aka ichefu ọnwụnwa anyị niile na ntamù anyị niile ma ọ bụrụ na anyị gaatụgharịuche wee hụ na nsogbu anyị dị ntà nke ukwu n’iji ha tụnyere ahụhụ niile nke onye a buruụzọ malite ọlụ nke Oziọma ahụ.

Chee échìchè banyere ọtụtụ ihe nke ọ gabigaworo, mgbe o ji ndọgbun’ọlụ ya tụnyere nke ndịozi ụgha ahụ: “Anamadọgbugiga onwem ókè n’ọlu kari, anamanọbiga ókè n’ulọ-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n’ọnu ọnwu ọtutu mgbe. Ugbò ise ka ndi Ju piaram otù adigh n’ọgu ube-utari abua. Ugbò atọ ka apiaram utari, otù ugbò ka aturum nkume, ugbò atọ ka ugbọ m’nọ nime ya kpuru, otù ubọchi abali na ehihie ka m’nọworo nime ogbu-miri; n’ije ọtutu mgbe, n’ize-ndu site n’osimiri, n’ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n’ize-ndu site na ndi mba nkem, n’ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n’ize-ndu nime obodo, n’ize-ndu nime ọhia, n’ize-ndu nime oké osimiri, n’ize-ndu n’etiti umu-nna ugha; n’idọgbu onwem n’ọlu na ihuju-anya, n’imu-anya ọtutu mgbe, n’oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n’obubu-ọnu ọtutu mgbe, n’oyi na igba-ọtọ” (2 Ndi Kọrint 11:23-27). N’ezie, ọ dịghị ihe ọzọ pụrụ ịrụgide mmadụ ka ọ gaa n’iru n’ijéozi dị otú a nke jupụtara n’ihe izendu ma ọ bụghị mkpalị nke sitere na Chineke.

Kọrint

Mgbe ọ rịọsịrị “ọtutu aririọ” na Mesedọnia niile, Pọl bịaruru na Gris, ebe ọ nọrọ ọnwa atọ ya na ndị Kọrint ndị o degawoororị akwụkwọ. Náagbanyeghị ahụhu niile ọ hụworo n’ihi Kraist, Pọl, onye ọnụọgụgụ arọ ya naabịaru iri arọ isii, agafebeghị ikwusa oziọma n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ n’ebe a ka ọ nọ degara Ndi Rom akwụkwọozi ya, naekwusiike sị: “Ka ihe banyere mu onwem ra, ọ dim ọku n’obi izi kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma” (Ndi Rom 1:15).

Ụbọchị Mbụ nke Izuụbọchị Asaa

Kama ịgbá ụgbọmmiri site na Kọrint dịka o zubewororị, Pọl zigara ndịenyi ya ijéru Troas site n’ụgbọmmiri, ebe ya onweya ji ijèụkwụ gaa ihe karịrị maịlị 400 (kilomita 640) rue Filipai, wee baa n’ụgbọ site n’ebe ahụ jee Troas. N’ebe a, na Sọnde, bụ ụbọchị mbụ nke izùụbọchị asaa, ndị náesoụzọ Ya zukọrọ. Nke a bụ ụbọchị nke ndị náesoụzọ Ya rọpụtara maka ifèòfùfè mgbe mbiliten’ọnwụ nke Onyenwe anyị gasịrị, n’ihi na Pọl dụtụrụ ndị Kọrint ọdụ ka ha náeweta ihe onyinye ha n’ụlọ nzukọ n’ụbọchị ahụ. Jisọs n’otùakaahụ, mgbe O siri n’ọnwụ bilie n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde, O zutere Ndịozi ahụ n’ụbọchị ahụ na n’ụbọchị Sọnde nke náesonu, Onyenwe anyị Onweya wee kàá izuike (Sabaat) nke ndị Juu. Ndị náesoụzọ Ya ndị nọ na Troas mekwara ememe nke Nrianyasị nke Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị nyere n’iwu.

Ndị Agụụnaagụ

Egosịrị ike ukwu nke Chineke nime Troas site n’ime ka onye nwụrụanwụ dị ndụ ọzọ. Ndị nọ n’ebe ahụ gaenweworị obi nke agụụnaagụ, n’ihi na Pọl kwuruokwu Chineke rue etiti abalị, ọ kwụsịrị náánị nwa oge ime ka nwaokorọbịa ahụ dị ndụ ọzọ, o wee gaakwa n’iru n’ikwuokwu ya rue chi ọbụbọ. Náenweghị oge nke iji zueike, Pọl malitere ije ya site n’iji ụkwụ jee iri maịl abụọ (Kilomita 32) rue Asọs. Eleghịanya, Pọl enwewo ịgbaume ọhụụ dịka Jisọs nwere n’olùlùmmiri Jekọb mgbe O zutere nwanyị Sameria ahụ onye agụụ nke eziokwu naagụ obi ya.

