Aisaia 6:1-13

Lesson 350 - Senior

Memory Verse
“Ndi bu di, hunu nwunye-unu n’anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya; ka O we do ya nsọ, mgbe O mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke, ka Ya Onwe-Ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbụ iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpugh ìta uta” (Ndi Efesọs 5:25-27).
Cross References

I Ọhụ nke Aisaia banyere Atọnimeotù ahụ nke Ịbụisi Chineke

1. Aisaia hụrụ ọhụ ahụ mgbe akpọsịrị ya n’ọkwa nke ịbụ onyeamụma, ebe agụsịworo ya n’onye eziomume, onye náasọpụrụ Chineke, Aisaia 6:1; 1:1

2. Ọhụ ahụ bụ banyere Atọnimeotù ahụ dị nsọ nke Ịbụisi Chineke, Onye pụrụimeiheniile, Aisaia 6:1-3, 8: Jọn 12:41; Ọlu Ndi-ozi 28:25; Nkpughe 4:1-11; 5:6; Ezikiel 1:1-28; Abù Ọma 72:19.

3. Ihe mmetụta nke a nwere bụ n’ihe nke mmụọ, Aisaia 6:4; Ọpupu 40:34, 35; I Ndi Eze 8:10, 11.

II Otú Aisaia si Hụta Onweya, Odudunsọ Ya nke Náesochita

1 Ọhụ a banyere ịdịnsọ nke Chineke mere ka Aisaia hụ njọ ekere ụwa ya na erughịeru ya, Aisaia 6:5; Ọpupu 33:20 Luk 5:8; Matiu 5:8; Ndi Hibru 12:14.

2 Edoro Aisaia nsọ mgbe nkume ahụ dị ọkụ metụrụ egbugbereọnụ ya abụọ, Asaia 6:5-7; Abù Ọma 51:2, 7; Ezikiel 36:26.

III Ọkpụkpọòkù nke Aisaia na Ozi Eziri Ya

1 Akpọrọ Aisaia ịlụọlụ pụrụ iche nke sikwaraike mgbe edosịrị ya nsọ, Aisaia 6:8; Jenesis 17:1-22.

2 Ijiobichụọàjà ahụ nke sitere n’afọòfùfè mere ka Chineke zie ya ozi ahụ pụtara ìhè, Aisaia 6:8-13; Ọpupu 3:1-10; I Ndi Eze 19:19-21 cf. 2 Ndi Eze 3:11, 12; Ọlu Ndi-ozi 13:2.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ọhụ ahụ na Ihe Ọ naakụzi

Ihemmụta dị iche nke enyere n’ọhụ a nke Aisaia hụrụ dị ọtụtụ, nke otù nime ha bụ mkpughe nke óké ịdịnsọ Atọnimeòtù ahụ nke Ịbụisi Chineke. Na Ịbụisi Chineke bụ Atọnimeòtù ka anaahụ nkeọma, n’ihi na Aisaia hụrụ Onyenwe anyị wee nụ kwa ka ụsụ nke eluigwe naakpọku Ya náeji òkpùkpù atọ nke ọjịja náeto Ya. Ndị ahụ agbapụtara, ndị nọ n’iru Ocheeze Chineke ji kwa otù òkpùkpù atọ nke ọjịja ahụ náeto Chineke mgbe Óké Mkpagbu ahụ gaadị n’eluụwa (Nkpughe 4:8; 5:8-10). Ọ bụghị ihe mberede na enwere akụkụ atọ n’ọjịja ahụ, nke otù onye nime Ịbụisi Chineke ahụ, n’ihi na ọ dịghị ihe mberede dị n’ebe Chineke nọ. Nke a abụghị kwa náánị ihe ịmaàtụ enyere banyere ọhụ nke Aisaia bụ nke náekpughe Atọnimeotù ahụ.

Chineke Nna nọ ya, n’ihi na mgbe niile ka anaegosipụta Ya dịka Onye ahụ náanọkwasị n’Ocheeze ahụ nke dị n’Eluigwe. Kraist naanọdụ ugbu a n’akụkụ akanri nke Ocheeze ahụ ma Mmụọ Nsọ ahụ dị ngọzi nọ n’ụwa náatụ kwa “uwa nmehie, na ezi-omume, na ikpé, n’anya” (Jọn 16:8). Ma Jọn onye ahụ ahụrụn’anya naede na mgbe ahụ Aisaia hụrụ Onyenwe anyị na ọ hụkwara Jisọs! Le (Jọn 12:37-41). Ọbụná n’Ọlụ Ndịozi anyị naagụ na Mmụọ Nsọ kwuru okwu n’oge ahụ! (Lee Ọlu Ndi-ozi 28:25-27). Òkpùkpù atọ nke ọjịja ahụ ka enyere Atọnimeotù -- Chineke Naa, Jisọs Kraist Ọkpara, na Mmụọ Nsọ.

