2 Ihe Emere 32:1-22; 2 Ndi Eze 19:14-37

Lesson 344 - Junior

Memory Verse
“Nke nọnyere ayi bu JEHOVA, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi” (2 Ihe Emere 32:8).
Notes

Ịlụọlụ Nye Onyenwe anyị

Ejighị obi niile lụara Chineke ọlụ enweghị ọnọdụ na ndụ Hezekaia. Gụọ Iheọmụmụ 340 wee mụta ọlụ niile dị ukwu nke ọ lụrụ. Mgbe niile ngọzi Chineke naeso ndị niile ji obi ha náefe Chineke òfùfù; dịka Hezekaia, ha onweha gaenwe kwa ọgan’iru.

Ọtụtụ mgbe, mmadụ malite ịlụrụ Chineke ọlụ, setan gaabịa gbalịa igbochi ọlụ ahụ. Otù mgbe Jisọs kọrọ akụkọ banyere otù nwoke ghara mkpụrụ ọma n’otù ubi. Ma onyeiro bịara n’abalị wee ghaa kwa ata n’etiti ọka, wee laa (Matiu 13:24, 25).

Ịnyaisi Nke Otù Eze Ọjọọ

N’iheọmụmụ a anyị gaahụ na otù onyeiro bịara náakwụgharị náagbalị igbochi Hezekaia bụ ezi eze n’ọlụ ọ naalụrụ Chineke. Senakerib, eze Asiria, chịkọtara ndịagha ya bịa maa ụlọikwù ha n’akụkụ obodo ahụ ewusirịike bụ Juda wee chee na ya pụrụ iwere ha. Ọ bụ na o meribeghị n’ọtụtụ agha dị ukwu n’oge nke ya? Gịnị, o ji ìgwè ndịagha ya karịrị narị puku iriastọ na ise (185,000) náanyaisi, “Ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbụ ala-eze ọ bụla puru ịnapụta ndị-ya n’akam …. n’ezie Chineke-unu agagh-anaputa kwa unu n’akam.” Gịnị ka Senakerib naachọ kwa? Ọ naekwu na Chineke Hezekaia dara mba karịa chi niile nke ndị náamaghị Chineke (2 Ndi Eze 19:12, 13)? Ka anyị hụ.

Ihe niile Senakerib bụ Eze kwuru megide Hezekaia adịghị ya mkpà, ma mgbe ọ natara akwụkwọozi nke okwu ịtaụta dị nime ya megide Jehova Chineke nke Israel onye Hezekaia hụrụ n’anya, náefè, náalụrụọlụ, náerubekwaraisi, nke ahụ bụ ịgabiga ókè.

Ntụkwasịobi Nke Hezekaia

Hezekaia zipụrụ ndịagha ya otù mgbe ahụ ijé lụso ndịiro ọgụ ugbu a ndịagha ya bụ ndị ejikereworo nkeọma? Arọpụtawo ndịisiagha, ewuwo kwa mgbidi, mee kwa ọtụtụ ngwaagha. Ihe niile nọ ná njikere, ma ntụkwasịobi Hezekaia adịghị n’ihe niile ahụ.

Ọ gwara ndịagha ya n’okporoụzọ niile nke obodo ka ha ghara ịtụegwù eze maọbụ nke ìgwè ndịagha so ya, n’ihi na “nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya” ka ọ sịrị. Senakerib tụkwasịrị obi n’ike nke ụsụ ndịagha ya; ma Hezekaia sịrị, “Nke nọyere ayi bu JEHOVA, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi.” Lee ụdị okwu ịgbaume dị otú a sitere n’ọnu onyendú ha! Ewepurụ egwù niile nime ndịagha Juda -- ha nwere okwukwe nime onyendú ha.

Ndịndú Kwesịrị Ntụkwasịobi

Lee otú obi anyị jupụtara n’ekele n’ụbọchị taa n’ihi ndịndú na eguzoro Chineke náagba kwa obi anyị ume ịtụkwasị Chineke nke Hezekaia obi! Ọ bụrụ na anyị nwere iruọma inwe ndịnlekọta, ndịọzụzụatụrụ, na ndị náeje ozi nke Oziọma ndị náatụkwasị Chineke obi mgbe ọ dị ka ike nke onyeiro naakarị, ka anyị gụọ ha ná ndị dị ókéọnụ “were kwa ihu-n’anya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n’ihi ọlu-ha” (I Ndi Tesalọnaika 5:13).

