Aisaia 40:1-31; 52:7-10; Matiu 3:1-3; 11:2-15.

Lesson 352 - Senior

Memory Verse
“Agēkwusa kwa ozi-ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa” (Matiu 24:14).
Cross References

I. Ijéozi nke Onye ahụ Náedoziri Kraist Ụzọ

1. Ezigara ndị Israel ozi nkasiobi nke edere nime akwụkwọ amụma banyere ọdịn’iru, Aisaia 40:1, 2.

2. Jọn Baptist bụrị onye gaabịa dịka onye ahụ nke náedoziri Onyenwe anyị ụzọ maọbu onye náezi ozi banyere ọbịbịa Ya, Aisaia 40:3; Malakaia 3:1; Matiu 3:1-3; Mak 1:1-3; Luk 1:13-17; Jọn 1:19-30.

3. Ọbịbịa nke Jọn bụ maka igosipụta oge ọhụ nke Oziọma ahụ, Aisaia 40:4-8; Matiu 35:12; 11:2-15; Mak 1:4-8; Luk 1:57-80; 3:7-18; Jọn 1:30:37.

II. Oge nke Oziọma ahụ na óké Ịdịelu Ya

1. Ndụ a nke náadịghị adịgide naeme ka mgbasa nke Oziọma ahụ bụrụ ihe anaeme náatụfughị oge, Aisaia 40:6-8; I Pita 1:24, 25.

2. Ngwàọlụ nke Chineke iji mkwusa Oziọma ahụ -- Nzukọ Kraist aghaghị iji ịnụọkan’obi lụọọlụ niile dị nime ya, Aisaia 40:9-11; 52:7-10; Jọn 4:35; Ọlu Ndi-ozi 1:8; I Ndi Kọrint 9:19-22; Jemes 5:20; Jud 23.

3. Egosirị ike kachasị ukwu nke Chineke na erughịeru nke mmadụ, Aisaia 40:12-17, 43:13; Nkpughe 19:6; I Ihe Emere 29:12; Job 26:12; Abụ Ọma 115:3; Matiu 19:26.

4. Emere ka nganga na ikpere arụsị nke mmadụ bụrụ iheefù, Aisaia 40:18-24; Daniel 4:37; I Samuel 5:1-12.

5. Akọwara ebube nke Chineke na olileanya nke OnyeKraist, Aisaia 40:25-31; Abù Ọma 19:1-14; 89:6; 73:25.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mgbe ụfọdụ anaezi ozi maramma nke dị kwa ike nke Aisaia nye Israel náakpafuakpafu kpọmkwem, n’oge ndịọzọ kwa anaekwusa ha nye ụwa niile. Ebe ọ bụ na site n’ikike nke Okwu Chineke, anyị matara na mmalite nke isi nke 40 bụ amụma eburu banyere ọbịbịa nke Jọn Onyeọwụmmiri anyị nwere ike kwue nnọọ na ebe ahụ fọdụrụ n’ebe ọgụgụ ahụ otù nime ozi ahụ niile maramma nke ekwusara nye mba niile, náezisa Oziọma ahụ na Mesaia ahụ nke náabịa bụ Onye ahụ nke ezigara Jọn idoziri Ya ụzọ.

Ozi nke Nkasiobi ahụ

Eji ozi nke nkasiobi nye Jerusalem na ndị Juu niile meghee Aisaia isi nke 40, nke náadabere náánị na ọ bụrụ na ha anabata Jisọs Kraist dịka Mesaia ha; ma ụwa niile matara na ndị Juu jụrụ Ọkpara Chineke ahụ mgbe Ọ bịara n’ụwa. Ebe ndị Juu jụrụ Ya, eweere ozi nke nkasiobi ahụ, Oziọma ahụ, nye Ndịmbaọzọ karịsịa, nke mere ka anaamụbata ọtụtụ ndè mkpụrụobi nime Alaeze nke Kraist, ndị náanara nkasiobi nke mmehie ha niile nke agbaghaworo na ike nke ịdịndụ karịa mmehie nime ndụ nke a ya na olileanya nke ndụ ebighịebi n’ụwa ọzọ ma agafee ílì.