Tụkwasị kwa n’ihe mnwapụta ndịa, anyị naahụ na mgbe Aisaia nụrụ olu Onyenwe anyị, ọ nụghị olu nke náánị otù onye kama olu nke ndị karịrị otù onye ejikọtara n’otù, n’ihi na Onyenwe anyị sịrị: “Onye ka M gēziga, onye gāgakwara ayi?”Anaeziga Aisaia dịka onyeozi nke Atọnimeotù ahụ nke Ịbụisi Chineke, ma ozi ahụ nke ọ gaagbasa sitere n’ịbụisi Chineke ahụ nke ejikọtara n’otù -- ịdịn’otù nke échìchè mmadụ náapụghị ịghọta. (Lee Jọn 17:21-23; Ndi Hibru 2:11).

Ebe ọgụgụ a naakụzikwara anyị na Atọnimeotù ahụ naadịgide oge niile rue mgbe ebighịebi. “Nsọ, nsọ nsọ, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha di” bụ abụ nke otuto ahụ, náegosi na Kraist nọrị nime Ịbụisi Chineke ahụ. Ndị náasị na Kraist malitere ịdịadị Ya mgbe amụrụ Ya na Betlehem nọ nime ndahie dị ukwu. Ya ka “egbuworo site n’oge itọ ntọ-ala nke uwa” n’ihi mmadụ furuefu (Nkpughe 13:8), “ebe Ọ nādi ndu mgbe nile iriọ aririọ n’ihi ha” (Ndi Hibru 7:25).

Anaakụzikwara anyị na otuto na nsọpụrụ kachasị elu na nke kachasị mma kwesịrị inye Chineke anyị, na anyị kwesịkwara inye Ya ha n’ikwesị ntụkwasịobi. Ndị ahụ kachasị elu nke náejeozi gburugburu Ocheeze ahụ, kpuchiri iru ha na ụkwụ ha n’óké nsọpụrụ, n’oge ahụ niile, náeji kwa ike ha niile náeto Chineke. Ọ bụrụ na ndị ahụ náenweghị mmehie, bụ ndị náeguzo n’iru Onye ahụ nke pụrụ ime ihe niile naeme otú a, òlee otú anyị onweanyị, bụ ndị agbapụtara site n’Ọbara ahụ dị ókéọnụahịa gaesi ghara ime otú a karịa. Anyị kwesịrị inye Ya otuto anyị, òfùfè anyị, nsọpụrụ anyị, ijéozi anyị -- ihe niile anyi nwere -- nime obiumeala nke kachasị omimi. Ndịa dị nsọ naeto Ya mgbe niile -- bụ ndị náaka amaghị mmehie, nke mere na ọ dịbeghị mgbe ha nwapụtara ịhụn’anya nke Chineke n’ebe ha nọ site n’amara nke mgbapụta Ya. O kwesịrị ka anyi too Ya karịa, n’ihi na anyị anwapụtawo ịhụn’anya ahụ, amara ahụ, na ebere ahụ nke anaeme ka o rue anyị arụ kwa ụbọchị rue ụbọchị niile nke ndụ anyị.

Odudonsọ nke Aisaia

Aisaia bụ onye náasọpụrụ Chineke n’oge enyere ya ọhụ ahụ. Ọ bụrụworị onye amụma nke Chineke. Ndịamụma nke Chineke bụ ndị dị nsọ, ma ebe ọ bụ na Aisaia anatabeghị odudonsọ zuruòkè tupu oge a, agụrụ ya n’onye dị nsọ dịka ọ naadị nye ndị niile agụworo na ndị eziomume n’ezie. Ma oge ruru nime nwapụta nke Aisaia, dịka oge naabụ kwa ná mnwapụta nke onyeKraist ọ bụla agụrụ n’onye eziomume n’ezie mgbe ọ naaga ijè nime ìhè ahụ, bụ mgbe anaenye ya ịdịnsọ ahụ n’otù ntabianya n’ụzọ pụtara ìhè site n’ọlụ nke odudonsọ zuruòkè nke alụrụ nime obi ya. Ịgụ mmadụ n’onye dị nsọ, maọbu ịdịnsọ nke emere ka ọ dịrị mmadụ site n’amara nke Chineke, bụ nke ya náánị ka oge ra ọ naenweghi ìhè dị ukwu maọbu ohere inwetara onweya ịdịnsọ ahụ nke anaenye site n’ịdịmma nke onyinyeamara nke Chineke -- Jisọs Kraist, na Ọbara Ya nke awụsịrị -- n’oge odudonsọ zuruòkè.

