Aisaia 5:1-30

Lesson 349 - Senior

Memory Verse
“Madu gābà kwa n’ọgbà nile nke oké nkume nile, na n’olùlù nile nke ájá, ipu n’iru oké egwù JEHOVA, na ipu n’ima-nma nke nbili-elu-Ya, mgbe O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku” (Aisaia 2:19).
Cross References

I Ubi vine nke Onyenwe anyị

1. Akụrụ ubi vine nke Onyenwe anyị n’elu ugwu nke náamịpụta mkpụrụ nkeọma wee kekọta ya n’ịhụn’anya, Aisaia 5:1, 2; Abù Ọma 80:8, 9, 15.

2. Onyenwe anyị lereanya inweta mkpụrụ, ma ubivine ahụ mịpụtara mkpụrụ vine ọhịa, Aisaia 5:3, 4; Jeremaia 2:21.

3. Onyenwe anyị nyere iwu ka ebibie ubivine ahụ, Aisaia 5:5, 6; Abù Ọma 80:12, 13.

4. Ubivine nke Onyenwe anyị a bụ ụlọ Israel, Juda bụ kwa osisi ahụ maramma, Aisaia 5:7.

II Mbibi nke Ndị Náemebiiwu

1. Ahụhụ na mbibi ka ekwupụtara megide anyaukwu, Aisaia 5:8-10; Ọpupu 20:17; Habakuk 2:9; Luk 12:15; Ndi Kọlọsi 3:5.

2. Emere ka ịñụbigammanyaòkè baa n’ikpé n’iru Chineke ịnara ikpéọmụma, Aisaia 5:11-13, 22, 23; Levitikọs 10:9; Ilu 20:1; 23:29-31; Luk 21:34; Ndi Rom 13:13.

3. Alammụọ emewo onweya ka ọ saa mbara ịnara ndị náemebiiwu, Aisaia 5:14.

4. Ndị náalụọlụ ajọomume na ndị mpako bara n’ikpé, Aisaia 5:15, 17-21; Ilu 16:18; 21:4; Luk 1:52; I Jọn 2:16; Malakai 4:1.

III Ikpé niile nke Chineke

1. Agaebuli Jehova nke ụsụniilenkendịagha elu n’ikpé, Aisaia 5:16; Nkpughe 20:11-15.

2. Chineke nwererị ihe zuruezù nke Ọ gaeji maka ya kpee Ụmụ Israel ikpé, Aisaia 5:24, 25.

3. Chineke weere mba dị icheiche sitere n’ebe dị anya dịka ngwáọlụ nke ikpé, Aisaia 5:26-30.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

“Emewom ka eluigwe na ala gbaàmà megide unu ta, na ọ bụ ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m’tinyeworo n’iru-gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi” (Deuteronomi 30:19). Onyenwe anyị ziri Ụmụ Israel ozi a; ma, n’ihi na Jisọs, bụ Nwaatụrụ ahụ, nke “egbuworo site n’oge ịtọ ntọala nke ụwa,” nke a wee metụta mmadụ niile dị n’ụwa. Ụzọ nke ịba n’Eluigwe ghereoghe nye mmadụ dum. Dịka achọrọ ya n’aka Ụmụ Israel ime nrọrọ nke onweha ifè Chineke maọbụ ịjụ ifè Ya, otú a kwa ka onye ọ bụla gaekpebiri onweya ịrọrọ ndụ ebighịebi maọbụ ọnwụ ebịghịebi. Onye ahụ nke náachọ ịnọ ebịghịebi n’Eluigwe nke Chineke aghaghị ịchọ nzọpụta nke Chineke ma bie kwa ndụ n’ụwa a dịka Okwu Chineke si dị. Otú a onye ọ bụla n’otù n’otù wee ghọọ onye náakwadoro onweya ebe ọ gaanọ ebighịebi.

