Ndi-Filipai 4:8.

Lesson 341 - Junior

Memory Verse
“Turu ọlu-gi nile rue JEHOVA aru, échìchè-gi nile ewe guzosie ike” (Ilu 16:3).
Notes

Otù Akwụkwọozi

Pọl ejeruwo obodo Filipai dị na Masedọnia n’ijé mkwusa Oziọma ya nke abụọ na nke atọ. N’ekpere ya, o kelere Chineke ekele n’ihi ncheta ọñụ o nwere banyere ndị náeso ụzọ Kraist nọ n’ebe ahụ, na n’ihi mmekọrịta ha (Ndi Filipai 1:3-5). Ndị náesoụzọ Kraist nọ na Filipai chètakwara Pọl. Ha zigaara ya onyinye inyere ya aka n’ijèmkwusa Oziọma ya. N’otù oge ha zigara onyinye ha site n’aka otù nwoke anaakpọ Epafrọdaitọs. Mgbe Pọl degaara ndị Filipai akwụkwọozi ekele, ọ sịrị: “Emewo ka m’zue ezù, ebe m’natara n’aka Epafrọdaitọs ihe nile si n’aka-unu bia, isisi nke ihe ísì utọ, àjà nke anānaraa nke-ọma nke nāto Chineke ezi utọ” (Ndi Filipai 4:18).

Akwụkwọ Baịbụl amatara dịka Ndị Filipai bụ akwụkwọozi nke Pọl nye nzukọ dị na Filipai. Chineke kpaliri Pọl ide ya, site kwa na mgbe ahụ ndị niile náesoụzọ Jisọs anatawo ndụmọdụ na agbamume site na ya.

Échìchè

Akwụkwọozi Pọl naagwa anyị otú OnyeKraist gaesi biendu na ụfọdụ nime ọlụ ya. Pọl depụtara ezi ihe gaenye kwara ndị azọpụtara aka nke ha kwesịkwara ichè échìchè banyere ya. Échìchè onyeKraist naadị iche site na nke o naehcè mgbe anaasọpụtabeghị ya. Échìchè onyeKraist naadị iche site na nke o naechè mgbe anaazọpụtabeghị ya. Mgbe Aisaia bụ Onyeamụma naakpọ ụmụmmadụ òkù ka ha chègharịa, ọ sịrị: “Onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu échìchè-ya nile: ya laghachikute kwa JEHOVA, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n’aru-ya; ya lachachikute kwa Chineke-ayi, n’ihi na ọ gāgbaghara ya nmehie-ya n’uba” (Aisaia 55:7). Chineke kwuru banyere ndị-Ya sị: “M’gētinye Iwum n’uche-ha, ọ bu kwa n’obi-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ” (Ndi Hibru 8:10).

Ọ bụghị ezi échìchè náánị naeme ka mmadụ bụrụ OnyeKraist, ma ajọ échìchè pụrụ iduba ná mmehie. Mgbe mmadụ natasịrị ebere na mgbaghara nke mmehie-ya, ọ naachọ ka udo ahụ dịgide nime obi ya. Aisaia bụ Onyeamụma sịrị: “I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n’udo: n’ihi na ọ bu Gi ka ọ nātukwasi obi” (Aisaia 26:3).

Devid matakwara mkpà ọ dị ka OnyeKraist chéé échìchè ya nche. O kpere ekpere ka ntụgharị niile nke obi ya maọbụ échìchè ya niile na okwu niile nke ọnụ-ya, bụrụ ihe náatọụtọ n’iru Chineke (Abù Ọma 19:14). Devid rịọrọ Chineke ka Ọ nwaa échìchè ya, hụ kwa ma ọ dị ụzọ ọ bụla náeweta ihemgbu dị nime ya (Abù Ọma 139:23, 24).

Chineke maara échìchè anyị, Ọ naedekọta kwa ihe niile anyị naechè banyere Ya. Malakai Onyeamụma sịrị: “Ndi nātu egwù JEHOVA nēkwurita okwu, otù onye na ibe-ya: JEHOVA we ña nti, nu, ewe dere ndi nātu egwù JEHOVA, ndi nēchè kwa échìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n’iru Ya” (Malakai 3:16

