2 Ihe Emere 30:1-27; 31:1-12

Lesson 340 - Junior

Memory Verse
“Nyenu JEHOVA nsọpuru aha-Ya; nkpọnu isi ala nye JEHOVA n’ima-nma nke idi-nsọ” (Abù Ọma 29:2).
Notes

Otù Ihenchèta

N’óké ụbọchị ahụ Ụmụ Israel rapụrụ Ijipt ebighịebi, Chineke debeere otù ememe nke anaakpọ Ememengabiga. Ha ganaeme ya otù ugbò n’arọ ichètara Israel ịdịmma nke Chineke nye ha n’ịkpọpụta ha n’orù.

Ọtụtụ arọ agabigawo site n’ụbọchị ahụ, ndị Israel adịghịedebe kwa ememe ahụ. Ọ bụghị náánị na ha echèfuwo óké nnapụta ahụ, kama ha echèfuwo Chineke n’onweYa. Kama ifè Chineke òfùfè, ha naefè arụsị; n’ihi mmehie ha kwa Chineke ekwewo ka ikpé jọgburu onweya dakwasị ha.

Ọtụtụ ndị mba ọzọ abatawo nime Kenean dọrọ kwa ọtụtụ ndị Israel n’agha. Moses adọwo ndị nna ha ochie akanántị na nke a gaeme ọ bụrụ na ha agbakụta Chineke azụ. Moses edepụtawo ọtụtụ ngọzi ha gaenweta ọ bụrụ na ha rubere Chineke isi; ma ọ tụkwasịkwara ọbụbụọnụ gaadakwasị ha ọ bụru na ha nupụisi (Deuteronomi 28). Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inupụrụ Chineke isi náagaghị anata ahụhụ. Ntaramaahụhụ nwereike ghara ịbịa n’otù oge ahụ, kama ka o doo gị anya na mmehie gị gaachọpụta gị.

Ndị Israel elefuruwo ịdọnántị ahụ anya, wee fèe arụsị dị icheiche òfùfè, ọbụbụọnụ nke ịdọrọ n’agha wee dakwasị ha. Chineke enyewo ịdọakanántị sị: “JEHOVA gēme ka etigbue gi n’iru ndi-iro-gi: n’otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n’uzọ asa ka i gābalaga n’iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari” (Deuteronomi 28:25). Nke a malitere imezu n’arụ ha ntakịrị ntakịrị rue taa anyị naahụ ụmụ ha nime mba niile nke ụwa.

Ebere Nke Chineke

Ebere nke Chineke naeso kwa ndị Ya nime nsogbu ha. Mgbe ebube Israel toruru n’ebe dị elu n’oge ọchịchị Solomom, Chineke kwere mkwà na ọ bụrụ na ndị ahụ echịgharịa pụọ n’ebe Ya nọ, Ya wee nye ha ahụhụ, ma ọ bụrụ na ha gaeweda onweha n’ala kpee ekpere, chègharịa kwa, na Ya gaagbaghara: “Ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham eweda onwe-ha n’ala, kpe ekpere, chọ irum, si n’uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n’elu-igwe nuru, gbaghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu” (2 Ihe Emere 7:14).

Rịbaama na Ọ sịrị na ha gaesi n’ụzọ ọjọọ ha laghachị ọ bụrụ na ha chọrọ iweta ngọzi niile nke Chineke. Ọtụtụ mmadụ taa chère na ha pụrụ ịbụ NdịKraist ma nọgide kwa nime mmehie. Jisọs sịrị, “Ga nke gi; site n’ugbu a adila nēmehie ọzọ.” Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iweta ngọzi nke Chineke, ọ ghaghị ichègharị wee chigharị kwa site ná mmehie ya. Chineke naenwe ọñụ ịnụ ka mmadụ naasị, “Gbagharam,” ọ bụrụ na onye ahụ kwue ya site n’obi ya niile.

