Aisaia 2:1-22; Abù Ọma 2:1-12

Lesson 342 - Junior

Memory Verse
“Aghagh kwa ime ka JEHOVA, nání Ya, di elu n’ubọchi ahu. (Aisaia 2:11).
Notes

Nke Kachasị Mkpà

Ka oge naagafe ụbọchị naabịa kwa naagabiga, i nwereike inwe ọchịchọ nime obi gị banyere ihe ụfọdụ nke ị náapụghị inwe. Eleghịanya ị naachọ ịbànye n’ụlọakwụkwọ dị elu otù ụbọchị, maọbụ o nwereike bụrụ na i nwere ọchịchọ ijé ebe dị icheiche dị anya wee hụ ụwa. I nwereike ghara inweta ha. Ihe ụfọdụ dị mkpà nke ukwu na ọ gaghịadị mma ịrapụ inweta ha. Ka anyị were oge a lerueanya nkeọma n’ihe ndị dịkarịrị mkpà ná ndụ.

Anyị mụtara n’otù iheọmụmụ anyị mụrụ na mgbe nso a na ndịamụma Chineke dere Baịbụl mere nke a site na mkpalị nke Mmụọ Nsọ, na ihe niile edere nime Akwụkwọnsọ agaghị imezu. Aisaia, otù nime ndị amụma ukwu, dere ọtụtụ ihe gaemezu n’ọdịn’iru. N’isi nke abụọ nke akwụkwọ Aisaia anyị naagụ ụfọdụ okwu nke Maika dekwara, banyere onye anyị mụrụ ihe banyere ya n’Iheọmụmụ 330. Le ma ị pụrụ ịchọta amaokwu yiri ibe ha nime Akwụkwọnsọ. Ọ ghaghị ịbụworị okwu dị mkpà nke ukwu, ma ọ bụghị ya Chineke agaghịagwaworị ndịamụma Ya abụọ ka ha dee otù okwu ahụ. Ha niile bụ eziokwu ha gaemezu kwa; otú ọdị, ezonarịrị anyị oge ọ gaemezu (Matiu 24:36, 42).

Ọbịbịa Ọsọsọ

Ka anyị wee ghara inwe mgbagwojuanya banyere ihe niile gaeme n’ọdịn’iru na otú ha gaesi mezue n’usoron’usoro, ka anyị jisieike ịtụkwasị nnọọ uche anyị n’ihe dị n’iru. Ihe ukwu ọzọ gaeme ka ụwa maa jijiji naabịa ime -- ọ pụkwara imezu taa -- bụ ọbịbịa nke Jisọs ịbịa kpọrọ Nwunye Nsọ Ya naechere, “nzukọ” Ya, ndi jikereworo, náele kwa anya Onye-nwe-anyị (Matiu 24:36; I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17).

Nke a ka amatara dịka Mwelikọ nke ndịnsọ, ọ bụ kwa nke anyị náaghaghị isọ na ya! Jisọs agaghịagbadata n’elu ala n’oge Mwelikọ nke ndịnsọ, kama Ọ gaapụta n’igweoji; ndị jikereworo, gaebili n’otù ntabianya ewee nwoghaa ha ijé zute Onyenwe anyị. Ndị nwụrụ nime Kraist gaesi n’ílì ha bilie, náeyikwasị arụ ebube, ha gaezute kwa ya na mbaraigwe (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17).

“Ewere otù, rapu kwa otù” (Matiu 24:40, 41). Agaewere otù ka o je binyere Onyenwe anyị, rapụ kwa otù ịnọ n’ụwa nke a n’oge óké mkpagbu (Matiu 24:21; Aisaia 26:20, 21; Nkpughe 13:1-18). Oge nsogbu ahụ bụ otù nime ihe anyị aghaghị ileruanya hụ na anyị gbanarịrị ya; ọ bụrụ na anyị esoro na Mwelikọ ahụ, anyị agaghị atụegwù maka mkpagbu ahụ.

Nrianyasị nke Ọlụlụnwunye

Ndị niile ewepụrụ n’oge Mwelikọ ahụ gaenwe òkè na Nrianyasị nke Ọlụlụnwunye Nwaatụrụ ahụ (Nkpughe 19:7-9). Anyị amataghị nnọọ ihe nrianyasị ọlụlụnwunye a gaabụ, ma Kraist n’Onweya gaeje ozi; n’ihi na Ọ sịrị: “Ngọzi nādiri ndịorù ahụ, ndi, mgbe onye nwe ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n’ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe okiké n’úkwù, ma ka ha nọdu ná nri, ọ gābia kwa jere ha ozi” (Luk 12:37). Ugbu a ejikọtara obi anyị na Kraist, ma mgbe ahụ agaejikọta anyị na Ya ebighịebi. O! anyị matara na ọ gaabụ ihe ebube ịbụ onye mmeri wee jee “izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe” (I Ndi Tesalọnaika 4:17).