Ihe Bụ Eziokwu

Ebe anyị hụworo na échìchè anyị bụ ihe dị mkpà otú a, gịnị ka anyị ganaechè échìchè banyere? Pọl sịrị, “Ka ihe bu ezi-okwu ra, … nāgukọnu ihe ndia.” Ọtụtụ ihe dị n’uwa taa abụghị eziokwu. Òlee otú mmadụ pụrụ isi mata ihe bụ eziokwu? N’otù oge, mgbe Jisọs naekpeekpere, náagwa Chineke okwu, Ọ sịrị, “Okwu-Gi bu ezi-okwu” (Jọn 17:17). Okwu Chineke bụ Baịbụl, Baịbụl bụ kwa -eziokwu. Ọ naakuziri anyị na nkwà niile nke Chineke bụ eziokwu. Anyị naagụ na “ikpé nile nke JEHOVA bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n’otù” (Abù Ọma 19:9). Nime mkwà niile nke Chineke, nke ngọzi na ikpé, enwere àkụ nke ezi échìchè. Ịtụgharịụche n’ihe ndịa bụ eziokwu kwesịrị ime ka mmadụ kpebìe n’obi ya ibindụ ya nye Onyenwe anyị. Mgbe ahụ ka ọ gaenweike ikwu na mkwà niile ahụ dị ebube nke ngọzi bụ nke ya.

Ụgha

Setan bụ nna nke ụgha, ọ dịghị kwa eziokwu dị nime ya (Jọn 8:44). Ọ bụ onyeiro nke mkpụrụobi anyị, ọ gaagbalị kwa ihe niile ime ka anyị kwere ma chèe kwa échìchè banyere ihe náabụghị eziokwu. Mgbe ị naarịaọrịa, o nwereike ịchọ ime ka ị chèta na Chineke agaghị agwọ gị; ma Onyenwe anyị naasị, “Mu onwem bu JEHOVA Nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26).

Nke a bụ iheatụ nke otù onye chère échìchè banyere ihe bụ ụgha. Setan, n’ụdị nke agwọ, gwara Iv okwu ụgha n’ogige Iden. Ọ sịrị ya, “Ọ digh ọnwu unu nāghagh inwu” (Jenesis 3:4). Chineke ekwuwo sị: “Nkpuru nke sitere n’oisis ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n’ihi na n’ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghagh inwu anwu” (Jenesis 2:17). N’ihi na Iv chère échìchè banyere ihe bụ ụgha nke ekwensu gwara ya, anwara ya o wee mehie. Ekewapụrụ ya n’ebe Chineke nọ, o wee nwụaọnwụ nke imemmụọ. Ọ bụghị náánị nke ahụ, kama mmehie emewo ka mmadụ niile nwụọọnwụ nke imemmụọ. Náánị otù ụzọ nke mmadụ ọ bụla pụrụ isi nwee ndụ ọzọ bụ site n’inwe nzọpụta site n’Ọbara Jisọs.

Ka anyị che échìchè banyere ihe bụ eziokwu. Amara Jisọs dịka “ezi osisi vine” (Jọn 15:1), “ezi nri ahụ (Jọn 6:32), na “ezi Ìhè” ahụ (Jọn 1:9).

Ikwesịnsọpụrụ

Ikwesịnsọpụrụ bụ ihe ọzọ kwesịrị ịdị n’échìchè anyị. Ikwesịnsọpụrụ pụtara ime ihe nkeọma, na ịbụ onye apụrụ ịtụkwasịobi. Apụrụ ịtụkwasị onye náeme ihe kwesịrịnsọpụrụ obi na ọ gaeme ihe ziriezi. Ndịọzọ apụghị ịtụkwasị onye náadịghị eme ihe kwesịrịnsọpụrụ obi. Nkekanke, ndị náaghọgbu ndịọzọ, náadịghị eme kwa ihe nkeọma, ụmụmmadụ adịghị ahụ ha n’anya. Ọ dị mkpà ka anyị náeme ihe kwesịrịnsọpụrụ náechè kwa échìchè banyere omume niile ziriezi. Mgbe ụfọdụ otù onye pụrụ ịnaenyo ihe onyeọzọ dere wee náede n’ụlọakwụkwọ ebe ị naaga. Ekwensu gaagbalị ime ka ụmụntakịrị ndịọzọ chèe échìchè banyere omume ahụ náezighịezi. Ọ gaagwa ha na ọ dị mfé, o gaatụpụtara ha ka ha nwaa kwa ya. Mgbe ha chère échìchè ya, tụọ kwa atụmààtụ ya, iheọzọ bụ ime ya. Ọ bụghị ihe ijuanya mgbe ahụ na Pọl nyere ndụmọdụ ka ụmụmmadụ náechè échìchè banyere ihe kwesịrịnsọpụrụ.