Eziomume Hezekaia

Ndịeze ọjọọ emewo ka Israel na Juda mehiee. Ọ dịghị ezi eze ọ bụla ahụrụ n’Israel siterị na mgbe mba ahụ kewara. Otú ọ dị, Juda enwewo ezi eze olenaole. Mgbe Hezekaia malitere ịchị na Juda, “Ọ me ihe ziri ezi n’anya JEHOVA, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere” (II Ihe Emere 29:2). Lee óké mgbanwe nke a wetara na Juda! Emere ka Ụlọukwu dị ọcha, ezi òfùfè Chineke wee malite kwa ọzọ. Ihe a niile mere ka ndị ahụ ñụrịaọñụ nke ukwu.

Hezekaia matara ihe banyere iwu nke Ememengabiga nke enyeworo ihe ra ka narị arọ asatọ tutu oge ahụ. Ọ chọrọ ime ihe Chineke nyere n’iwu, ya mere o zipụrụ akwụkwọozi ọ bụghị nye náánị ebo Juda ebe ọ naachị, kama nye Israel niile kwa, náagwa ha ka ha bịa na Jerusalem idebe Ememengabiga.

Hezekaia agwaghị ndị Israel ka ha bịa sonye n’alaeze ya, ka ha ñụọ kwa íyì irubere ya isi. Alaeze ahụ adịghị ya mkpà dịka ọlụ nke òfùfè Chineke si dị ya mkpà. Ọ chọrọ ka azọputa ndị ahụ, ka ha wee nweeike ịba n’Eluigwe wee keta ndụ ebigbịebi. Ndụ anyị n’ebe a dị óké mkpụmkpụ, ọ dị kwa mkpà ka anyi were oge anyi jikere maka ebighịebi.

Ụbọchị Ememe Ahụ

Iwu enyere Moses bụ na agaeme ememe ahụ n’ọnwa mbụ, malite n’ụbọchị nke irinaatọ. Agaarọpụta nwaatụrụ eji achụàjà ahụ n’oge ka ewee chọpụta ezughịòkè ọ bụla apụrụ ịchọpụta n’arụ ya nime ìzù abụọ ahụ.

Ịzachasị Ụlọukwu na ido ndị nchụàjà nsọ ka emere na nwa oge dị mkpụmkpụ nke mere na ohere adịghị imezu njikere niile kwesịrị. Moses ekwuwo kwa na ọ bụrụ na n’ihi otù ihe maọbu nke ọzọ apụghị ime ememe ahụ n’ọnwa mbụ, apụrụ ime ya n’ọnwa nke abụọ. Hezekaia na ndịisi na ụfọdụ mmadụ n’etiti nzukọ ahụ wee kwurịta okwu, ewee kpebie na agaeme ememe ahụ n’ọnwa nke abụọ. Ha chọrọ ka o doo ha anya na mgbe ha gaabịa n’iru Chineke ifè òfùfè, na ha gaanọ n’ọnọdụ Ọ gaenweike ịgọzi ha. Ihe dị ha mkpà abụghị náánị ime ka Ụlọukwu dị ọcha, kama ha kwesịrị inwe mgbanwe nke obi.

Nke a kwesịrị ịbụ ememe ukwu. Mgbe akpọrọ òkù maka ememe ahụ, arịọkwara ụmụmmadụ arịrịọ ka ha si ná mmehie ha chigharịa wee chigharịkwute Chineke. Ha agaghịenwe ọñụ n’Ememengabiga ahụ ọ bụrụ na ha bụ ndị mmehie. Nke a karịrị nnọọ ebe nzute nke enyi na enyi ya gaanọ náekwuokwu náabaghị n’ihe. Nke a gaabụ òfùfè nke ụmụmmadụ gaenwe ọñụ na ngọzi nke Chineke na mmekọrịta ha na Ya.