Mgbe niile anaenwe ụfọdụ ndị náagbalị ịkwagharị okwukwe nke ndị nwere ntụkwasịobi na Chineke na ndịndú ha. Otù onye gaasị, “Ọ dịghị mkpà na ị gaesoro ndụmọdụ ya,” maọbụ dịka Senakerib sịrị, “Unu ekwela ka Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a … unu ekwe-kwa-la ya.” Ma anyị matara na Chineke naanọnyere ndị Ya arọpụtara ilekọta ìgwè atụrụ, ọ bụ kwa ọlụ na ohere dịrị anyị ịdabere ná mkpebì ha.

Iheagha Nke Ekpere

Ma enwetabeghị mmeri ahụ -- ọ dị kwa ihe karịrị agaeme. Ikwuokwu agbamume náenyeaka ebe ọ dị ukwu ịkwalite onye náadịghịike. Okwu ọnụ naenye kwa aka ebe ọ dị ukwu ịkwalite okwukwe nke onye daworo mbà. Ma ọ dị ihe dị ukwu nke anyị gaeme karịa ịgwa onye náarịaọraịa sị, “A, ị gaadị mma!” Ihe fọdụrụ anyị gaemere onye emechibidoro n’ịlụso ọrịa maọbụ ịdambà ọgụ karịa ịchịsa ya ọchị maọbụ ikwe ya n’aka maọbu inye ya okokosisi dị icheiche maramma. Ihe niile ahu dị mma nke ukwu, ma ọ ka dị iheagha dị mma karịa nke anyị náaghaghị iji lụso onyeiro ọgụ. Ọ bụ iheagha nke ekpere, náánị otù iheagha nke naakwada ike nke onyeiro -- ọ bụghị ekpere otù ntabìanya maọbụ abụọ, kama ụdị nnọgidesiike nke náejigide rue mgbe ọzịzá gaabịa.

Jekob kpereekpere rue chiọbụbụ, ewee zaa ekpere ya (Jenesis 32:24). Elaija kpereekpere ugbù asaa tupu ya enweta ọchịchọ nke obi ya (I Ndi Eze 18:43). Hana nọgidere n’ekpere, náakwa kwa ákwá rue mgbe o kperuru ná mmeri, mgbe ahụ “iru-ya agbarugh kwa n’ihi ya ọzọ” (I Samuel 1:10-18). Ụdị ekpere ahụ naalụpụta kwa ihe taa.

Ekpere Hezekaia

Ka anyị naechè ihe banyere Hezekaia bụ Eze, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ na anyị hụrụ ya ka ọ naabànye n’ụlọ Jehova. Iru ya gosipụtara échìchè nke obi ya, akwụkwọozi ahụ nke ejiri taa Chineke nke Israel ụta dị kwa n’aka ya, nke Senakerib, eze Asiria dere. Anyị naahụ Hezekaia ka o gburu ikpere n’ala n’ekpere; anyị naanụ kwa ka ọ naasị, “JEHOVA, bú Chineke Israel, … Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.” N’ekpere ya ọ nabatara na eze Asiria ebibiwo mba na ala niile ọzọ, tụbà kwa chi ha n’ọkụ. Ọ tụkwasịkwara, “n’ihi na ọ bugh chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n’iyì.” Ọ rịọrọ Chineke: “Zọputa ayi n’aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu JEHOVA, bú Chineke, nání Gi.”

Chineke agaghị arapụ ịzá ekpere sitere n’ala obi nke onye náebi nso Chineke, dịka Hezekaia mere. Chineke zigara onyeozi site n’aka Aisaia Onyeamụma nke Chineke ịgwa ya sị, “Ekpere nke i kpeworom banyere Senakerib … anuwom ya” (2 Ndi Eze 19:20). Jehova kwuru banyere Senakerib na ọ gaghị abà n’obodo ahụ, ọ gaghị agba kwa otù àkụ n’ebe ahụ, ọ gaghị ewere kwa ọta bịa n’iru ya, kama ọ gaalaghachị n’ụzọ o siri bịa. “M’gēgbochi kwa obodo a izọputa ya, n’ihi Onwem, na n’ihi Devid, bú orùm.”