Ubivine nke Onyenwe anyị

“Biko, ka m’bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ bayere ubi-vine-ya. Onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku nwere ubi-vine n’ugwu ntà nke bu ezi oké ala” (Aisaia 5:1). Ugwú nta ahụ nke bụ ubi ezi ókèala abụghị ebe ọzọ karịa Kenean, Ala Mkwà ahụ nke enyere Ụmụ Israel bụ ndị órù ahụ ndị Chineke mere ka ha nwere onweha pụọ na yoke nke ígwè na obiọjọọ nke ndị Ijipt. Nkume ndị ahụ, bụ ebo dị icheiche nke mba ndị ahụ náekpere arụsị ndị bi na Kenean tupu Ụmụ Israel abịa, ka ewepụrụ n’ezie site n’ike nke Chineke mgbe Ụmụ Israel naewere ihe onwunwe ha. Mba ọ bụla nke fọdụrụ ná mba ndị ahụ náefè arụsị n’ala ahụ nke Chineke nyere ndị Israel, fọdụrụ n’ihi na Ụmụ Israeal emezughị akụkụ nke ha n’ime na idebe iwu niile nke Chineke.

Onyenwe anyị ji Eziokwu gbaa ubivine Ya ogige, iji gbochie mba ndị ahụ naefè arụsị ka ha ghara ibibi ihe ọkụkụ niile ahụ dị nrò nke Ọ kụrụ n’ubivine Ya. “Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n’olu nke JEHOVA, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasịa mba niile nke uwa elu’…. JEHOVA gēme ka etigbue n’iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n’otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n’uzọ asa ka ha gāgbalaga n’iru-gi” (Deuteronomi 28:1, 7).

Ewuru ụlọelu n’etiti ubivine nke Onyenwe anyị. Ụlọelu niile nke mgbe ochie ahụ ka ewuru dịka ebe ízèrèndụ n’oge agha maọbụ mgbe iheegwù dị. Ewuru ha ka ha dị elu ka onye nche nke edebere n’elu ya wee nweeike ịhụ ndịiro mgbe ha naabịa. Ewusịrị ụlọelu ndị ahụ ike mee kwa ka ha guzosieike igbochi ibuagha niile nke onye iro ahụ mgbe ọ gaagbalị imeri onyenwe ubivine ahụ. Obodo Jerusalem na Ụlọukwu Chineke wee ghọọ ebe izerendụ dị ukwu nye Ụmụ Israel, nkekanke n’oge ha ji obi ha dum, mkpụrụobi ha dum na ike ha dum náefe Onyenwe anyị òfùfè. (Gụọ Aisaia 37:14-23, 33-36).

Onyenwe anyị gwara ụlọ Israel na ha bụ ubivine Ya -- na ndị Juda bụ kwa iheọkụkụ nke ubi nke dị Chineke ezi mma. Onyenwe anyị kwesịrị ileanya owuweiheubi ririnne site ná ndọgbun’ọlụ Ya niile, ma asị kwa na Ụmụ Israel fèrè Chineke òfùfè n’ikwesịntụkwasịobi ụdị owuweiheubi dị otú a gaadịworị. “Ndi akuworo n’ulo JEHOVA dika osisi gāma akwukwọ n’ogige niile nke Chineke-ayi. Ha gānọ nāmi nkpuru n’isi-awọ” (Abù Ọma 92:13, 14). Ọ dịghị ihe ọ bụla jọrọnjọ n’iheọkụkụ ahụ nke Chineke kụworo. “Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bú nání ihe ziri ezi.”

Abụ nke Ikpé

“Ì si kwa aña gbanwe orù osisi vine nke ala ọzọ n’ebe M’nọ?” (Jeremaia 2:22). Abụ ikpé nke Aisaia gosipụtara eziokwu ahụ nke bụ na Onyenwe anyị emewo ihe niile ekwesịrị ime ka ubivine Ya bụrụ nke ganáamị mkpụrụ rinne; ma mgbe O lereanya owuweiheubi, Ọ hụrụ na ubivine ahụ amịwo náánị mkpụrụ vine ọhịa. Ụmụ Israel niile, n’òzùzùòkè, jụrụ ifè Chineke òfùfè. N’otùaka ahụ ha rọọrọ iji mmehie na ikpere arụsị gwuriegwú, náánị izute Chineke nke náeweiwe ziriezi n’ikpé. Ụmụ Israel matara na Eluigwe naechere ndị ahụ fere Chineke n’ịkwesị ntụkwasịobi n’elu ụwa, ha matakwara n’otùaka ahụ na ọkụalammụọ bụ ọgwụgwụ nke anaapụghị ịgbanarị nye ndụ nke ekwesịghị ntụkwasịobi, na nke mmehie; ma otú ọ dị ndị ka n’ọnụọgụgụ nke ndị Israel rọọrọ ịga n’iru nime mmehie. Ọ dị onye ọ bụla pụrụ ichepụta nrọrọ ọzọ dị njọ karịa nke a?

