Aisaia 1:1-31

Lesson 348 - Senior

Memory Verse
“Jisus siri ya, ọ digh onye ọ bula nke nēle anya n’azu, mgbe o tinyesiri aka-ya n’ọgù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke” (Luk 9:62).
Cross References

I Ọhụ nke Aisaia

1 Aisaia hụrụ ọhụ banyere Juda na Jerusalem n’ụbọchị nke Uzaia, Jotam, Ehaz na Hezekaia, bụ ndịeze Juda. Aisaia 1:1.

2 Chineke baara ndị Israel mba nke ukwu: ọ bụ ezie na anụọhịa dara ogbi matara ndị nwe ha, ma ndị Israel amaghị Onyenwe ha na Onye kèrè ha, Aisaia 1:2-4; Jeremaia 8:7.

3 Ajụrụ ndị Israel ihe mere ha ji achọ ka etie ha iheotiti ọzọ ebe ọ bụ na etiwo ha iheotiti site n’isi rue n’ọbụụkwụ, Aisaia 1:5-9; Jeremaia 2:30; 5:3.

4 Chineke jụrụ ịnara ọtụtụ àjà na ememe dị icheiche nke okpukpé nke ndị Israel, bụ nke náemegide ezi òfụfè nke Chineke, Aisaia 1:10-15; Malakai 1:6-14; Matiu 15:7-9.

5 Chineke nyere ndị Israel iwu ka ha rapụ ime iheọjọ, ma mụta ime eziihe, Aisaia 1:16, 17; Hosea 6:6; Matiu 9:13; Jeremaia 4:14; Jemes 4:8-10.

6 Chineke chọrọ ka Ya na ndị Israel rụrịta ụka banyere mmehie ha, Aisaia 1:18-20; I Samuel 12:7; Maika 6:2, 3.

7 Chineke nwere mwute banyere Jerusalem n’ihi ikpere arụsị ha na mgbakụtaazụ nke ihere nke ha gbakụtara Ya, Aisaia 1:21-23; Jeremaia 2:19-27; Ezikiel 22:24-29.

8 Ekwere mkwà iwere ọkụ nnụcha nke Chineke nụchaa ndị Israel rue mgbe agaeji ikpé gbapụta Zaion, jiri kwa eziomume gbapụta ndị ya náalata, Aisaia 1:24-31; Malakai 3:3-6; Zekaraia 13:9; Ndi Rom 11:24-27; 9:26, 27.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndịozi niile nke Chineke

Aisaia malitere ijéozi ya nke ibu amụma mgbe ọ dị ka agaasị na ezi okpukpé niile nke dị n’Israel nọ n’ọnọdụ dị óké egwù nke ịbụ ihe aga arapụarapụ. Ozi niile nke Aisaia bụ ihe dịrị nnọọ Juda na Jerusalem. Ebo iri ndịọzọ nke Israel adaghachiworị azụ site n’ikpere Chineke nke mere na ikpé nke Chineke naabịakwasị ha. Ikpé ahụ bịara n’ụdị ndị Asiria, ndị náemekpa mmadụ arụ na ndị náachịọchịchị akaike bụ ndị bịara bibie ọtụtụ ihe naala ha wee dọrọ ha n’agha. Ndị Juda na Benjamin gara n’iru ifè Chineke òfùfè omen’ala, ma nime mmụọ na n’eziokwu ha n’aba ngwangwa n’uche ajụrụajụ dịka ụmụ nne ha.

Náagbanyeghị ndaghachịazụ nke ndị Israel, Chineke tọpụtara ọtụtụ ndịkom bụ ndị kwusara eziokwu niile ahụ dị ukwu nke Chineke nye ha náatụghị egwù ọ bụla. Aisaia bụ otù nime ndịkom ndịa, ọ bụ kwa onye anaakpọ “onye nkwusa nke ise n’ihi ọtụtụ amụma ya na òzízí ya nke náenweghị atụ banyere Jisọs Kraist. Aisaia kwusara eziokwu nke Chineke náeleghị mmadụ anya n’iru n’oge ọchịchị nke ndịeze anọ dị icheiche. Okwu Chineke ahụ nke ọ naekwu megide mmehie na mmebiiwu náatụghị egwù wetara ya ọnwụ n’okpuru ọchịchị nke eze ọjọọ ahụ bụ Manase n’ikpeazụ. Dịka akụkọ mgbe ochie sị dị Aisaia bụ onye anaatụaka n’akwụkwọ Ndi Hibru isi nke iri na otù n’ebe ekwuru banyere otù onye nke akọwaraakwọwa.