Mgbe Aisaia hụrụ ezi ọnọdụ ya n’iru Chineke na ịdịnsọ nke Chineke nke emere ka ọ puta ìhè n’iru ya, o tiri mkpu n’enweghị olileanya sị, “Ahuhu nādirim! n’ihi na alawom n’iyi; n’ihi na onye egbugbere-ọnu-ya abua ruru árú ka m’bu, … n’ihi na ọ bu Eze-ayi, bú JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.” Ịhụ ịmamma niile zuruòkè nke ịbuisi Chineke ebighịebi ahụ mere ka ọ hu ọnọdụ nke ya onweya n’ụzọ ọ pụtara ìhè nkeọma. Emere ka ọ mata na ọ ka nwere mmehie ahụ nke sitere n’ọmụmụ nke dị kwa mkpà ka asụchapụsịa ya. Ọ hụrụ erughịeru nke ya onweya. Ịhụta onweya dịka o mere, mere ka ọ dị mfé nye Chineke ịlụọlụ nke nsacha ahụ n’obi ya bụ nke anaakpọ odudonsọ zuruòkè.

Ọ dị mma ka anyị náahụ onweanyị dịka Chineke si ahụ anyị. Mgbe anyị naeme otú a, anyị naetikusi Chineke mkpu ike ka O nyere anyị aka nime enweghị olileanya. Mgbe ahụ ka Chineke pụrụ ịlụrụ anyị ọlụ ma mekwara anyị ihe ahu nke Ọ naachọ. Eji Okwu Chineke tụnyere enyo. O kwesịrị ka anyị naeleba anya n’enyo ahụ mgbe niile, náekpe kwa ekpere nime obi anyị ka anyị wee nwee ike ịhụ onweanyị dịka anyị dị n’ebe ahụ. Ndị anaedobeghị nsọ kwesịrị inwe obiike, “n’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Anyị onweanyị kwa bụ ndị nataworo mnwapụta ahụ dị ebube ka nwekwara ike irita úrù site n’ule nnyocha nke Okwu Chineke, n’ihi na anyị aghaghị ịsacha onweanyị, ọbụná dịka Ya onweYa dị ọcha, wee náaga n’iru site “n’okwukwe rue okwukwe,” site kwa n’otuto rue n’otuto, rue mgbe anyị gaahụ otú Ọ dị wee dị kwa ka Ya site n’amara Ya dị ebube.

Nime Ụlọukwu ahụ nke dị n’elu ụwa, amụnyere ọkụ n’elu ebe ịchụàjà nkeọla ahụ n’ụzọ dị ebube ichekuọkụ ahụ nke sitere n’ebe ịchụàjà nke ọla ahụ ka ewebara nime Ebe Nsọ ahụ wee tụkwasị ya n’elu ebe ịchụàjà nke ọlaedo nke ụdà náesi ísìụtọ (insence), nke anwụrụọkụ sitere na ya náakwụgo mgbe niile n’ebe Chineke nọ. Nke a nọ ọnọdụ dịka odudonsọ zuruòkè. Otù nime ndị Seraf ahụ wee were otù ọkụicheku sitere n’elu ebe ịchụàjà ahụ wee detụ ya n’egbugbereọnụ abụọ nke Aisaia, ewee kwupụta sị “ewe wezuga ajọ-omume gi, kpuchi kwa nmehie gi.” Ya mere, ewere ike ukwu ya náenweghị obiabụọ site ná mkwuwaokwu niile nke mmadụ pụrụ inwe, na edoro Aisaia nsọ.

Odudonsọ nke Aisaia abụghị ihe mere nwayọ nwayọ. Ọ bụ mnwapụta nke enwere n’otùntabianya. O togheto wee torue nime ịdịnsọ, wee náahụ ka mmehie, ahụ o ketara site n’ọmụmụ náapụsị nke ntà nke ntà. N’otù nkeji ka Aisaia hụrụ onweya dịka onye rụrụarụ ma nime nkeji nke ọzọ ọ nụrụ mkpọsa nke mmụọozi Seraf ahụ na emewo ka ọ dị ọcha ma dị kwa nsọ. Odudunsọ bụ ọlụ nke nsacha obi nke anaenwe site n’okwukwe mgbe enyefesịrị onweonye n’ozuzuòkè, maọbụ ikewapụ iche, nke ndụ, mkpụrụobi, na mmụọ nke onye ahụ náachọ mnwapụta ahụ.