Oge ahụ naabịa, náenweghị obiabụọ ọ gaghị adị kwa anya, mgbe ndị Juu gaahụ Jisọs Kraist ka ekpughere Ya dịka Ọ naabịaghachị n’ụwa iguzobe Ocheeze Ya ịchị n’eziomume na ike otù puku arọ. Ndị Juu niile dị ndụ n’ụbọchị ahụ gaatọgbọ ngwaagha nke nnupụisi ha wee nara ma nabata kwa Jisọs dịka Mesaia ha. N’ụbọchị ahụ apụrụ ikwu n’ezie: “Gwanu Jerusalem okwu gabà ya n’obi, ikpọ-kwa-nu ya òkù, si, obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n’aka JEHOVA okpukpu abua n’ihi nmehie-ya nile” (Aisaia 40:22). Ịta ahụhu, enweghị ihe dị icheiche nke eji enyere ndụ aka, na mkpagbu niile nke ndị Juu gafeworo nime ha n’arọ niile ndịa gaabụworị ihe apụrụ igbochi, nkasiobi nke Chineke ewee bụrụ nke ha, ma asị na ha naararị Jisọs Kraist dịka Mesaia ha.

Otù eziokwu ahụ dịkwaara mkpụrụobi nke Onyembaọzọ ọ bụla taa. Okwu Chineke bụ gwaọlụ nke iji nweta ndụ ebighịebi maọbụ n’ezie ngwaọlụ nke ọnwụ nye mkpụrụobi. Onye ahụ nke náajụ ifè Kraist na irubeisi n’okwu Chineke naakpọbata ụdị nsogbu dị icheiche nye onweya ná ndụ a, ma ọ bụrụ na ọ nọgidesieike nime nnupụisi ya, ọ gaanata ahụhu ebighịebi nime ọdọọkụ ahụ; ebe onye ahụ nke ji obi ya niile náefe Kraist nwere mkwà nke ndụ dị ugbu a na nke gaje ịbịa. Ozi nkasịobi nke Chineke ka échèrè n’iru ụwa niile, ma náánị ndị gaanara ya ka ọ gaabara úrù.

Mmụọ na Ike nke Elaija

“Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwù nke JEHOVA abia” (Malakai 4:5). Jisọs n’ikwu ihe banyere olileanya nke ndị Juu, sịrị “Asim unu, na Elaija abiawori ugbu a, ha amazugh kwa ya, kama ha mere n’aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbụná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hụ ahuhu. Mgbe ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu banyere Jọn Baptist” (Matiu 17:12, 13). Mmụọozi ahụ kwuru okwu amụma banyere Jọn: “Ya onwe-ya gaga kwa n’iru Ya nime mọ nke ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānugh ihe chigharia iga n’uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ayi otù ndi nke akwadebeworo Ya” (Luk 1:17).

Gịnị ka o ji dị mkpà bụ mmụọ na ike nke Elaija? Elaija bụ onye nọchirianya ndị amụma n’oge Testament Ochie, dịka Moses bụ kwa onye nọchịrịanya Iwu ahụ. Ọbịbịa nke Jọn nime mmụọ na ike nke onye ahụ nọchirianya ndị amụma niile, naanọdụ n’ọkwá nke ijéozi ahụ, náemechi oge nke ndị amụma, náeguzo kwa n’ọnụụzọ nke esi abànye n’Oge nke Izisa Oziọma ahụ. “Iwu Chineke na ndi-amumaYa di rue oge Jọn: site n’oge ahu anēzisa ozi-ọma ala-eze Chineke, madu nile n’otù n’otù were ihe-ike nabà nime ya” (Luk 16:16).