Gịnị ka agaeme ubivine ahụ nke náamịghị mkpụrụ? Onyenwe anyị ekwuworị na agaje iwezuga ogige ahụ nke eji chebe ya, agaerichapụ kwa ubivine ahụ -- aga akwatu kwa mgbidi ya wee zọtọọ ubivine ahụ. Ewezugara ngọzi niile nke Onyenwe anyị site ná mba Israel, ewee chụsasịa ha n’oge náadịghịanya gaa n’akụkụ anọ nke ụwa. Chineke gbochiri mmiriòzùzò n’ala ahụ, mgbe náadịghịanya ala ahụ nke maramma wee ghọọ ọzàrà kpọrọnkụ. Osisi ahụ maramma nke dị n’ugwu ntà ahụ bụ ezi ókèala nke Onyenwe anyị wee ghọọ osisi kpọbigara nkụ ókè; ma ọ bụghị n’ihi ebere nke Onyenwe anyị na ọgbụgbandụ Ya, Ụmụ Israel gaabụworị ndị ekpochapụrụ. Site n’onye amụma ahụ, Chineke kwupụtara ụfọdụ nime mmehie ndị ahụ nke ikpé mara Ụmụ Israel nime ha, ọbụná onye óké nnyocha aghaghị ikwenye na Chineke nwere ihe kpatara O jiri kpee ndị a náadịghị asọpụrụ Chineke ikpé siriike.

Ọnọdụ Dị Icheiche nke Náagbanweagbanwe

Okwu ahụ nke dị ka onyinyo bụ nke onye amụma ahụ gosịrị n’oge a banyere Ụmụ Israel bụ nnọọ ihe nkọwa siriike ịgụ maọbụ ịnụ. Ọ gaadị nnọọ mma ma ọ bụrụ na Chineke gaekwe ka otù ikpéọmụma nke mmehie a bụrụ ihe gaezu ịdọ ndị mmehie niile akanántị ka ha wee gbanarị iwe nke Onye kachasịiheniileelu ma chigharịa kwa n’eziokwu ifè ezi Chineke dị ndụ.

Wepụ isiokwu nke iheọmụmụ a n’ebe ndị Israel nọ ma were ya tụnyere Ndịmbaọzọ, agaahụ na ihe nke naeme n’ụbọchị taa dị kwa dịka ọ dị na mgbe ahụ. N’oge nke Amara, emere ka Mmụọ Chineke bịakwute Ndịmbaọzọ n’uju. Onyenwe anyị emewo mkwadobe niile banyere nzọpụta nke mmadụ niile, ma Chineke emewo mmadụ ka ọ bụrụ onye nweere onweya ime ihe ọ chọrọ, ma tinye kwa n’aka ya ike nke ịrọrọ ndụ ebighịebi maọbụ ọnwụ ebighịebi. Chineke emewo ihe niile O nwereike ime iji mee ka ụmụmmadụ bịarue nchègharị; ma n’ihe niile ha ka naajụ kwa ọkpụkpọòkù nke ebere Ya. Ikpé niile nke Chineke kwuru megide Israel náenupụisi gaadakwasị kwa Ndịmbaọzọ ahụ jụrụ ichègharị site ná mmehie ma nara kwa amara Chineke nime obi ha.

Ịchọ náánị nke onweonye

Onyenwe anyị kwuru na ahụhụ gaadịrị ndị anyaukwu nke Israel, ma ikpé ahụ megide mmehie nke ndị Israel ewepụghị mmehie n’ụwa. Ụmụmmadụ ka bụ kwa ndị anyaukwu, mmehie a ka naewute Chineke riinne dịka ọ dị n’oge mbụ. Jisọs gwara ndị náege Ya ntị “Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula n’ihi na ọ bugh n’ihe ọ nwebigara ókè ka ndu di, o sigh n’ihe ọ nwere puta” (Luk 12:15). Ọtụtụ mgbe ndịụwa naagụ ọgan’iru ha site n’ihe onwunwe nke ụwa na ihe ha lụpụtara, ma Chineke naagụ ọgan’iru nke mmadụ site n’ihe onwunwe na ihe dị icheiche nke imemmụọ nke ọ lụpụtaworo. Enwere ihe dị iche dị ukwu na nke a.