Ozi nke Chineke

Ozi nke Aisaia nye ndị Israel, dịka anyi gụrụ ya n’isi nke mbụ nke akwụkwọ Aisaia, bụ ihe ọ natara site n’ọhụ bụ nke kpugheere ya ọnọdụ pụtara ìhè nke mkpụrụobi ndị ahụ n’iru Chineke. Ọhụ ahụ jikọtara ogologo oge nke ọchịchị nke ndịeze anọ dị icheiche. Ọ bụ ozi nke Aisaia gaezisa n’oge ọchịchị nke ndịeze ahụ, náekwusara ndị ahụ ọnọdụ nke mmehie ha n’iru Chineke.

Ọnwụ nke onye náemebiiwu adịghị atọ Chineke ụtọ; ma otú ọ dị ụmụmmadụ rọọrọ ịnọgide n’ibindụ nke mmehie, náagbanyeghị ịdọakanántị niile nke Chineke naadọ ha. Ndị Israel arapụghị òfùfè nke Chineke ma laghachị kwa azụ ọzọ n’ifè arụsị dị icheiche nke ndị náamaghị Chineke náebughị ụzọ mata nkeọma na Okwu Chineke enweghị mgbanwe, na apụghị kwa ijéhie nime ya náenweghị ahụhụ. Apụrụ ikwu na ndịamụma ahụ nke Chineke zitere ndị Israel abụrụworị akọnauche nke ndị Israel, ha kwakwara ákwá banyere mmehie nke Israel n’iru ndị ahụ. Ndị amụma nke Chineke; ịjụ ha bụ kwa ịjụ Chineke.

Pọl gwara ndịnsọ nọ na Tesalọnaika banyere ozi ahụ nke o wetara, “Ya mere onye nāju, ọ bugh madu ka o nāju, kama ọ bu Chineke” (I Ndi Tesalọnaika 4:8). N’otù aka ahụ kwa Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya: “Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem” (Luk 10:16). Ọ bụ ezie na ndị amụma ahụ bịara site n’ikike na Mmụọ nke Chineke, ma ọ bụghị mgbe niile ka eji obiọma nabata ha; ọtụtụ mgbe ndị Israel apụghị ịnagide ndị amụma ahụ ịnọ n’etiti ha. Otú ọ dị ha bịara, dịka ndị Chineke zitere, wee dọọ ndị Israel akanántị banyere ahụhụ niile nke gaeso ngwangwa n’ihi mmehie ha.

Eziokwu nke Chineke

Nkọwa ahụ nke Aisaia natara banyere mmehie nke ndị Israel bụ otù nime nkọwa zuruezù nke pụtakwara ìhè na Baịbụl banyere mmehie. Chineke adịghị ebelata iheegwù nke ndị nime mmehie; Ọ dịghị kwa atụfu oge ịgwa ụmụmmadụ ihe bụ ezi ọnọdụ nke mkpụrụobi ha n’iru Ya. Ụmụmmadụ apụghị, ha agaghị echègharị kwa ná mmehie ha rue mgbe ha gaaghọta iheegwù nke jọgburu onweya na iheihere nke mmehie naeweta. Mgbe ụmụmmadụ ghọtara ihe banyere amamikpé nke mmehie ha, n’oge ahụ, ọ bụ kwa náánị na mgbe ahụ ka enwere olileanya na ha gaéchịgharịkwute Chineke ná nchègharị banyere mmehie ahụ.

Jisọs sịrị, “Unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahụ gēme kwa ka unu pua n’orù” (Jọn 8:32). Otù nime eziokwu nke Chineke bụ amamikpe nke mmehie nke onye ọ bụla náaghaghị inwe. Nke a bụ nzube nke Chineke n’ikpughere ndị Israel mmehie ha niile. Ebe ọ bụ na Aisaia amataworị otú ọnọdụ nke obi ndị ahụ dị, ọ gwara ha okwu banyere mmehie ha náesepụghịaka, ka ha wee mata na Chineke amatawo mmehie ha, ka ha wee chègharịa.

