Aisaia 24:1-23; 26:19-21; 34:1-8

Lesson 351 - Senior

Memory Verse
“Bia, ndim, bata n’ime-ulo-gi nile, mechibido uzọ-gi nile n’azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mgbe oké iwe gāgabiga” (Aisaia 26:20).
Cross References

I Ikpé nke Chineke n’elu Ụwa

1. Onyenwe anyị gaekpe ụwa na ndị bi nime ya ikpé, Aisaia 24:1, 3, 4; 26:21; 34:1-3; 13:11; Matiu 24:21, 22; 2 Ndi Tesalọnaika 1:7-9.

2. Chineke agaghị ele mmadụ anya n’iru n’ikpé Ya, Aisaia 24:2; 34:2-5; Jọn 12:48; Ndi Rom 2:8, 9; Ndi Kọlọsi 3:25; I Pita 1:17.

3. Abụrụ ụwa ọnụ n’ihi mmehie niile nke mmadụ, Aisaia 24:5-12; Jenesis 3:17; Jeremaia 44:22.

4. Ndị fọdụrụ ka agaarapụ, ha gaeto Chineke, ma ndị náemebiiwu agaghị agbanarị, Aisaia 24:16-18, 21, 22; 34:6-8; Ilu 11:21; 19:5; Emọs 9:1-4; Matiu 23:33; Ndi Rom 2:3; Ndi Hibru 2:3.

5. Ụwa gaañagharị iru na azụ dịka onye ñubigaworo mmanyaókè, Aisaia 24:19, 20; 2:19; 13:13; Nkpughe 11:19.

II Nchébe nye ndịEziomume

1. Agaeme ka ndị eziomume nwụrụanwụ si n’ọnwụ bilie, ewee bubiga ha na ndị eziomume dị ndụ jee n’Eluigwe tutu óké mkpagbu ahụ amalite, Aisaia 26:19, 20; I Ndi Kọrint 15:19-22, 51-54; I Ndi Tesalọnaika 4:13-17; Nkpughe 20:4.

2. Chineke nke ụsụniilenkendịagha gaachị nime Jerusalem mgbe mkpagbu ahụ gwụsịrị, Aisaia 24:23; 2:1-3; Zekaraia 14:9, 16, 17; Nkpughe 11:15; 19:11-16.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

“Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa … na mgbe ahu ka nkpagbu uku gādi, nke ihe di ka ya akādigh site ná nmalite uwa rue mgbe a, é-è, ọ gagh-adi kwa ma-ọli” (Matiu 24:14, 21). Ekwusawo Oziọma nke Alaeze n’ọtụtụ mba nke ụwa, ma ụmụmmadụ ajụwo ya nke ukwu; n’ihi nke a Mkpagbu Ukwu ahụ agaghị iso mgbe ihe ndịa gasịrị. Ọ bụrụ na elerueanya n’ụwa taa, mmadụ nwereike ịhụ nkeọma mmetụta ọjọọ dị icheiche nke mmehie na mpụta ìhè nke ọlụ niile nke Setan nke náelomi agbụrụ niile nke ụwa. Ọ naadị ka site n’óké ịbaụba nke amamihe na ọmụmụihe, inwe ọchịchọ n’ebe eziomume na ezi nsọpụrụ Chineke dị naatalataatalata. Baịbụl naekwu sị, “Ajọ madu nile na ndi-aghughọ ganāga n’iru n’ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha” (II Timọta 3:13).

Ikpé dị Icheiche nke Náabịa

Onyenwe naadọ akanántị nke ukwu nime Okwu Ya na mmehie na ndị mmehie agaghị agbanarị ahụhụ. Amụma nke Aisaia gosịrị óké ịbaụba nke ahụhụ ahụ gaadị n’ụbọchị iwe nke Onyenwe anyị. “Le JEHOVA nāgbaba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọgbọrọ n’efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya gbasa” (Aisaia 24:1). Ọ dịghị onye ọ bụla dị ndụ nke gaagbanarị ikpe niile nke Chineke n’ụbọchị ahụ. Mmadụ niile gaata ahụhụ n’ihi mmehie ahụ niile nke ha mere. Ndị ahụ niile na ndị amụma ụgha ahụ kuziiri ha ma mee kwa ka ha kwere na nchebe ụgha, gaahụkọ ahụhụ; ndịkom nwe mmadụ bụ ndị pụrụ iji ego ha zụta ma eleghịanya ihe niile ụwa pụrụ inye na ọñụ ya ha na ndị orù ahụ jeere ha ozi gaahụkọ ahụhụ; ndịnyom nwe mmadụ na ụmụagbọghọ náejere ha ozi; ndị náazụ ahịa na ndị naere ihe; ndị naebiri ihe na ndị naebinye ihe -- ha niile gaezuta ọnụmà na ikpe nke Chineke n’ihi na ha jụrụ atụmàtụ nke nzọpụta nke Chineke mere n’ihi ndị bi n’Ụwa.