Ejiri otù mmụọ ahụ nke Elaija nwere due Jọn Onye ọwụmmiri, ọlụ ha bụ kwa otù ụdị n’ileanya -- ime ka obi Ụmụ Israel chigharịkwute Chineke ha. “Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, JEHOVA bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata” (I Ndi Eze 18:37). Mmụọozi ahụ kwuru ihe banyere Jọn Onyeọwụmmiri sị: “Ọtụtụ madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikute Onye-nwe-ayi Chineke-ha” (Luk 1:16). Elaija na Jọn Onyeọwụmmiri biri otù ụdị ndụ -- ịnọdụ iche na ịnọ nime ọzara, náenweghị ọchịchọ nke iheụtọ nke ụwa ma náachọ ihe dị ntà iji enyere ndụ aka. Ha abụọ bụ ndị dị ike ma nwee kwa ozi dị ọkụ nke sitere na Chineke; mmadụ abụọ ndịa guzoro n’iru ndịeze na ndị ọchịchị ikwugide mmehie; akpagbukwa-ra mmadụ abụọ ndịa n’ihi mkwusa ha dị icheiche náenweghị egwù. Jezebel barambá ma chọọkwa ụzọ iwepụ ndụ Elaija, ebe Herodias tụrụ àtụmààtụ ọjọọ wee rue mgbe o mere ka ewepụ ndụ Jọn Onyeọwụmmiri n’ikpeazụ. Omume niile nke Elaija na Jọn Onyeọwụmmiri yiri nke ukwu nke mere na ndị Juu zipụrụ ndị nchụàjà na ndị Livai ka ha jụọ ya ma ọ bụ ya bụ Kraist ahụ maọbụ Elias (aha ndị Grik naakpọ Elaisia). Jọn gọpụụrụ onweya na ya abụghi Kraist maọbụ Elaisa, ma ọ sịrị na ya bụ “olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie” (Jọn 1:23). N’ezie Jọn Onyeọwụmmiri bịara nime ike na mmụọ nke Elaija.

Onyenáadịghị Elemmadụ Anyan’iru

Chineke adịghị elemmadụ anyan’iru. Onye ọ bụla nke jikeere inye ihe ọ bụla ọ gaefu ya, nwereike n’ezie ime ihe dimkpa nye Chineke nime Oziọma. Naira na kobo n’onweha apụghị ịzụta ike maọbụ iruọma nke Chineke, n’ihi na Chineke naachọ ndụ achụrụ dịka àjà nke Ọ pụrụ iji lụọọlụ. Elaija na Jọn Onyeọwụmmiri rere onweonye na ọchịchọ ha niile, ha wee were onyinye niile nke Chineke bụ eziomume, ebere na ike dịka ihe dị ókéọnụahịa. Jisọs kwuruokwu banyere Jọn Onyeọwụmmiri sị: “Ọ bu gini ka unu puru je n’ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n’ifufe?” (Matiu 11:17). É-è Jọn abụghị àmì nke náeme mkpatụ site n’ifufe, n’ihi na ozi nke Jọn nke jupụtara na Mmụọ Nsọ bụ ihe guzosịrịike, nke zuruòkè náenweghị obiabụọ ọ bụla. Asị na Jọn eguzosighị ike ndị ahụ agaghị arapụworị ụlọ ha, ọlụ ha, obodo ha wee bịa nime ọzara ịnụ ozi ya. Ndị ahụ bịara -- ihengosi zuruòkè na ọ bụrụ na ozi nke onyemkwusa jupụtara na Mmụọ nke Chineke, ọ gaenwe ndị gaegentị n’ozi ya.

Jisọs gara n’iru n’ajụju ahụ, “Nwoke eyikwasiworo uwe di bịalị bịalị?” É-è, ndị náeyi uwe dị bịalịbịalị bụ ndị anaahụ mgbe dum nime ụlọ eze, ha adịghị alụọlụ n’ubivine nke owuweiheubi nke Onyenwe anyị. Oziọma ahụ naachọ ka ndị ahụ náanabata ya bụrụ ndị náaghaghị ijikere iwere ndụ ha chụọàjà. “Ọ buru na onye ọ bụla ahụ uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adigh nime ya” (I Jọn 2:15). Jisọs mechiri ajụjụ ahụ, “Ihu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke uku … N’ezie asim unu, … ọ digh onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dịkasịrị ntà n’ala-eze elu-igwe ka ya uku” (Matiu 11:9, 11). Onye dịkasịrị ntà n’Ala-eze Elu-igwe -- onye ọ bụla nke azọpụtara site n’Ọbara Jisọs nke náadị kwa ndụ dịka Okwu Chineke sị dị -- dị ukwu karịa Jọn Onyeọwụmmiri. N’ụzọ dị otú a Jisọs gosipụtara ọkpụkpọòkù ahụ dị elu na ọnọdụ ahụ dị mkpà nke ezi OnyeKraist nwere nime àtụmààtụ ahụ dị ukwu ma dị kwa ebube nke Chineke. Dịka ndịKraist, ànyị naebi kwa ndụ dịka Chineke chọrọ n’ebe anyị nọ?