Dịka Onyenwe anyị mechibidoro Noa na èzínaụlọ ya ụzọ nime ụgbọ, otú ahụ ka Ọ gaemechibido Onweya na Nwanyị ahụ anaalụ ọhụ ná Nrianyasị nke Ọlụlụnwunye Nwaatụrụ ahụ. Ọbụná dịka ebuliri ụgbọ ahụ n’elu mmiri nke ijummiri ahụ otú ahụ ka agaeweli anyị na Kraist nime mbara-elu-igwe. Ijummiri ahụ abịaghị rue mgbe Noa na èzínaụlọ ya nọ n’udo nime ụgbọ ahụ, otùaka ahụ, anyị kweere na óké mkpagbu ahụ agaghị amalitere rue mgbe Jisọs naraworo ndịnsọ Ya nye Onweya.

Ọ bụ ná Nrianyasị nke Ọlụlụnwunye Nwaatụrụ ahụ ka agaenye ụgwọọlụ n’ihi ọlụ alụrụ n’ikwesị ntụkwasịobi. Ndị jiworo talent ha lụọọlụ n’ihi otuto Chineke gaanụ okwu ndia: I mere nkeọma, ezi orù nke kwesịrị ka atụkwasị gị obi, baa n’ọñụ nke Onyenwe gị. Ọlụ niile alụrụ dịka anaalụrụ ya Onyenwe gị. Ọlụ nile alụrụ dịka anaalụrụ ya Onyenwe anyị, n’ihi otuto Ya náánị, gaanata ezi ụgwọọlụ baraụba, agaesure kwa ọlụ niile ọzọ n’ọkụ (I Ndi Kọrint 3:13, 14).

Mkpagbu Ahụ

Mgbe Aisaia lepụrụ anya hụ ndịmmehie nọ n’ụwa, o mere ka anyị mata ihe gaabụ ọnọdụ ha mgbe ọ sịrị: “Madu gābà kwa n’ọgbà nile nke oké nkume nile, na n’olùlù nile nke ájá ipu n’iru oké egwù JEHOVA, na ipu n’ima-nma nke nbili-elu-Ya, mgbe O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku” (Aisaia 2:19). Ma ka ha chọgharịa otú ike ha niile ra, ọ dịghị ebe nzuzo gaadịrị ha site n’ebe Onye ahụ nke anya ya dị ka “ire ọku” (Nkpughe 19:12). Ewo, asị nnọọ n’àkụ ha gaekpepụta ha mgbe ahụ! ma ndị mpako, ndị anya ha dị elu ka agaeweda n’ala n’ụbọchị Jehova. Taa bụ ụbọchị nke mmadụ; “JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi” (Aisaia 2:12) nke náabịa. N’ụbọchị ahụ ọgaranya agaghị aka onye arịrịọ mma. Ha na àkụ niile ha kpadoworo maka “mgbe ikpe-azu” (Jemes 5:3), ọgaranya apụghị ịzụtara onweya ebe ịnọn’ụdo ọbụná nye náánị otù hour. Mmadụ gaetufu ọlaọcha na ọlaedo ya nke bụwooro ya arụsị ọ na eféòfùfè nye anụ mole na egwugwa ala na ụsụ náefeghrị n’ọchịchịrị nke ụlọ ruru unyi, mmadụ ná ebighị kwa nime ya (Aisaia 2:20). Ọ dịghị úrù ọ bụla ha gabaà n’ụbọchị ahụ.

Mkpughe

N’ọgwụgwụ nke arọ asaa nke mkpagbu ahụ, Jisọs gaabịaghachị n’ụwa ọzọ. N’oge a Ọ gaghịabịa “dika onye-iro” (I Ndi Tesalọnaika 5:2), kama “le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya” (Nkpughe 1:7). Nke a ka amatara dịka Mkpughe nke Kraist. Ndịnsọ náanọkwasị n’ịnyịnya ọcha gaeso kwa Ya, soro Kraist náabịghachị n’ụwa. Nke a bụ ihe óké ebube ọzọ nke anyi gaagbalịsịike ka ọ ghara ịganarị anyị, o dokwara anya na anyị gaenwe òkè na ya ọ bụrụ na anyị soro na Nwelikọ nke ndịnsọ.