Agaahụ na nkume dị ọkụ ahụ nke agụpụtara site n’ebe ịchụàjà ahụ yiri ọkụ nnụcha nke Mmụọ Nsọ ma ọ bụghị ike ahụ náenyeume nke baptizim nke Mmụọ Nsọ. Mmadụ ndị náanwa ịkọwa na baptizim nke Mmụọ Nsọ abụghị mnwapụta nke atọ pụtara ìhè nke onyeKraist, ewetawo ọtụtụ ọgbaghara. Edoro Aisaia nsọ -- ewezugara ajọomume ya ma sụchapụ kwa njọ ekere ụwa ya -- mgbe ichekuọkụ ahụ metụrụ egbugbereọnụ ya abụọ. Enyeghị ya ike site na Mmụọ Nsọ n’oge ahụ dịka n’ụdị ahụ esi enye mmadụ ike mgbe ọ natara mkwà nke Nna ahụ. Nwapụta nke Aisaia bụ ọlụ nke nnụcha na nsacha nke Mmụọ Nsọ. Ọ bụ itinye Ọbara nke nsacha ahụ n’ọlụ -- icheọkụ nke ọkụ nnụcha -- nke naeme ka anyị bụrụ ndị ejikeere maka mbata nke Mmụọ Nsọ ahụ n’inye ike Ya n’ùjù. Anaenye anyị ike a mgbe anyị natara mnwapụta ukwu nke atọ ahụ nke dịrị NdịKraist -- ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ.

Edoro Aisaia nsọ, ma ọ bụ náánị n’Ụbọchị Pentikọst ka ebu ụzọ nye ụmụmmadụ ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Onyenkasiobi ahụ apụghị ịbịa rue mgbe Jisọs rigosịrị n’eluigwe, n’ihi nke a ọ dịghị onye nsọ nke Testament Ochie awụrụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. Ma ọtụtụ ndịnsọ ndịa anapụghị ịgụtaọnụ nke Testament Ochie ka edoronsọ, ma gbakwaara nke a àmà site n’ijéijè n’ụwa nke a n’izuòkè nke ịdịnsọ ahụ nke náánị ndị edoro nsọ pụrụ ịma.

Ikike nke Ijéozi nke Enyere Aisaia

Chineke naakpọ onye ọ bụla. Olenaole naaza òkù ahụ, Chineke náarọrọ kwa ha, ma dịka ha naanọgidesi kwa ike n’ụzọ nke nsọpụrụ Chineke, ha náabụ ndị kwesịrịntụkwasịobi (Matiu 20:16; Nkpughe 17:14). Ụfọdụ ndị ahụ náaza òkù nke Chineke rue nzọpụta ka Ọ naakpọ wee rọpụta kwa maka ọlụ pụrụ iche nime ijéozi Ya (I Ndi Kọrint 12:28; Ndi Efesọs 4:11-13). Akpọrọ Aisaia dịka onyeamụma nke Chineke ọbụná tupu edoo ya nsọ ma mgbe asụchara ya site ná njọekèrè ụwa emere ka ikike ahụ nke enyere ya maka ijéozi pụta ìhè ewee nye kwa ya ọlụ pụrụ iche ịlụ banyere Israel nke daghachiworo azụ.

Enyere Aisaia ozi dị mkpà n’ihi ndị ahụ, ka ha ghara ịdịgide otú ha dị, ọchịchịrị na ịbụorù ewee bịakwasị ha. Enyere ya ikike nke ijéozi maka ọlụ a dị mkpà ma jikere kwa ya nkeọma n’ihi ya. Akwụkwọ niile nke amụma ya náagbaàmà nye eziokwu ahụ na o kwesịrị ntụkwasịobi n’òkù ahụ akpọrọ ya na n’ebe ndị ya nọ. Ọtụtụ ihe nke náejuanya nke dị kwa ebube ka ekpughere nye anyị site n’ozi ya dị icheiche, nke ya onweya site na mkpalị nke Mmụọ Nsọ wetawooro anyị site n’ebe Chineke nọ. Ikpé dị egwù na ihe dị icheiche dị óké egwù nke ọ gaalụpụta, n’ihi mmehie na nnupuisi megide Chineke, ka edoro n’usoro n’iheodidé niile nke Aisaia. Akpọrọ ya, rọpụta kwa ya, o wee kwesị kwa ntụkwasịobi ọbụná rue n’ọnwụ ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kpọpụta eziokwu dị icheiche banyere Chineke bụ nke eziri anyị site n’ọhụ nke Aisaia.
  2. Òlee otú anyị si mara, site n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ anyị na n’akụkụ ọzọ dị icheiche nke Akwụkwọnsọ na Ịbụisi Chineke ahụ dị ụzọ Ebube atọ pụtara ìhè?
  3. Òlee mmetụta Iru Chineke nwere n’Ụlọukwu ahụ n’onweya?
  4. Òlee mmetụta ọhụ ahụ nwere n’ebe Aisaia nọ?
  5. Gịnị ka Mmụọozi Seraf ahụ mere ma kwue kwa n’ịzaghachi okwu nke Aisaia kwuru banyere onweya?
  6. Òlee otú anyị si mara na edoro Aisaia nsọ n’oge a?
  7. Òlee otú anyị si mara na awụghị Aisaia mmiri nke Mmụọ Nsọ n’oge a?