Ọgbụgbandụ nke Emebiri

N’etiti ndịamụma nke Testament Ochie kachasị ukwu, amaara Aisaia karịa dịka onye amụma nke mgbapụta; ma o kwukwara ọtụtụ ihe banyere ikpé nke gaabịkwasị ọtụtụ obodo akpọpụtara aha ha, na ụwa niile. Ikpé ahụ ekwupụtara isi nke iri abụọ na anọ nke akwụkwọ Aisaia dị ka ihe ekwupụtara nye ụwa niile, edepụtakwara isi ihe nke kpatara ikpé a “Ha agabigawo iwu nile, gbanwe ukpuru, mebie ọgbugba-ndu ebigh-ebi.”

Mmehie niile nke ụmụmmadụ adịghị atọ Chineke ụtọ, ma eleghịanya mmehie nke jọkarịsịrị njọ nke mmadụ naeme bụ ịjụ Kraist. Malite ná mmehie mbụ ahụ nke emere megide Chineke, Chineke kwere mkwà na Ya gaezite Onye mgbapụta nke gaakwụ ụgwọ mmehie niile nke ụmụmmadụ. Ọgbụgbandụ ebighịebi ahụ dịrị mmadụ niile. Ka ọtụtụ arọ naagafe emere ka mkwà ahụ dị ọhụ, mmezu ya wee bịa kwa nso, rue mgbe Chineke zitere Ọkpara Ya, Jisọs Kraist n’ụwa ka Ọ hụọ ahụhu, wee nwụọ dịka àjà achụrụ n’elu Obe, ka ewee zọpụta mmadụ niile site n’Ọbara nke Jisọs. “Chineke … ugbu a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n’ebe nile: ebe Ọ debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n’ezi omume ya site n’aka otù Nwoke Ọ kara àkà; Ọ nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si ná ndi nwuru anwu bilie” (Ọlu Ndi-ozi 17:30, 31).

Náánị ihe gaeme ka agbanarị egwù na nhụjuanya niile nke Óké Mkpagbu ahụ bụ nrubeisi nye àtụmààtụ niile nke ọgbụgbandụ ebighịebi -- nke pụtara, ikwere na Jisọs Kraist, ichègharị ná mmehie niile emeworo, wee hụ Chineke n’anya ma rubekwara Ya isi site n’obi dum, mkpụrụobi dum, uche dum, na ike dum. Ọ bụ ihe mwute ikwu, na ọ bụghị mmadụ dum ndị bi n’ụwa naanabata maọbụ rubeisi nye mkwadobe niile nke ọgbụgbandụ ahụ. N’ihi na ha anabataghị ịhụn’anya nke eziokwu ahụ ka ewee zọpụta ha, mmadụ ndị ka n’ọnụọgụgụ nime ụwa ka akwadobeworo ịla n’íyì.

Óké Mkpagbu

N’ụzọ dị egwù ka mmehie naewepụ ndụ ọtụtụ mmadụ nime arọ niile; ma Óké Mkpagbu ahụ gaabụ oge ikpé pụrụ iche. Enwewo nsogbu n’oge dị icheiche garaaga, ma ọ dịghị oge ọ bụla n’akụkọ nke ụwa niile nke agaeji tụnyere oge a nke akọwara nime Okwu Chineke. Óké Mkpagbu ahụ gaadị arọ asaa. Mgbe ihe ra ka nkera oge a gabigara, aga awụkwasị óké ikpé n’arụ ndị niile bị ná mba dị icheiche nke ụwa, ma Ndị Juu ma Ndịmbaọzọ, n’ihi asọpụrụghị Chineke na ọjụjụ ha jụrụ Oziọma na ozi nke Kraist. Ọ gaabụ oge nke óké nhụjuanya, ihe mgbu, na mkpagbu nke anụarụ na imemmụọ nye ndị niile dị ndụ. Mmehie na ajọomume gaabaụba karịa otú anaahụtụbeghị na mbụ n’oge nke ikpé a dị egwù. “Nkpuru ọ bula madu nāgh, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi,” ka Okwu nke Chineke naagwa anyị, ma oge nke owuweiheubi agaghị ịbịa dịka oge nke ọghịghamkpụrụ.