Kraist naarịdata, dịka Jọn Onyeahụrụn’anya naagwa anyị, náanọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha “nma-agha di nkọ nēsi kwa n’ọnu-Ya puta, ka Ọ wee were ya tigbue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n’aka nke ígwè zùa ha dika aturu” (Nkpughe 19:15).

Ha-Magedon

Ìgwè ndịagha a naanọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha, nke Eze nke ndịeze na Onyenwe kachasị ndịnwenu niile naedu gaabà n’ụdị agha nke anaahụbeghị n’ụwa, Anaakpọ ya “Ha-Magedon.” “Onye ahu nēmegide Kraist” ka aga-atụbà “na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre” (Nkpughe 19:20), Jisọs Kraist gaachịkọpụ kwa n’Alaeze Ya “ihe nile nēme ka ama n’ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu” (Matiu 13:41).

Puku Arọ Nke Udo Ahụ

Ndịọchịchị nke ụwa, alaeze ukwu niile, na ndị amadị enwewo oge nke ha. Ma ọtụtụ ndịa jiri ekwensu mee onyeisi n’oge ọchịchị ha. Ma mgbe Kraist bịaghachịrị n’ụwa dịka Eze nke ndịeze na Onyenwenụ kachasị ndịnwenụ niile, agaewere óké mkpọrọ kee setan agbụ puku arọ (Nkpughe 20:1-3).

Aisaia kwuruokwu banyere oge ahụ n’isi ebeọgụgụ a, Ezikiel naagwa kwa anyị sị, “Ha gēbi n’ọzara na ntụkwasi-obi, raru ura n’oké ọhia” (Ezikiel 34:25). Anyị mụrụ n’Iheọmụmụ 168 nke Ndịetiti na nke Ndịokenye n’Akwụkwọ 13, na n’Iheọmụmụ 121 nke Ụmụnta, banyere oge ọbụná ụmụntakịrị gaenwe ike ịrarụụra n’ọhịa wee nọdụ n’udo. N’ụtụtụ mgbe ha biliri, ọ bụrụ na ha hụrụ anụọhịa wolf ka ọ naedina n’akụkụ ha, ha pụrụ igafe wee gwusa ya egwú náatụghị egwù, n’ihi na anụọhịa ọjọọ agaghịemerụ kwa mmadụ arụ, Ejula na ụmụ arụrụ ọzọ niile agaghị emebi kwa okokoosisi rose na osisi niile ọzọ agaghịenwe kwa ogwu n’arụ ha, ogwu na uke agaghị adị kwa imerụ anyị arụ na ịdọwasi uwe anyị. Mmiriiyi niile, ọdọmmiri niile, na isiiyi mmiri niile ka agaachọta n’ọzara niile kpọworo nkụ taa, mgbe ahụ ọzara gaagbawa “okoko-ọhia” (Aisaia 35:1). Agaghị ahụ kwa ndịìsì náarịọarịrịọ n’amá niile nke obodo, n’ihi na anya nile nke ndiìsì gaemeghe; ihe nile anaemepụta maka ịnuihe nkeọma agaghị adị kwa mkpà, n’ihi na “nti nke ndị ntị chiri ka agēmeghe. Mgbe ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ogbi gēti kwa nkpu ọñụ” (Aisaia 35:5, 6).

N’ọgwụgwụ nke ọchịchị Puku arọ ahụ, agaatọpụ ekwensu na nwa mgbe (Nkpughe 20:3, 7); ma mgbe náadịghị anya, agaatụbà ya n’ọdọọkụ ahụ ji brimstone náere, ebe agaemekpa ya arụ ehihie na abalị mgbe niile ebighịebi (Nkpughe 20:10).