Mgbe anyi gbakọtara maka òfùfèntutemmụọ maọbụ nzukọ nke ụmụ Chineke ọ bụla, anyị naanata ngọzi dị ukwu ọ bụrụ na anyi kpee ekpere tutu oge ahụ, rịọ kwa Chineke ka Ọ lụọọlụ n’etiti anyị. Mgbe anyị doziri obi anyị maka oriri nke imemmụọ site n’ịgwa Chineke okwu n’ekpere, anyị naabụ ngọzi nye ndịọzọ, bụrụ kwa ndị emejuru n’ike ọhụụ.

Ndị Agọziri n’ime Ihe Ndịa

Mgbe Jisọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, nke anyị naeme ugbu a kama Ememengabiga, Ọ sịrị, “Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.” Ọñụ naabịa mgbe anyị mere uche Chineke n’ụzọ Ọ chọrọ ya. Pọl Onyeozi dọrọ ụmụmmadụ akanántị ka ha ghara iri Nri Anyasị nke Onyenwe anyị ọ bụrụ na ha bụ ndịmmehie. Nke ahụ gaewetara ha ahụhụ. Ma mgbe nwa Chineke bịara na okpokoronri nke Onyenwe anyị, náechè kwa échìchè banyere abalị ahụ araara Jisọs nye, ọ naanata ngọzi buru ibu. Anyị adịghị ele náánị anya n’azụ ichèta àjà ahụ nke Kraist ji Onweya chụọ, kama anyị naelepụ anya n’iru náechere ụbọchị ahụ anyị gaeso Ya rikọọ n’Alaeze Ya.

Hezekaia chètaara ndị ahụ mkwà Chineke kweworo ha ọ bụrụ na ha gaechègharị. Ugbu a adọrọwo ọtụtụ Ụmụ Israel n’agha. Ọ bụrụ na ndị fọdụrụ gaeji obi ha niile chọọ Chineke, Ọ gaakpọghachi ndị ha ha hụrụ n’anya.

Ị gaechè na mmadụ niile gaamalite ichègharị na ikpeekpere mgbe ha natara akwụkwọozi dị otú a. Nke a bụ kwa olileanya na Chineke gaenyere ha aka. Kama nke ahụ, ndị ahụ kwara ndị wetara ozi ahụ emò, wee “nāchi ha ọchai.” Ọ bụ na ndịmmehie adịghị eme otù ihe ahụ taa?

Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ụwa chọrọ ịnụ ozi nke Oziọma. Ọ dị ka obi ụmụmmadụ jupụtara náánị ihe ọjọọ mgbe niile; na ọ bụ kwa náánị mmadụ olenaole naachọ ka azọpụta ha. Lee óké ọñụ anyị naenwe bụ ndị nyeworo Onyenwe anyị obi anyị, mata kwa na Eluigwe naechéré anyị! Lee kwa otú ọñu anyị naadịkarị ukwu ịhụ ka anaazọpụta ndịọzọ!

Mgbe niile anaenwe kwa mmadụ olenaole naanabata ozi nke Oziọma. Ụfọdụ ndị ahụ nọ n’Israel natara akwụkwọozi ahụ jikeere irubere Chineke isi na ịbịa Jerusalem idebe Ememengabiga.

Ndị ebo Juda nabatara ozi ahụ karịa ndịọzọ niile. Ọtụtụ nime ha bịara Jerusalem wee nye aka ikwatusi ebe ịchụàjà nke arụsị fọdụrụ na ibibi ha.

Òfùfè Sitere N’ala Obi

Ọ bụghị náánị na aghaghị ikwatusi ebe ịchụàjà niile nke arụsị mee kwa ka Ụlọukwu dị ọcha, kama ndị ahụ kwa aghaghị ime onweha ka ha dị ọcha maka Ememengabiga ahụ. Otú ọ dị, ohere adịghị imezu ememe niile nke ime ka adị ọcha nke anụarụ, ụfọdụ mmadụ aghaghị kwa inwetaworị iheotiti n’ihi na ha ririoriri Ngabiga náemeghị onweha ka ha dị ọcha. Hezekaia kpeere Chineke ka Ọ gbaghara emezughị ememe nke anụarụ a, wee gwọọ ndị ahụ. Chineke zara ekpere ya n’ihi na obi ndị ahụ echègharịkwuruwo Chineke, nke ahụ bụ kwa ihe dị mkpà karịa ememe. Ọ bụ òfùfè sitere n’ala obi ka Chineke chọrọ.