Mmeri

Hezekaia alụwo agha n’ikpèrè ya, mmeri dị kwa n’iru. Ọ dịghị egbe agbara, ọ dịghị àkụ agbapụrụ, ọ dịghị anwụrụọkụ nke agha kwụgoro n’ọmụma ụlọikwù nke ndịiro. N’abalị, mgbe ndịagha nke Chineke nọ n’udo, mmụọozi nke Jehova weere nwayọ jégharịa n’ọmụma ụlọikwù nke onyeiro. N’isi ụtụtụ mgbe ndịkom Hezekaia biliri ha hụrụ narị puku ozu iriasatọ na isi (185,000) n’ọmụma ụlọikwù nke onyeiro! Senakerib onyenganga náanya isi laghachịrị n’ala ya n’iru ihere bụrụ kwa onye emeririemeri.

Ụgha Nke Ekwensu

Nke ahụ bụ uzọ chi nke ụwa nke a si alụọlụ -- ọ naekwemkwà mmeri, ọñụ, àkụnaụba, udo, na ọgan’iru. Ọtụtụ mgbe anaanapụ ndị náekwere ụgha ya ihe niile dị mma, náadịgide, nke kwesịkwara nsọpụrụ. Ọtụtụ ụmụagbọghọbịa ka chi nke ụwa nke a mechiworo anya ha ha wee refue mma, ịdịọcha, na ijisi onweha ike, ha wee bụrụ ndị arapụrụ náánị n’ịkwaụta. Ụmụokorọbịa kwa ka arafuworo site ná mkwà nke ekwensu inye ha udéaha maọbụ ego, náenwe kwa mmetụta na ha pụrụ ime mmehie náenweghị kwa onye gaachọpụta ha.

Jehova Chineke, Onye Náachị ihe Niile

Chineke dị ike karịa Nisrok bụ chi Senakerib naefèòfùfù emeriwo Senakrib n’oge a. Gịnị mere? Senakerib, Nisrok eledawo gị anya. Gịnị mere ichigharịkwurughị Chineke Hezekaia? Gịnị mere ịnabataghị na Ya ọbụná náánị Ya Onweya bụ JEHOVA Chineke?

Senakerib wee laghachị n’ụlọ Nisrok, ifèòfùfè otù ugbò ọzọ n’iru arụsị ya dara ogbi. Chineke nọ n’Eluigwe náahụ ha niile. O zuwo! Nke a bụ oge ikpeazụ, Senakerib, ị gaefe chi gị maọbụ chi ọzọ ọ bụla. Emechibidowo gị ọnụụzọ nke ebere. Ohere ị nwere ichègharị agwụsịwo ugbu a. Ụmụ nke ya onweya gburu ya n’ụbọchị ahụ ka ọ nọ nime ụlọ chi ya.

“Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ugbò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n’ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma” (Eklisiastis 8:12).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Hezekaia mere ichebe obodo ya niile ahụ? Ntụkwasịobi ya ọ dị nime ihe niile ahụ?
  2. Kwue ihe banyere okwu agbamume niile ọ gwara ndịagha ya. Ndịagha ya hà nwere okwukwe n’onyendú ha?
  3. Gịnị bụ ihe Senakerib ji náanyaisi? Ọ dịwo mgbe ọ bụla emeriri ya?
  4. Òlee ụdị akwụkwọozi ọ zigara Hezekaia?
  5. Gịnị ka Hezekaia mere mgbe ọ natara ha?
  6. Òlee otú o si mata na azawo ekpere ya?
  7. Gịnị ka Senakerib tụkwasịrịobi?
  8. Kwuo ihe mere n’ọmụma ụlọikwù nke ndịiro n’abalị.
  9. Gịnị bụ ọgwụgwụ nke Senakerib?
  10. Gịnị ka iheọmụmụ a naakuziri anyị?