Ọ bụ obiọma na ebere nke Chineke naekpughere ụmụmmadụ mmehie nke obi ha, ka ha wee mara na ọ dị mkpà ka ha nwee nzọpụta. Ụmụmmadụ anaghị achọ ịnu ihe banyere iwe nke Chineke megide mmehie, banyere ọku alammụọ nke ekwensu, Ụbọchị Ikpé nke agaekpe onye ọ bụla nke náechègharịghị ikpe n’ihi ajọomume nke ha mere, maọbụ ịnụ na ụgwọọlụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma ọ bụghị ma ha matara wee kwere kwa n’eziokwu ahụ, ha agaghị enwe nzọpụta site ná mmehie.

Ịhụn’anya nke Chineke nwere n’ebe mkpụrụobi nke mmadụ nọ enyeghị mmadụ ike ka ọ nọgide ná mmehie. Kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi na Chineke hụrụ mmadụ n’anya ka O jiri weta nzọpụta site n’Ọbara nke obe nke Kraist ka ha wee gbanarị ahụhu mmehie nke ha mewororị.

Anyị hụrụ otù ihe ahụ ka emezukwara ya n’otùakaahụ n’ọhụ na mkwusa nke Aisaia. Agwara ndị Israel ná nkọwa pụtara ìhè nke zukwara ókè ihe banyere ọtụtụ na ịdịnjọ nke mmehie ha niile, Onyenwe anyị jụkwara ha ihe mere ha jiri chọọ ịnọgide nime ha.

Arọọrọ Ọnwụ

Chineke naajụ ụmụmmadụ ajụjụ mgbe niile ihe mere ha jiri náanagide ihemgbu niile nke mmehie ebe ọ bụ na o kwesịghị ka ọ dị otú ahụ. Aisaia etikuworị ndị ahụ mkpu, “N’ihi gini ka aganēti unu ihe rue ugbu a?” Chineke jiri ndị Israel tụnyere onye etiworo iheotiti nke ukwu, onye site n’opun’isi ya rue n’ọbụụkwụ ya bụ náánị ogbugbumma, itirụarụ, na ọnyá etipụtara ọhụ. Ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ bụ mmehie ha mere ka ha nọọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ dịghị kwa ihe ọzọ ọ bụ karịa ịwịara n’ime ka ọnọdụ ha dị njọ karịa site n’ịga n’iru n’ime mmehie megide Chineke.

Mmehie naarafuarafu na nwa oge, ma nrafu nke mmehie maọbụ iheụtọ ya niile apụghị ime ka aghara inwe mmetụta nke ihemgbu nke akọnauche ahụ emejọworo. Apụghị kwa imechibido olu nke Chineke ụzọ bụ nke náeti mkpu megide mmehie nime obi mmadụ. Mmehie naegbumgbu, ma ụzọ nke onye nghọgbu bụ náánị nkume. Okwu nke Onyenwe anyị bụ: “Ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n’ihi na ọ pugh idi jù, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti. Ọ digh udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chineke siri” (Aisaia 57:20, 21). Ọ bụ iheijuanya na mmadụ naanọgide ná mmehie náagbanyeghị ihemgbu nke ọ naeweta, nke mere na ọ naeju ọbụná Chineke anya bụ otú ha si anọgide n’ahụhụ nke isiike wetaara ha, wee náajụ, “N’ihi gini ka aganēti unu ihe rue ugbu a?