Aghụghọ

Nime Baịbụl enwere iheatù banyere ndị chère échìchè ime ihe náekwesịghịekwesị. Ụfọdụ ndị náesoụzọ Jisọs naere iheonwunwe ha náenye kwa Ndịozi ego ha retara. Ananaias na Safaira nwunye ya chèpụtara ụzọ ha gaesi gosi onweha na ha mere dịka ndịọzọ. Ha rere ihe ha nwere. Ha kwurịtaraokwu wee kpebìe ihe ha gaeme. Ananaias weere náánị ụfọdụ ego ahụ nye Ndịozi. O mere ka agaasị na ọ bụ ego ahụ niile. Ọ bụ onye aghụghọ na onye náekwesịghị ntụkwasịobi. Ọnwụ bụ ahụhụ enyere Ananaias na Safaira. Ụgha bụ iheọjọọ, ma emere ya n’omume maọbụ na ekwuru ya ekwu. Anyị kwesịrị ịkwesịntụkwasịobi, náechè kwa banyere ihe kwesịrịnsọpụrụ.

Ihe Ziriezi na Ihe dịọcha

Ịziezi, dịka iwu Chineke si dị, bụ ịbụ onye eziomume na ikwesịntụkwasịobi, náebindụ rue ogo Baịbụl tụpụtaworo. Ịdịọcha bụ ịbụ onye náenweghị amamikpé, onye náemeghị iheọjọọ, na ịbụ onye dị ọcha. Cheè échìchè n’ihe ndịa. Ụdị akwụkwọ mmadụ naagụ na ụdị onyinyo ọ naele na ụdị abụ na akụkọ ọ naege na enwe mmetụta dị ukwu n’échìchè ya. Ọ bụghị náánị anyị ka ọ naemetụ kama ọ naemetụ kwa omume anyị na otú anyị si ebindụ. Ụmụntakịrị na ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa ka amaara nkeọma dịka ndị naeme otù ụdị iheọjọọ niile ahụ nke ha hụworo na sinima, na televisịon, na nke ha nụworo na redio. Ha chère échìchè banyere ha, tụgharịa uche na ha, wee nwaa ime ha. Oge ụfọdụ, ụdị ihe a ebuteworo ha ọnwụ, maọbụ ọnwụ nke ndịọzọ ma wetara ha ahụhụ.

Échèla na mmadụ nwereike lee mmehie anya ma ọ gaghị enwe mmetụta n’obi ya. Ọ naenye ekwensu ohere iwebata échìchè niile náadịghị ọcha nke náezighị kwa ezi n’uche mmadụ na nke naanwa mmadụ ịbà ná mmehie. Gịnị mere mmadụ gaeji were ihe bụ mmehie mebie onweya ebe enwere ọtụtụ ihe dị ọcha nke makwara mma anyị gaenwe ọñụ na ha? Gịnị mere ị dịghịagụ akwụkwọ dị mma? Gịnị mere ị dịghịege abụ dị mma? Gịnị mere ị dịghị ekiri ihe Chineke kère? Ha adịghị anwa mmadụ ịbà ná mmehie. Ihe ekèrèèkè n’ụdị ya -- ogige okokoosisi, anyanwụ náacha uhie n’ọdịda ya, miri si n’ugwu náasụpụta --- ha niile náeto Chineke n’ụzọ nke ha náecheta kwara anyị na anyị kwesịrị ime otú ahụ.

Ihe Kwesịrị Ịhụn’anya

Chèe échìchè banyere ihe kwesịrị ịhụn’anya! Gịnị bụ ihe kwesịrị ịhụn’anya? Ihe niile naakpali anyị ịhụn’anya na ịjamma. Abụ banyere ebere Chineke, akụkọ banyere nlekọta Ya, onyinyo banyere ndụ Jisọs -- ọ bụ na ha adịghị akpalị anyị ịhụ Ya n’anya karịa? Tụlee n’obi gị na Kraist hụrụ anyị n’anya rue n’inye ndụ Ya ka ewee nweeike ịzọpụta anyị. Ọ bụ na nke a adịghịeme ka ị hụ Ya n’anya? Anyị onweanyị naahụ Ya n’anya n’ihi na Ya onweya buruụzọ hụ anyị n’anya.

Ị naechè échìchè banyere ezi ihe dị na ndụ ụmụụlọakwụkwọ ibe gị, ndị enyi gị, na ndị nke Chineke? Setan bụ onye náebo ụmụnna ebubo. Ọ naachọ ka anyị náechè échìchè banyere ndahie nke ndị ọzọ, maọbụ okwu maọbụ omume náabàghị úrù, maọbụ ihe ọ bụla nke nwere oyiyi nke iheọjọọ. Ọ bụrụ na anyị edebe ụdị échìchè a n’obi anyị, ọ gaeme ka anyị naenwe obi ọjọọ n’ebe ndị ọzọ nọ. “Ọ buru na idi-nma ọ bula di, ọ buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.” Náánị mmadụ olenaole dị n’ụwa bụ ndị náenweghị eziihe dị nime ha nke kwesịrị otuto nke dị nime Ndị Kraist ibe ya, náekpesi kwa ekpere ike ka Chineke nyere onye ọ bụla nime ha aka ka ha bụrụ ezi NdịKristian, emere ka ha guzosieike “n’ezi ọlu na ezi okwu nile ọ bula.” Ka anyị chèe échìchè banyere ihe gaakpalị obi anyi inwe ịhụn’anya n’ebe Chineke na ndị Ya nọ.

