Abù Ọma 5:1-12

Lesson 343 - Junior

Memory Verse
“N’ututu ka m’gēdoro Gi ekperem n’usoro, che kwa nche” (Abù Ọma 5:3).
Notes

Òfùfè Ụtụtụ

Tupu gị arapụ ụlọ n’ụtụtụ a, ị chetara ikpeekpere? Ị chetakwara ịgụ ụfọdụ amaokwu nke Akwụkwọnsọ site na Baịbụl? Maọbụ ùnu nwere òfùfè nke èzínaụlọ n’ụlọ unu n’ụtụtụ a? Ụtụtụ bụ oge dị mma ifè Onyenwe anyị òfùfè, tupu ijé n’ụlọakwụkwọ, tupu ọlụ maọbụ igwuegwú gị amalite. Ọtụtụ mgbe ọlụ nke mmadụ nwere ịlụ n’ụbọchị naebochirị ya ohere ịgwa Chineke okwu na ikwe ka Chineke gwa mkpụrụobi ya okwu. N’ebe ọzọ Devid dere sị, “Anyasi, na ututu, na etiti ehihie, ka m’gātughari-uche” (Abù Ọma 55:17).

Ichénché

Devid sịrị: “JEHOVA, n’ututu ka I gānu olum; n’ututu ka m’gādoro Gi ekpere n’usoro, che kwa nche” (Abù Ọma 5:3). Eleghịanya ihe Devid bu n’obi n’ikwu okwu a bụ “che kwa nche” bụ na site n’okwukwe ya naahụta iru Chineke ngwangwa nwee kwa ike ịmụta uche Ya “Anyam gādikwasi kwa gi n’aru” ndia bụ kwa okwu nke Onyenwe anyị nke Devid dere n’Abù Ọma 32:8.

Ọ dịwo mgbe nne gị maọbụ nna gị gosipụtara na ihe i mere adịghị ha mma site náánị n’ile gị anya náekwughị kwa okwu ọ bụla? Maọbụ, n’ụzọ ọzọ, ọ dịwo mgbe ha gosipụtara nnabata nke omume gị site n’ile gị anya n’obiụtọ nke náapụta ìhè n’anya ha” Mgbe i weliri anya lee Chineke ị gaama ma obi ọ dị Ya ụtọ n’ihi ndụ ị naebì.

Lee otú nna gị naenwe obiụtọ mgbe ị mere ihe ọ kwuru, bie kwa ndụ nke ezigbo nwatakịrị nwoke maọbu nwatakịrị nwanyị! Ọ bụrụ na nna gị bụ OnyeKraist ọ gaachọ ka ụmụ ya bụrụ ezi ụmụ náerube kwa isi. Lee otú ọ kpọrọ omume ọjọọ, mmehie, na aghụghọ asị ọ bụrụ na ọ chọpụta na otù nime ụmụ ya naeme omume dị otú a! Devid sịrị na Chineke kpọrọ ndị naalụọlụ ajọomume asị; Ọ ka hụrụ mkpụrụobi ha n’anya, Ọ chọkwara ka mmadụ niile si ná mmehie ha chègharịa wee nweta nzọpụta, ma Ọ kpọrọ ụzọ ọjọọ ha niile asị o dokwara anya na ọ gaebibi arụ na mkpụrụobi nke ndịmmehie náechègharịghị. “Nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n’iyì n’ọku ala-mọ” (Matiu 10:28).

Devid nwere obi na akọnauche dị ọcha nwere kwa onweya site n’ikpé na amamikpé niile. Nke ahụ bụ ihe mere o ji pụ iweli anya ya lee iru Chineke dịka nwata matara na ya emeghị isiike, o kwughị okwuụgha, o kwughị kwa okwuọjọọ maọbụ okwu náadịghịmma gaewute ndịọzọ, pụrụ ilegide ndị mụrụ ya anya n’iru náemeghị ihere maọbụ tụọ egwù na agaenye ya ahụhụ.