Imeọsọsọ

Mmụọ nke Onyenwe anyị bụ nke náekwuokwu site n’ọnụ onyeamụma ahụ, gosịrị ndụ dịka ihe anaejighị n’aka na mkpà nke ozi nke Oziọma ahụ dị. Ejiri mmadụ tụnyere ahịhịa, were kwa ọnụọgụgụ nke arọ o nwere ịdịndụ tụnyere okokoosisi nke ubi. Elee ya anya n’ọnọdụ ihe banyere ebighịebi, okwu ahụ nke ekwuru bụ nnọọ eziokwu. Ewezuga ịhụn’anya na ebere nke Chineke idebe na ichebe ụmụmmadụ, ọ dịghị onye pụrụ ịdịzu ọnụọgụgụ nke ụbọchị ndụ ya. Ọ bụ ihe dị mkpà izisa Oziọma ahụ ngwangwa ya na mkwà ya nke ndụ ebighịebi nke sitere ná mkpuchi mmehie nke emere site n’ọnwụ nke ịchụàjà nke Jisọs nwụrụ na mbiliten’ọnwụ nke mmeri Ya.

Chineke nwere otù ngwaọlụ arọpụtara -- ndị Ya agbapụtara -- iji gbasaa Oziọma ahụ rue ụwa niile. Oziọma nke nzọpụta adawo ụda n’obi nke ụmụmmadụ, ekwusawo kwa ya n’ọtụtụ ụzọ na n’ụdị dị icheiche site n’ụbọchị ahụ Jisọs rigooro n’Eluigwe. Òtù mbụ nke ndị kwere na Kraist dị ntakịrị n’ezie, ma ọlụ ha, ike na mmetụta sitere na ha bụ ihe ruru mba niile náatụfughị oge. Taa iso ụzọ Kraist ka bụ kwa ihe dị mkpà karịsịa, ọ bụghị náánị n’ebe ndị Kraist n’otù n’otù nọ kama n’ebe ijeri mmadụ abụọ na ọkaàrà ndị bi n’elu ụwa nọ. Enyere mmadụ ọ bụla n’otù n’otù mkpụrụobi nke gaanọ ebighịebi n’otù nime ebe abụọ -- n’Eluigwe maọbụ n’ọkụalammụọ. Ka o wee dooanya na onye ahụ gaenwe ebeobibi ebighịebi ya n’ebe Chineke nọ n’Eluigwe, onye ahụ aghaghị inwe okwukwe nime Jisọs Kraist ma rube kwa isi n’iwu Ya niile. “Nzọputa adigh kwa n’onye ọ bula ọzọ: n’ihi na aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti mmadụ, nke anaghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12). Otú a apụrụ ịhụ ịdịmkpà nke izisa ozi nke Oziọma ahụ ngwangwa, ọlụ nke ikwusa Oziọma ahụ naadakwasị kwa ndị ahụ nataworo ịhụn’anya nke Chineke nime obi ha.