Emere ka ụmụmmadụ mara site n’Okwu Chineke, na ọ bụghị ihe ntà ịgbakụta Onyenwe anyị azụ, wee ghọrọ ụgwọọlụ nke mmehie dịka iheubi. Ụfọdụ mmadụ naanwa inye ihengọpụ na ha amaghị ihe banyere Chineke na Iwu Ya, ma Chineke sịrị, “ha leziri anya ghara ịmara” (2 Pita 3:4). Ọ dịghị ihengọpụ gaadị nye mmehie n’ụbọchị ikpé a, n’ihi na emewo mkwadobe dị ukwu iji wepụ mmehie n’obi mmadụ. Okwu banyere ikpé abụghị ihe náatọụtọ, ma eleghịanya, maọbụ òzízí dị mkpà nke ukwu nke Okwu Chineke, ma karịsịa n’ihi ihe ndị ahụ nke gaje ịdakwasị ụwa.

Onye ahụ Náemegide Kraist

“Ahuhu gādiri uwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu aridakuruwo unu, nēnwe oké ọnuma, ebe ọ matara na ọ nwere nání nwa oge” (Nkpughe 12:12). Ekwensu alụworị ọgụ n’Eluigwe ma o merighị, ya mere n’elu ụwa ọ gaeme ihe niile o nwereike ime iji mebie àtụmààtụ nke Chineke. Ngwangwa mgbe ewelisịrị Nzukọ Kraist -- Ndị Kraist náemeribiga ókè -- pụọ n’ụwa, ekwensu gaachịkọta mmadụ niile iguzobe àtụmààtụ ọjọọ ya iji chịa ụwa.

Jisọs biara dịka Okwu ahụ nke ghọrọ mmadụ, Ọkpara Chineke nke pụtara ìhè n’anụarụ; n’otùaka ahụ Onye ahụ nke náemegide Kraist gaabịa n’oyiyi nke ekwensu ma bụrụ kwa ekwensu n’onweya, Ewepụtara omume niile nke onye ahụ náemegide Kraist n’ụzọ pụtara ìhè na Baịbụl. Ọ bụ onye náadịghị edebe iwu, bụrụ kwa onye náadịghị asọpụrụ iwu niile nke mmadụ maọbụ Iwu nke Chineke. Nke a bụ ihe pụtaworo ìhè nkeọma n’ụbọchị ndịa, n’ihi na anyị bi nime ụbọchị ndịa nke anaadịghị asọpụrụ iwu. Otù nime ihe ndị eji mara mmekọrịta nke mba na ibe ya n’arọ ndịa bụ asọpụrụghị iwu maọbụ mkwekọrịta nke mba na mba maọbụ mkwà ekwere n’okwu n’ọnụ; ha niile ka anaadịghị kwa asọpụrụ. N’otù aka ahụ kwa ụfọdụ nime ọtụtụ mba dị icheiche enweghị nsọpụrụ ọ bụla nye Iwu Chineke. Ihe ndịa bụ ụfọdụ nime ihe ịrịbaàmà nke náegosi na ọbịbịa nke Onye ahụ náemegide Kraist adịwo nso.

Ọ gaabụ onye mkpagbu, onye ọchịchị ọjọọ karịa ndị ọchịchị ọjọọ niile, dị kwa elu karịsịa ha niile. Ọ gaenweta ọnọdụ a site n’ireụtọ dị icheiche; ma mgbe o nwetasịrị ọnọdụ a ọ gaeme ka ọchịchọ ya guzo site na mmanya. Mgbe Daniel naekwu ihe banyere ya, ọ sịrị na “ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru.” N’ụzọ ọzọ okwu a pụtara, ọ gasọpụrụ ọchịchị nke ibuagha.

N’ụbọchị ndịa mgbe ụwa naeme óké ngwangwa ịkpụtara onweya ngwaagha, náachọ ịkwadebere onweya ebe nchebe dị icheiche, ibu agha abụrụwo otù nime ihe ndị pụtara ịhè karịsịa iji mee ka ihe ndịa guzosieike nime ọtụtụ mba. Ọ bụrụwo ihe ndabere nke mba dị icheiche tụkwasịworo obi iji nweta ọchịchọ ha; ime ihe ná mmanye bụ ihe pụtara ìhè nke eji mara obodo niile jiworo ibu agha kwagide onweha. Ha adịghị adabere ná mmekọrịta nke mba na mba maọbụ ịnabata okwu udo site n’aka mba ọzọ. Ha adịghị achọ ịbịakọrịta nso n’ụzọ ziriezi ka ewe gboo mkpà ha n’ụzọ kwesịrịekwesị; ma ha kpebiri inweta ọchịchọ ha n’ike nke a bụ nnọọ omume siriike nke eji mara Onye ahụ náemegide Kraist.