Mmehie ọzọ nke ịchọ náánị nke onweonye bụ nke Onyenwe anyị maraikpé taa dịka n’ụbọchị nke ndị Israel bụ mmehie nke ịñụbiga mmanya ókè. Ihe dị icheiche achọpụtaa nke egosipụtara site n’ọnụọgụgụ (Statistics) naegosi na N9,000,000,000 ka anaemefu kwa arọ n’ihe ọñụñụ náaban’anya, site n’aka ọtụtụ mmadụ, ndị náapụghị ịrapụ omume a naeweta mbibi nke náabaghị kwa úrù. Ọtụtụ èzínaụlọ na ụmụntakịrị adịghị enwe ihe oriri maọbụ ihe dị mkpà nke ndụ a n’ihi na nna mọbụ nne maọbụ ha abụọ náemefu ego nke èzinaụlọ ahụ náenweta n’ihe ọñụñụ náaban’anya na omume ndịọzọ náezighịezi. Enwere ihe karịrị nde mmadụ atọ n’obodo Amerịka, ndị amaara nkeọma dịka ndị naañụbiga mmanya òkè. Ọtụtu nde mmadụ ka bụ ndị náañụtụ mmanya náaban’anya ntakịrị nke náegbochi akọnauche ha inwe ezi uche, ndị a náakpata ọtụtụ ihemberede nke náewetara ọtụtụ narị mmadụ ọnwụ n’okporo ụzọ. Okwu nke Chineke, nke náadịghị adaada, kwuru okwu banyere ọnọdụ nke ndị a náañụbiga mmanyaòkè: “Ikpọ-asì, iñubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m’buru uzọ gwa unu, dika m’buru uzọ gwa unu n’oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agagh-eketa ala-eze Chineke” (Ndi Galetia 5:21).

Ịsa Mbara nke Ọkụalammụọ

Mmebiiwu nke mmadụ dị ukwu náagbasa kwa ebe niile nke mere na Chineke gwara onyeamụma ahụ okwu: “Ala-mụọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnụ-ya ókè ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāñuri ọñụ-agha n’etiti-ya, gārida kwa nime ya” (Aisaia 5:14). Emeghị ọkụalammụọ na mbụ n’ihi mmadụ kama emere ya “nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya” (Matiu 25:41). Otú ọ dị, ekwuwo sị, na onye ọ bụla nke náanọgide n’ibindụ dịka ekwensu naebi gaenwe afọojuju ịnara ụgwọọlụ nke ekwensu naakwụ. “Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu” (Ndi Rom 6:23). “Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkwegh ekwe, na ndi-árú, na ndi-ogbu-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ nsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu” (Nkpughe 21:8).

Agaahụ nkeọma n’etiti ndị bi n’ụwa taa ụdị mmehie nke Ụmụ Israel. Dịka Chineke si kpee mmehie nke ndị Israel ikpé, otú ahụ ka Ọ gaekpé mmehie ahụ dị n’obi na ndụ nke onye mmehie ọ bụla bụ Onyembaọzọ ikpé. “N’ihi nka ka M’gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M’gēme gi, jikere izute Chineke-gi” (Emos 4:12). Ọzọ kwa Chineke naagwa mmadụ niile: Rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi” (Deuteronomi 30:19).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye bụ ubivine nke Onyenwe anyị?

  2. 2 Òlee ụzọ Onyenwe anyị si chebe ubivine Ya?

  3. 3 Òlee ihe yiri ụlọelu ahụ nke onyeamụma ahụ kọwara ihe banyere ya?

  4. 4 Gịnị ka Onyenwe anyị chọpụtara mgbe O lereanya mkpụrụ n’ubivine Ya?

  5. 5 Gịnị mere ubivine nke Onyenwe anyị? N’ihi gịnị?

  6. 6 Òlee ụzọ esi taa ndị ahụ ahụhu n’ihi anya ukwu ha?

  7. 7 Gịni ka Onyenwe anyị kwuru banyere ịñụbigammanya òkè?

  8. 8 N’ihi gịnị ka ọkụalammụọ ji mee onweya ka ọ saa mbara?