Oge bịara n’akụkọ banyere Israel mgbe ha leziri anya náedebezu ememe niile na iwu niile nke òfùfè, ma obi ha dị anya n’ebe Chineke nọ. Chineke kwuru n’oge ahụ sị: “Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta, -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi ngbochi” (Aisaia 1:13, 14). Ndị ahụ chọrọ ka ha dị nsọ. “Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n’iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ mutanu ime ezi ihe” (Aisaia 1:16, 17).

Ịñụrịọñụ nime Onyenwe anyị

Chineke nụrụ ekpere Hezekaia, hụ kwa na obi ndị ahụ ziriezi, wee wụkwasị ndị niile doziworo obi ha ịchọ Ya ngọzi Ya. Ụbọchị asaa ka ha ji kwupụta mmehie ha wee nwee ọñụ nke ngọzi sitere n’aka Onyenwe anyị. Ha wee mee ememe achịcha ekoghịeko “n’ọñụ uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa JEHOVA kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto JEHOVA.” Ndi Livai wee kuziere ndị ahụ inwe “ezi uche banyere JEHOVA.” “A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! Le otú anēnwegh ike ichọputa ikpe-Ya nile, otú anēnwegh kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!” (Ndi Rom 11:33).

Ọ dịbeghị mgbe ọzọ ndị Israel nwere obiụtọ ra otú ahụ maọbụghị oge Solomon! Ha echịgharịkwuruwo Chineke wee náefè kwa Ya dịka iwu Ya si dị. Nke a ahụ wetara ezi obiụtọ. Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, ha kpebiri ịnọ ụbọchị asaa ọzọ. Onye ọ bụla ñụrịrịọñụ, ọbụná ndị ọbịa nọ na Jerusalem n’oge ahụ.

N’ikpeazụ, emesịrị óké ememe ahụ ndị ahụ wee laghachị n’ụlọ ha. Chèe échìchè ihe ha nwetaworo n’ihi ọbịbịa ha biara! Ha jikọtakwara ọzọ, náefè Chineke òfùfè n’ịdịn’otù nke okwukwe. Ha nwere mkpebì karịa ka ha nweworo na mbụ ijigide ezi okpukpé; ebe ọ bụla ha hụkwara arụsị na ebeịchụàjà nke arụsị, ha naakwatụ ha.

Ha nwere obiụtọ n’ihi na ha mezuru uche Chineke. Chineke naagọzi mgbe anyị nyere Ya ihe niile.

Ntute ahụ bụ náánị mmalite nke ọgbọ ọhụ nke ezi òfùfè na Jerusalem. Hezekaia mere ka nzukọ guzosieike, ijéozi nke ndịnchụàjà, iji otùụzọnaụzọiri lekọta ndịnchụàjà, na ihe niile dị mkpà ime ka ha wee fèe Chineke òfùfè n’ụzọ anaanara nkeọma. Hezekaia ji obi ya niile mee ihe niile o mere, Chinek wee mee ka ihe gaara ya na Ụmụ Israel nkeọma.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ememe Hezekaia chọrọ ime na Jerusalem?
  2. Òlee mgbe eburu ụzọ malite ememe a?
  3. Ò ruwo ihe ra ka arọ ole emebeghị ya?
  4. Gịnị ka ndị Israel mere iji jikere maka ememe ahụ?
  5. Òlee otú esi nabata akụkọ ahụ n’Israel ma na Juda?
  6. Gịnị mere mgbe anaeme ememe ahụ?
  7. Èmere ememe ahụ ụbọchị ole?
  8. Òlee ụdị òfùfè Chineke naanara?
  9. Gịnị ka Hezekaia mere mgbe emesịrị ememe ahụ?