Akàrà nke Anụọhịa ahụ

Ndụ nke Kraist pụtara ìhè karịa ndụ onye ọ bụla ọzọ dịka Onye bụ iheatụ nke eziomue nke Chineke nye ụwa. Onye ahụ nke náemegide Kraist, n’akụkụ ọzọ gaabịa dịka iheatụ nke mmebiiwu. N’ezie ọ gaabụ onye amara nkeọma n’ihe banyere ajọomume, anụọhịa nke jọgburu onweya ná njọ. Akọwara ya nime Akwụkwọnsọ dịka anụọhịa; agaachọ kwa ka ndị fọdụrụ n’ụwa mgbe onye ahụ náemegide Kraist gaachị nara akàrà nke anụọhịa ahụ n’egedegeiru ha maọbụ n’aka nri ha maọbụ ha atufue ndụ ha. Ihe agaachọ ka mmadụ mee gaadị óké ike nke gaeme “ka onye ọ bula ghara kwa ipu izuta ahia ma-ọbu ire ihe, ma-ọbugh onye nwere akàrà ahu, bú aha nke anu-ọhia ahu ma-ọbu ọnu-ọgugu aha-ya” (Nkpughe 13:17).

Ekwupụtara ahụhu dị óké egwù nke gaadakwasị onye ọ bụla nke gaanara akàrà nke anụọhịa ahụ: “Ọ buru na onye ọ bula nākpọ-isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi ya, nānata kwa akàrà-ya n’egedege-iru-ya, ma-ọbu n’aka-ya, ya onwe ya gāñu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwagh-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọkụ na brimstone mekpa ya arụ n’iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n’iru Nwa-atụrụ ahu: anwuru ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mgbe nile ebigh-ebi; ha adigh ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya” (Nkpughe 14:9-11).

Ụzọ nke Mkpagbu

Dịka anyị naagụ n’Okwu Chineke maka ihe akọwara banyere ọchịchị nke Onye ahụ náemegide Kraist, na ihe dị egwù nke gaeme n’oge Mkpagbu Ukwu ahụ, anyị kwesịrị inwe obi ekele na Chineke akwaworo anyị ụzọ mgbapụ n’oge ahụ. Jisọs Kraist naabịaghachị n’ụwa ịkpọrọ ndịnsọ Ya náechere -- ụmụ Ya ndị ahụ meworo ezi mkwadobe izute Ya. “Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere óké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opi nke Chineke, si n’elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie mgbe ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ ná ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17).

Chineke napụtara Noa mgbe eji mmiri mebie ụwa: Ọ napụtara Lọt n’oge ebibiri Sọdọm na Gọmọra; O wee napụta kwa ndị Israel mgbe emere ka mmụọozi nke ọnwụ gabiga n’ala Ijipt. N’otù ụzọ ahụ, Ọ kwaworo ndị Ya ụzọ ịgbanarị Mkpagbu ahụ. “Bia, ndim, bata nime-ulo-gi nile mechibido uzọ-gi nile n’azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mgbe oké Iwe gāgabiga. N’ihi ha, Le, JEHOVA nēsi n’ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n’uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gagh-ekpuchi kwa ndi-ya egburu egbu ọzọ” (Aisaia 26:20, 21). Ọ dị mkpà ka ụmụmmadụ nara ọkpụkpọòkù nke Oziọma taa, n’ihi na ụbọchị ọ bụla nke naabịa naewepụta iheịrịbaàmà nke anaapụghị ịgọnarị nke náegosi na ụbọchị ọbịbịa nke Kraist dị nso.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Chineke ji kpebie na ikpé gaabịakwasị ụwa?
  2. Òlee ndị bi n’ụwa bụ ndị gaaba n’ikpé Chineke?
  3. Gịnị ka “ọgbugbandụ ebighịebi” ahụ bụ nye ụwa taa?
  4. Òlee otú ụmụmmadụ si emebi “ọgbụgbandụ ebigbịebi” ahụ.
  5. Òlee mgbe Mkpagbu Ukwu ahụ gaabịakwasị ụwa?
  6. Gịnị gaeme ndị ahụ naara akàrà nke anụọhịa ahụ n’oge Mkpagbu ahụ?
  7. Kọwaa ụfọdụ nime ọnọdụ jọgburu onweya nke gaadị n’ụwa nime oge niile nke Mkpagbu ahụ.
  8. Òlee ụzọ o si dị mfé ịgbanarị Óké Mkpagbu ahụ?