Ihenáabụghị ihe ọ bụla, ma ọ dịghị Anwụanwụ

“Mgbe m’huru eluigwe-Gi, bú ọlụ nkpisi-aka-Gi, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo, gini ka madu bu, na I nēcheta ya; na nwa nke madu, na I nēleta ya” (Abù Ọma 8:3, 4). Aisaia onye amụma kwu kwaraokwu banyere ọlụ ukwu niile nke Chineke Onye nwere ike niile na adịghịike nke mmadụ na ịdị ntà ya. “Le, aguwo mba nile n’otù ntù-miri nātupu n’ite-miri, na n’uzuzu nke ihe-ọtùtù: lee Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu ihe” (Aisaia 40:15). Egosịrị eziokwu ahụ na mmadụ dị ntakịrị n’etiti ihe niile nke Chineke kere, ma asị na ọ bụghị na Chineke wedatara onweYa ileta mmadụ, ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ime ka Chineke lee ya anya maọbụ ịnata iruọma nke Onyeòkìkè ahụ. Ma Chineke naechèta mmadụ -- nchèta nke karịrị nke mmadụ pụrụ ichèta onweya. Chineke naejide ndụ mmadụ ọ bụla n’otù n’otù, Ọ naamata kwa échìchè niile na omume niile nke ndụ onye ọ bụla. “Ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma-ọbu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ” (Eklisiastis 12:14). “M’we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n’iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpee ndi nwuru anwu ikpe site n’ihe nile edereri n’akwukwọ ahụ di iche iche, dika ọlu nile ha si di” (Nkpughe 20:12).

Agbàmume

Ọ bụrụ na mmadụ gaenweta nzọpụta site n’ezi ọlụ nke aka ya, maọbụ ọ bụrụ na mmadụ gaadabere ná nkwesị nke onweya iji baa n’Eluigwe, nzube ahụ gaabụ iheefu; ma ezi OnyeKraist náadabere na Chineke náenwe kwa olileanya ya nime àtụmààtụ nke nzọpụta nke Chineke. “Lee, aka JEHOVA adigh nkpunkpu kari izọputa; nti Ya adigh kwa arọ kari inu ihe” (Aisaia 59:1). “Ọ bugh na nzuzo ka M’kwuworo okwu, n’otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n’ebe tọgbọrọ n’efu: Mu onwem bu JEHOVA, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi” (Aisaia 45:19). “Ì magh? Ì nugh? Chineke nke mgbe ebigh-ebi ka JEHOVA, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ digh-ada mbà, ike adigh-agwu kwa Ya; ọ digh ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya. Ọ bu onye nēnye onye dara mbà ike; onye ike nādigh ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n’uba. Ọbụná umu-okoro nāda mba, ike nāgwu kwa ha, ọbụná umu-okorobia nāsu ngọngọ da: ma ndi nēle anya JEHOVA gāgbanwe ike-ha; ha gēfego elu na nku dika ugo; ha gāgba ọsọ, ike agagh-agwu kwa ha; ha gēje ijè, ghara ida mbà” (Aisaia 40:28-31). Ewoo, mkwà dị ebube! Ewoo, ndị nwere obiụtọ ndị náejéijè nime ìhè ahụ na uche nke Onyenwe anyị Chineke! Òlee otú mmadụ ọ bụla gaesi jụ ọkpụkpọòkù nke Oziọma ahụ dị ebube nke Onyenwe anyị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. N’ụzọ dị añaa ka onye amụma ahụ si kwe Ụmụ Israel na Jerusalem mkwà nkasịobi?
  2. Ònye bụ “olu otù onye nēti mkpu n’ọhia?”
  3. Òlee otú olu ahụ náeti mkpu n’ọhịa si jikọta Jisọs na àtụmààtụ nke Oziọma ahụ?
  4. Òlee otú esi kọwaa ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ nime iheọmụmụ a?
  5. Gịnị mere o ji dị nnọọ óké mkpà ka mmadụ were ndụ ya nye n’ijéozi nke Chineke mgbe ọ ka naadị ndụ n’elu ụwa?
  6. Gịnị ka okwu ahụ “Onye nwe ike nile” pụtara?
  7. Gosịpụta ọtụtụ amaokwu sitere n’iheọmụmụ a iji gosi na Chineke anyị bụ onye nwe ike niile.
  8. Gịnị ka ejiri tụnyere mba niile, n’iru Chineke?
  9. Gịnị bụ agbamume nke enyere ndị ahụ gaatụkwasị Chineke obi?