Ihe Ekwuru Nkeọma

NdịKraist náechèe échìchè banyere ihe ekwuru nkeọma, kama ịtụgharị uche n’akụkọ gaeme ka ha daa mba, nwee kwa obiabụọ. OnyeKraist adịghịege okwuazụ, ma ọ fọdụ kwa ichè échìchè banyere ya. Baịbụl nyere iheatụ nke ụfọdụ ndị tụgharịrị uche n’akụkọ ọjọọ. Ezipụrụ ndịnledo iri na abụọ ka ha jee nyochaa Ala Kenean. Mgbe ha latara, ndịnledo iri wetara akụkọ ọjọọ, náekwu banyere obodo agbara mgbidi na ndịokoroukwu. Otù nime ndịnledo ahụ wetara akụkọ ọma sịrị, “Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n’ihi na ayi puru ime ya nke-ọma” (Ọnu-ọgugu 13:30). Ndị ahụ echèghị échìchè banyere mkwà niile nke Chineke. Ha chère échìchè banyere akụkọ ọjọọ ahụ, kwere ya, wee wagharịa n’ọzara iriarọanọ.

“Ọ buru na idi-nma ọ bula di, ọ buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia.” Eleghịanya okwu niile ndịa pụrụ ịchịkọta ndụmọdụ niile ọzọ banyere échìchè anyị. Anyị pụrụ ịmara échìchè ọma maọbụ nke ọjọọ site na nke a: Ọ dị ịdịmma, ihe kwesịrị ọjịja, ọ dị nnọọ ezi ihe ọ bụla dị na ya? Ọ dị kwa otuto, ihe kwesịrị nnabata, nsọpụrụ dị na ya?

Ịbànye Nime Obi

Mmadụ nwereike ghara inweike igbochi échìchè ịbata n’obi ya ma ọ pụrụ ịghara ikwe ka ha nọgide n’ebe ahụ. Wepụ échìchè ọjọọ niile ekwensu náagbalị itinyen’uche gị, ka ha wee ghara ịbà n’obi gị wee ghọọrọ gị mmehie. Enyere ihe nkọwa a: Mmadụ apụghị igbochi nnụnụ ifefe n’elu isi ya ma ọ pụrụ ịgbochi ha ịkpà akwụ n’agịrịisi ya. Otùaka ahụ, mmadụ nwereike ghara inweike igbochi échìchè ọjọọ ịbata n’uche ya ma ọ pụrụ igbochi ha ịnọgide n’ebe ahụ site n’ichè échìchè banyere Chineke na Okwu Ya. Jisọs mere ka ekwensu rapụ Ya site n’ịgụpụta okwu sitere n’Akwụkwọnsọ. Anyị nwereike ichetara onweanyị amaokwu ibun’isi anyị mụworo, maọbụ ụfọdụ amaokwu nke Akwụkwọnsọ anyị gụworo n’òfùfènrò anyị náenwe kwa ụbọchị; ka anyị náeji kwa ihe niile a náemeju obi anyị, ekwensu gaarapụ kwa anyị.

Pọl sịrị: “Nāñurinu ọñu n’Onye-nwe-ayi mgbe nile: --- Unu echègbula onwe-unu n’ihe ọ bula; kama n’ihe nile ọ bula site n’ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ. Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na échìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus” (Ndi Filipai 4:4-7).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye degaara Ndị Filipai akwụkwọozi a?
  2. Òlee mgbe o jeworo Filipai?
  3. Gịnị ka anaechèta banyere Lydia, na onyenche ụlọmkpọrọ dị na Filipai?
  4. Òlee ụzọ ndị Filipai si cheta Pọl?
  5. Òlee otú Pọl si cheta ha?
  6. Gịnị ka échìchè naalụpụta ná ndụ mmadụ?
  7. Òlee otú échìchè si emetụta omume mmadụ?
  8. Òlee otú anyị pụrụ isi mata ma échìchè dị nime anyị ọ bụ ezi échìchè maọbụ nke ọjọọ?
  9. Kpọọ aha ihe ụfọdụ ekèreekè náenye Chineke otuto kwesịkwara ime ka anyị too Chineke.
  10. Kpọọ aha ihe ụfọdụ ọzọ náenwe mmetụta n’ebe échìchè anyị nọ.