Ikpé

Mgbe ahụ ka agaenwe Ikpé nke Óké Ocheeze Ọcha mgbe Kraist gaachịkọta ndị dị ndụ na ndị nwụrụanwụ ikpé ha ikpe n’ihi omume ha (Nkpughe 20:11-13). Ụbọchị nke ikpé ahụ agaghịetinye egwù ọ bụla nime ndi niile nweworo òkè na Nwelikọ nke ndịnsọ. Ndị buworo ụzọ zigaa mmehie ha ka ewee kpee ha ikpe (I Timọti 5:24), ndị niile ewepụworo ibinyere Onyenwe anyị ebighịebi agaghịatụ egwù ikpé. Ndịmmehie, ndị ajọomume, onye ọ bụla lefuworo nzọpụta nke Chineke anya jụ kwa ya ka agaekpe ikpé n’ụbọchị ahụ. “Àyi onweanyị gēsi aña gbanari, ma ọ bụrụ na ayi lefuru oké nzọpụta di otú a anya” (Ndi Hibru 2:3). Ọ dịghị mgbapụ dịrị ndị ahụ jụrụ ịchọ Chineke.

Ihe Kachasị Mkpà

Ọ bụ n’aka anyị ka ọ dị. Ọ bụrụ na anyị jikeere maka ihe ukwu ọzọ nke gaeme n’ụwa, nke bụ Mwelikọ nke ndịnsọ, ọ dịghị mkpà ka anyị tụọegwù maka ihe niile ọzọ gaeso. Ya mere anyị naekwubì na ihe kachasị mkpà na ndụ bụ ijikere izute Jisọs mgbe Ọ gaabịa. Ka azọpụta gị site ná mmehie gị, ọ bụrụ na i nwebeghị nzọpụta; chọọ kwa iru Chineke maka odudonsọ, na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ. Nọgidesiike n’ikpéekpere, náagụ kwa Baịbụl, nọdụ kwa ná njikere, “n’ihi na n’oge hour nke unu nēchegh ka Nwa nke madụ gābia” (Luk 12:40).

Usoro Iheukwu Gaeme Maka Nghọta Zuruòkè Lee

Mwelikọ nke Ndịnsọ (Ọbịbịa

Kraist dịka “onye-ori”) Iheọmụmụ 164, Akwụkwọ 13

Nrianyasị nke Ọlụlụnwunye nke

Nwaatụrụ, na mbara eluigwe na

ụgwọọlụ agaenye ndịnsọ n’Oche Ikpé

Nke Kraist Iheọmụmụ 165, Akwụkwọ 13

N’oge ahụ, Óké Mkpagbu gaadị

n’ụwa Iheọmụmụ 165, Akwụkwọ 13

Mkpughe Nke Kraist (Na Ndịnsọ ná

anọkwasị n’ịnyịnya ọcha náeso Ya Iheọmụmụ 166, Akwụkwọ 13

Agha Ha-Magedon Iheọmụmụ 166, Akwụkwọ 13

Ọchịchị Puku Arọ nke Kraist --

Arọ 1000 nke udo (Ndịnsọ na

Kraist naachị náabụ kwa eze) Iheọmụmụ 168, Akwụkwọ 13

Atọpụrụ ekwensu na nwa mgbe ntà

(Agha ikpeazụ nke Gog na Megog) Iheọmụmụ 168, Akwụkwọ 13

Ikpé nke Óké Ocheeze Ọcha (Atụbà

ndị ọjọọ nime Ọdọọkụ) Iheọmụmụ 169, Akwụkwọ 13

Eluigwe Ọhụụ na Ụwa Ọhụụ Iheọmụmụ 169, Akwụkwọ 13

Ebighiebi -- mgbe niile mgbe niile

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ Mwelikọ nke ndịnsọ? Ànyị matara mgbe ọ gaemezu?
  2. Gịnị bụ mkpughe nke Kraist?
  3. Gịnị ka amatara dịka Ọchịchị Puku Arọ? Kwuo otú ọnọdụ niile nke ụwa gaadị mgbe ahụ.
  4. Òlee ebe ụmụmmadụ gaagbalị ijé chọọ ebenzuzo pụọ n’iru Onyenwe anyị? Hà gaachọta ebe ha gaezo?
  5. Òlee ndị Onyenwe anyị gaachịọchị n’ọdịn’iru?
  6. Gịnị ka ụmụmmadụ gaeji ọlaọcha na ọlaedo ha mee n’Ụbọchị Onyenwe anyị?
  7. Gịnị bụ Ikpé nke Óké Ocheeze Ọcha?
  8. Òlee ndị gaanọ n’ebe ahụ? Ọ naetinye egwù nime gị ma ị cheta ya?
  9. Gịnị bụ ihe kachasị mkpà nye anyị ime?
  10. Ọ dị onye ọ bụla matara mgbe Jisọs gaabịaghachị? Òlee otú anyị si mata na ọbịbịa Ya dị ezi nso?