Ire Náekwuokwu Ireụtọ

Ihe ndịọzọ Devid kpereekpere banyere ha bụ iruabụọ na ireụtọ. Chineke kpọrọ ihe ndịa asị dịka Devid kpọkwara ha, ezi OnyeKraist ọ bụ nke náebì náeso kwa Chineke jeeijè náakpọ kwa ha asị, ọ ghaghịekwe kwa ka ikpé nke mmehie ahụ jọgburu onweya maá ya. Ndị niile náekwu iheọzọ mgbe ha bu ihe ọzọ n’obi bụ ndịiruabụọ. Ọ bụrụ na onye ireụtọ abịa gwa gị” okwu dị ụtọ” wee chigharịa kwuo “okwu ọjọ” banyere gị n’ebe onyeọzọ nọ, ọ bụghị ezi enyi, o dokwara anya na ọ bụghị OnyeKraist. Devid sị na akpịrị onye ahụ dị ka ílì ghereoghe. Ílì bụ ebe anaelì ndị nwụrụanwụ, aghaghị kwa ikpuchi ya ka ọ ghara iwepụta ísì ọjọọ nke ihe rereurè. Ya mere ka ndị niile bụ ndị ireụtọ na ndị iruabụọ were aka ha dochie ọnụ ha mọbụ kpuchie ọnụ ha.

Ka anyị bụrụ ndị omume anyị ziriezi na ndị náekwu eziokwu, ghara ịbụ ndị agaahụta na ikpé nke omume aghụghọ na iruabụọ mara anyị. Ọ bụrụ na anyị naekwu eziokwu mgbe niile site n’obi anyị o nwereike iwuta onyeọzọ, ma Okwu Chineke naagwa anyị sị, “Ihe kwesịrị ntụkwasịobi ka ogbugbu-mma nile nke onye nāhu gi n’anya bu: ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu” (Ilu 27:6). Nke ahụ apụtaghị na anyị kwesịrị ịnaejégharị náeme ihe gaewute ndịọzọ mgbe niile; ma Onyenwe anyị gaenyere anyị aka inwe amamihe na nghọta otú anyị gaesi náekwuokwu wee ghara ịbụrụ ndịọzọ ihe ịma n’ọnyá, ghara kwa ịbụ ndịiruabụọ.

Edebere N’udo

Ọ bụrụ na ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa niile bụ NdịKraist ganaechèta ikpeekpere n’ụtụtụ wee bulie obi ha nye Chineke ogologo ụbọchị ahụ, Chineke gaedebe ha. Ha gaenwe kwa ike ibindụ náemeghị mmehie náemebighị kwa nke ọ bụla nime iwu niile nke Chineke. “N’ihi na, onye ahu nke nāchọ ihu ndu n’anya, na ihu ezi ubọchi, ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, me kwa ka egbugbere-ọnụ ya ghara ikwu okwu aghughọ” (I Pita 3:10).

Ekpere ụtụtụ nke Devid bụ ka Chineke duzie ya. Lee obiụtọ Devid nwere n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi! Ọ pụrụ itimkpu ọñụ, dịka ụmụ Chineke niile pụrụ ime n’ihi nchébe ịhụn’anya nke Onyenwe anyị. N’ezie ọ bụ Chineke n’Onweya naekpuchi náanapụta kwa ndị eziomume site n’ihe ọjọọ niile. Ị gaghị achọ ka ọta nke nchébe Ya gbaa gị gburugburu karịa ike ọ bụla ọzọ nke ụwa?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ aha nsọpụrụ nke Devid nyere Onyenwe anyị?
  2. Gịnị bụ oge nke ụbọchị Devid sịrị na ya gaekpeekpere?
  3. Gịnị mere Devid ji rịọ Onyenwe anyị ka O duzie ya?
  4. Gịnị ka Devid kwuru banyere ndị ireụtọ?
  5. Gịnị ka o ji tụnyere akpịrị nke onye ireụtọ?
  6. Gịnị ka Devid kwuru banyere ndị náatụkwasị Jehova obi?
  7. Gịnị mere ụtụtụ ji bụrụ oge dị mma nye anyị ikpeekpere?
  8. Ugbò ole ka Daniel kpereekpere?