Okwu Ndụmọdụ Ikpeazụ nke Pọl nye Ndịokenye nọ n’Efesọs

Pọl enweghị ohere ịkwụsị n’Efesọs, n’ihi na ọ chọrọ ịnọ na Jerusalem n’ememe nke Pentikọst; ma o zigara ewee kpọọ ndịokenye nke nzukọ, o wee nye ha ndụmọdụ ikpeazụ, náagwa ha na ha agaghị ahụ iru ya ọzọ. N’ịmáàtụ ya Pọl dụrụ ha ọdụ ka ha nwee obiumeala ma bụrụ kwa ndị kwesịrịntụkwasịobi. O chetaara ha na ọ bụ Mmụọ Nsọ mere ha ndị nlekọta, na ha ganáazụ ìgwè atụrụ nke Chineke site náadịghị arapụ ikwupụta ndụmọdụ niile nke dị n’okwu Chineke. Òzízí nke Kraist dị Onyeozi ukwu nke Ndịmbaọzọ ahụ óké mkpà, n’ihi na ọ matara na oge naabịa mgbe ndị mmadụ náagaghị anagide kwa ezi òzízí.

Pọl achọghị ka ndị Efesọs a rapụ òzízí nke nchègharị. Eleghịanya ọ matara ụdị ihe ahụ nke gaje ịbịa mgbe aga náagwa ndị mmadụ ka ha nábata Kraist kama inwe mwuta dịka Chineke chọrọ n’ihi mmehie ha na inwe ezi nchègharị ịnata mgbanwe nke obi. Ọ chọghị ka ha nwee okpukpé nke náegwumighị egwumi nke náenweghị kwa Ọbara nke Mkpuchimmehie dịka ụfọdụ naeme n’ụbọchị taa; n’ihi na o chetaara ha na Nzukọ nke Chineke bụ ihe ejiri Ọbara nke Jisọs zụta. O kwukwara na Okwu Chineke pụrụ iwuli ha elu na inye ha ihe nketa ahụ n’etiti ndị edoworo nsọ.

Pọl gaamataworị ihe banyere ndị ahụ gaadị ka anụọhịa wolf nke agụụ naagụ, ndị gaewere okpukpé dịka ihe ịtụ mgbereahịa, ya mere o ji dọọ ndịokenye akanántị megide inwe anyaukwu. Ka aka nke Pọl nke náalụpụta ihe o ji egbò mkpà ya niile bụrụ ihe ịdọakanántị nye ndị náarịọarịrịọ maka ọlaọcha na ọlaedo na ndị náekwusa Oziọma n’ihi úrù náeweta ihere.

Ịdọakanántị dị icheiche na anyammiri nke Pọl n’ihe ra ka arọ atọ ehihie na abalị egosiwo ịhụn’anya na nchègbu dị ukwu nke o nwere n’ebe ndị Efesọs nọ. Iji obi ya niile náekwusa Okwu ahụ ka emere ka ọ pụta ìhè site n’okwu ahụ o kwuru: “Egwù emeghm ka m’ghara ikọrọ unu otù ihe n’ihe niile bara unu urù.”

Mmụọ Nsọ mere ka amara na ihe náechére Pọl bụ agbụ na mkpagbu dị icheiche, ma obi ya nke siriike pụrụ ịzaghachị “Akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n’ebe mu onwem nọ, ka m’we gbazue ọsọm, jezu kwa ozi nke m’natara n’aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahụ ike, bú nke amara nke Chineke.” Ì nwere ụdị mkpebi ahụ nke ịnọgidesiike rue n’ọgwụgwụ?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Chọpụta ihe i nwereike ịchọpụta banyere ndịkom ahụ akpọrọ aha ha n’Ọlu Ndi-ozi 20:4

  2. 2 Chọpụta nzọụkwụ niile nke Pọl nime iheọmụmụ nke taa.

  3. 3 Kwue ọtụtụ iheịmáátụ nke ọchịchọ na ịdịike nke Pọl.

  4. 4 Ụzọ ebe òle ka ahụrụ nime Akwụkwọnsọ ebe emere ka onye nwụrụanwụ si n’ọnwụ bilie?

  5. 5 Kọwaa ihe ụfọdụ mere anyị ji náefè òfùfè nrò n’ụbọchị Sọnde kama n’ụbọchị izuike (Sabaat).

  6. 6 Site n’aka ònye ka emere ndịokenye nke Efesọs ndịnlekọta?

  7. 7 Ogologo oge ra añaa ka Pọl nọrọ n’Efesọs?

  8. 8 Òlee otú Pọl jiri gosipụta enweghị anyaukwu ya?

  9. 9 Chọọ ụzọ òzízí ole nke ị pụrụ ịhụ nke akpọrọ aha n’ebe ọgụgụ a.

  10. 10 Kpọọ aha ụfọdụ ahụhụ nke Pọl hụrụ n’ihi Oziọma.