Ebere, Ọ bụghị Àjà

N’otù oge Jisọs sịrị: “Ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, o bugh àjà” (Matiu 9:13; Hosea 6:6). Otù okwu ahụ ka Aisaia gwara ndị Israel. Ememe dị icheiche nke okpukpé ha abaraghị Chineke úrù ọ bụ ezie na ọ bụ Ya Onweya malitere ha niile, n’ihi na eziokwu ahụ nke ezubere ka ha gosi ka échèfuru ma jụ kwa; nke bụ na Chineke agaghị anagide mmehie, na ifè Ya òfùfè gaabụ kwa ifè Ya nime mmụọ na eziokwu. Ikpé ziriezi na eziomume abụghị ihe amụtara n’iheọmụmụ nke náakụzi ihe banyere Chineke na okwukwe nke okpukpé dị icheiche [Theology] kama ha bụ mkpụrụ nke naapụta site n’obi ndị ahu hụrụ Onyenwe anyị n’anya. N’ebe ọ bụla nime Okwu nke Chineke -- nime Testament Ochie na nke Ọhụụ, n’òzízí niile nke ndị amụma, na n’òzízí niile nke Jisọs -- ọ bụ ihe ekwusiri ike ọtụtụ mgbe na apụghị inwe ezi òfùfè nke Chineke ma ọ bụrụ na ekwenyeghị na ịdịnsọ na ịdịọcha bụ akụkụ dịkarịrị mkpà n’Oziọma.

“Mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-ngbei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.” Nke a bụ ozi nke Aisaia wetara ndị Israel, ọ bụ kwa otù ozi ahụ nke ewetawororị site ná mmalite, ọ ka bụ kwa otù ozi ahụ taa: “Rapunu ime ihe ọjọ.” Mmehie nke ndị Israel abụghị na ha lefuuru ihe banyere òfùfè nrò anya, kama ọtụtụ usoro dị icheiche nke ha si efè òfùfè bụ ihe efu na nke iruabụọ n’iru Chineke. Ala ahụ jupụtara ná mmebiiwu na ajọomume nke ukwu nke mere na eji ndị ahụ tụnyere obodo Sọdọm na Gọmọra, ndị ọkụ nke Chineke dakwasịrị.

Ịrụrịtaụka

Ekwuru otù okwu nke kwesịrị ka ịrịbaàmà n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ anyị: “Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe JEHOVA nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.” N’ezie, ọ bụ mkpughe nke omume nke Chineke na O jikeere ka Ya na mmadụ rụrịtaụkà banyere nzúzù nke mmehie ya niile. Ọ bụrụ na mmadụ gaege Chineke ntị mgbe ya na Chineke naarụrịtaụka, ọ gaaghọta nzúzù ya ngwangwa. Mmehie ya niile ka Chineke pụrụ ịgbaghara, ọbụná ma asị na ha dị ka uwe uhie, Chineke gaeme ka ha dị ọcha dịka snow. “Ọ buru na unu ekwe, we nu ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri.”

Gịnị gaeso ma ajụ? “Ọ buru na unu aju, we nupu isi, nma-agha gērichapu unu: n’ihi na ọnu JEHOVA ekwuwo.” Ndị Israel jurụ igentị ná nrụrịtaụka nke ha na Chineke. Ha nọgiddere ná mmehie ha, rue mgbe iwe Chineke dakwasịrị ha n’ùjú mgbe ọnwụ Kraist gasịrị.

Ebe ikpeazụ nke ebeọgụgụ anyị naeme ka anyị mata na site n’ebere nke Chineke agaenwe ndị gaafọdụ site n’ọgbọ niile, rue mgbe agaeweghachị Zaion n’ebube mbụ ya, na Jisọs Kraist Onye ha jụrụ ma gbue kwa gaabụ Onye ha gaanabata nkeọma dịka Eze ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee otú Aisaia siri nata ozi ya nke ọ gaje ikwusara ndị Israel?

  2. 2 Ogologo oge ra añaa ka Aisaia kwusara okwu ahụ?

  3. 3 Òlee otú Aisaia si nwụọ n’ikpaazụ?

  4. 4 Gịnị mere Chineke ji kọwaa otú ọnọdụ ndị Israel dị kpọmkwem?

  5. 5 Gịnị mere ụmụmmadụ aghaghị ikwere na ha bụ ndịmmehie tupu ha echègharịa ná mmehie?

  6. 6 Òlee ụzọ ụmụmmadụ si aghọta na ha bụ ndịmmehie?

  7. 7 Gịnị mere usoro òfùfè nke okpukpé ndị Israel ji ọ tọghị Chineke ụtọ?

  8. 8 Òlee ụzọ anyị gaesi feè Chineke òfùfè?

  9. 9 Gịnị mere Chineke jiri chọọ ka Ya na ndị Israel rụrịtaụka?